Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Olee Mgbe Ị Ga-agụcha Ihe A Nile?”

“Olee Mgbe Ị Ga-agụcha Ihe A Nile?”

“Olee Mgbe Ị Ga-agụcha Ihe A Nile?”

Na July 2001, otu nwoke nọ na Khabarovsk nke dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Russia hụrụ mbipụta Teta! 34 n’ọ́bá akwụkwọ nke obodo ahụ. O deturu aha ya n’akwụkwọ ma were ha, ma mgbe ụbọchị ọ ga-eweghachi ha ruru n’August, ọ dịghịzi ya ka ya weghachi ha. N’ihi ya, o deturu aha ya ọzọ n’akwụkwọ iweghachi ha na September. Magazin ndị ahụ masịrị ya nke ukwuu nke na o detughachiri aha ya n’akwụkwọ na November ma were ha na mbipụta ndị ọhụrụ isii.

Tupu nwoke ahụ ahụ magazin ndị a, ọ nọwo mgbe nile na-agbara akwụkwọ okpukpe ọsọ. N’ihi gịnị ka o ji malite ịgụ Teta!? Ọ bụ “n’ihi na ihe ka ọtụtụ n’isiokwu ndị dị n’ime magazin a na-atụle nsogbu ọha bụ́ ndị na-adọrọ mmasị ma na-emetụta onye ọ bụla,” ka o dere.

“Mgbe mgbe, a na-enwe isiokwu ndị e dere nke ọma banyere obodo ukwu na mba ndị nke oge a nakwa ihe ọmụma banyere ọdịnala ndị mmadụ,” ka nwoke ahụ gara n’ihu ikwu. O nwekwara mmasị n’isiokwu ndị kwuru banyere ndị nweworo ihe ịga nke ọma ná ndụ, ndị nọgidere na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, nakwa ndị nyewooro ndị ọzọ aka ịtachi obi ná nsogbu na ọdachi. Olee otú o si lee magazin a anya? “N’ime magazin nile na-ekwu banyere ihe ndị na-eme n’oge a, nkà mmụta sayensị, nkà mmụta banyere ọdịdị mbara ala, na omenala nke ndị bi gburugburu ụwa, a pụrụ ikwu n’ezie na ọ dịghị nke karịrị Teta!.”

Nwoke ahụ kwuru ka e zitere ya mbipụta Teta! ndị ochie n’asụsụ Russian malite ná ndị nke afọ 1995 bịawa. E wezụga Teta!, ọ rịọrọ ka e zitere ya akwụkwọ na broshuọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova bipụtara. “Ị pụrụ ịjụ, sị,” ka o dere, “‘Olee mgbe ị ga-agụcha ihe a nile?’” Ọ zara ajụjụ ahụ n’onwe ya site n’ịsị na ya nwere oge maka ịgụ akwụkwọ ndị bara uru, ebe ọ bụ na ya adịghị etinye oge dị ukwuu n’ikiri telivishọn nakwa n’ịchọ ihe n’Intanet.

Teta! na-enye ihe ọmụma sara mbara banyere ihe ndị na-eme ugbu a ma na-eme ka a ghọta ihe ngwọta dịịrị nsogbu ndị a na-enwe n’oge a. Gịnị ma ị gwa Ndịàmà Jehova ka ha na-ewetara gị mbipụta Teta! ndị ọhụrụ kwa ọnwa?

[Foto dị na peeji nke 27]

Ịghọta Nsogbu Mgbanwe Mberede n’Ọnọdụ Uche

[Foto dị na peeji nke 27]

Egwu Nuklia—Ruo Ókè Há Aṅaa Ka Ọ Dị Adị n’Ezie?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 27]

Mgbawa nuklia: Foto nke U.S. Department of Energy