Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Geneva Bible—Nsụgharị E Chefurula Echefu

Geneva Bible—Nsụgharị E Chefurula Echefu

Geneva Bible—Nsụgharị E Chefurula Echefu

Site n’aka onye edemede Teta! na New Zealand

Ì NWERE obere Bible nke ị pụrụ ijide n’aka n’ụzọ dị mfe, nke nwekwara mkpụrụ akwụkwọ ndị dị mfe ọgụgụ? È dere ya n’ụzọ na-eme ka ọ dịrị gị mfe ịchọta ihe ọmụma ị na-achọ? Ọ bụrụ na azịza gị nye ajụjụ ndị a bụ ee, mgbe ahụ n’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ Geneva Bible nke e dere n’afọ 1560 mere ka o kwe omume.

Ọ bụ mmadụ ole na ole taa nụtụrụla banyere Geneva Bible. N’agbanyeghị nke ahụ, nsụgharị Bible a dị ịrịba ama bụ nsụgharị kasị gaa ahịa n’oge ya. Ndehie a na-edehieghị ihe na ya, nakwa otú e si dee ma hazie ya mere ka ndị na-agụ akwụkwọ nwee mmasị dị ukwuu na ya. Ndị England na-ede egwuregwu bụ́ Shakespeare na Marlowe ji ya mee ihe dị ka ebe ha si hota akụkụ Bible ndị ha hotara.

Olee nnọọ otú Bible Bekee a wuru ewu na narị afọ nke 16 si malite n’obodo Geneva a na-asụ asụsụ French, bụ́ nke dị na Switzerland? Olee ihe ndị o nwere nke ndị ọzọ na-enweghị? Gịnị mere o ji pụọ n’anya? Olee otú anyị si nọgide na-erite uru na ya taa?

Bible nke Nwere Ihe Ndị Ọzọ Na-enweghị

Ndị sụgharịrị Geneva Bible bụ ìgwè ndị okpukpe si England gbaa ọsọ ndụ n’ihi mkpagbu nakwa ka e wee ghara igbu ha mgbe Mary Tudor malitere ọchịchị n’afọ 1553. A nabatara ndị ọkà mmụta ndị a nke ọma n’ógbè ndị Protestant dị na Geneva. N’ịbụ ebe e nwere ụlọ ọrụ ndị kwụsiri ike na-ebi akwụkwọ, bụrụkwa ebe e nwere mmasị n’ọgụgụ Bible, Geneva ghọrọ ebe ịsụgharị na ibipụta Bible bịara nwee ihe ịga nke ọma.

N’afọ 1560, e bipụtara Geneva Bible, bụ́ nke William Whittingham na ndị nyeere ya aka sụgharịrị. N’oge na-adịghị anya, ndị mmadụ bịara jiri ịnụ ọkụ n’obi na-agụ ya n’England. N’ịbụ nke dị mfe ọgụgụ karịa Bible ndị bu ya ụzọ, nke a bụ Bible Bekee mbụ nwere amaokwu ndị e nyere nọmba, nke bụ́ usoro e ji eme ihe n’ebe nile taa. O nwekwara isiokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ n’elu peeji nke ọ bụla iji nyere ndị na-agụ ya aka ịchọta kpọmkwem akụkụ ihe odide ha na-achọ n’okpuru ha. Tụkwasị na nke ahụ, kama ịbụ nke nwere mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo ndị Goth, bụ́ nke yiri ihe e ji aka dee, e ji mkpụrụ akwụkwọ a na-ahụ anya nke ọma dee ya, bụ́ nke yiri nke a ka na-ahọrọ iji ede Bible Bekee taa.

Bible ndị bu ya ụzọ, bụ́ ndị e mere otú a ga na-agụ ha n’elu tebụl ikpo okwu chọọchị, abụwo ndị dị ná nnukwu akwụkwọ ndị na-anyị nnọọ arọ. Geneva Bible bụ mbipụta a pụrụ ịkpa n’aka, bụ́ nke há ka ọkara nnukwu akwụkwọ. Ọ bụghị nanị na Bible a nke dị obere karị dị mma maka ọgụgụ Bible onwe onye nakwa ọmụmụ ihe, kamakwa, ọ dị nnọọ ọnụ ala karị.

Ịgbalịsi Ike Ime Ka Ihe Odide Ya Zie Ezi

Ndị sụgharịrị Geneva Bible lekwasịrị anya kpọmkwem n’ichebe ụtọ asụsụ na echiche nke Hibru ochie. Aha Chineke, bụ́ Jehova, pụtara n’ebe ole na ole, gụnyere Ọpụpụ 6:3; 17:5; na Abụ Ọma 83:18. E ji aka akwụkwọ dị iche dee okwu ndị nsụgharị ahụ lere anya dị ka ndị ọ dị mkpa ka a gbakwụnye, e jikwa akara ngebichi gebichie okwu ndị a gbakwụnyere iji mee ka ụtọ asụsụ doo anya.

Geneva Bible bịara ozugbo ghọọ nsụgharị a nakweere iji na-eme ihe na Scotland. E jikwa ya mee ihe n’ebe nile n’England, a na-echekwa na ọ bụ nsụgharị nke ndị Britain chịrị ala ọzọ ji mee njem ahụ a ma ama ha mere n’afọ 1620 gaa n’ebe a na-akpọ United States ugbu a. E zigara Geneva Bible ná mba ndị ọzọ Britain na-achị—gụnyere New Zealand, bụ́ nke kasị dị anya. N’ebe ahụ, n’afọ 1845, e debere otu ya n’ọ́bá akwụkwọ nke Gọvanọ Sir George Grey.

