Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Njedebe nke Ajọ Mbunobi

Njedebe nke Ajọ Mbunobi

Njedebe nke Ajọ Mbunobi

ÀNYỊ pụrụ ịchọpụta àgwà ndị yitewere ajọ mbunobi bụ́ ndị anyị nwere? Dị ka ihe atụ, ànyị na-ekwubi na mmadụ nwere àgwà ụfọdụ dabere n’ụcha akpụkpọ ahụ́ ya, mba o si, ma ọ bụ agbụrụ ya—n’agbanyeghị na anyị amaghị onye ọ bụ? Ka ànyị pụrụ iji ndị mmadụ n’otu n’otu kpọrọ ihe n’ihi àgwà ndị pụrụ iche ha nwere?

N’oge Jizọs, ndị bi na Judia na Galili “na ndị Sameria adịghị emekọ ihe.” (Jọn 4:9) Obi abụọ adịghị ya na otu okwu e dekọrọ na Talmud na-egosipụta echiche nke ọtụtụ ndị Juu: “Ka ọ ghara ịdị mgbe m ga-ahụ onye Sameria.”

Ọbụna ndịozi Jizọs pụrụ inwewo ajọ mbunobi ruo n’ókè ụfọdụ megide ndị Sameria. N’otu oge, ndị bi n’otu obodo nta nke ndị Sameria anabataghị ha. Jems na Jọn jụrụ ka ọ̀ bụ ha zite ọkụ ka o repịa ndị ahụ na-anabataghị ha. Site n’ịbara ha mba, Jizọs gosiri ha na àgwà ha ekwesịghị ekwesị.—Luk 9:52-56.

Mgbe e mesịrị, Jizọs tụrụ ilu banyere otu nwoke nke ndị na-apụnara mmadụ ihe wakporo ka o si Jeruselem na-aga Jeriko. Ndị Juu abụọ ji okpukpe kpọrọ ihe bụ́ ndị si n’ụzọ ahụ gafee enyereghị nwoke ahụ aka. Otú ọ dị, otu onye Sameria kwụsịrị ma kechie ọnyá nwoke ahụ. Mgbe ahụ, o mere ndokwa ka e lekọta nwoke ahụ anya ka ọnyá ya wee nwee ike ịla. Onye Sameria ahụ gosipụtara na ya bụ ezigbo onye agbata obi. (Luk 10:29-37) Ilu Jizọs pụrụ inyeworo ndị gere ya ntị aka ịghọta na ajọ mbunobi ha mere ka ha ghara ịhụ àgwà ọma nke ndị ọzọ. Afọ ole na ole mgbe e mesịrị, Jọn lọghachiri na Sameria ma kwusaa ozi ọma n’ọtụtụ n’ime obodo nta ndị dị na ya—ikekwe obodo nta ahụ ọ chọburu ibibi so na ha.—Ọrụ 8:14-17, 25.

Pita onyeozi mekwara ihe n’eleghị mmadụ anya n’ihu mgbe mmụọ ozi duziri ya ịgwa Kọnịliọs, bụ́ ọchịagha ndị Rom, banyere Jizọs. Iso ndị na-abụghị ndị Juu emekọ ihe amabughị Pita ahụ́, ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu ahụghịkwa ndị agha Rom n’anya. (Ọrụ 10:28) Ma mgbe Pita hụrụ nduzi Chineke n’okwu ahụ, o kwuru, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

Ihe Mere A Ga-eji Lụsoo Ajọ Mbunobi Ọgụ

Ajọ mbunobi na-emegide otu ụkpụrụ bụ́ isi Jizọs kụziri: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Ọ̀ dị onye ga-achọ ka e ledaa ya anya nanị n’ihi ebe a mụrụ ya, ụcha akpụkpọ ahụ́ ya, ma ọ bụ otú e si zụlite ya? Ajọ mbunobi na-emegidekwa ụkpụrụ Chineke nke eleghị mmadụ anya n’ihu. Bible na-akụzi na Jehova “sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum.” (Ọrụ 17:26) N’ihi ya, mmadụ nile bụ ụmụnne.

Ọzọkwa, Chineke na-ekpe ndị mmadụ ikpe n’otu n’otu. Ọ dịghị ama mmadụ ikpe n’ihi ihe ndị mụrụ ya ma ọ bụ ndị nna nna ya hà metere. (Ezikiel 18:20; Ndị Rom 2:6) Ọbụna mmegide e nwetara n’aka mba ọzọ abụghị ezi ihe mere a ga-eji kpọọ ndị si ná mba ahụ asị, bụ́ ndị o nwere ike ịbụ na aka ha adịghị ná mmegide ahụ. Jizọs kụziiri ụmụazụ ya ‘ịhụ ndị iro ha n’anya ma na-ekpe ekpere maka ndị na-akpagbu ha.’—Matiu 5:44, 45.

