Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iweruru Ndị Akakpọ Eziokwu Bible

Iweruru Ndị Akakpọ Eziokwu Bible

Iweruru Ndị Akakpọ Eziokwu Bible

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA CAMEROON

N’ihe karịrị ala 230 n’ụwa nile, Ndịàmà Jehova na-agbalị iweruru “ụdị mmadụ nile” ozi Alaeze Chineke. (1 Timoti 2:4; Matiu 24:14) Nke a gụnyere Ndị Akakpọ nọ n’Africa, bụ́ mmadụ ndị dị mkpụmkpụ bụ́ ndị ịdị ogo ha dị agbata mita 1.2 na mita 1.4 ná nkezi. Ndị a na-ebikarị n’oké ọhịa ndị dị na Central African Republic, ógbè Congo, nakwa n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Cameroon.

Ihe ndekọ mbụ e nwere banyere nzute Ndị Akakpọ na ndị si esi bịa zutere bụ mgbe Fero Neferirkare nke Ijipt zipụrụ ndị ozi ya ịga chọpụta isi Osimiri Naịl. N’oké ọhịa ndị dị n’ime ime Africa, ndị ahụ si esi bịa kọrọ na ha zutere ndị dị mkpụmkpụ. Ma onye edemede Gris bụ́ Homer ma onye ọkà ihe ọmụma bụ́ Aristotle kọrọ banyere Ndị Akakpọ. Ndị Europe zutere Ndị Akakpọ na narị afọ nke 16 nakwa na nke 17.

N’oge anyị a, Ndịàmà Jehova anọwo na-eme nkwusa n’ime ọhịa Africa. Ọ bụ ezie na Ndị Akakpọ egewo ntị n’ozi Alaeze ahụ, mgbalị ndị a na-eme isochi mmasị ahụ amịbeghị mkpụrụ n’ụzọ bụ́ isi. Nke a bụ n’ihi ndụ nkwagharị nke Ndị Akakpọ—na-esi n’otu ebe akwaga n’ebe ọzọ n’ime ọnwa ole na ole ọ bụla.

A maara Ndị Akakpọ dị ka ndị udo na ndị ihere, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha n’Africa dị ihe dị ka 150,000 ruo 300,000. Gọọmenti, òtù mba ụwa, na chọọchị dị iche iche arụwo ụlọ akwụkwọ dị iche iche kpọmkwem maka ha, rụọkwa obere ụlọ ndị kwekọrọ n’ụzọ ndụ ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ mgbalị ndị e mere iji rata ha ibi otu ebe akụwo nnọọ afọ n’ala.

Otu onye a rịbara ama na Cameroon na ọ dịghị ka ibe ya bụ Janvier Mbaki, bụ́ Onye Akakpọ mbụ a maara ghọrọ Onyeàmà n’ebe ahụ. Ọ nakweere ozi Bible mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ ahụ nwere ọmarịcha ihe osise bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, nakwa akwụkwọ ndị ọzọ. * E mere Janvier baptizim n’afọ 2002, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka onye ọsụ ụzọ, nke bụ́ ihe Ndịàmà Jehova na-akpọ ndị ozi oge nile ha. Ọ bụkwa ohu na-eje ozi n’ọgbakọ Ndị Kraịst o so na ya bụ́ nke dị na Mbang, bụ́ obodo nta dị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ. Anyị ga-ama n’ọdịnihu ma ọtụtụ n’ime Ndị Akakpọ nọ na Cameroon hà ga-ahọrọ ife Jehova, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, onye hụrụ “ụdị mmadụ nile,” n’anya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma a dịghịzi ebipụta ya.

[Foto dị na peeji nke 12]

Janvier Mbaki—Onye Akakpọ mbụ ghọrọ Onyeàmà na Cameroon—ka ọ na-ezisa ozi ọma