Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Dị Mma Karịa Ịbụ Onye A Ma Ama

Ihe Dị Mma Karịa Ịbụ Onye A Ma Ama

Ihe Dị Mma Karịa Ịbụ Onye A Ma Ama

DỊ KA CHARLES SINUTKO SI KỌỌ

N’afọ 1957, e nyere m ọrụ ịbụ abụ na Las Vegas, Nevada, U.S.A., ruo izu 13, n’ọnụ ego bụ́ otu puku dollar kwa izu, enwere m ohere nke ịbụkwu abụ izu 50 ọzọ ma ọ bụrụ na ihe omume ndị ahụ agaa nke ọma. Nke ahụ ga-apụta na m ga-enwetakwu dollar 50,000 ná ntụkwasị—nke ahụ bụ nnukwu ego n’oge ahụ. Ka m kọwaa ihe mere e ji na-achọ inye m ọrụ a ego dị na ya bụ atụrụ tawa, nakwa ihe mere ikpebi ịnara ya ma ọ bụ ịjụ ya ji bụrụ nnọọ nke tara akpụ.

AMỤRỤ nna m, bụ́ onye Ukraine, n’ebe ọwụwa anyanwụ Europe n’afọ 1910. N’afọ 1913, nne ya kpọtara ya na United States, bụ́ ebe ọ lakwuuru di ya. Nna m lụrụ nwanyị n’afọ 1935, otu afọ mgbe e mesịkwara, a mụrụ m n’Ambridge, Pennsylvania. N’ihe dị ka n’oge ahụ, ụmụnne nna m ndị nwoke abụọ tọrọ ya ghọrọ Ndịàmà Jehova.

Mgbe mụ na ụmụnne m ndị nwoke atọ ka dị obere, bụ́ mgbe ezinụlọ anyị bikwa na nso New Castle, Pennsylvania, nne anyị sooro Ndịàmà mụọ Bible ruo nwa oge. Ma nne m ma nna m adịghị nke ghọrọ Onyeàmà n’oge ahụ, ma nna m kweere na ụmụnne ya nweere onwe ha ikwere ihe ha chọrọ ikwere. Ọ bụ ezie na papa m zụlitere anyị ịbụ ndị hụrụ mba anyị n’anya, mgbe mgbe, ọ na-akwadokarị nnwere ndị ọzọ nweere onwe ha ikpe okpukpe masịrị ha.

Ọrụ Ịbụ Abụ

Nne na nna m kweere na m bu olu abụ pụta ụwa, n’ihi ya, ha mere ihe nile ha pụrụ ime iji kwalite m n’ọrụ ịbụ abụ. Mgbe m dị afọ isii ma ọ bụ asaa, papa m na-eme ka m guzoro na tebụl a na-ere mmanya n’ụlọ oriri na nkwari abalị iji bụọ abụ ma kpọọ ụbọ m. Ana m abụ abụ bụ́ “Mother” [Nne]. Abụ ahụ na-akọwa àgwà nke nne na-ahụ n’anya, a na-ejikwa olu latụrụ elu, bụ́ nke na-emetụ n’ahụ́, emechi ya. Ndị ikom nọ n’ụlọ mmanya ahụ, bụ́ ndị ṅụrọworo anya, na-adị ebe ákwá ma na-etinye ego n’okpu papa m.

Egwú mbụ m gụrụ na redio bụ na New Castle, n’ụlọ ọrụ redio bụ́ WKST, n’afọ 1945, bụ́ ebe m nọ gụọ ụdị egwu a na-akpọ country music. E mesịa, amalitekwuru m ịgụ egwú ndị a ma ama sitere n’egwú Hit Parade, nke bụ́ usoro ihe omume a na-eme kwa izu n’ụlọ ọrụ redio nwere ngalaba n’ọtụtụ akụkụ nke mba anyị, bụ́ ebe a na-agụ egwú iri kasị wuo ewu n’izu. Oge mbụ m pụtara na telivishọn bụ n’afọ 1950, n’ihe ngosi nke Paul Whiteman duziri. Otú o si gụọ egwú George Gershwin bụ́ “Rhapsody in Blue” ka bụ ihe a ma ama. Oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, papa m rere ebe obibi anyị dị na Pennsylvania, anyị kwagakwara n’ógbè Los Angeles nke dị na California n’olileanya nke ịkwalitekwu ọrụ m.

