Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?

Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Zere Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?

“Mgbe m dị afọ 19, mụ na otu nwa okorobịa nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị nwere mmekọahụ. Ị gaghị ama ụdị ihere na nchekasị ọ kpataara m. O mere ka m na-ele onwe m anya dị ka onye na-abaghị n’ihe.”—Laci. *

“GBANAHỤNỤ ịkwa iko,” ka Bible na-enye n’iwu. (1 Ndị Kọrint 6:18) Otú ọ dị, o yiri ka ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime ndị na-eto eto taa dị njikere ịṅa ntị n’okwu Bible ahụ ma zere inwe mmekọahụ ruo mgbe ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Ụfọdụ ndị, dị ka Laci, emejụwo ọchịchọ ha ma bụrụ ndị na-ata ahụhụ nakwa ndị ha na akọ na uche ha na-alụ.

N’eziokwu, mmadụ ịchịkwa agụụ mmekọahụ ya adịghị mfe. Dị ka akwụkwọ bụ́ Adolescent Development si kwuo, mgbanwe mmiri ọgwụ ahụ́ a na-enwe n’oge uto na-eme ka “ịrị elu nke agụụ mmekọahụ bụ́ nke ya na ya na-agakọ” bụrụ ihe a na-apụghị izere ezere. Paul na-ekweta, sị, “Mgbe ụfọdụ, echiche inwe mmekọahụ na-abata m n’uche n’enweghị nnọọ ihe kpatara ya.”

N’agbanyeghị nke ahụ, prọfesọ bụ́ ọkà n’ọrịa ụmụaka bụ́ Howard Kulin na-ekwu, sị: “Ọ bụ ime nnọọ ka ihe daa mfe mfe ikwu na àgwà ndị nọ [n’oge uto] na-akpa dabeere nanị ná mgbanwe nke mmiri ọgwụ ahụ́.” Ọ na-akọwa na ihe ndị metụtara mmekọrịta mmadụ na ibe ya sokwa akpata ya. N’eziokwu, ihe ndị metụtara mmekọrịta mmadụ na ibe ya—karịsịa nrụgide ndị ọgbọ—pụrụ inwe mmetụta siri nnọọ ike.

N’akwụkwọ ya bụ́ A Tribe Apart, onye edemede bụ́ Patricia Hersch na-ekwu na “ndị na-eto eto ewuwo ógbè nke ha. . . . Ọ bụghị nanị na ọ bụ ìgwè nke ndị ọgbọ mejupụtara, ọ bụkwa ógbè nke a gụpụrụ [ndị okenye] na ya, bụ́ nke nwere ụkpụrụ na iwu nke ya.” Otú ọ dị, “ụkpụrụ” nakwa “iwu” nke ọtụtụ ndị na-eto eto taa na-akwadokarị imejụ agụụ mmekọahụ, ọ bụghị ịchịkwa ya achịkwa. N’ihi ya, a pụrụ ịrụgide ọtụtụ ndị ịnwale mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye.

Ka o sina dị, ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst emewo mkpebi amamihe dị na ya izere ụdị ịkwa iko nile, ebe ha maara na Chineke na-akatọ ya dị ka otu n’ime “ọrụ nke anụ ahụ́.” * (Ndị Galeshịa 5:19) Otú ọ dị, olee otú ị pụrụ isi nọgide na-adị ọcha n’omume mgbe ị na-eche nrụgide ndị siri ike ihu?

Soro Ndị Maara Ihe Na-akpakọrịta

Ọ dị mma ịmara na dị nnọọ ka nrụgide nke ndị gị na ha na-akpakọ pụrụ inwe mmetụta dị njọ n’ebe ị nọ, ezi ndị enyi pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ebe ị nọ. Ọ bụ dị ka Bible na-ekwu, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe.” (Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrint 15:33) Akụkọ e si n’aka Òtù Ahụ́ Ike Ụwa nweta na-ekwu na “ndị nọ n’oge uto bụ́ ndị ha na ndị mụrụ ha, ndị okenye ndị ọzọ hụrụ ha n’anya, na ndị ọgbọ ha, na-enwe mmekọrịta bara uru,” bụ́kwa ‘ndị e nyere ezigbo nduzi ná ndụ eyikarịghị ka ọ bụ ha ga-amalite ihe omume ndị ga-eduga n’inwe mmekọahụ.’

Iso nne na nna gị na-enwe ezi mmekọrịta pụrụ ịba uru dị ukwuu. Joseph na-ekwu, sị, “Nne na nna m nyeere m aka nke ukwuu iguzogide nrụgide m na-enwe ịchọpụta otú mmekọahụ na-adị.” N’eziokwu, ndị nne na nna bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke pụrụ inye gị nduzi ndị dabeere n’Okwu Chineke. (Ndị Efesọs 6:2, 3) Ha pụrụ ịkwado gị ná mgbalị ndị ị na-eme ịnọgide na-adị ọcha n’omume.

