Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịbụ Nne n’Etorughị Nnọọ Etoru

Ịbụ Nne n’Etorughị Nnọọ Etoru

Ịbụ Nne n’Etorughị Nnọọ Etoru

“Enyi m nwoke mara mma. O nwere ego, anyị pụkwara ịga ebe dị iche iche ma kporie ndụ. Mgbe m na-ahụghịzi nsọ m, amatara m na nsogbu adịla. Olee otú m ga-esi akọrọ mama m? Olee otú o si bụrụ m ka ihe a na-eme? Adị m nanị afọ 16, amaghịkwa m ihe m ga-eme eme.”—Nicole.

TAA, Nicole, * bụ́ onye dị ihe dị ka afọ 36, bụ nne ji ụmụ atọ, nke nwere obi ike ma gbasie ike. Nwa mbụ ya dị afọ 20. Ee, ọtụtụ afọ gara aga, ọ bụ otu n’ime ọtụtụ nde ndị dị afọ iri na ụma bụ́ ndị dị ime n’alụghị di. Dị nnọọ ka ndị nne ndị ọzọ dị afọ iri na ụma, o chere ọtụtụ ihe ịma aka ndị dị egwu na mkpebi ndị tara akpụ ihu, ọ maghịkwa ihe ọdịnihu ya ga-abụ.

Nicole adịkarịghị ekwu banyere akpata oyi wụrụ ya, nkweta ọ na-ekwetaghị ihe mere, egwu tụrụ ya, iwe were ya, na obi nkoropụ ndị o nwere n’oge ọ nọ ná ngwụsị afọ iri na ụma ya—oge ndị ọgbọ ya na-eche banyere uwe na ịgbata ihe n’ụlọ akwụkwọ. Otú o sina dị, ọnọdụ Nicole abụghị nke olileanya na-adịghị na ya. O si n’ezinụlọ na-ahụ n’anya bụ́ nke gbalịworo ịkụnye ụkpụrụ omume ọma n’obi ya. Ọ bụ ezie na ruo oge ụfọdụ, ọ họọrọ ileghara ụkpụrụ ndị ahụ anya—ma taa ahụhụ ndị si na ya pụta—mgbe e mesịrị, ụkpụrụ ndị ahụ mere ka o bie ndụ nwere nzube na nke na-eju afọ. “Olileanya ka dị” bịara ghọọ ụkpụrụ nduzi ya.

N’ụzọ dị mwute, ọ bụghị ndị nne nile dị afọ iri na ụma nwere ezinụlọ na-akwado ha—ma ọ bụ echiche dị otú ahụ nke ikwere na ihe ga-emesị dị mma. Ọtụtụ ndị na-ahụta onwe ha ngwa ngwa dị ka ndị tọrọ atọ n’ọnọdụ nke ịda ogbenye nke na-eyi ha ka ọ dịghị ihe a pụrụ ime banyere ya. Ụfọdụ aghaghị ịnagide obi mgbawa ndị ndina n’ike na ime ihe ike na-akpata.

Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a na-enwe mmetụta dị mma n’ahụ́ ụmụaka nke ndị nne dị afọ iri na ụma. Akwụkwọ bụ́ Teen Moms—The Pain and the Promise (Ndị Nne Dị Afọ Iri na Ụma—Ihe Mgbu na Ihe Ọma Ndị A Na-atụ Anya Ha) na-ekwu na ụmụ ọhụrụ nke ndị nne dị afọ iri na ụma “na-adịkarị abụ ndị na-adịrughị arọ otú ụmụaka ndị nne ha merela okenye na-adị ma a mụọ ha, ha na-arịakwa ọrịa karịa ha, na-anwụ karịa ha, ha adịghị enweta nlekọta ahụ́ ike dị mma otú ha na-enweta, ha bụ ndị agụụ na nsogbu ndị a na-enwe site n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ na-akpa aka ọjọọ karịa ha; ha na-abụ ndị a na-emeso ihe ike karịa ha, ha adịghịkwa eto ngwa ka ha.” N’ezie, ụmụ nwanyị ndị a mụrụ mgbe nne ha dị afọ iri na ụma yikarịrị nnọọ ka hà ga-amụ nwa mgbe ha onwe ha dị afọ iri na ụma karịa ụmụ nwanyị ndị a mụrụ mgbe nne ha torurula ogo mmadụ.

Ókè ha aṅaa ka ịtụrụ ime mgbe a dị afọ iri na ụma gbasaruworo? Olee otú ndị nne dị afọ iri na ụma pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ịnagide ihe ịma aka nke ịzụlite ụmụ ha? Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla a pụrụ isi nyere ndị na-eto eto aka izere ịbanyedị n’ọnọdụ ọjọọ dị otú ahụ abanye? Isiokwu ndị na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ n’usoro isiokwu a.