Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịtụrụ Ime Mgbe A Dị Afọ Iri na Ụma—Ọdachi Zuru Ụwa Ọnụ

Ịtụrụ Ime Mgbe A Dị Afọ Iri na Ụma—Ọdachi Zuru Ụwa Ọnụ

Ịtụrụ Ime Mgbe A Dị Afọ Iri na Ụma—Ọdachi Zuru Ụwa Ọnụ

ỊTỤRỤ ime mgbe a dị afọ iri na ụma abụwo nke a kpọrọ nsogbu zuru ebe nile. Otú ọ dị, a na-ahụ nnọọ otú nsogbu a dịruru ná njọ mgbe a tụlere mmetụta ịtụrụ ime na-enwe n’ahụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na ụma nke egwu ji. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọtụtụ ihe ga-agbanwe ná ndụ ya bụ́ nke ga-enwe mmetụta dị ukwuu, ọ bụghị nanị n’ebe ya onwe ya nọ kamakwa n’ebe ezinụlọ ya na ndị ọ hụrụ n’anya nọ.

Ndị dị afọ iri na ụma nọ n’ihe Bible na-akpọ “ntoju ntorobịa”—oge agụụ mmekọahụ na-anọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu. (1 Ndị Kọrint 7:36) Otú ọ dị, ọ ga-abụ ime ka ọnọdụ siri ike yie ihe dị mfe ma ọ bụrụ na e lee ịtụrụ ime n’oge a dị afọ iri na ụma anya nanị dị ka ihe ejighị ihe mgbochi afọ ime mee ihe na-akpata. Ihe àmà na-egosi na ịtụrụ ime mgbe a dị afọ iri na ụma na-agụnye ọtụtụ ihe ndị metụtara mmetụta uche na mmekọrịta mmadụ na ibe ya.

Ihe Ndị So Akpata Ya

Nnyocha e mere na-egosi na ọtụtụ ndị nne dị afọ iri na ụma si n’ezinụlọ tisara etisa. “Ná ndụ m nile, ihe kasị dị m mkpa bụ ịnọ n’ezinụlọ nke bụ́ ezigbo ya” bụ ihe ọtụtụ ndị tụụrụ ime mgbe ha dị afọ iri na ụma na-ekwukarị. Ya mere, dị ka ihe àmà na-egosi, ezinụlọ itisa pụrụ ime ka nwa agbọghọ dị afọ iri na ụma nke nọ na ya tụrụ ime. N’otu ihe omume e guzobere iji nyere ndị nne dị afọ iri na ụma aka, a chọpụtara na “mmekọrịta ha na nne ha anaghị [adịkarị] mma nakwa na ha na nna ha adịghị enwe mmekọrịta ọ bụla.” Anita, bụ́ onye ghọrọ nne mgbe ọ dị afọ 18, na-echeta na n’agbanyeghị na nne ya nke na-azụ ụmụ nanị ya rụsiri ọrụ ike iji gboo mkpa ya n’ụzọ ihe onwunwe, Anita ka na-enwe mmetụa nke onye ihe funahụrụ n’ihi ọnụnọ nna ya na-anọghị ya.

Ụmụ agbọghọ ndị ọzọ na-aghọ ndị nne n’alụghị di n’ihi ihe ndị si kpọmkwem ná ndina e dinara ha n’ike, pụta. Nye ụfọdụ n’ime ha, mkpasasị uche ahụ yiri ka ọ̀ na-akpatara ha obi mgbawa ndị ha pụrụ igosipụta ka oge na-aga site n’ibi ndụ n’ụzọ na-etinye ha n’ihe ize ndụ. Dị ka ihe atụ, e dinara Jasmine n’ike mgbe ọ dị afọ 15. “Mgbe nke ahụ gasịrị,” ka ọ na-echeta, “achọghịzi m ịma ma ụzọ ndụ m ọ̀ na-etinye m ná nsogbu. Mgbe m dị afọ 19, ebutere m ime.” Mmetọ n’ụzọ mmekọahụ pụkwara ịkpali mmetụta nke ịbụ onye na-abaghịzi n’ihe. “Ọ dịghị mgbe ọ dị m ka m bara uru,” ka Jasmine kwara n’arịrị. Anita gabigara ahụmahụ ọjọọ yiri nke ahụ: “N’oge m nọ n’agbata afọ 7 na afọ 11, otu nwoke dị afọ iri na ụma metọrọ m n’ụzọ mmekọahụ. Abịara m kpọọ onwe m asị. Atara m onwe m ụta.” Ọ tụụrụ ime mgbe ọ dị afọ 17.

