Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iche Ihe Ịma Aka nke Ịbụ Nne Mgbe A Dị Afọ Iri na Ụma Ihu

Iche Ihe Ịma Aka nke Ịbụ Nne Mgbe A Dị Afọ Iri na Ụma Ihu

Iche Ihe Ịma Aka nke Ịbụ Nne Mgbe A Dị Afọ Iri na Ụma Ihu

MMADỤ ịtụrụ ime mgbe ọ dị afọ iri na ụma na-eme ka o mewe mkpebi ndị torurula ogo mmadụ na-eme. “Ọ na-adị m ka m dị afọ 40,” ka otu nne dị afọ iri na ụma na-ekwu. “Anụghị m ụtọ oge nke ịbụ nwata.” N’ezie, mgbe nwa agbọghọ matasịrị na ya dị ime, ụjọ na nchekasị pụrụ nnọọ irikpu ya.

Ọ bụrụ na ị dị afọ iri na ụma ma dịrị ime, ọ pụkwara ịdị gị otú ahụ. Otú ọ dị, ọ dịghị ihe ị ga-arụpụta site n’ikwe ka mmetụta ndị na-adịghị mma ghara ikwe gị megharịa ahụ́. “Onye na-arịba ifufe ama agaghị agha mkpụrụ,” ka Bible na-ekwu, “ọzọ, onye na-elekwasị igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.” (Eklisiastis 7:8; 11:4) Onye ọrụ ugbo nke nchegbu banyere ọdịdị ihu igwe na-ekweghị megharịa ahụ́ agaghị eme ihe ndị o kwesịrị ime. Zere ịbụ onye na-enweghị ike ime ihe ọ bụla. E meekwa elu mee ala, ị ghaghị ibiri ndụ gị gaa n’ihu ma buru ibu ọrụ dịịrị gị.—Ndị Galeshia 6:5.

Olee nhọrọ ndị i nwere? Ụfọdụ pụrụ ịtụrụ gị aro isikwopụ afọ ime ahụ. Ma nke a abụghị nhọrọ dịịrị ndị chọrọ ime mgbanwe iji mewe ihe na-atọ Chineke ụtọ, ebe Bible na-eme ka o doo anya na nsikwopụ afọ ime megidere iwu Chineke. (Ọpụpụ 20:13; 21:22, 23; Abụ Ọma 139:14-16) N’anya Chineke, ndụ nke nwa ọ bụla e bu n’afọ—gụnyere nke e bu mgbe a na-alụbeghị di—dị oké ọnụ ahịa.

Gịnị banyere ịlụ nwoke ahụ tụwara gị ime ka unu abụọ wee gbakọọ aka zụlite nwa ahụ? Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ịlụ ya pụrụ ime ka ọ ghara ịbụchara gị ihe ihere. Ma ọbụna mgbe nwa okorobịa lere ya anya dị ka ihe kwesịrị ekwesị inye aka n’ịzụlite nwa ọ tụwara ime ya, ịlụ ya adịkarịghị abụ nhọrọ amamihe dị na ya. * Na nwa okorobịa nwere ikike nke ịtụwa nwanyị ime apụtaghị na o nweela ikike mmetụta uche na nke iche echiche bụ́ ndị dị mkpa iji bụrụ ezi di na ezi nna. Ọ dịghịkwa apụta na ọ pụrụ ịkwado nwanyị na nwa n’ụzọ ego. Ọzọkwa, ọ bụrụ na gị na nwa okorobịa ahụ adịghị ekpe otu okpukpe, ịlụ ya pụrụ imegide ndụmọdụ Bible bụ́ ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) Ahụmahụ ndị e nwere na-egosi na nanị ihe iji ọsọ banye n’alụmdi na nwunye n’etorughị etoru—bụ́kwa nke na-agaghị adịte aka ma eleghị anya—pụrụ ime bụ ịkwanyekwu ọkụ n’obi mgbawa nakwa n’ahụhụ ị nọ na ya.