Ihe Ndị E Dere n’Ohere Dị n’Akụkụ Peeji Bụ́ Ndị Sere Okwu

Okwu nkọwa dị ukwuu e tinyere na Geneva Bible mere ka ọ bụrụ nke ihe ka ọtụtụ mmadụ ji mee ihe ruo ogologo oge. E tinyere ha n’ihi na ndị nsụgharị ahụ ghọtara na Bible nwere ‘ebe ndị kpọrọ akpọ,’ ma ọ bụ akụkụ ndị siri ike nghọta. Ihe odide dị otú ahụ e dere n’ohere dị n’akụkụ peeji abụghị ihe ọhụrụ. Tyndale ji ha mee ihe ‘n’Agba Ọhụrụ’ ọ sụgharịrị n’afọ 1534. E wezụga ihe ndị ahụ e dere n’ohere dị n’akụkụ peeji, Geneva Bible nwere ihe osise dị iche iche, okwu mbido, na map—e ji ha nile mee ihe iji mee ka a ghọtakwuo Bible. Ihe ndị ọzọ e tinyere na Bible a bụ ihe ndekọ usoro ọmụmụ, nchịkọta dị iche iche, na ọbụna akụkụ na-agba ume ịgụ Bible kwa ụbọchị.

Ọ bụ ezie na ha jara nsụgharị a mma n’azụ dị ka nke magburu onwe ya, ndị isi nke Chọọchị England katọrọ ya n’ihu ọha n’ihi na ha lere ihe ndị ahụ e dere n’ohere ndị dị n’akụkụ peeji anya dị ka ihe na-ekwekọghị n’ihe ndị ha kweere. Matthew Parker, bụ́ Achịbishọp nke Canterbury n’oge ahụ, kpọrọ ha “ihe odide dịgasị iche iche e ji ajọ mbunobi dee.” Eze James nke Mbụ lere ihe odide ndị ahụ anya dị ka ihe ndị “e lere nnọọ mmadụ anya n’ihu dee, ndị na-abụghị eziokwu, na ndị e ji agba ọchịchị mgba okpuru.” Nke ahụ abụghị ihe ijuanya, ebe ọ bụ na ụfọdụ n’ime ihe odide ndị ahụ gbaghara echiche bụ́ na ndị eze na-enweta “ike ọchịchị site n’aka Chineke”!

Geneva Bible Apụọ n’Anya

N’afọ 1604, Eze James nyere iwu ka e nwee nsụgharị ọhụrụ, na-atụ anya iji ya kpochapụ Geneva Bible n’England ruo mgbe ebighị ebi. Ọkọ akụkọ banyere nkà mmụta okpukpe bụ́ Alister McGrath na-ekwu na “ihe mgbochi kasịnụ chere nsụgharị King James Version ihu ka a bịara matawa ya na narị afọ nke 17 bụ ojiji ọtụtụ mmadụ nọgidere na-eji Geneva Bible eme ihe.” Ruo ọtụtụ afọ, ọha na eze ka họọrọ Geneva Bible, ọ nọgidekwara bụrụ Bible a nakweere iji na-eme ihe na Scotland. A nọgidere na-ebipụta mbipụta ndị ọhụrụ ruo n’afọ 1644.

Òtù Bible nke Britain na Ofesi kwuru na “nnyocha e nyochara nsụgharị Bible Eze James nke a sụgharịrị n’afọ 1611 na-egosi na ndị sụgharịrị ya . . . dabeere na [Bible] Geneva karịa ka ha si dabere ná nsụgharị Bekee ọzọ.” E ji ọtụtụ usoro ndị ọhụrụ na okwu ndị e ji mee ihe na Geneva Bible mee ihe ná nsụgharị King James Version.

Mmetụta Na-adịgide Adịgide

Ọ bụ ezie na Authorized Version, ma ọ bụ King James Version mechaziri nọchie ya, Geneva Bible bara ezigbo uru n’akụkọ ihe mere eme nke akwụkwọ ọgụgụ. Ọ bụghị nanị na o setịpụrụ ụkpụrụ ndị ọhụrụ ná nsụgharị nakwa n’usoro ide ihe kama ọ nọgidere na-abụ ihe dị mkpa a na-adabere na ya edezigharị Bible Bekee dị iche iche. O mere ka ọtụtụ ndị na-agaraghị enwe ohere ịgụ na ịmụ Bible nwee ike ịgụ na ịmụ ya.

Site n’ime ka e nwee ike imepụta Bible Eze James, Geneva Bible mekwara ka e webata nkebi ahịrịokwu ụfọdụ n’akwụkwọ ọgụgụ nakwa n’asụsụ Bekee. Ya mere, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa echezọọla Geneva Bible, o nwewo mmetụta dị ukwuu nakwa nke na-adịgide adịgide.

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

Ọpụpụ 6:3, ebe aha Chineke pụtara

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Isiokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ n’elu peeji

Ihe osise

Ihe ndị e dere n’ohere dị n’akụkụ peeji

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto nile: Site n’ikike nke American Bible Society

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 22]

Foto nile: Site n’ikike nke American Bible Society