N’ihi ọnwụ nna m siri, n’oge na-adịghị anya, enwetara m usoro ihe omume nke mụ onwe m na-eme na redio kwa izu n’obodo Pasadena, nwetakwa ihe omume TV nke na-ewe ọkara awa na Hollywood. Akpọnyere m egwú na teepụ n’ụlọ ọrụ bụ́ Capitol Records bụ́ ebe e nwere otu narị mmadụ na-eti egwú nke Ted Dale na-eduzi, ana m agụkwa egwú n’ụlọ ọrụ redio bụ́ CBS bụ́ nke nwere ngalaba n’ọtụtụ akụkụ nke mba anyị. N’afọ 1955, akpọkwaara m ìgwè ndị egwú gaa n’Ọdọ Mmiri Tahoe nke dị n’ebe ugwu California. Ka m nọ n’ebe ahụ, echiche m nwere banyere ihe ndị ka mkpa ná ndụ gbanwere n’ụzọ dị ịrịba ama.

Inwe Ihe Ndị Ọhụrụ M Na-ebute Ụzọ

N’ihe dị ka n’oge ahụ, Deede John—nwanne nwoke nna m nke tọrọ ya, bụ́ onye sikwa Pennsylvania kwafeta California—nyere m akwụkwọ bụ́ “Kwe Ka Chineke Bụrụ Onye-Ezi-Okwu.” * * Eji m ya gaa n’Ọdọ Mmiri Tahoe. Mgbe anyị nwesịrị ihe ngosi ikpeazụ anyị, bụ́ nke kwụsịrị n’etiti abalị, amalitere m ịgụ akwụkwọ ahụ iji tụsaratụ ahụ́ tupu m lakpuo ụra. Enwere m oké obi ụtọ mgbe m chọtara azịza Bible nye ajụjụ ndị m nọworo na-eche banyere ha eri ogologo oge.

N’oge na-adịghị anya, abịara m na-anọ gburugburu ụlọ oriri na nkwari abalị ahụ mgbe anyị mechisịrị ọrụ ma na-agwa ndị ọrụ ibe m okwu, mgbe mgbe, ọ na-abụkarị ruo na ndeeri. Anyị kwurịtara isiokwu ndị dị ka ndụ mgbe a nwụsịrị, ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị, nakwa ma mmadụ ọ̀ ga-emesị bibie onwe ya na ụwa. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, na July 9, 1955, ná mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova e nwere na Wrigley Field nke dị na Los Angeles, e mere m baptizim ná ngosipụta nke nrara m raara onwe m nye Jehova Chineke.

N’ihe na-erughị ọnwa isii mgbe e mesịrị, n’ụtụtụ Krismas nke afọ 1955, otu Onyeàmà ibe m, bụ́ Henry Russell, kpọrọ m iso ya gaa leta Jack McCoy, bụ́ onye na-arụ ọrụ ime ihe ngosi. Henry n’onwe ya bụ onye nduzi egwú n’ụlọ ọrụ bụ́ NBC. Mgbe anyị ruru, Jack mere ka ụmụ ya atọ na nwunye ya nọdụ ala ma gee anyị ntị, n’agbanyeghị na ha ka nọ nnọọ na-emepesị onyinye Krismas ha. Ya na ezinụlọ ya ghọrọ Ndịàmà n’oge na-adịghị anya.

N’ihe dị ka n’oge a, eduziiri m nne m ọmụmụ ihe, ọ bịara jidesie eziokwu Bible ike n’ezie. O mesịrị ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova nakwa onye ọsụ ụzọ, bụ́ onye na-ezisa ozi ọma oge nile. Ka oge na-aga, e mekwara ụmụnne m ndị nwoke atọ baptizim, ha rụkwara ọrụ ọsụ ụzọ ruo oge ụfọdụ. Na September 1956, mgbe m dị afọ 20, aghọrọ m onye ọsụ ụzọ.

