Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Jehova, Ị Chọta M!”

“Jehova, Ị Chọta M!”

“Jehova, Ị Chọta M!”

Dị ka Nelly Lenz si kọọ

“Ùnu bụ Ndịàmà Jehova?” ka m jụrụ ndị ikom abụọ bịara n’ụlọ anyị. “Ee,” ka ha zaghachiri. Ekwuru m, sị, “Mụ onwe m bụkwa!” Adị m nanị afọ 13, adịghịkwa m aga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nne na nna m abụghị Ndịàmà Jehova. Gịnịzi mere m ji kwuo na m bụ?

A SỊ na ọ bụghị Ndịàmà Jehova, ma eleghị anya, a garaghị amụ m. Nne m tụtara ime m mgbe o bi na Montreal, Quebec, Canada. Ọ dị nanị afọ 17 mgbe ahụ. Ezinụlọ ya rụgidesiri ya ike isikwopụ afọ ime ahụ. Ya ekwere.

Mama m rịọrọ ka e nye ya ikike ịgha ọrụ otu ụbọchị iji gaa sikwopụ afọ ime ya. O yiri ka onyeisi ọrụ ya, onye bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ̀ chọpụtara ihe mere nne m ji chọọ ịgha ọrụ. Ọ gwara mama m ná nkenke banyere ịdị oké ọnụ ahịa nke ndụ. (Abụ Ọma 139:13-16) Ka mama m nọ na-aga n’ụlọ ọgwụ, ọ tụgharịrị uche n’ihe onyeisi ọrụ ya kwuru. O kpebiri na ya agaghị esikwopụ ime ahụ. Mgbe ọ mụsịrị m n’afọ 1964, nne m tinyere m n’ogige ụmụ mgbei.

Oge Mbụ M Nụrụ Eziokwu Bible

Mgbe m dị ihe dị ka afọ abụọ, nne m na di ọ ka lụrụ ọhụrụ kpọpụtara m n’ogige ụmụ mgbei ahụ. Ka anyị bi na Sainte-Marguerite-du-Lac-Masson, Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ ha Bible, ha nọkwa na-aga nzukọ ọgbakọ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, anyị kwagara na Boisbriand, nne m na di ya kwụsịkwara ịmụ ihe.

Afọ ole na ole mgbe e mesịrị, ha maliteghachiri ọmụmụ ihe ha. Egere m ntị iji nụ ihe e kwuru banyere olileanya paradaịs elu ala bụ́ nke dabeere na Bible. (Luk 23:43) Abịara m hụ Jehova n’anya hie nne.

Otú ọ dị, otu ụbọchị, mama m gwara m na ha akwụsịwo iso Ndịàmà na-amụ ihe, nakwa na anyị agaghịzi na-aga Ụlọ Nzukọ Alaeze. Na mbụ, obi tọrọ m ụtọ. Ebe m bụ nwatakịrị dị afọ asatọ, mgbe ụfọdụ nzukọ ndị ahụ na-adị m ka hà na-etogbu nnọọ onwe ha n’ogologo. Otú ọ dị, n’anyasị ahụ, achọrọ m ịgwa Jehova okwu n’ekpere, enwekwara m nchegbu na e nwere ike ọ gaghị ege m ntị.

N’ehihie Sunday sochirinụ, ahụrụ m ndị agbata obi anyị, bụ́ Ndịàmà Jehova, ka ha na-aga nzukọ ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Amalitere m ibe ákwá ma jụọ Chineke, sị, “N’ihi gịnị ka ụmụ ha ga-eji na-aga nzukọ ma agaghị m aga?” Ka o sina dị, okwu nke Abụ Ọma 33:18 ga-emesị bụrụ eziokwu: “Lee, anya Jehova dị n’ahụ́ ndị na-atụ egwu Ya, bụ́ n’ahụ́ ndị na-echere ebere Ya.”

Ịgaghachi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze

Mgbe izu atọ gasịrị, agara m na nke ndị agbata obi anyị, ma gwa nne ha, bụ́ Lilianne, na m chọrọ ịga nzukọ. Lilianne kọwara na nke a agaghị ekwe omume, ebe ọ bụ na nne m achọghị inwe ihe ọ bụla jikọrọ ya na Ndịàmà Jehova. Ma, esiri m ọnwụ. Ya mere, ọ kpọọrọ m gaa n’ụlọ anyị ma jụọ mama m ma m pụrụ iso ha gaa. N’ụzọ tụrụ m n’anya, mama m kwere. O kwuru na m ga-amụta ụkpụrụ ndị dị mma ná nzukọ ndị ahụ. N’ihi ya, abịara m na-aga nzukọ n’ụbọchị Sunday ọ bụla.

Ruo ihe dị ka afọ atọ, anọ m na-aga nzukọ ọgbakọ. Ma mgbe m gbara afọ 11, nne m na di ya gbara alụkwaghịm, mụ na nne m kwapụkwara. Mụ na Ndịàmà Jehova ahụghịkwa anya ọzọ.

Nzute A Na-atụghị Anya Ya

Otu ụbọchị, anọ m ọdụ na steepụ dị n’ihu ụlọ anyị mgbe Ndịàmà abụọ—Eddie Besson na Don Fisher—bịarutere ma jụọ ma nne na nna m hà nọ n’ụlọ. Mgbe m kwuru na ha anọghị ya, ndị ikom ahụ tụgharịrị ịla. Ma achụkwuuru m ha, anyị wee nwee mkparịta ụka ahụ m kọrọ ná mmalite.

