Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Na-anabata Gị ná Mgbakọ Distrikti “Soro Chineke Na-eje Ije”

A Na-anabata Gị ná Mgbakọ Distrikti “Soro Chineke Na-eje Ije”

A Na-anabata Gị ná Mgbakọ Distrikti “Soro Chineke Na-eje Ije”

▪ Ọtụtụ nde mmadụ ga-aga ya n’ọtụtụ narị ebe dị iche iche gburugburu ụwa. Nke mbụ n’ime mgbakọ 142 a ga-enwe na Nigeria ga-amalite n’October 8-10, 2004, a ga-enwekwa nke ikpeazụ na January 14-16, 2005. Ma eleghị anya, a ga-enwe otu n’ime mgbakọ ndị a ga-ewe ụbọchị atọ—nke a na-enwekarị Friday ruo Sunday—n’obodo dị gị nso.

N’ihe ka ukwuu n’ebe ndị a ga-enwe ya, usoro ihe omume ahụ ga-eji olu ụtọ malite n’ụbọchị nke ọ bụla n’elekere anya 9:30 nke ụtụtụ. Isiokwu nke ụbọchị Friday bụ “Nke A Bụ Ụzọ, Jeenụ Ije n’Ime Ya.” Isiokwu nwere ajụjụ ọnụ bụ́ nke a ga-agba ndị ji iguzosi ike n’ihe soro Chineke na-eje ije ga-esochi okwu nnabata bụ́ “Anyị Gbakọtara Ka Jehova Wee Zi Anyị Ụzọ Ya.” Mgbe e kwusịrị okwu ndị bụ́ “Nọgidenụ Na-anwapụta Ihe Unu Onwe Unu Bụ” nakwa “Kwe Ka Okwu Chineke Na-eduzi Nzọụkwụ Gị Kwa Ụbọchị,” nnọkọ nke ụtụtụ ga-eji okwu bụ́ isi nke isiokwu ya bụ “Soro Chineke Na-eje Ije n’Oge Ọgba Aghara” mechie.

Nnọkọ nke ehihie Friday ga-agụnye okwu mmadụ atọ ga-ekwu nke isiokwu ya bụ “Amụma Hosea Na-enyere Anyị Aka Iso Chineke Na-eje Ije.” Okwu ndị bụ́ “Unu Atọsala ‘Ihe Chineke Kekọtaworo’” nakwa “Igosi Nkwanye Ùgwù Maka Mgbakọta Anyị Ndị Dị Nsọ,” ga-esochi. Okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ bụ́ “Ozi Ọma Maka Ndị nke Mba Nile,” ga-enye agbamume banyere izi ndị na-asụ asụsụ nile ozi ọma ahụ.

Isiokwu ga-edu ụbọchị Saturday bụ “Nọrọsienụ Ike na Nche Otú Unu Si Na-eje Ije.” Otu akụkụ nke okwu ọtụtụ ndị ga-ekwu n’ụtụtụ nke isiokwu ya bụ “Ije Ije n’Ụzọ Na-aga n’Ihu n’Ihu Dị Ka Ndị Ozi,” ga-atụkwuru anyị aro banyere ụzọ anyị ga-esi na-ezi ndị na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma ahụ. Usoro ihe omume nke ụtụtụ ga-eji isiokwu dị mkpa bụ́ “Iso Jehova Na-eje Ije Site n’Izute Ya,” mechie, mgbe e kwusịrị ya, a ga-enwe ohere maka ime ndị ruru eru baptizim.

Okwu ndị a ga-ekwu n’ehihie Saturday ga-agụnye okwu ndị bụ́ “Zere Ihe Na-eme Ka A Sụọ Ngọngọ’” nakwa “Ihe Omume Ndị Na-ewuli Elu Bụ́ Ndị Na-enye Ume Ọhụrụ.” Nke ọ bụla n’ime okwu ndị ga-esochi bụ́ “Jehova Bụ Onye Na-azụ Anyị Dị Ka Atụrụ,” “Ịzụpụta Oge Kwesịrị Ekwesị,” nakwa “Ije Ije n’Okporo Ụzọ nke Ìhè Na-amụsiwanye Ike na Ya,” ga-agụnye ajụjụ ọnụ ndị na-agba ume. Nnọkọ ahụ ga-eji isiokwu na-akpali iche echiche bụ́ “‘Nọrọnụ na Nche’—Oge Awa nke Ikpe Abịawo” mechie.

E mesiri isiokwu ga-edu usoro ihe omume nke ụbọchị Sunday bụ́ “Nọgide Na-Eje Ije n’Eziokwu Ahụ” ike n’isiokwu bụ́ “Ndị Ntorobịa—Na-ejenụ Ije n’Ụzọ nke Ezi Omume.” Ihe ga-esochi ya bụ ihe nkiri a ga-eyi uwe ihe nkiri zuru ezu eme, bụ́ nke a ga-egosi banyere ozi Pọl onyeozi. Ihe ga-esochi ya bụ okwu nke ga-emesi ihe mmụta ndị dị n’ihe nkiri ahụ ike. Usoro ihe omume nke ehihie ga-agụnye okwu ihu ọha isiokwu ya bụ, “Iso Chineke Na-eje Ije Na-eweta Ngọzi Ugbu A Nakwa Ruo Mgbe Ebighị Ebi.”

Iji mata ebe kasị dịrị gị nso n’ime ebe ndị a ga-enwe mgbakọ a, ị pụrụ ịga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị ma ọ bụ detara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ.