Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Ihe Dị Njọ n’Ịṅụ Oké Mmanya Mgbe Ụfọdụ?

Ò Nwere Ihe Dị Njọ n’Ịṅụ Oké Mmanya Mgbe Ụfọdụ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . .

Ò Nwere Ihe Dị Njọ n’Ịṅụ Oké Mmanya Mgbe Ụfọdụ?

“Ọ bụ ezie na anyị anọwo na-aṅụ nnọọ mmanya ruo ọtụtụ awa, mụ na enyi m nwoke ji otu karama mmanya ọkụ hapụ nnọkọ ahụ n’elekere mbụ nke abalị. Anyị malitere ịla—na-aṅụ mmanya ka anyị na-ala. Ihe ọzọ m chetara bụ na anyanwụ wapụtara, mgbe ahụ ka m ghọtara na anyị ehiewo ụzọ. N’eziokwu, anyị anọwo na-aga n’okporo ụzọ awara awara na-ekwo ekwo. Ọ bụ ihe ijuanya na ụgbọala akụtughị anyị.”—Clay. *

ỊṄỤ OKÉ MMANYA MGBE ỤFỌDỤ. Ụfọdụ na-akọwa ya nnọọ dị ka mmadụ ịṅụgide mmanya ruo mgbe mmanya gbuwere ya. Akụkọ e si n’aka Ụlọ Ọrụ Mba United States nke Na-ahụ Maka Ịṅụbiga Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Ókè na Aṅụrụma, nweta, nwara ịkọwa ya n’ụzọ a kapịrị ọnụ karị. O kwuru na ịṅụ oké mmanya mgbe ụfọdụ bụ nke ‘a na-akọwakarị dị ka nwoke ịnọ n’otu oge ṅụchapụ ihe dị ka karama mmanya biya atọ na nwanyị ịnọ n’otu oge ṅụchapụ karama abụọ.’

Ndị ọrụ ahụ́ ike na United States na-akpọ ya “nsogbu bụ́ isi nke ahụ́ ike ọha na eze.” Dị ka nnyocha e mere n’ebe ụmụaka sekọndrị nọ n’England, Scotland, na Wales nọ, na-egosi, ‘ihe ruru pasent 25 nke ndị dị afọ 13 na 14 zọọrọ na ha aṅụwo, ọ dịkarịa ala, ihe dị ka karama biya atọ n’otu oge.’ Ihe dị ka pasent 50 nke ndị nile dị afọ 15 na 16 a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ha emewo otu ihe ahụ.

N’otu nnyocha e mere na United States, mmadụ 2 n’ime ụmụ akwụkwọ sekọndrị 5 ọ bụla aṅụwo

oké mmanya ọ dịkarịa ala otu ugbo n’ime izu abụọ gaferenụ tupu e mee nnyocha ahụ. Dị ka Ngalaba Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike na United States si kwuo, “ihe dị ka nde 10.4 nke ndị nọ site n’afọ 12 ruo 20 kọrọ na ha na-aṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya. N’ime ha, nde 5.1 bụ ndị na-aṅụ oké mmanya mgbe ụfọdụ gụnyere nde 2.3 bụ́ ndị aṅụrụma na-aṅụrọ anya ọ dịkarịa ala ugboro ise kwa ọnwa.” Otu nnyocha e mere n’Australia gosiri na ụmụ agbọghọ na-aṅụ oké mmanya karịa ụmụ okorobịa ná mba ahụ—na-aṅụ site na karama 7 ruo karama 18 n’otu oge!

N’ihe ka ukwuu n’ugboro ole ha ṅụrụ oké mmanya, ọ bụ ndị ntorobịa ndị ọzọ rụgidere ha ịṅụ ha. Onye nnyocha bụ́ Carol Falkowski na-akọ, sị: “Egwuregwu asọmpi ndị ọhụrụ a na-ama mmadụ aka ịṅụ mmanya juru ebe nile: ìgwè ndị ihe mgbaru ọsọ ha bụ ịṅụgide mmanya ruo mgbe ọ ga-egbuwe ha egbu. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime asọmpi ndị ahụ na-achọ ka ndị nile na-ekere òkè na ya ṅụọ otu shọtụ mmanya ọkụ a na-agwaghị agwa n’otu oge a kapịrị ọnụ, ka ihe ngosi TV na-aga n’ihu ma ọ bụ ka ìgwè ahụ na-enwe nkwurịta okwu.”

Ịṅụ Oké Mmanya Mgbe Ụfọdụ —Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya

Ọ bụ ezie na ndị ụfọdụ pụrụ iwere ịṅụ oké mmanya mgbe ụfọdụ dị ka egwuregwu, ọ bụ egwuregwu dị nnọọ ize ndụ! Ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè na-eme ka ụbụrụ ghara ịdị na-enweta ikuku ndụ; ihe ndị dị mkpa na-arụ ọrụ n’ime ahụ́ pụrụ ịkwụsị ịrụ ọrụ. Ihe mgbaàmà ya pụrụ ịgụnye ịgbọ agbọ, ntụbọ, nakwa ịghara ịdị na-ekutecha ume. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịkpata ọnwụ. N’ihe dị ka otu ọnwa Kim, bụ́ onye dị afọ 17, gụsịrị akwụkwọ na sekọndrị, ọ gara nnọkọ a na-asị “onye ọ bụla ṅụrụ otú ike kwere ya.” Kim ṅụrụ ihe dị ka karama 10 tupu ya atụbọọ. Nwanne ya nwanyị nke tọrọ ya bịaziri buru Kim eburu lawa n’ụlọ. N’echi ya, nne Kim hụrụ na ọ nwụwo.

Ọ pụrụ ịbụ na ịṅụ oké mmanya n’onwe ya adịkarịghị egbu mmadụ, ma ọ ka bụ ihe ize ndụ nye ahụ́ ike. “Ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya pụrụ imebi akụkụ ahụ́ ọ bụla dị n’ime ahụ́ gị n’ụzọ dị oké njọ,” ka Jerome Levin, bụ́ ọkachamara n’ahụ́ ike nke uche na-ekwu. “Akụkụ ahụ́ ebe ndị ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-aka akpa aka ọjọọ bụ usoro akwara, imeju, na obi.” Otu isiokwu gbara na magazin bụ́ Discover na-ekwu, sị: “Nnyocha ndị ọhụrụ e mere na-enye echiche na ụmụaka ndị na-aṅụ mmanya na-etinye onwe ha n’ihe ize ndụ. Ndị dị afọ iri na ụma bụ́ ndị na-aṅụ oké mmanya pụrụ ịdị na-ebibi ihe ka ukwuu n’ikike nke ụbụrụ ha, n’ihi na ụbụrụ ha ka na-etolite nnọọ ịbanye n’afọ ndị iri abụọ ha.” A na-ekwu na aṅụrụma na-akpatakwa pịmpụl, ahụ́ nsekọta n’etorughị etoru, ibutukwu ibu, mmebi nke akụkụ ahụ́ ndị dị n’ime ahụ́, mmanya iri ahụ́, na ọgwụ ọjọọ iri ahụ́.

E nwere ihe ize ndụ ndị ọzọ dị n’ịṅụbiga mmanya ókè. Ọ bụrụ na mmanya amalite igbu gị, ọ pụrụ ịdịrị mmadụ mfe imeso gị mmeso ọjọọ. A pụrụ iti gị ihe ma ọ bụ ọbụna dinaa gị n’ike. Ọzọkwa, ị pụrụ ịbụ ihe ize ndụ nye ndị ọzọ, na-akpa àgwà ndị na-enweghị nchịkwata, bụ́ ndị ị na-agaghị echetụ n’echiche ịkpa ma ọ bụrụ na anya doro gị. Ya mere, Bible na-adọ aka ná ntị na ọ bụrụ na ị ṅụbiga mmanya ókè, “anya gị abụọ ga-ahụ ndị inyom na-abụghị nwunye gị, obi gị ga-ekwukwa okwu ịgbakụta Chineke azụ.” (Ilu 23:33) Ihe ndị dị mwute ọ na-akpata pụrụ ịgụnye ntisa nke enyi, emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ebe ọrụ, ịbụ onye a mara ikpe ime mpụ, na ịda ogbenye. *Ilu 23:21.