N’aka nke ọzọ, ihe na-etinye ụfọdụ ndị ntorobịa n’ọnọdụ ahụ bụ inwebiga obi ike ókè na ịchọ ịmata ihe. Nicole, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru n’isiokwu bu ụzọ, na-ekweta, sị: “Echere m na m maara ihe nile, na m nwere ikike nke ime ihe ọ bụla. N’ụzọ dị mwute, m nwekwara ikike nke ịmụ nwa.” Carol, bụ́ onye ghọkwara nne n’alụghị di n’oge ọ dị obere, kpebiri inwe mmekọahụ iji chọpụta otú ọ na-adị. Ọ na-ekwu, sị, “Echere m na ọ dị ihe dị na ya nke na-efunahụ m.”

Amaghị ihe ga-esi n’inwe mmekọahụ pụta sokwa akpata ya. Na Britain, dị ka ndị ọkà ná mmekọrịta ọha na eze bụ́ Karen Rowlingson na Stephen McKay si kwuo, ụfọdụ ndị na-eto eto “adịghị enwe ezi ihe ọmụma banyere . . . ihe ndị ha ga-atụwa anya ha ná mmekọrịta ha na-enwe na ihe ịtụrụ ime na-agụnye.” O yiri ka ụfọdụ ndị ntorobịa adịghị aghọta njikọ dị n’etiti inwe mmekọahụ na ịtụrụ ime. N’otu nnyocha e mere, ndị nne dị afọ iri na ụma “kọrọ mgbe mgbe na ọ wụrụ ha akpata oyi n’ahụ́ ma ọ bụ ju ha anya ịchọpụta na ha dị ime n’agbanyeghị na ha adịghị eji ihe ndị na-egbochi afọ ime eme ihe.”

Ka o sina dị, echiche na-agbanwe agbanwe a na-enwe banyere mmekọahụ bụ ihe kasị eme ka ndị dị afọ iri na ụma na-atụrụ ime. Anyị na-ebi n’oge ndị mmadụ bụ “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1-4) Ndị Australia na-eme nnyocha bụ́ Ailsa Burns na Cath Scott na-ekwu na “ọha na eze, okpukpe, na ndị achụmnta ego, ewetulatawo aka na ntaramahụhụ ndị a na-enye mmadụ n’ihi inwe mmekọahụ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye.” Ịmụ nwa n’alụghị di nwere ike ọ gaghịzi na-eme ihere otú o si eme n’oge ndị gara aga. Leenụ, n’ógbè ụfọdụ, ndị dị afọ iri na ụma pụrụ ọbụna ịdị na-ele ịmụ nwa anya dị ka ụdị nke nturu ugo ma ọ bụ ihe na-egosi na ọkwá ha arịala!