N’ihi ozizi ndị dị otú ahụ, e nyeere Ndị Kraịst narị afọ mbụ aka ịkwụsị ajọ mbunobi ha ma ghọọ òtù ụmụnna pụrụ iche bụ́ ndị si mba dị iche iche. Ha kpọrịtara ibe ha nwanna nwoke na nwanna nwanyị ma were onwe ha dị ka ụmụnna, n’agbanyeghị na ha si n’obodo dị iche iche. (Ndị Kọlọsi 3:9-11; Jems 2:5; 4:11) Ụkpụrụ mere ka e nwee mgbanwe a pụrụ imekwa otu ihe ahụ taa.

Ịlụso Ajọ Mbunobi Ọgụ Taa

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ anyị nile nwere echiche ndị anyị dị mbụ nwee, ma a dịghị atụ anya na ha ga-emerịrị ka anyị nwee ajọ mbunobi. “Ịdị mbụ kpebie otú ihe dị tupu ị mata banyere ya na-aghọ ajọ mbunobi nanị ma ọ bụrụ na ị gbanweghị echiche gị mgbe i nwetasịrị ihe ọmụma banyere ya,” ka akwụkwọ bụ́ The Nature of Prejudice na-ekwu. Mgbe mgbe, ndị mmadụ pụrụ ịkwụsị inwe ajọ mbunobi mgbe ha matara ibe ha. Otú ọ dị, dị ka akwụkwọ ahụ si kwuo, “ọ bụ nanị ụdị mmekọrịta ndị na-eme ka ndị mmadụ na-emekọ ihe ọnụ pụrụ ime ka a gbanwee àgwà ahụ.”

Nke a bụ otú John, bụ́ onye Nigeria nke si n’ala Igbo, si merie ajọ mbunobi o nwere n’ebe ndị Hausa nọ. “Na mahadum,” ka ọ na-ekwu, “ezutere m ụfọdụ ụmụ akwụkwọ bụ́ ndị Hausa bụ́ ndị ghọrọ enyi m, achọpụtakwara m na ha nwere ụkpụrụ ndị dị mma. Mụ na nwa akwụkwọ bụ́ onye Hausa rụkọrọ ọrụ n’otu ihe omume ụlọ akwụkwọ, ihe dabakwaara anyị; ebe onye Igbo mụ na ya kpakọburu na-ekweghị rụọ ókè nke ya.”

Ngwá Ọrụ E Ji Alụso Ajọ Mbunobi Ọgụ

Dị ka akụkọ bụ́ UNESCO Against Racism si kwuo, “mmụta pụrụ ịbụ ngwá ọrụ dị oké mkpa n’ọgụ a na-alụso ụdị ndị ọhụrụ nke ịkpa ókè, ịkpa ókè agbụrụ, na ikewapụ ndị ọzọ iche.” Ndịàmà Jehova kweere na mmụta dabeere na Bible bụ n’ezie ihe enyemaka kasị mma n’akụkụ a. (Aịsaịa 48:17, 18) Mgbe ndị mmadụ tinyere ozizi ya n’ọrụ, a na-eji nkwanye ùgwù edochi inyo mmadụ enyo, a na-ejikwa ịhụnanya emenyụ ọkụ nke ịkpọasị.

Ndịàmà Jehova achọpụtawo na Bible na-enyere ha aka imeri ajọ mbunobi ha. N’ezie, Bible na-enye ha ma ihe mkpali ma ohere nke iso ndị si n’ọdịbendị nakwa n’agbụrụ ọzọ na-emekọ ihe. Christina, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru n’isiokwu nke mbụ n’usoro isiokwu a, bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. “Nzukọ anyị na-aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ka m na-enwekwu obi ike onwe onye,” ka ọ na-ekwu. “Ahụ́ na-eru m ala n’ebe ahụ n’ihi na ọ naghị adị m ka ọ̀ dị onye na-enwe ajọ mbunobi megide m.”

Jasmin, bụ́kwa Onyeàmà, na-echeta na oge mbụ e gosipụtara ịkpa ókè agbụrụ n’ebe ọ nọ bụ mgbe ọ dị afọ itoolu. Ọ na-ekwu, sị: “Thursday na-abụkarị ụbọchị ihe na-adịrị m mfe n’izu n’ihi na n’abalị ya, ana m aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị mmadụ na-egosi m ịhụnanya n’ebe ahụ. Ha na-eme ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye pụrụ iche, ọ bụghị onye a jụrụ ajụ.”