Nrụgide A Na-enwe n’Ịṅụ Mmanya

N’agbanyeghị ihe ize ndụ ndị dị otú ahụ, a na-akwalite ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ụzọ dị ukwuu, na-emekwa ka o jupụta ebe nile n’ọtụtụ ala. N’eziokwu, a na-eto ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ná mkpọsa ngwá ahịa ndị a na-eme na TV nakwa na magazin. Otú ọ dị, ndị na-eto eto na-adabakarị n’ịṅụ oké mmanya mgbe ụfọdụ n’ihi nrụgide nke ndị ọgbọ.

N’otu nnyocha e mere n’Australia iji mara ọnọdụ nke ndị bi na ya n’ihe banyere ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, pasent 36 nke ndị na-eto eto a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na isi ihe mere ha ji aṅụ mmanya bụ “iji gosi na ha sokwa biri.” N’ọnọdụ ọgba aghara a na-enwe ná “nnọkọ ịṅụ biya,” onye ihere pụrụ ime ka nnọkọ ahụ kpoo ọkụ ka ndị ọgbọ ya na-agba ya ume ịnọgide na-aṅụpụ ma na-aṅụchi. E bu obere Katie ebu laa n’ụlọ mgbe ọ ṅụsịrị oké mmanya. “Enyi” ya nyere ya mmanya, ma na-agwa ya, sị: “Katie, ngwanụ, ị bụghịzi obere nwa. I kwesịrị ịmụ otú e si eloda ya.”

Ọchịchọ nke ịtụrụ ndụ na nke igosi na e sokwa biri siri nnọọ ike nke na, n’agbanyeghị ihe àmà ndị doro anya na-egosi na e nwere ihe ize ndụ ndị dị n’ịṅụ oké mmanya, ọ ka nọgidere na-ewu ewu.

Nhọrọ Dị Aṅaa Ka Ị Ga-eme?

Ajụjụ ndị na-ebilite bụ: Nhọrọ ndị dị aṅaa ka ga-eme banyere ịṅụ mmanya? Ihe ị ga-eme ọ̀ bụ nanị isonyere ndị ọgbọ gị? Cheta ihe Bible na-ekwu ná Ndị Rom 6:16: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ bụrụ na unu anọgide na-enyefe onwe unu n’aka onye ọ bụla dị ka ndị ohu irubere ya isi, unu bụ ndị ohu ya n’ihi na unu na-erubere ya isi?” Ọ bụrụ na i kwere ka ndị ọgbọ gị na-achịkwa ihe ọ bụla ị na-eme, ị ghọzielanụ ohu ha. Bible na-agba gị ume ime mkpebi n’onwe gị. (Ilu 1:4) O nwere ndụmọdụ ndị pụrụ inyere gị aka izere ihie ụzọ dị njọ. Tụlee ihe o nwere ikwu banyere mmanya na-aba n’anya.

N’ezie, Bible adịghị akatọ ịṅụ mmanya na-aba n’anya, ọ dịghịkwa emegide ndị na-eto eto ịtụrụ ndụ. Otú ọ dị, ọ na-adọ aka ná ntị megide ịṅụbiga ya ókè. “Onye na-akwa emo ka mmanya vaịn bụ, onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ nke na-aba n’anya bụ; onye ọ bụla nke na-awagharị site na ya amaghị ihe,” ka Ilu 20:1 na-ekwu. Ee, mmanya pụrụ ime ka mmadụ mee ihe a ga-eji na-akwa ya emo, ọ pụkwara ịkpali mmadụ ime mkpọtụ! N’eziokwu, ọ pụrụ ime ka i nwee obi ụtọ ruo nwa oge, ma, ọ bụrụ na ị ṅụbiga ya ókè, ọ ‘na-ata dị ka agwọ,’ na-eme ka i merụọ ahụ́ ma na-akpatakwara gị obi mgbawa.— Ilu 23:32.

Ihe ọzọ a ga-atụle bụ na n’ọtụtụ mba, e nwere afọ ole e kwuru mmadụ ga-eru tupu e kwe ka ọ na-aṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya. Ndị Kraịst na-erube isi n’iwu ndị dị otú ahụ. (Taịtọs 3:1) E mere ha iji chebe gị.