Mmetụta Uche Ndị Ọ Na-akpata

Ihe ndị nne dị afọ iri na ụma ji anya ha ahụ na-adị nnọọ iche n’echiche efu nke ndị ntorobịa. Ozugbo ha matara na ha dị ime, ụmụ agbọghọ na-enwekarị mmetụta dịgasị iche iche. Ọtụtụ na-ekweta na ọ wụrụ ha akpata oyi n’ahụ́ ma ọ bụ rie ha ọnụ. “Mmeghachi omume ndị a na-enwekarị na-agụnye iwe, obi amamikpe, na mmadụ ekwetaghị na ọ bụ ya ka ihe a na-eme,” ka òtù Ndị Ọkachamara America Na-ahụ Maka Nsogbu Uche Ụmụaka na nke Ndị Nọ n’Oge Uto na-ekwu. Otú ọ dị, ekwetaghị banyere ihe merenụ pụrụ ịdị ize ndụ, ebe ọ bụ na ọ pụrụ igbochi nwa agbọghọ ịga nweta nlekọta ahụ́ ike ndị dị ya mkpa.

“Ụjọ tụrụ m,” ka Elvenia na-echeta banyere oge ọ chọpụtara ihe si ná mmekọahụ o nwere pụta. Ọtụtụ ụmụ agbọghọ dị ime adịghị enwe onye ha pụrụ ịkọsara ọnọdụ ha ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ihere na-eme ha nke ukwuu ịkọrọ onye ọzọ banyere ọnọdụ ha. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ụfọdụ na-abụ ndị obi amamikpe na egwu rikpuru. Ọtụtụ ndị tụtara ime mgbe ha dị afọ iri na ụma na-enwekwa ajọ ịda mbà n’obi. “Achọghị m nnọọ ịma ma m̀ na-adị ndụ ma m̀ na-anwụ anwụ,” ka Jasmine na-ekwu. *

Otú ọ sọrọ nwa agbọghọ ya siri meghachi omume ná mmalite, ọ ghaghị imesị meere onwe ya na nwa ya ọtụtụ mkpebi ndị gụnyere ihe dị ukwuu. Otú ụmụ agbọghọ pụrụ isi mee mkpebi ndị dị otú ahụ n’ụzọ amamihe dị na ha ka a ga-atụle n’isiokwu anyị na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ụzọ isi nagide echiche nke ịchọ igbu onwe onye, lee usoro isiokwu ndị dị na peeji nke 13-22 ná mbipụta Teta! nke November 8, 2001.

[Igbe dị na peeji nke 7]

Ịdị Afọ Iri na Ụma Atụrụ Ime—Eziokwu Ndị Na-awụ Akpata Oyi

Ọ bụ ezie na ihe ndị na-esonụ na-akọwa ọnọdụ ndị e nwere na United States, ọ na-egosipụta ụfọdụ n’ime nsogbu ndị dị ime mgbe ha dị afọ iri na ụma na-eche ihu n’ụwa nile.

● Mmadụ 4 n’ime ụmụ agbọghọ 10 ọ bụla na-atụrụ ime tupu ha eruo afọ 20—ihe karịrị mmadụ 900,000 dị afọ iri na ụma na-atụrụ ime kwa afọ.

● Ihe dị ka pasent 40 nke ndị nne dị afọ iri na ụma erubeghị afọ 18.

● Ụmụaka ndị nne ha dị afọ iri na ụma na-abụ ndị a na-emegbu na ndị a na-eleghara anya karịa ụmụaka ndị nne ha torurula ogo mmadụ.

● Nanị mmadụ 4 n’ime ndị nne 10 ọ bụla na-erubeghị afọ 18 gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị.

● Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 80 nke ụmụ nwoke adịghị alụ ụmụ agbọghọ dị afọ iri na ụma mụtaara ha nwa.

● Nanị pasent 30 nke ndị nne dị afọ iri na ụma, bụ́ ndị lụrụ di mgbe ha mụsịrị nwa, na-anọgide na di; ụmụ nwanyị lụrụ di mgbe ha dị afọ iri na ụma yikarịrị ka hà ga-ahapụ di ha karịa ụmụ nwanyị lụrụ di mgbe ha dị, ọ dịkarịa ala, afọ 25.