Ọrụ afọ ofufo nke Ndịàmà Jehova na-akwalite na-emekwa ka ndị a zụlitere n’ụzọ dị iche iche na-emekọ ihe ọnụ. A mụrụ Simon na Britain, ọ bụ ezie na ezinụlọ ya si Caribbean. E gosiwo ya ajọ mbunobi dị ukwuu mgbe ọ rụrụ ọrụ ido blọk n’ụlọ ọrụ ihe owuwu dị iche iche. Ma e mesoghị ya otú ahụ n’oge nile o jere ozi dị ka onye ọrụ afọ ofufo, bụ́ nke o so ụmụnna ya n’okwukwe rụkọọ ọrụ. “Esorowo m Ndịàmà ibe m si n’ọtụtụ ala rụkọọ ọrụ,” ka Simon na-akọ, “ma anyị mụtara imekọ ihe ọnụ n’udo. Ụfọdụ n’ime ndị bụ́ ezigbo enyi m bụ ndị si mba ọzọ, bụrụkwa ndị nzụlite ha dị iche na nke m.”

N’ezie, Ndịàmà Jehova ezughị okè. N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ na ha aghaghị ịnọgide na-alụso ọchịchọ nke inwe ajọ mbunobi ọgụ. Ma ịmara na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu na-eme ka ha bụrụ ndị a kpaliri n’ụzọ dị ukwuu ime otú ahụ.—Ndị Efesọs 5:1, 2.

Ụgwọ ọrụ a na-enweta n’ịlụso ajọ mbunobi ọgụ dị ọtụtụ. Ka anyị na ndị si ná mba ọzọ na-emekọrịta ihe, ndụ anyị na-aka mma. Ọzọkwa, site n’Alaeze ya, Chineke ga-eguzobe n’isi nso, ọha mmadụ nke ezi omume ga-ebi n’ime ha. (2 Pita 3:13) N’oge ahụ, a ga-emeri ajọ mbunobi ruo mgbe ebighị ebi.

[Igbe dị na peeji nke 11]

M̀ Na-enwe Ajọ Mbunobi?

Jụọ onwe gị ajụjụ ndị na-esonụ iji chọpụta ma ọ̀ pụrụ ịbụ na ị na-enwetụ ajọ mbunobi n’amaghị ama:

1. M̀ na-ewere ya na ndị si n’agbụrụ ụfọdụ, okpukpe ụfọdụ, ma ọ bụ mba ụfọdụ nwere àgwà na-adịghị mma, dị ka nzuzu, umengwụ, ma ọ bụ aka ntagide? (A na-ejikarị okwu njakịrị eme ka ụdị ajọ mbunobi a dịgide.)

2. M̀ na-adị ata ndị si mba ọzọ kwabata ụta maka nsogbu akụ̀ na ụba ma ọ bụ nke ọha ndị m na-enwe?

3. Èkwewo m ka ibu iro nke ógbè m buwere megide mba ọzọ eri oge mee ka m na-ebuso ndị si mba ahụ iro?

4. M̀ na-enwe ike ile onye ọ bụla m zutere anya dabere n’àgwà nke ya—n’agbanyeghị ụcha akpụkpọ ahụ́ ya, ọdịbendị ya, ma ọ bụ agbụrụ ya?

5. M̀ na-eji ohere m nwere amata ndị ọdịbendị ha dị iche na nke m? M̀ na-eme mgbalị iji mee nke ahụ?

[Foto dị na peeji nke 8]

N’ilu ya banyere ezigbo onye Sameria, Jizọs kụziiri anyị otú e si eguzogide ajọ mbunobi

[Foto dị na peeji nke 8]

N’ụlọ Kọnịliọs, Pita kwuru, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu”

[Foto dị na peeji nke 9]

Ozizi Bible na-eme ka ndị si n’obodo dị iche iche dị n’otu

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndịàmà Jehova na-etinye ihe ha na-amụta n’ọrụ

[Foto dị na peeji nke 10]

Christina—“Nzukọ anyị na-aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ka m na-enwekwu obi ike onwe onye”

[Foto dị na peeji nke 10]

Jasmin—“Ndị mmadụ na-egosi m ịhụnanya . . . Ha na-eme ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye pụrụ iche, ọ bụghị onye a jụrụ ajụ.”

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Simon, bụ́ onye ọrụ afọ ofufo n’iwu ihe owuwu—“Anyị mụtara imekọ ihe ọnụ n’udo”