Mkpebi Ndị Metụtara Ọrụ

N’ihe dị ka n’oge a, ezigbo enyi nke onye na-ahụ maka ọrụ m, bụ́ George Murphy, bịara nwee mmasị ịkwalite ọrụ m. George ekerewo òkè n’ọtụtụ ihe nkiri n’afọ ndị 1930 nakwa n’afọ ndị 1940. N’ihi ọmụma Murphy maara ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ihe ndị metụtara ọrụ ihe ngosi, na December 1956, ekeere m òkè n’ihe nkiri Jackie Gleason bụ́ nke a na-eme na New York City, n’ụlọ ọrụ telivishọn bụ́ CBS-TV. Nke a kwalitere ọrụ m nke ukwuu, ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ ndị na-ekiri ihe nkiri ahụ dị ihe dị ka 20,000,000. Ka m nọ na New York, agara m leta isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn na nke mbụ ya.

Mgbe m keresịịrị òkè n’ihe nkiri Gleason, abịanyere m aka n’akwụkwọ maka ịrụ ọrụ ruo afọ asaa n’ụlọ ọrụ na-eme ihe nkiri, bụ́ MGM. E nyere m akụkụ ihe nkiri m ga na-eme mgbe nile n’ihe omume bụ́ TV Western. Otú ọ dị, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, akọ na uche m malitere inye m nsogbu, ebe ọ bụ na akụkụ a na-enye m mgbe ụfọdụ na-abụ nke onye na-agba chaa chaa na nke onye na-agba égbè—akụkụ ndị na-eme ka omume rụrụ arụ na omume ndị ọzọ na-ekwesịghị Ndị Kraịst yie ihe ndị magburu onwe ha. N’ihi ya, akwụsịrị m iso na ya. Ndị nọ n’ọrụ ime ihe nkiri chere na ara awịwala m.

Ọ bụ n’oge ahụ ka e nyere m ọrụ ịkụ egwu na Las Vegas ahụ m kọrọ banyere ya ná mmalite, bụ́ nke ego a na-akwụ na ya bụ atụrụ tawa. Ekwesịrị m ibido ọrụ n’izu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ga-abịa ileta anyị. Ọ bụrụ na m anaraghị ọrụ ahụ n’oge ahụ, ohere ahụ ga-akwa m kpamkpam. O mere m obi abụọ, ebe ọ bụ na papa m anọwo na-atụ anya oge m ga-akpata ezigbo ego! Echere m na o kwesịrị ka m kwụghachi ya ụgwọ maka ihe nile o meworo iji kwalite ọrụ m.

Ya mere, agakwuuru m Carl Park, bụ́ onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ anyị, bụ́kwa onye na-akụ egwú n’onwe ya, nke na-akpọkwa ngwá egwú violin n’ụlọ ọrụ redio bụ́ WBBR nke dị na New York, n’afọ ndị 1920. Akọwara m na ọ bụrụ na mụ anara ọrụ a, na m pụrụ ịsụ ụzọ ná ndụ m nile n’echegbughị onwe m banyere ego. “Apụghị m ịgwa gị ihe ị ga-eme,” ka o kwuru, “ma apụrụ m inyere gị aka iru ná mkpebi.” Ọ jụrụ m, sị, “Ị̀ ga-agawa ọrụ a ma ọ bụrụ na Pọl onyeozi na-abịa ileta ọgbakọ anyị n’izu a?” Ọ gbakwụnyere, sị, “Gịnị ka i chere Jizọs ga-achọ ka i mee?”

Nke ahụ doro nnọọ anya, ka m chere. Mgbe m gwara papa m na ekpebiwo m ịjụ ịnara ọrụ ahụ na Las Vegas, ọ sịrị na m na-ebibi ndụ ya. N’abalị ahụ, o weere obere égbè ya, mụrụ anya, na-eche m. Ọ chọrọ ịgbagbu m, ma ụra buuru ya—ma eleghị anya, n’ihi nnukwu mmanya ọ ṅụrụ. E mesịa, ọ nwara iji ihe ụgbọala na-eji akwụpụ anwụrụ ọkụ gbuo onwe ya n’ebe a na-adọba ụgbọala. Akpọrọ m ndị uwe ojii na-anapụta mmadụ, ha bịakwara ma nwee ike ịtụte ya.