Gịnịkwanụ banyere inyefe nwa ahụ ka onye ọzọ kuchie ya? Ọ bụ ezie na o doro anya na nke a dị mma karịa isikwopụ afọ ime, i kwesịrị ịtụle eziokwu ahụ bụ́ na, n’agbanyeghị ọnọdụ ọjọọ ahụ, i nwere ohere nke ịzụlite nwa gị.

Iche Ihe Ịma Aka Ndị ahụ Ihu

N’ezie, ịzụlite nwa n’alụghị di adịghị mfe. Otú ọ dị, site n’ịgbaso ụkpụrụ Bible ruo n’ókè i nwere ike nakwa site n’ịtụkwasị Chineke obi maka ume na nduzi, ị pụrụ iche ọtụtụ ihe ịma aka ihu n’ụzọ gara nke ọma. Lee ụfọdụ n’ime ihe ndị ị pụrụ ime bụ́ ndị ga-enyere gị aka ịnagide ọnọdụ gị.

Mee ka gị na Chineke dịghachi ná mma. Ghọta na inwe mmekọahụ mgbe ị na-alụbeghị di bụ mmehie megide Chineke—imebi ụkpụrụ omume ya dị elu. (Ndị Galeshia 5:19-21; 1 Ndị Tesalonaịka 4:3, 4) N’ihi ya, nzọụkwụ mbụ dị oké mkpa bụ ichegharị ma rịọ Chineke mgbaghara. (Abụ Ọma 32:5; 1 Jọn 2:1, 2) N’eziokwu, ọ pụrụ ịdị gị ka i rughị eru inweta enyemaka ya. Otú ọ dị, Jehova na-ekwe nkwa ịgbaghara, ọ na-enyekwara ndị chegharịrị ná mmehie ha aka. (Aịsaịa 55:6, 7) N’Aịsaịa 1:18, Jehova na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na mmehie unu adị ka uwe uhie [adị oké njọ], ọ bụ dị ka snow ka ha ga-adị ọcha [a ga-ehichapụ ha kpamkpam].” Bible na-agbakwa ndị mere ihe ọjọọ ume irite uru n’enyemaka ime mmụọ ndị okenye a họpụtara ahọpụta n’ọgbakọ na-enye.—Jems 5:14, 15.

● Kwụsị inwe mmekọahụ n’alụghị di. Nke ahụ nwere ike ịpụta na ị ga-akwụsị iso nwoke ahụ tụwara gị ime na-akpakọrịta. Nanị ihe ịnọgide na-eso ya akpakọrịta n’alụghị ya ga-eme bụ ime ka ị na-enwe nrụgide nke ịnọgide na-etinye aka n’omume na-adịghị atọ Chineke ụtọ. Echefula ma ọlị na, ọ bụ ezie na iwu Chineke siri ike, e mere ha iji chebe anyị. Nicole, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ n’usoro isiokwu a, na-echeta, sị: “Abịara m ghọta na ihe Chineke kwuru bụ eziokwu. Ọ chọrọ ime ihe ga-abara anyị uru.”—Aịsaịa 48:17, 18.

● Gwa ndị mụrụ gị. Ị pụrụ izi ezi ịtụ ụjọ na ndị mụrụ gị ga-ewesa gị iwe. N’eziokwu, ha ga-ewe iwe ma nwee nchegbu mgbe ha nụrụ na ị dị ime. Ha pụrụ ọbụna iche na ha emeghịrị gị ihe ha kwesịrị imere gị dị ka ndị mụrụ gị ma taa onwe ha ụta maka ihe ọjọọ ahụ i mere. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ndị mụrụ gị na-atụ egwu Chineke n’ezie, o yiri ka hà ga-akwụsị inwe oké mwute ka oge na-aga. Ọ bụ ha mụrụ gị, ha hụkwara gị n’anya n’agbanyeghị ihe i mehiere. Ka ha na-ahụ àgwà nchegharị gị, obi abụọ adịghị ya na ha ga-abụ ndị a kpaliri iṅomi nna nwa mmefu ahụ ma jiri ịhụnanya gbaghara gị.—Luk 15:11-32.

