Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 19. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Iji mee ka anyị ghọta na anyị ekwesịghị ‘ịlaghachi n’ihe ndị anyị hapụworo,’ ònye ka Jizọs Kraịst na-agba anyị ume icheta? (Luk 17:31, 32)

2. N’ilu Jizọs banyere ọgha mkpụrụ ahụ, n’ihi gịnị ka mkpụrụ ahụ nke pulitere n’elu nkume ji chanwụọ? (Mak 4:5, 6)

3. Olee ihe eziokwu ahụ bụ́ na Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ga-anọdụ ala “n’aka nri” Jehova pụtara? (Ọrụ 2:34)

4. Ònye bụ nanị onye Shụa a kpọrọ aha ya n’Akwụkwọ Nsọ? (Job 8:1)

5. Gịnị bụ aha Chineke nyere Jekọb mgbe ọ dị ihe dị ka afọ 97? (Jenesis 32:28)

6. Ọ bụ ezie na Sọl egosiwo onwe ya dị ka onye nnupụisi n’ebe Chineke nọ ma na-achụgharị Devid, n’ihi gịnị ka Devid na-ejighị gbuo Sọl mgbe o nwetara ohere ime otú ahụ? (1 Samuel 26:7-11)

7. Ná mmezu nke okwu Jehova, olee anụmanụ riri Jezibel? (2 Ndị Eze 9:36)

8. Olee ebe mbụ a kpọrọ aha ndị Izrel kwụsịrị ka ha na-aga Oké Osimiri Uhie ahụ? (Ọpụpụ 12:37)

9. Dị ka Jems si kwuo ya, olee ụdị ofufe nke ‘dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ site n’ụzọ Chineke si ele ihe anya’? (Jems 1:27)

10. Olee oge e kpugheere Daniel iji gosi mgbe Mezaịa ga-abịa, nakwa mgbe a ga-ebipụ ya? (Daniel 9:24-27)

11. Olee ihe Jizọs kwuru a ‘ga-ekwusa n’ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile’ tupu ọgwụgwụ abịa? (Matiu 24:14)

12. Olee “ọrụ nke anụ ahụ́” ndị pụrụ igbochi mmadụ iketa Alaeze Chineke? (Galeshia 5:19-21)

13. Olee ikike Jehova nwere bụ́ nke na-eme ka o nwee ike ikpe mmadụ ikpe n’ụzọ ziri ezi? (1 Samuel 16:7)

14. Tupu a họpụta ya ịbụ onye amụma, olee ọrụ Emọs rụrụ? (Emọs 7:14)

15. Olee ihe Jizọs bu n’uche mgbe ọ sịrị na ndị na-eso ụzọ ya aghaghị ‘ịkpọ ndị òtù ezinụlọ ha asị’? (Luk 14:26)

Azịza Nye Ajụjụ

1. “Nwunye Lọt”

2. N’ihi na o nweghị mkpọrọgwụ, ya mere, ọ pụghịkwa ịnagide oké anwụ

3. Jizọs ga-anọ n’ọkwá kasị elu dị ka onye na-enyere Jehova n’onwe ya aka

4. Bildad, otu n’ime ndị enyi atọ Job

5. Izrel

6. Jehova etewo Sọl mmanụ, n’ihi ya, Devid hapụụrụ Jehova okwu ahụ

7. Nkịta

8. Sukọt

9. “Ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha, na mmadụ idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị”

10. ‘Izu iri asaa’

11. “Ozi ọma nke a nke alaeze”

12. “Ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ, ikpere arụsị, ime mgbaasị, ibu iro, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, ndọrọ ndọrọ, nkewa, ịrọ òtù, anyaụfụ, ịṅụ oké mmanya, oriri oké mkpọtụ, na ihe ndị dị ka ndị a”

13. ‘Ọ na-ele obi’

14. Ọ bụụrụ ‘onye nche ehi na onye na-edozi mkpụrụ osisi sycomore’

15. Na ha kwesịrị ịhụ Ya n’anya karịa ha