N’ikpeazụ, bụ́ nke kasịkwa mkpa, tụlee mbibi ime mmụọ ịṅụbiga mmanya ókè pụrụ ịkpata. Jehova Chineke chọrọ ka i jiri “obi gị dum” na-ejere ya ozi—ọ bụghị obi nke ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya bibisịworo n’ụzọ na-enweghị isi! (Matiu 22:37) Okwu Chineke na-akatọ, ọ bụghị nanị “ịṅụ oké mmanya” kama, ọ na-akatọkwa “ịma aka n’ịṅụ mmanya.” (1 Pita 4:3) Ya mere, ịṅụ oké mmanya megidere uche Onye Okike anyị. Imebiga ihe ókè n’ụzọ dị otú ahụ pụrụ igbochi mmadụ na Chineke inwe mmekọrịta chiri anya.

Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị na-aṅụ oké mmanya mgbe ụfọdụ? Chọọ enyemaka ngwa ngwa site n’ịgwa ya nne gị ma ọ bụ nna gị ma ọ bụkwanụ Onye Kraịst tozuru okè. * Jekwuru Jehova Chineke n’ekpere ma rịọ maka enyemaka ya. E kwuwerị, o “mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile.” (Abụ Ọma 46:1) Ebe ọ bụ na ihe na-akpatakarị ịṅụ oké mmanya mgbe ụfọdụ na ịṅụ mmanya n’etorughị etoru bụ nrụgide ndị ọgbọ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i mee mgbanwe dị ukwuu n’ụdị ndị enyi ị na-ahọrọ nakwa n’ụdị ntụrụndụ ị na-enwe. Ime mgbanwe ndị dị otú ahụ agaghị adị mfe, ma site n’enyemaka Jehova, ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo ụfọdụ n’ime aha ndị ahụ.

^ par. 12 Dị ka otu nnyocha e mere na United States si kwuo, “o yikarịrị ka ohere e nwere na ndị na-aṅụ oké mmanya mgbe ụfọdụ ga-agha klas, laa azụ n’ọrụ ụlọ akwụkwọ, nwee mmerụ ahụ́, mebiekwa ihe onwunwe, ji okpukpu asatọ karịa nke ndị na-adịghị aṅụ oké mmanya.”

^ par. 22 N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mkpa inweta enyemaka nke onye dọkịta.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 27]

Ịṅụ Oké Mmanya Mgbe Ụfọdụ—Ndekọ nke Ọnụ Ọgụgụ Ọdachi Ndị Ọ Kpataworo

Ndekọ nke ọnụ ọgụgụ ndị a na-esonụ na-egosi ihe dị mwute ịṅụ oké mmanya n’etiti ụmụ akwụkwọ sekọndrị na United States kpataworo:

Ọnwụ: Kwa afọ, ụmụ akwụkwọ sekọndrị 1,400 bụ́ ndị nọ n’agbata afọ 18 na 24 na-anwụ site ná mmerụ ahụ́ mberede ndị metụtara ịṅụ oké mmanya, tinyere ihe mberede ụgbọala

Mmerụ ahụ́: Ụmụ akwụkwọ 500,000 bụ́ ndị nọ n’agbata afọ 18 na 24 na-enwe mmerụ ahụ́ mberede mgbe mmanya na-egbu ha.

Mwakpo: Ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ bụ́ ndị nọworo na-aṅụ mmanya na-awakpo ihe karịrị ụmụ akwụkwọ 600,000, bụ́ ndị nọ n’agbata afọ 18 na 24.

Mmekọahụ A Na-achọghị: Ihe karịrị ụmụ akwụkwọ 70,000 bụ́ ndị nọ n’agbata afọ 18 na 24 bụ ndị e sowooro nwee mmekọahụ ha na-achọghị ma ọ bụ ndị ndị enyi ha dinara n’ike n’ihi ịbụ ndị mmanya na-egbu.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Ụlọ Ọrụ Mba United States nke Na-ahụ Maka Ịṅụbiga Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Ókè na Aṅụrụma

[Foto dị na peeji nke 25]

Ndị ọgbọ gị pụrụ ịrụgide gị ịṅụ oké mmanya mgbe ụfọdụ