Ebe ọ bụ na ha maara na papa m bụ onye iwe ọkụ, ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ anyị na-atụ ya egwu, ma onye nlekọta sekit anyị, bụ́ Roy Dowell, atụghị ya egwu. Mgbe Roy gara ịhụ ya, papa m gwara ya na mgbe a mụrụ m, na e nwere ohere dị ukwuu na m agaghị adị ndụ. Papa m kwere Chineke nkwa na ọ bụrụ na m adị ndụ, ọ ga-enyefe m maka ijere Ya ozi. Roy jụrụ ya ma ọ̀ batatụwo ya n’uche na Chineke pụrụ ịdị na-atụ anya ka o mezuo ihe o kwere ná nkwa. Nke ahụ tụrụ papa m n’anya. Mgbe ahụ, Roy jụrụ ya, sị, “Ọ bụrụ na ozi oge nile dị mma nye Ọkpara Chineke, n’ihi gịnị ka ọ na-ejighị dị mma nye ọkpara nke gị?” Mgbe o kwusịrị nke ahụ, o yiri ka papa m ọ̀ bịara nakwere nhọrọ m mere.

Ka ọ dịgodị, na January 1957, Shirley Large na onye ọsụ ụzọ ibe ya si Canada bịa ileta ndị enyi ha ụfọdụ. Mụ na Shirley bịara mata mgbe mụ na ya na onye ọsụ ụzọ ibe ya gara ozi ụlọ n’ụlọ. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Shirley sooro m gaa Hollywood Bowl, bụ́ ebe mụ na Pearl Bailey bụrụ abụ.

Ime Ihe M Kpebiri

Na September 1957, a họpụtara m ije ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche na steeti Iowa. Mgbe m gwara papa m na ekpebiwo m ịnara ọrụ ahụ, nanị ihe o mere bụ ibe ákwá. Ọ pụghị ịghọta echiche ọhụrụ a m nwere banyere ihe ndị bara uru n’ezie. Akwọọrọ m ụgbọala gaa Hollywood ma kagbuchaa ọrụ nile m ji n’ebe ahụ. Onye ndú a ma ama nke òtù ndị oti egwú na ndị ọgụ egwú, bụ́ Fred Waring, so ná ndị m ji ọrụ n’aka ha. Ọ gwara m na m gaghị arụ ọrụ ọzọ dị ka ọbụ abụ ma ọ bụrụ na m emezughị ihe e kwekọrịtara. Ya mere, akọwaara m ya na m na-ahapụ ọrụ ịgụ egwú m iji mụbakwuo ozi m na-ejere Jehova Chineke.

Maazị Waring ji nkwanye ùgwù gee m ntị ka m nọ na-akọwara ya ihe nile, e mesịa, o ji olu dị nro zaghachi n’ụzọ tụrụ m n’anya, sị: “Nwa m, ọ dị mwute na ị na-ahapụ ọmarịcha ọrụ dị otú a, ma anọwo m na-arụ ọrụ ịkụ egwú ná ndụ m nile, achọpụtawokwa m na e nwere ihe ndị ọzọ dị mkpa ná ndụ karịa nanị ịkụ egwú. Ka Chineke gọzie ihe ị na-eme.” M ka na-echeta mgbe m bu anya mmiri nke ọṅụ kwọrọ ụgbọala na-ala, na-amara na enweere m onwe m ugbu a iji ndụ m jeere Jehova ozi.

“Oleekwanụ Ebe Okwukwe Gị Dị?”

Mụ na onye ọsụ ụzọ ibe m, bụ́ Joe Triff, malitere ije ozi na Strawberry Point, Iowa, bụ́ obodo nke ihe dị ka mmadụ 1,200 bi na ya. Shirley bịara ileta m, anyị kwukwara banyere ịlụ di na nwunye. Enweghị m ego ọ bụla, ya onwe ya enweghịkwa. Ọ bụ nna m ji ego nile m kpataworo. Ya mere, akọwara m, sị: “Achọrọ m ịlụ gị, ma oleenụ otú anyị ga-esi ebi? Nanị ihe m nwere bụ dollar 40 a na-enye m n’ọnwa dị ka ego mmachi akpa maka ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche m na-arụ.” N’ụzọ dị jụụ, nke ezoghị ọnụ, ọ na-esikarị ekwu okwu, ọ sịrị: “Charles, oleekwanụ ebe okwukwe gị dị? Jizọs kwuru na ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ na ezi omume ya, na ọ ga-atụkwasịrị anyị ihe nile dị anyị mkpa.” (Matiu 6:33) Okwu wee bie. Anyị lụrụ na November 16, 1957.

