Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụlọ Akwụkwọ Ọta Akara nke Na-enweghị Ihe Ngwuri Egwu

Ụlọ Akwụkwọ Ọta Akara nke Na-enweghị Ihe Ngwuri Egwu

Ụlọ Akwụkwọ Ọta Akara nke Na-enweghị Ihe Ngwuri Egwu

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA GERMANY

N’otu ụtụtụ, mgbe ụmụ akwụkwọ ọta akara bịara akwụkwọ, ha hụrụ na ọ dịghị ihe ọzọ dị n’ọnụ ụlọ nile ahụ ma e wezụga oche. Ha chọgidere nwa bebi, ngwá e ji egwuri egwú, ákwà ndị a dụkọtara adụkọta nke yiri anụmanụ, ma ha ahụghị. E nweghị akwụkwọ ma ọ bụ ihe ndị a na-edo ka blọk. Ọbụna mpempe akwụkwọ na mkpà adịghị. E wepụsịala ihe nile ha ji egwuri egwu, a gaghịkwa eweghachi ha ruo ọnwa atọ. Ọ̀ bụ gịnị mere?

Ụlọ akwụkwọ ọta akara a bụ otu n’ime ọtụtụ ndị dị n’Austria, Germany, nakwa Switzerland bụ́ ndị na-ekere òkè n’otu ihe omume ọhụrụ dị ịrịba ama nke a kpọrọ Ụlọ Akwụkwọ Ọta Akara nke Na-enweghị Ihe Ngwuri Egwu. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịda gị ka ihe ọhụrụ, atụmatụ a, bụ́ nke ndị ọkachamara n’ọrụ ahụ́ ike nke Njikọ Mba Ndị Dị na Europe jara mma nke ukwuu, bụ iji gbochie ihe iri mmadụ ahụ́. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị nchọpụta achọpụtawo na ndị mmadụ adịchaghị abụ ndị ụdị ihe ọ bụla na-eri ahụ́ riri ahụ́ ma ọ bụrụ na ha azụlite nkà nke iso ndị ọzọ na-emekọ ihe n’oge ha dị obere. Akụkọ si n’otu akwụkwọ akụkọ na-ekwu na ihe ndị a na-agụnye mmadụ inwe “nkà nke nkwurịta okwu na ikike nke iso ndị mmadụ malite mkparịta ụka, nke idozi esemokwu, nke ikweta ihe o mere, nke isetịpụrụ onwe ya ihe mgbaru ọsọ, nke ịghọta nsogbu dịgasị iche iche, nke inweta enyemaka, na nke ịchọta ihe ngwọta.” Dị ka ndị na-akwado atụmatụ a si kwuo, a ghaghị ịzụlite nkà ndị dị otú ahụ n’oge dị ka o kwere mee, oge ndị ahụ a na-agaghị enwe ihe ngwuri egwu na-emezu nzube a, na-akwalite nkà nchepụta ihe na obi ike onwe onye.

E ji nlezianya hazie ma kwurịta banyere atụmatụ a ma n’ihu ndị nne na nna ma n’ihu ụmụ akwụkwọ. Ná mmalite, ụfọdụ ụmụaka amaghị ihe ha ga-eme n’ihi enweghị ihe ngwuri egwu. “E nwere ụlọ akwụkwọ ọta akara ebe ndị ụmụaka na-amalite ịkpa aghara n’izu anọ mbụ [a malitere ihe omume ahụ],” ndị na-ahazi ya adịkwaghị ama ihe ha ga-eme banyere ya, ka akụkọ ahụ na-ekwu. Ma ụmụaka na-amụta ime mgbanwe, ha na-amụtakwa otú e si echepụta ihe. N’ihi enweghị ihe ngwuri egwu, ụmụaka na ibe ha na-enwe nkwurịta okwu, na-eme atụmatụ, na-egwukọkwa egwu ọnụ karị, si otú ahụ na-enwekwu nkà nke iso ndị mmadụ na-emekọ ihe na nkà nke ịsụ asụsụ. Ụfọdụ ndị nọbu na-ezere ikwunyere ụmụaka ndị ọzọ okwu site n’itinye uche ha n’ihe ngwuri egwu ha, na-emetezi enyi. Ndị nne na nna ahụwokwa ezi mgbanwe n’ebe ụmụ ha nọ. Ụmụaka kpara àgwà ka mma mgbe ha na-egwuri egwu, ha chepụtakwara ihe karị, ka ndị nne na nna kwuru.