● Na-egosipụta ekele. Ndị nne na nna, ndị ikwu, na ndị enyi na-abụkarị ndị na-eweta enyemaka na nkwado dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, ndị mụrụ gị pụrụ ime ndokwa ka i nweta nlekọta ahụ́ ike. Mgbe ị mụsịrị nwa ahụ, ha pụrụ inyere gị aka ịmara ihe ndị bụ́ isi n’ilekọta ya; ha pụkwara inyere gị aka n’iku nwa ahụ. Nicole na-ekwu banyere nne ya, sị, “Ọ bụ m mụrụ nwa, ma o nyeere m aka nke ukwuu.” Ndị enyi pụkwara inyere gị aka, ikekwe jiri akọ na-enye gị uwe ụmụaka na ihe ndị ọzọ pụrụ ịbara gị uru. (Ilu 17:17) Mgbe e gosiri gị obiọma, gbasoo ndụmọdụ Bible ma ‘gosi onwe gị ịbụ onye nwere ekele.’ (Ndị Kọlọsi 3:15) Ikele ha pụrụ ime ka ndị dị otú ahụ ghara ichewe na i jighị ihe ha ji ịhụnanya na-emere gị akpọrọ ihe.

● Mụta nkà nke ịzụ ụmụ. N’ezie, ị gaghị achọ ịnọgide na-adabere n’ebe ezinụlọ gị na ndị enyi gị nọ ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, malite ịzụlite nkà ndị ga-enyere gị aka inwetụ ikike nke ilekọta nwa gị na nke ilekọta ezinụlọ. Ịmụta igbo mkpa nke onye chọrọ nlebara anya dị ukwuu bụ ihe ịma aka. E nwere ọtụtụ ihe ị ga-amụta banyere ihe oriri, ahụ́ ike, na akụkụ ndị ọzọ nke ịzụlite nwa. N’ụzọ na-akpali mmasị, Bible na-agba Ndị Kraịst bụ́ ndị inyom merela okenye ume ka ha na-agba ụmụ agbọghọ ume ịbụ “ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ.” (Taịtọs 2:5) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nne gị—na ikekwe, ndị ọzọ merela okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst—pụrụ inye gị ọzụzụ bara uru n’akụkụ a.

● Na-eji amamihe emefu ego. Bible na-ekwu na ‘ego bụ ndo.’ (Eklisiastis 7:12) Ọmụmụ ị mụrụ nwa ga-eme ka i mefuwe ego dị ukwuu.

Ị pụrụ ibu ụzọ chọọ enyemaka ndị i ruru eru inweta n’ụlọ ọrụ gọọmenti ndị na-enyere ọha na eze aka. Otú ọ dị, mgbe mgbe, nwa agbọghọ aghaghị ịnọgide na-adabere n’ebe ndị mụrụ ya nọ maka mkpa ndị metụtara ego. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ n’ọnọdụ gị, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya na ihe na-egosi nchebara echiche iwetulata aka ruo ókè o kwere mee n’ihe ndị i ji ego azụ. Ọ bụ ezie na ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-achọ ịzụtara nwa gị ihe ndị ọhụrụ, ikekwe ị pụrụ ichekwa ego site n’ịdị na-azụ ihe n’ahịa ọkịrịka ma ọ bụ n’ahịa mgbuka.

● Gbalịa ịga akwụkwọ ruo n’ókè ụfọdụ. “Ndị maara ihe na-akpakọba ihe ọmụma,” ka Ilu 10:14 na-ekwu. Ọ bụ ezie na nke a bụ eziokwu karịsịa banyere ihe ọmụma Bible, ọ bụkwa eziokwu banyere agụmakwụkwọ nkịtị. Ọ dị gị mkpa ịzụlite nkà ndị dị mkpa iji na-akpata ihe e ji ebi ndụ.