● Ụmụ nke ndị nne dị afọ iri na ụma yikarịrị ka hà ga-abụ ndị a mụkworo amụkwo na ndị na-adịghị arọ otú kwesịrịnụ, bụ́ nke na-amụbakwu ohere e nwere na ha ga-anwụ, na ha ga-ekpu ìsì, na ha ga-abụ ndị ntị chiri, ndị nwere nsogbu iku ume ndị na-ekweghị ala ala, ndị isi na-ezughị okè, ndị isi mgbaka, ndị nwere ọrịa ụbụrụ nke na-eme ka ahụ́ na-ama jijiji, ndị nwere nsogbu ịgụ ihe, na ndị oké aghara.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya bụ n’akwụkwọ bụ́ Not Just Another Single Issue: Teen Pregnancy Prevention’s Link to Other Critical Social Issues, The National Campaign to Prevent Teen Pregnancy, February 2002.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Ọnụ Ọgụgụ Ndị Na-adị Afọ Iri na Ụma Atụrụ Ime n’Ụwa Nile

BRAZIL: Dị ka a kọrọ, “ụmụ agbọghọ 698,439 na-erubeghị afọ 19, mụrụ ụmụ n’afọ 1998 n’ụlọ ọgwụ ndị dị na Brazil . . . Mmadụ 31,857 n’ime ha bụ ụmụaka ndị nọ n’agbata afọ 10 na afọ 14, bụ́ nke ị na-aghaghị ikweta na ọ bụ afọ ndụ ezi uche na-adịtụghị na ya mmadụ ịmụ nwa.”—Folha de S. Paulo, August 25, 1999.

BRITAIN: “Britain nwere ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu nke ndị na-adị afọ iri na ụma amụ nwa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe . . . Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 90,000 dị afọ iri na ụma tụụrụ ime n’England n’afọ 1997. Ihe dị ka ụzọ atọ n’ụzọ ise [nke ndị ahụ tụụrụ ime] mụrụ nwa ha (56,000), pasent 90 nke ụmụ a mụrụ n’afọ 1997 bụkwa nke ụmụ nwanyị na-alụghị di (ihe dị ka 50,000).”—Lone Parent Families, 2002.

MALAYSIA: “Ụmụaka ndị a mụrụ n’alụghị di ná mba ahụ amụbaala kemgbe afọ 1998, ihe ka ọtụtụ ná ndị nne ahụ dịkwa afọ iri na ụma.”—New Straits Times–​Management Times, April 1, 2002.

RUSSIA: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụmụ nile a mụrụ na Russia n’afọ gara aga bụ nke ndị nne na-alụghị di, ọnụ ọgụgụ a ji okpukpu abụọ karịa pasent ole ha dị n’afọ iri bu ụzọ, ọ nọkwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ, ka ndekọ ọnụ ọgụgụ gọọmenti na-egosi. Ọ bụ ndị dị afọ iri na ụma mụrụ ihe karịrị pasent 40 nke ụmụaka ndị a.”—The Moscow Times, November 29, 2001.

UNITED STATES: “N’agbanyeghị ndalata ọnụ ọgụgụ nke ndị dị afọ iri na ụma atụrụ ime na-adalata, mmadụ 4 n’ime ụmụ agbọghọ 10 ọ bụla dị afọ iri na ụma na-atụrụ ime, ọ dịkarịa ala, otu ugbo tupu ha eruo afọ 20.”—Whatever Happened to Childhood? The Problem of Teen Pregnancy in the United States, 1997.

[Foto dị na peeji nke 5]

Mgbe ndị nne na nna kewara, ohere e nwere na nwa agbọghọ dị afọ iri na ụma nke nọ n’ezinụlọ ahụ ga-ebute ime, na-amụba

[Foto dị na peeji nke 6]

O yiri ka ụfọdụ ndị ntorobịa adịghị aghọta njikọ dị n’etiti inwe mmekọahụ na ịtụrụ ime

[Foto dị na peeji nke 6]

Ibute ime na-emetụta ma nwa agbọghọ ma ndị ọ hụrụ n’anya, n’ụzọ dị ukwuu