Ana m eduziri otu onye ọrụ ugbo ọmụmụ Bible ná mpụga Strawberry Point, bụ́ onye nwere otu ụlọ e ji osisi rụọ nke dị amaụkwụ 12 n’ogologo nakwa amaụkwụ 12 n’obosara. Ọkụ eletrik, mmiri pọmpụ, na ọnụ ụlọ ịsa ahụ́ adịghị na ya. Ma ọ bụrụ na anyị achọọ, anyị pụrụ ibi n’ebe ahụ n’akwụghị kobo. O meela ochie, ma anyị kwubiri na ebe ọ bụ na anyị na-anọ n’ozi ụbọchị nile, nanị ihe dị anyị mkpa bụ ebe anyị ga na-ehi ụra.

Ana m ekute mmiri n’otu isi iyi dị nso. Anyị na-akwanye ekwu n’ụlọ ahụ iji mee ka o kpoo ọkụ, anyị na-ejikwa ọkụ mpanaka agụ akwụkwọ; Shirley na-ejikwa stovu mmanụ ọkụ esi nri. Anyị ji otu ọkwa ịsa ahụ́ merela ochie na-asa ahụ́. Anyị na-anụ ka nkịta ọhịa na-agbọ ụja n’abalị, ọ dabakwaara anyị na anyị abụọ nọ ya ma na-ejere Jehova ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka Ndị Kraịst bụ́ ndị ozi. Bill Malenfant na nwunye ya, bụ́ Sandra, bụ́ ndị na-eje ozi ugbu a n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile dị na Brooklyn, bụụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Decorah, Iowa, bụ́ ebe ji ihe dị ka 100 kilomita dịpụ adịpụ site n’ebe anyị nọ. Site n’oge ruo n’oge, ha na-abịa soro anyị jee ozi ubi otu ụbọchị. Ka oge na-aga, a bịara nwee otu obere ọgbakọ mmadụ 25 mejupụtara na Strawberry Point.

Ịbanye n’Ọrụ Njegharị

Na May 1960, a kpọrọ anyị ịrụ ọrụ sekit, bụ́ ozi njegharị. Sekit mbụ anyị rụrụ ọrụ na ya dị na North Carolina, ọ gụnyekwara obodo ukwu ndị bụ́ Raleigh, Greensboro, na Durham, nakwa ọtụtụ obere ime obodo. Ọnọdụ ibi ndụ anyị bịara ka mma, ebe ọ bụ na anyị nọ na-ebi na nke ọtụtụ ezinụlọ ndị nwere ọkụ eletrik na ọbụna ụlọ mposi ndị dị n’ime ụlọ. Otú ọ dị, ihe na-eme ka ahụ́ ghara iru anyị ala bụ ịdọ aka ná ntị ndị nke nwere ụlọ mposi ndị dị n’èzí na-enye anyị. Ha dọrọ anyị aka ná ntị ilezi anya maka agwọ ndị na-adị n’ụzọ ahụ!

Ná mmalite afọ 1963, e zigara anyị n’otu sekit dị na Florida, bụ́ ebe m nọ malite ịrịa ajọ ọrịa obi bụ́ pericarditis nke fọrọ nke nta ka o gbuo m. Ma eleghị anya, ọ gaara egbuwo m ma e wezụga enyemaka Bob na Ginny Mackey, bụ́ ndị si Tampa. * Ha kpọgara m na nke dọkịta ha, ọbụnakwa kwụọ ụgwọ nile e mefuru.