N’eziokwu, o siri ike ịdị na-aga akwụkwọ mgbe ị na-elekọta nwa. Otú ọ dị, enwetaghị agụmakwụkwọ bụ́ isi pụrụ ime ka gị na nwa gị tọ ná ndụ nke ịda ogbenye, nke ịdabere n’enyemaka nke ụlọ ọrụ gọọmenti, nke ịkpata ego dị ala, nke ibi n’ụlọ na-adịghị mma, ma ọ bụ nke inwe nsogbu ndị na-abịa site n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́. Ya mere, ọ bụrụ na o kwere nnọọ mee, nọgide na-aga akwụkwọ. Nne Nicole siri ọnwụ na Nicole ga-agụcharịrị akwụkwọ, n’ihi ya, Nicole mesịrị nweta ọzụzụ dị ka onye na-enyere ọkàiwu aka, iji nwee ike ịkwado onwe ya.

Gịnị ma i mee nnyocha banyere ohere agụmakwụkwọ ndị dịnụ? Ọ bụrụ na ọ ga-esiri gị ike nke ukwuu ịgụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ, ị pụrụ ịchọpụta ma ị̀ ga-enwe ike ịnọ n’ụlọ na-amụ ihe. Dị ka ihe atụ, ịnọ n’ụlọ na-enweta ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ site ná nderịta akwụkwọ pụrụ ịba uru n’ọnọdụ nke gị.

Ị Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma

Ịzụlite nwa n’alụghị di bụ ihe ịma aka nye nwa agbọghọ. Ma, ọ pụrụ ikwe gị mee inwe ihe ịga nke ọma! Site n’inwe ndidi, mkpebi siri ike, nakwa site n’enyemaka Jehova Chineke, ị pụrụ ịghọ nne na-ahụ n’anya, nke dị ike, ma ruo eru. Ụmụ nke ndị nne na-alụghị di pụrụ itolite ma ghọọ ndị okenye na-akpa ezi àgwà. Leenụ, ị pụrụ inweta ọṅụ nke ịhụ nwa gị ka ọ na-anakwere mkpụzi na ọzụzụ ndị ị na-enye ya ma ghọọ onye hụrụ Chineke n’anya.—Ndị Efesọs 6:4.

Nicole si otú a kwuo ya: “Site n’enyemaka Chineke—n’agbanyeghịkwa ihe mgbochi nile—enwere m ọṅụ nke ịbụ onye nyeere nwa m nwanyị aka ịghọ nwa agbọghọ dị obiọma, nke na-akwanyere mmadụ ùgwù, ma bụrụ onye a pụrụ ịdabere na ya. Anya m na-ele ya na-echetara m abalị nile ahụ m na-ehighị ụra ma ọ na-enyekwa m obi ụtọ.”

Otú ọ dị, olee otú ndị toruworo ogo mmadụ kwesịrị isi na-emeso ndị nne dị afọ iri na ụma na ụmụ ha? Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla a pụrụ isi nyere ndị na-eto eto aka izere ibutedị ime ebute mgbe ha dị afọ iri na ụma?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A pụrụ ịhụ ebe a tụlere ibu ọrụ na ihe ịma aka nke ndị na-eto eto ghọrọ nna n’alụghị nwanyị na-enwe n’isiokwu “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” bụ́ ndị pụtara na Teta! nke May 8, 2000, nakwa nke June 8, 2000.

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Ndị nne dị afọ iri na ụma na-eche ọtụtụ ihe ịma aka ihu n’ịzụlite ụmụ ha

[Foto dị na peeji nke 10]

Iji ọsọ lụọ di mgbe ị na-etorughị nnọọ etoru abụghị ebe o biri

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye pụrụ inyere ndị ntorobịa mehierenụ aka ime ka ha na Chineke dịghachi ná mma

[Foto dị na peeji nke 11]

Ọ bụ ihe amamihe dị na ya bụ́ ndị nne na-alụghị di inwetacha agụmakwụkwọ bụ́ isi