Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Na-akpata Ajọ Mbunobi

Ihe Ndị Na-akpata Ajọ Mbunobi

Ihe Ndị Na-akpata Ajọ Mbunobi

A PỤRỤ inwe ọtụtụ ihe na-akpata ajọ mbunobi. Otú o sina dị, ihe abụọ e dekọworo nke ọma na-akpata ya bụ (1) ọchịchọ nke ịchọ onye a ga-ata ụta, na (2) iwe e bu n’obi n’ihi mmegbu e nwetara n’oge dị anya gara aga.

Dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, mgbe ọdachi mere, ndị mmadụ na-achọkarị onye a ga-ebo ya. Mgbe ndị a ma ama nọgidere na-ebo ìgwè nta ebubo n’esepụghị aka, a na-anakwere ya, ajọ mbunobi na-amalitekwa. Iji nye ihe atụ a ma ama, n’oge e nwere ndakpọ akụ̀ na ụba n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, a na-atakarị ndị ọrụ si esi bịa ụta maka ụkọ ọrụ—n’agbanyeghị na ha na-arụkarị ọrụ ihe ka ọtụtụ n’ụmụ amaala na-ajụ ịrụ.

Ma ọ bụghị ajọ mbunobi nile na-amalite n’ihi ịchọ onye a ga-ata ụta. Ihe ndị mere n’oge gara aga pụkwara ịkpata ya. “Ọ bụghị ikwubiga okwu ókè ịsị na ahịa ohu ahụ kpalitere echiche nke ịkpa ókè agbụrụ megide ndị isi ojii na nke ileda ha anya,” ka akụkọ ahụ bụ́ UNESCO Against Racism na-ekwu. Ndị ahịa ohu nwara ime ka arụrụala ha nke ịzụ na ire ụmụ mmadụ yie ihe ziri ezi site n’ikwu na ndị Africa dị ala. A ka nwere ajọ mbunobi a na-enweghị isi, bụ́ nke e mesịrị nwekwuo n’ebe ndị bi n’ala ndị mba ọzọ chịrị nọ.

N’ụwa nile, mmegbu na ikpe na-ezighị ezi ndị dị otú ahụ e nwetara n’oge gara aga na-eme ka a nọgide na-enwe ajọ mbunobi. Ibu iro nke dị n’etiti ndị Katọlik na ndị Protestant n’obodo Ireland malitere laa azụ na narị afọ nke 16, bụ́ mgbe ndị ọchịchị England kpagburu ma chụga ndị Katọlik n’ala ọzọ. Arụrụala ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst rụrụ n’oge Agha Ntụte ahụ ka na-ewe ndị Alakụba nọ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ezigbo iwe. Ihe kpatara ibu iro ahụ dị n’etiti ndị Serbia na ndị Croatia nọ n’ógbè Balkan bụ mgbuchapụ e gbuchapụrụ ndị nkịtị n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Dị ka ihe atụ ndị a na-egosi, iro ìgwè abụọ buru n’oge gara aga pụrụ ime ka ajọ mbunobi gbanyekwuo mkpọrọgwụ.

Ịkwalite Àgwà nke Ikwere Ihe n’Ajụghị Ase

Nwa na-amụ ije adịghị enwe ajọ mbunobi. N’ụzọ dị iche, ndị nchọpụta na-ekwu na nwatakịrị na-adị nnọọ njikere iso nwatakịrị si n’agbụrụ ọzọ gwurie egwu. Otú ọ dị, mgbe ọ na-erule afọ 10 ma ọ bụ afọ 11, ọ pụrụ ịdị na-ajụ iso ndị si n’agbụrụ, ebo, ma ọ bụ okpukpe ọzọ na-emekọ ihe. N’oge ọ na-etolite, ọ na-enweta ọtụtụ echiche ndị pụrụ ịdịgide n’obi ya ruo oge ndụ ya nile.

Olee otú e si amụta ihe ndị a? Nwatakịrị na-amụta àgwà ọjọọ—ma ndị nke e kwuru n’ọnụ ma ndị nke a na-ekwughị n’ọnụ—na mbụ, site n’aka ndị mụrụ ya, e mesịakwa, site n’aka ndị enyi ma ọ bụ ndị nkụzi ya. Mgbe e mesịrị, ndị agbata obi, akwụkwọ akụkọ, redio, ma ọ bụ telivishọn pụrụ inwekwu mmetụta n’ebe ọ nọ. Ọ bụ ezie na o yikarịrị ka ọ dịghị ihe ọ ma banyere ìgwè ndị ahụ ọ na-enweghị mmasị na ha, n’oge ọ ga-etoruwo ogo mmadụ, o kwubiwo n’obi ya na ha dị ala ma bụrụ ndị a na-apụghị ịtụkwasị obi. Ọ pụdịrị ịkpọ ha asị.

