Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ntorobịa—Bụ́ Ndị Kwupụtara Ihe Ndị Ha Kweere n’Atụghị Egwu

Ndị Ntorobịa—Bụ́ Ndị Kwupụtara Ihe Ndị Ha Kweere n’Atụghị Egwu

Ndị Ntorobịa—Bụ́ Ndị Kwupụtara Ihe Ndị Ha Kweere n’Atụghị Egwu

N’ETITI Ndịàmà Jehova, e nwere ọtụtụ ndị na-eto eto. Ha hụrụ Chineke n’anya ma na-agbalịsi ike ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya ndị e dekọrọ na Bible. Ndị ntorobịa ndị a ji okpukpe ha akpa nganga, ha na-akọkwara ya ndị ọzọ n’ụlọ akwụkwọ n’atụghị egwu. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

▪ Mgbe Holly nọ na praịmarị nke isii, e nyere ya na ụmụ klas ya ihe omume nke ide edemede banyere ajụjụ bụ́ “Olee otú ị ga-esi akwụsị nsogbu nke iyi ọha egwu n’emeghị ya n’ike?” Holly ji ohere a dee banyere olileanya o nwere maka ọdịnihu bụ́ nke dabeere na Bible. Ọ kọwara na, n’akụkọ ihe mere eme nile, ‘mmadụ enwewo ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.’ (Eklisiastis 8:9) Mgbe ahụ ọ dọọrọ uche gaa na nanị ezi olileanya ihe a kpọrọ mmadụ nwere—Alaeze Chineke. “Ebe ọ bụ na Jizọs bụ Eze a họpụtara ịchị n’Alaeze ahụ,” ka o dere, “a ga-ekpochapụ nsogbu nile, gụnyere iyi ọha egwu.” Holly kọwara otú Jizọs ga-esi mezuo ihe onye ọchịchị ọ bụla bụ́ mmadụ na-apụghị imezu. “Mgbe ọ nọ n’ụwa,” ka o dere, “Jizọs gosipụtara ụdị onye ọchịchị ọ ga-abụ. Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ma lekọta ha. O gosipụtara ike o nwere site n’ịgwọ ọrịa na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọ dịghị ọchịchị mmadụ nke nwere ike ime ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ. Ma Alaeze Chineke ga-eme ya.” Holly mechiri edemede ya site n’ịsị, “Ngwọta ya dị n’aka Chineke, ọ dịghị n’aka ụmụ mmadụ.”

N’ala ala nke edemede ahụ, onye nkụzi ya dere, sị: “Chei! Holly, ihe odide a bụ ịgba. I chekwara echiche nke ọma wee dee ya.” Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị Holly zoro aka na ha masịkwara onye nkụzi ahụ. Nke a nyere Holly ohere nke ịgwa onye nkụzi ya banyere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, bụ́ usoro ihe omume nke ikwu okwu na izi ihe nke Ndịàmà Jehova na-enwe kwa izu. Onye nkụzi ya ji obi ụtọ nweta akwụkwọ ọgụgụ ahụ e ji eme ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.

Jessica enwewokwa ike ikwu okwu banyere okwukwe ya n’oge ndị ọ na-ede edemede n’ụlọ akwụkwọ. “Enwewo m ike ide edemede atọ banyere ihe ndị m kweere,” ka ọ na-ekwu. “Otu bụ banyere Ndịàmà Jehova na ihe ndị ruuru okpukpe. Onye nkụzi anyị weere ya dote ebe a ga na-ahụ ya anya n’ọ́bá akwụkwọ nke ụlọ akwụkwọ anyị ka ndị nwere mmasị ịgụ ya wee nwee ike ịgụ ya. Na nso nso a, edere m otu edemede banyere baptizim e mere m na otú ụbọchị ahụ dịruru ná mkpa nye m. Ụmụ akwụkwọ na-adị enyerịta ibe ha akwụkwọ ha ji rụọ ọrụ n’edemede tupu ha edebanyezie ya n’ezigbo akwụkwọ, n’ihi ya, ụmụ klas m nwere ohere nke ịgụ ihe m dere. Otu nwa agbọghọ kwuru, sị: ‘I detara ya. Ọ dị mma ịmara ibu ọrụ ndị ha na ịbụ Onyeàmà Jehova kwụ aga. Ndeewo maka baptizim e mere gị!’ Otu nwata nwanyị ọzọ kwuru, sị: ‘Akụkọ gị amaka! Obi dị m ụtọ na okwukwe gị siri nnọọ ike!’ Otu nwata nwoke dere nnọọ, sị: ‘Isi kpakọrọ gị ọnụ. Ndeewo.’”

▪ Mgbe Melissa dị afọ 11, o nwere ohere pụrụ iche nke ikwupụta ihe ndị o kweere. “Nọọsụ nke ụlọ akwụkwọ anyị bịara klas ebe a na-akụziri anyị ihe ọmụmụ sayensị iji kụziere anyị banyere usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ. Okwu banyere mmịnye ọbara bilitere. Mgbe anyị mụsịrị ihe na klas, agwara m onye nkụzi sayensị m banyere otu n’ime vidio anyị bụ́ nke kwuru banyere ọbara. Eji m vidio ahụ bịa akwụkwọ n’ụbọchị na-esonụ, onye nkụzi m jikwa ya laa ma soro ezinụlọ ya kirie ya. N’echi ya, o ji vidio ahụ bịa akwụkwọ ma gosi ya klas abụọ, gụnyere klas nke m. Mgbe ahụ, o kwuru okwu ọma banyere Ndịàmà Jehova, na-agwa klas ahụ na e wezụga anyị, a garaghị enwe ihe ndị e ji edochi anya mmịnye ọbara. Mgbe ọ na-eweghachiri m vidio ahụ, ọ jụrụ, sị, ‘Olee otú m pụrụ isi nweta vidio a maka ọ́bá akwụkwọ nke ụlọ akwụkwọ anyị?’ Enyere m ya otu vidio ahụ. Obi dị ya ụtọ nke ukwuu banyere ya, otú ahụ ka ọ dịkwa m!”

Holly, Jessica, na Melissa so n’ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-eto eto bụ́ ndị na-agbaso ndụmọdụ Bible nke bụ́ icheta Onye Okike ha. (Eklisiastis 12:1) Ị̀ na-eme nke ahụ n’onwe gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ijide n’aka na ị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11; Ndị Hibru 6:10.

Mgbe unu bụ́ ndị ntorobịa na-akọrọ ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ ibe unu banyere okwukwe unu, ọ na-agba àmà kpụ ọkụ n’ọnụ banyere Jehova Chineke na nzube ya. Ọ na-emekwa ka okwukwe unu sikwuo ike, na-emekwa ka unu malite iji ihe ùgwù unu nwere nke iso ná ndị ohu Chineke na-akpa nganga. (Jeremaịa 9:24) Ịgba àmà n’ụlọ akwụkwọ na-abụkwa ihe nchebe. Jessica na-akọwa ya n’ụzọ dị otú a, sị: “Otu n’ime uru ndị m na-erite n’ikwupụta ihe ndị m kweere bụ na ụmụ akwụkwọ adịghị anwa ịmanye m ime ihe ndị na-ekwekọghị n’ihe Bible na-ekwu.”

[Foto dị na peeji nke 30]

Holly

[Foto ndị dị na peeji nke 30, 31]

Jessica

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Melissa