N’eziokwu, ọ pụrụ ime gị ihere ná mmalite iso ha kwurịta banyere ihe ndị metụtara mmekọahụ. Ma ọ pụrụ iju gị anya ịhụ otú ha ghọtaruru nsogbu gị nke ọma. E kwuwerị, ọ dị mgbe ha onwe ha bụ ndị na-eto eto. Ya mere, Sonja na-adụ ndị ọzọ na-eto eto ọdụ, sị, “Gakwuru nne na nna gị, emekwala ihere ịgwa ha okwu banyere mmekọahụ.”

Gịnị ma ọ bụrụ na nne na nna gị adịghị agbaso ụkpụrụ Bible? N’agbanyeghị na ị ka ga na-asọpụrụ ha, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ịchọ nduzi ụfọdụ site n’aka ndị na-abụghị ndị òtù ezinụlọ gị. Paul, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, na-ekwu, sị, “Ana m enweta enyemaka dị ukwuu n’akụkụ a site n’aka ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst tozuru okè.” Kenji, bụ́ nwa agbọghọ nne ya na-ekweghị ekwe, kwuru n’otu aka ahụ, sị, “Iji nweta okwu ndụmọdụ, ana m agakwuru nnọọ ndị meworo okenye, bụ́ ndị na-ewuli m elu n’ụzọ ime mmụọ.” Ma ọ na-adọ aka ná ntị, sị, “Ana m ezere ndị na-enweghị ụkpụrụ omume ọma, ọbụna ma a sị na ha na-azọrọ na mụ na ha na-ekpe otu okpukpe.”

Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ịkpachara anya banyere mkpakọrịta ndị i na-enwe n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst. Bible na-echetara anyị na n’ìgwè ọ bụla buru ibu, a ga-enwe ụfọdụ ndị na-agaghị akpa àgwà kwesịrị nsọpụrụ mgbe mgbe. (2 Timoti 2:20) Olee ihe i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị chọpụta na ụfọdụ ndị ntorobịa gị na ha nọ n’ọgbakọ bụ “ndị ihu abụọ” n’ezie? (Abụ Ọma 26:4) Zere iso ndị dị otú ahụ na-akpachi anya, ma soro ndị enyi ga-akwado mkpebi i mere ịnọgide na-adị ọcha n’omume na-akpakọrịta.

Jụ Mgbasa Echiche Ndị Na-ebibi Ihe

I kwesịkwara ime ihe iji chebe onwe gị pụọ n’imerime foto na okwu ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ́ ndị a na-ahụ n’akwụkwọ, magazin, vidio egwú, egwuregwu vidio, ihe nkiri, na Intanet. Ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-egosi inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye dị ka ihe na-adọrọ adọrọ, ihe dị ụtọ, nakwa ihe na-adịghị ize ndụ. Mmetụta dị aṅaa ka nke a na-enwe? Kenji, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, na-ekweta, sị: “Ekiriri m ihe nkiri nke e gosiri mmekọahụ na ya dị ka ihe na-adịghị ihe o mere, nke nwere ọbụna ihe ndị metụtara mmadụ idina ụdị onwe ya. N’ihi ya, amalitere m ichefu otú ihe ndị a jọruru ná njọ n’anya Jehova.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na, ná ntụrụndụ ndị na-ewu ewu, a na-asa nnọọ anya mmiri ezochi nhụjuanya ndị na-esi n’inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye apụta—ịtụrụ ime ọkwà, ịlụ di ma ọ bụ nwunye n’etorughị etoru, nakwa ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ. N’ihi ya, ekwela ka “ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe, ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ” ghọgbuo gị.—Aịsaịa 5:20.

Cheta okwu dị n’Ilu 14:15: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ije ụkwụ ya.” Ọ bụrụ na i gwuru foto ndị na-egosi mmekọahụ ma ọ bụ na-akpali agụụ mmekọahụ anya n’oge ị na-agụ akwụkwọ, na-achọ ihe n’Intanet, ma ọ bụ na-ekiri TV, mee ihe ozugbo! Mechie akwụkwọ ahụ, gbanyụọ kọmputa gị, ma ọ bụ gaa na chanel telivishọn ọzọ! Mgbe ahụ tinye uche gị n’ihe ọzọ—n’ihe kwesịrị nsọpụrụ. (Ndị Filipaị 4:8) Site n’ime otú ahụ, ị pụrụ ịkwụsị ọchịchọ na-ezighị ezi tupu ha eduga n’ihe ọzọ.—Jems 1:14, 15.

Kpachara Anya Maka Ọnọdụ Ndị Pụrụ Iduba Gị n’Ịkwa Iko

Ọ̀ dị onye gị na ya na-eme mkpapụ? Mgbe ahụ, ọ dị mkpa ka ị mụrụ anya. Bible na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa.” (Jeremaịa 17:9) Ọ dị mfe ikwe ka ngosipụta nke ịhụnanya duga n’omume rụrụ arụ. Saa anya mmiri n’ụzọ ezi uche dị na ya, dị ka inwe ezigbo onye nnọnyere ma ọ bụ iso ìgwè ndị na-akpa ezi àgwà na-eme mkpapụ. Zere nanị unu ịnọ n’ọnọdụ ndị pụrụ iduba unu n’ịkwa iko.