Ejiri M Ọzụzụ M Nwetara na Nwata Mee Ihe

N’oge okpomọkụ nke afọ 1963, a kpọrọ m na New York ịrụ ọrụ n’ihe metụtara otu mgbakọ buru ibu nke Ndịàmà Jehova bụ́ nke a ga-enwe n’ebe ahụ. Esooro m Milton Henschel, bụ́ ọnụ na-ekwuchitere Ndịàmà Jehova, gaa maka ajụjụ ọnụ a na-agba na redio, nke ọ bụ Larry King gbara ya. Maazị King ka bụ onye a ma ama n’ịgba ajụjụ ọnụ na telivishọn. Ọ kwanyeere anyị ùgwù nke ukwuu, ruokwa ihe dị ka otu awa mgbe ajụjụ ọnụ ahụ gasịrị, ọ jụrụ ọtụtụ ajụjụ banyere ọrụ anyị.

N’oge okpomọkụ ahụ, Harold King, bụ́ onye ozi ala ọzọ nke a ka tọhapụsịrị n’ụlọ mkpọrọ ndị Kọmunist dị na China, bịara ileta isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà. N’otu uhuruchi, ọ gwara ìgwè mmadụ dị ihe dị ka 700 okwu, na-akọ ụfọdụ n’ime ahụmahụ ndị o nweworo ma na-akọwa otú ihe karịrị afọ anọ nanị ya nọrọ n’otu ọnụ ụlọ ụlọ mkpọrọ siworo wusie okwukwe ya ike. Ka ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, o dere abụ ndị dabeere na Bible nakwa n’ozi Ndị Kraịst.

N’anyasị ahụ kwesịrị ncheta, esooro m Audrey Knorr, Karl Klein, nakwa Fred Franz—bụ́ Onyeàmà jeworo ozi ruo ogologo oge, nke nwere olu abụ tenor a zụrụ azụ—n’ịbụ abụ bụ́ “Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ,” bụ́ abụ e mesịrị tinye n’akwụkwọ abụ Ndịàmà Jehova ji eme ihe. Nathan Knorr, bụ́ onye na-edu ndú mgbe ahụ n’ọrụ Ndịàmà, gwara m ka m bụọ ya ná Mgbakọ “Ozi Ọma Ebighị Ebi” e nwere n’izu sochirinụ n’Ámá Egwuregwu Yankee, emekwara m otú ahụ.

Ahụmahụ Ndị M Nwetara n’Ọrụ Njegharị

Mgbe anyị na-eje ozi na Chicago, Illinois, ihe abụọ kwesịrị ncheta mere. Nke mbụ, ná mgbakọ sekit, Shirley hụrụ Vera Stewart, bụ́ onye gbaara ya na nne ya àmà na Canada n’etiti afọ ndị 1940. A kpaliri mmasị Shirley, bụ́ onye dị afọ 11 mgbe ahụ, mgbe ọ nụrụ banyere nkwa Chineke ndị e dekọrọ na Bible. Ọ jụrụ Vera n’oge ahụ, sị, “Ì chere na m pụrụ ibi n’ụwa ọhụrụ ahụ?” Vera zaghachiri, sị, “Shirley, ahụghị m ihe mere na ị gaghị ebi na ya.” Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha chefuru okwu ndị ahụ kpọmkwem otú ahụ ha si kwuo ya. Site n’oge mbụ ahụ ya na Vera zutere, Shirley maara na ya chọrọ ijere Jehova ozi.

Nke abụọ, otu Onyeàmà jụrụ m ma m chetara oge m hụrụ akpa poteto nke dị kilogram 25 n’arọ na varanda anyị n’oge oyi nke afọ 1958. N’ezie, echetara m. Anyị hụrụ ya mgbe anyị jisiri nnọọ ike si n’ogbu snow lọrute n’otu uhuruchi! Ọ bụ ezie na anyị amaghị ebe o sitere, otú ọ dị, anyị weere ya dị ka ihe si n’aka Jehova bịa. Snow gbochiri anyị ịpụ èzí ruo ụbọchị ise, ma anyị ṅụrịrị ọṅụ n’iri poteto a hụrụ ahụ, poteto e ghere eghe, poteto a sụrụ asụ, na poteto mmiri ọkụ! Anyị enweghị nri ọzọ. Onyeàmà ahụ amaghị anyị, ọ maghịkwa ebe anyị bi, ma ọ nụrụ na ihe na-esiri ndị ọsụ ụzọ bi nso n’ebe ahụ ike. Otu ihe, ka o kwuru, kpaliri ya ịmalite ịjụ ajụjụ banyere ebe di na nwunye a na-akatabeghị ahụ́ bi. Ndị ọrụ ugbo maara ihe nile banyere ndị agbata obi ha, n’ihi ya, n’oge na-adịghị anya, a tụziiri ya aka gaa n’ụlọ osisi anyị, o bukwa poteto ahụ gaferechaa snow ahụ wee rute n’ụlọ anyị.