N’ihi nrịwanye elu nke njem na azụmahịa, n’ọtụtụ mba, ọtụtụ mmadụ na-eso ndị ọdịbendị ha na agbụrụ ha dị iche na nke ha emekọ ihe. Otú o sina dị, onye zụliteworo ajọ mbunobi siri ike na-anọgidekarị na-enwe echiche ọ dị mbụ nwee. Ọ pụrụ ịnọgide nnọọ na-ele ọtụtụ puku ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ nde mmadụ anya n’otu ụzọ dị njọ ọ dị mbụ na-ele ha, na-ewere ya na ha nile nwechara otu àgwà ọjọọ ahụ. Ihe ọ bụla na-adịghị mma e mere, ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị otu onye si n’ìgwè ahụ mere ya, na-eme ka ajọ mbunobi ahụ gbanyekwuo mkpọrọgwụ. N’aka nke ọzọ, ọ na-ewerekarị ihe ndị dị mma e mere dị ka ihe mere ná ndabara.

Ịkwụsị Ya

Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-akatọ ajọ mbunobi n’ọnụ, ọ bụ mmadụ ole na ole na-akwụsị ya. N’ezie, ọtụtụ ndị ajọ mbunobi barala n’ụmị agatụghị ekweta na ha na-eme otú ahụ. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ dịghị ihe o mere, karịsịa ma ọ bụrụ na ndị mmadụ adịghị egosipụta ajọ mbunobi ha egosipụta. Otú ọ dị, ajọ mbunobi dị ihe o mere n’ihi na ọ na-akpasu ndị mmadụ iwe ma na-ekewa ha. Ọ bụrụ na ọ bụ ikwere ihe n’ajụghị ase na-akpata ajọ mbunobi, ajọ mbunobi na-akpatakarị ịkpọasị. Onye edemede bụ́ Charles Caleb Colton (1780?-1832) kwuru, sị: “Anyị na-akpọ ụfọdụ ndị asị n’ihi na anyị amaghị ha; anyị agaghịkwanụ ama ha n’ihi na anyị kpọrọ ha asị.” Otú o sina dị, ọ bụrụ na a pụrụ ịmụta ajọ mbunobi amụta, a pụkwara ịkwụsị ya akwụsị. N’ụzọ dị aṅaa?

[Igbe dị na peeji nke 7]

Okpukpe—Ọ̀ Bụ Ihe Na-akwalite Ikwe Ibe Nọrọ Ka Ọ̀ Bụ Ajọ Mbunobi?

N’akwụkwọ ya bụ́ The Nature of Prejudice, Gordon W. Allport na-ekwu na “ná nkezi, ndị Chọọchị yiri ka hà na-enwe ajọ mbunobi karịa ndị na-abụghị ndị chọọchị.” Okwu a abụghị ihe ijuanya, n’ihi na okpukpe anọwo mgbe mgbe na-abụ ihe na-akpata ajọ mbunobi kama ịbụ ihe ngwọta ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ndị ụkọchukwu kpaliri asị a kpọrọ ndị Juu ruo ọtụtụ narị afọ. Dị ka akwụkwọ bụ́ A History of Christianity si kwuo, Hitler kwuru n’otu oge, sị: “A bịa n’ihe banyere ndị Juu, nanị ihe m na-eme bụ ịga n’ihu n’otu ihe ahụ ndị chọọchị Katọlik malitere afọ 1500 gara aga.”

N’oge a nọ na-arụ arụrụala ahụ a rụrụ n’ógbè Balkan, o yiri ka ndị chọọchị Ọtọdọks na nke Katọlik enweghị ike ịkụzi omume nke ikwe ibe nọrọ na nkwanye ùgwù n’ebe ndị agbata obi na-ekpe okpukpe ọzọ nọ.

N’otu aka ahụ, na Rwanda, ndị chọọchị gburu ndị chọọchị ibe ha. Akwụkwọ bụ́ National Catholic Reporter mere ka ọ pụta ìhè na agha a lụrụ n’ebe ahụ gụnyere “mgbukpọ agbụrụ doro anya nke, n’ụzọ dị mwute, ọbụna aka ndị Katọlik dị na ya.”

Chọọchị Katọlik n’onwe ya achọpụtala ekweghị ibe nọrọ ọ nọworo na-egosipụta eri ọtụtụ afọ gara aga. N’afọ 2000, n’oge Popu John Paul nke Abụọ na-edo Mas n’ihu ọha na Rom, ọ rịọrọ mgbaghara maka “ihe ndị ha mehiere n’oge ndị gara aga.” N’oge ihe omume ahụ, e kwuru kpọmkwem banyere “ekweghị ibe nọrọ nke okpukpe gosipụtara n’ebe ndị Juu, ụmụ nwanyị, ụmụ amaala, ndị si esi bịa, ndị ogbenye, na ụmụ e bu n’afọ nọ.”

[Foto dị na peeji nke 6]

N’elu: Ogige ndị gbara ọsọ ndụ, Bosnia na Herzegovina, October 20, 1995

Mmadụ abụọ n’ime ndị Serbia si Bosnia bụ́ ndị gbara ọsọ ndụ, ka ha na-eche ka agha obodo ahụ bie

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto si n’aka Scott Peterson/Liaison

[Foto dị na peeji nke 7]

A na-amụta ịkpọasị amụta

Nwatakịrị pụrụ ịmụta àgwà ọjọọ n’aka ndị mụrụ ya, na telivishọn, nakwa n’ebe ọzọ