Ikekwe gị na mmadụ ekwela nkwa ọlụlụ, gị ana-echekwa na igosipụta ịhụnanya n’ụzọ ụfọdụ ga-ekwesị ekwesị. N’agbanyeghị nke ahụ, otu akụkọ si n’aka Òtù Ahụ́ Ike Ụwa na-adọ aka ná ntị, sị: “Obere oge tupu ha alụọ di, ọ na-eyi ka ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ nwanyị hà na-enwe mmekọahụ, ọbụna n’ebe e weere inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye dị ka ihe arụ.” * Ya mere, kpaa ókè n’ókè a ga-egosipụtaru ịhụnanya ma si otú ahụ chebe onwe gị pụọ n’obi mgbawa na-enweghị isi.

Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́, a na-amanye ma ọ bụ na-arụgide ọtụtụ ndị ntorobịa—karịsịa ụmụ agbọghọ—inwe mmekọahụ. Dị ka otu nnyocha e mere na-egosi, “pasent 60 nke ụmụ agbọghọ nọ n’oge uto na United States, bụ́ ndị nwere mmekọahụ tupu ha eruo afọ 15, nwere ya ná mmanye.” Ndị na-amanye ha ime omume a na-ejikarị ike amanye ha. (Eklisiastis 4:1) Dị ka ihe atụ, Bible na-agwa anyị na nwa nwoke Eze Devid bụ́ Amnọn ‘hụrụ nwanne ya nwanyị nke otu nna ji ya na ya, bụ́ Tema, n’anya’ ma jiri ụzọ aghụghọ manye ya iso ya nwee mmekọahụ.—2 Samuel 13:1, 10-16.

Nke a apụtaghị na ọ gaghị ekwe omume igbochi idina mmadụ n’ike ma ọ bụ ịrụgide mmadụ inwe mmekọahụ. Site n’ịmụrụ anya mgbe e nwere ihe ize ndụ, na-ezere ọnọdụ ndị pụrụ iduga gị n’inwe mmekọahụ, ma na-eme ihe ozugbo e nwere ihe iyi egwu, ị pụrụ ime ihe dị ukwuu iji chebe onwe gị. *

Mee Ka Obi Gị Dị “n’Otu”

Anyị nwere olileanya na aro ndị anyị tụrụ n’ebe a ga-enyere gị aka ná mkpebi gị ịnọgide na-adị ọcha. Ma n’ikpeazụ, ọ bụ ihe dị n’obi gị ga-ekpebi ihe àgwà gị ga-abụ. Jizọs kwuru na ‘n’obi ka ịkwa iko si apụta.’ (Matiu 15:19) Ya mere, ị ghaghị iguzogide ọchịchọ nke inwe “uche abụọ” (ịdị ṅara ṅara) ma ọ bụ inwe ‘obi abụọ’ (inwe ihu abụọ) n’okwu a dị nnọọ mkpa.—Abụ Ọma 12:2; 119:113.

Ya dị mgbe ọ bụla i chere na mkpebi i mere esighịzi ike, ma ọ bụ chee na o nwere ihe ya na obi gị na-alụ, kpee ekpere dị ka Devid mere mgbe ọ rịọrọ, sị: “Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha Gị.” (Abụ Ọma 86:11) I mesịa nke ahụ, mee ihe kwekọrọ n’ekpere gị site n’ịmụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible ma na-etinye ihe ị na-amụta n’ọrụ. (Jems 1:22) Lydia na-ekwu, sị, “A na-akpali m iguzogide ọnwụnwa inwe mmekọahụ site n’ịdị na-echeta mgbe nile na ‘ọ dịghị onye na-akwa iko ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha nwere ihe nketa ọ bụla n’alaeze nke Chineke.’”—Ndị Efesọs 5:5.

Izere mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye pụrụ ịbụ ihe na-adịghị mfe. Ma site n’enyemaka Jehova, ị pụrụ idebe omume gị ọcha ma chebe onwe gị na ndị ọzọ pụọ n’obi erughị ala nakwa nhụjuanya.—Ilu 5:8-12.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ndị ahụ.

^ par. 21 Lee isi nke 29 nke akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 23 A tụrụ aro dị iche iche banyere nke a n’isiokwu dị iche iche nke “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” ndị bụ́ “Iyi Egwu Mmekọahụ—Olee Otú M Pụrụ Isi Chebe Onwe M?” nakwa “Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Enyi M Nwoke Imegbu M?” ná mbipụta anyị nke September 8, 1995, na July 8, 2004.

[Foto dị na peeji nke 25]

Iso nne na nna gị kwurịta nsogbu gị pụrụ inyere gị aka ịnọgide na-adị ọcha n’omume

[Foto dị na peeji nke 26]

Iso ìgwè na-akpa ezi àgwà na-eme mkpapụ pụrụ ịbụ ihe nchebe