Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-enyere Ndị Na-eto Eto Aka Ma Chebe Ha

Ihe Ga-enyere Ndị Na-eto Eto Aka Ma Chebe Ha

Ihe Ga-enyere Ndị Na-eto Eto Aka Ma Chebe Ha

Ọ BỤ ihe na-agbawa obi mgbe nwa agbọghọ—nke ka bụ́ nwata n’onwe ya—tụụrụ ime mgbe ọ na-alụbeghị di. Otú ọ dị, ịtụrụ ime mgbe a dị afọ iri na ụma bụ ihe zuru ụwa ọnụ, ọ na-emetụtakwa onye ọ bụla n’ụzọ ụfọdụ. Ọdachi ịtụrụ ime mgbe a dị afọ iri na ụma na-akpata bụ nanị otu ihe akaebe na-egosi izi ezi nke iwu Chineke bụ́: “Gbanahụnụ ịkwa iko.”—1 Ndị Kọrint 6:18.

N’agbanyeghị nke ahụ, site n’oge ruo n’oge, nwa agbọghọ nke a kụziwooro ụzọ Chineke na-ahọrọ ileghara ihe ọ maara anya. Ọ na-etinye aka ná mmekọahụ rụrụ arụ ma tụrụ ime. Olee otú ezi Ndị Kraịst si emeghachi omume na nke a? Mgbe nwa nnupụisi dị otú ahụ gosiri ihe àmà nke nchegharị, ndị mụrụ ya na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst kwesịrị iji ịhụnanya nyere ya aka ma kwadoo ya.

Tụleghachi ihe banyere Chinwe. Ndị mụrụ ya nọ na-azụlite ya ka ọ bụrụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, ọ bụụrụ ha nnọọ ihe na-agbawa obi mgbe ọ tụụrụ ime n’alụghị di. N’agbanyeghị nke ahụ, Chinwe na-echeta, sị, “Ndị Kraịst ibe m na-abịa n’ụlọ m ma na-agbalị ịgba m ume ịmụ Bible na ịnọ Jehova nso.”

Ee e, Ndịàmà Jehova adịghị akwado mmekọahụ rụrụ arụ. Ma ha na-aghọta na site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, onye mere ihe ọjọọ pụrụ ịbụ onye “e nwoghara.” (Ndị Rom 12:2) Ha nwere okwukwe siri ike na Chineke na-agbaghara ndị mere ihe ọjọọ ma chegharịa. (Ndị Efesọs 1:7) Ha na-aghọtakwa na, ọ bụrụgodịrị na a kwatara nwatakịrị n’iko, ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla nwa ahụ mere. Ya mere, kama ilewe nwa dị otú ahụ anya ọjọọ, ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-egosi ya otu mmetụta dị nro, ọmịiko, na obiọma ahụ ha na-egosi ụmụaka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ.—Ndị Kọlọsi 3:12.

Otu nne nanị ya na-azụ nwa malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ọ nakweere ozi Bible ozugbo ma mee mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ya. O kwuru banyere Ndịàmà, sị: “Ha nile gosiri ezi mmasị n’ebe mụ na ụmụ m nọ. Ha nyere m ihe oriri na uwe mgbe ọ dị mkpa, nyekwara m aka n’ụzọ ego. Mgbe m ruru eru iso Ndịàmà Jehova kere òkè n’ozi ubi, ha kuuru m nwa. Ha mere ihe nile ha pụrụ ime iji nyere m aka ịzụlite ezi ịhụnanya n’ebe Jehova nọ.”

Mgbochi

N’agbanyeghị nke ahụ, ọ kasị mma inyere ndị na-eto eto aka izere ịbanyedị ná nsogbu dị otú ahụ abanye. N’ihi nke a, Ndịàmà Jehova na-agbalị ịzụlite ụmụ ha n’ezinụlọ nke ịhụnanya dị na ya. Kama ịnọ nanị na-emenye egwu—na-eme ka a tụwa ụjọ ibute ọrịa AIDS ma ọ bụ ọbụna nke ịtụrụ ime—Ndịàmà na-agbalị ime ka ndị na-eto eto zụlite ezi ịhụnanya n’ebe Jehova Chineke nọ nakwa n’ebe iwu ya dị. (Abụ Ọma 119:97) Ha kweere na ọ dị mkpa inye ụmụaka ezi ihe ọmụma banyere mmekọahụ. Nke ka mkpa bụ na ha kweere na ọ dị mkpa ịkụziri ụmụaka ụkpụrụ omume ndị dị na Bible malite n’oge ha bụ ụmụ ọhụrụ. (2 Timoti 3:15) A na-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, a na-agbakwa ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà ume iso nwa ha nke ọ bụla na-amụ Bible. E bipụtawo akwụkwọ ndị dị ka Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, iji nyere ndị nne na nna aka inye ụmụ ha nduzi n’ihe ndị metụtara omume. *

Ịgbaso ụkpụrụ omume Bible nke na-adịghị agbanwe agbanwe dị iche n’ebe omume rụrụ arụ nke zuworo ebe nile n’ụwa dị. Ma, ọ bụ ụzọ ndụ nke ga-eme ka ọtụtụ nde ụmụ agbọghọ ghara ịdaba n’ọdachi nke ibute ime mgbe ha dị afọ iri na ụma.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 12]

Ezi Ndị Kraịst na-eji obiọma na nchebara echiche emeso ndị nne na-alụbeghị di