Ekele Maka Nhọrọ Ndị M Mere

Ka ọ na-erule 1993, mgbe m tinyesịworo afọ 33 n’ọrụ njegharị, ọrịa jidere m ruo n’ókè nke na m hapụrụ ihe ùgwù ije ozi ahụ. Mụ na Shirley ghọrọ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ahụ́ na-adịkwaghị ike, nke anyị ka bụ ruo taa. Ọ bụ ezie na ọ na-ewute m na enwekwaghị m ikike nke ịrụ ọrụ njegharị, enwere m obi ụtọ na m ji ikike m mee ihe n’ụzọ dị otú ahụ.

Ụmụnne m ndị nwoke atọ mere nhọrọ dịgasị iche iche. Nke ọ bụla n’ime ha mesịrị kpebie ịchụso akụ̀ na ụba, ọ dịghịkwa nke ọ bụla n’ime ha na-ejere Jehova ozi ugbu a. N’afọ 1958, e mere papa m baptizim. Ya na mama m nyeere ọtụtụ ndị mmadụ aka ịbịa mara Jehova, rara ndụ ha nye Ya, ma bụrụ ndị e mere baptizim. Ha abụọ nwụrụ n’afọ 1999. Ya mere, mkpebi m mere ịjụ ịbụ onye a ma ama n’ụwa wetaara nna m nakwa ọtụtụ ndị ya na nne m kụziiri eziokwu Bible, ndụ. Ana m echekarị, sị, ‘M̀ gaara anọgide na-ejere Jehova ozi ma a sị na m emeghị nhọrọ ndị m mere?’

Ihe dị ka afọ ise m hapụsịrị ọrụ sekit, ahụ́ bịara dị m ike karị, abịakwara m nwee ike ịgbasawanye ozi m. Ana m eje ozi ugbu a dị ka onyeisi oche ndị nlekọta n’otu ọgbakọ dị na Desert Hot Springs, California. Enwekwara m ihe ùgwù nke ịrụchitere onye nlekọta sekit ọrụ, na-eje ozi na kọmitii ndị pụrụ iche, mgbe ụfọdụkwa, na-akụzi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ.

Ruo taa, Shirley nọgidere na-abụ ezigbo enyi m. Ọ dịghị onye ọzọ ọnụnọ mụ na ya na-atọ m ụtọ karịa ya. Anyị na-enwe mkparịta ụka ime mmụọ ndị na-akpali akpali site n’oge ruo n’oge, anyị abụọ na-enwe nnọọ mkpali banyere eziokwu Bible ndị anyị na-ekwurịta. M ka na-eji ekele echeta ajụjụ ahụ o ji olu dị nro jụọ m afọ 47 gara aga, “Charles, oleekwanụ ebe okwukwe gị dị?” Ọ bụrụ nnọọ na Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye ọhụrụ ga-ajụ ibe ha ajụjụ dị otú ahụ, ana m eche nnọọ mmadụ ole n’ime ha ga-enwe ọṅụ na ngọzi otú anyị nweworo n’ozi oge nile.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 John Sinutko nọgidere na-abụ Onyeàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 1996 bụ́ mgbe ọ dị afọ 92.

^ par. 11 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma a dịghịzi ebipụta ya.

^ par. 32 Mbipụta Teta! (Bekee) nke February 22, 1975, peeji nke 12-16, bu akụkọ Bob Mackey kọrọ n’onwe ya banyere otú ya na ahụ́ mkpọnwụ si lụọ.

[Foto dị na peeji nke 18]

Deede John n’afọ 1935, bụ́ afọ e mere ya baptizim

[Foto dị na peeji nke 20]

Ụlọ osisi anyị

[Foto dị na peeji nke 21]

Foto nne na nna m sere n’afọ 1975, ha nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi ruo mgbe ha nwụrụ

[Foto dị na peeji nke 21]

Mụ na Shirley taa