N’ụzọ kwere nghọta, o juru ndị ikom abụọ ahụ anya ịnụ ka m kọwara onwe m dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Akọwaara m ha ọnọdụ m nọ na ya ma rịọ ha ka ha bịaghachi n’anyasị ụbọchị ahụ. Mgbe m gwara mama m na Ndịàmà ga-abịa ileta anyị, iwe were ya nke ukwuu, o wee kwuo na ya agaghị ekwe ka ha bata n’ụlọ anyị. N’eziokwu, o mere atụmatụ ịpụ tupu ha abịarute. Eji m anya mmiri na-arịọ mama m ka ọ nọrọ. Ka ọ nọ nnọọ na-ejikere ịpụ, a pịrị mgbịrịgba ọnụ ụzọ anyị, o wee bụrụ Eddie Besson. Cheedị echiche ụdị ọṅụ m nwere mgbe mama m nakweere ọmụmụ Bible!

N’ikpeazụ, apụrụ m ịga nzukọ ọgbakọ ọzọ! Otú ọ dị, n’ihe na-erughị otu afọ mgbe nke ahụ gasịrị, nne m kwụsịrị ịmụ ihe ọzọ. Na nke ugbu a, ọ machibidoro m inwe ihe ọ bụla jikọrọ mụ na Ndịàmà, ọ tụfusịkwara akwụkwọ Ndịàmà Jehova nile ọ hụrụ. Ma ezotaliri m Bible, akwụkwọ abụ, mpịakọta Ụlọ Nche abụọ, akwụkwọ Yearbook of Jehovah’s Witnesses abụọ, na otu akwụkwọ aha ya bụ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. * N’oge ikpeazụ anyị mụrụ ihe, ajụrụ m Eddie Besson ihe m ga-eme, ebe ọ bụ na m hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ọ gbara m ume ịnọ na-amụ ihe n’onwe m ma na-ekpechi ekpere anya. O mesiri m obi ike na Jehova ga-elekọta m. Adị m nanị ihe dị ka afọ 14.

Iduzi “Nzukọ” nke M

Site n’oge ahụ gaa n’ihu, n’ụbọchị Sunday ọ bụla, ana m abanye n’ime ọnụ ụlọ m ma mee ka à ga-asị na m nọ ná nzukọ. Ana m abụ abụ bụ́ “Mee Ka Anya Gị Lekwasị n’Ihe Nketa Ahụ!” ná mmalite, bụọkwa ya ná mmechi, ebe ọ bụ na ọ bụ nanị ya bụ abụ Alaeze m pụrụ icheta. Ruo taa, apụghị m ịbụ abụ a n’ebeghị ákwá. Ana m amụkwa otu isiokwu site ná mpịakọta Ụlọ Nche ndị m nwere. Ana m eji ekpere mechie “nzukọ” m. Ya mere, n’agbanyeghị na mụ na Ndịàmà adịghịzi akpakọrịta, enwere m mmetụta na Jehova nọ m nso.

Mgbe m gbara afọ 17, mụ na mama m kwagara Montreal. Ihe siiri m ike n’afọ ndị ahụ, ebe ọ bụ na ịhụnanya adịghị n’ụlọ anyị.

A Chọta M!

Otu ụbọchị, mama m natara akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala n’aka Ndịàmà Jehova. Mgbe m lọtara, ahụrụ m ya n’elu tebụl ma malite ikiri ya. Mgbe m hụrụ na o bu aha Chineke, bụ́ Jehova, amalitere m ibe ákwá ma kpee ekpere n’ime obi m, sị, “Jehova, ị chọta m!”

Ọ bịara dị m mkpa ịkpọtụrụ ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst. Ma olee otú m ga-esi mee ya? Mama m gwara m na onye agbata obi anyị nwere ike ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ya mere, mgbe m na-aga ọrụ, agara m n’ụlọ ya ma pịa mgbịrịgba ọnụ ụzọ ya. Otu nwoke—nke ụra ka dị n’anya—mepere ụzọ. Lee ihe ijuanya o nwere mgbe m kwuru na m bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova nakwa na m chọrọ ka e mee m baptizim! O mere ndokwa ka otu nwanna nwanyị bụ́ Onye Kraịst, nke aha ya bụ Josée Miron, mụọrọ m Bible. Ọzọkwa, mama m malitere imegide ọmụmụ m na-amụ Bible. Ọ gwara m na m ga-echere ruo mgbe m gbara afọ 18 tupu m nwee ike ịghọ Onyeàmà.

M̀ Ga-ajụ Jehova Iji Nwee Ndụ Ezinụlọ Dị Mma?

Onye were m n’ọrụ chọpụtara na ọnọdụ m nọ na ya n’ebe obibi anyị na-akawanye njọ. Ọ na-akpọkarị m ịbịa soro ya na nwunye ya nọkọọ ná ngwụsị izu. Ebe ọ bụ na m nwere mmasị n’ịnyịnya, anyị na-adị agakarị ịgba ịnyịnya. Ọ bịara dị m ka hà bụ nne na nna m.

Otu ụbọchị, onye were m n’ọrụ gwara m na ya na nwunye ya hụrụ m n’anya nke ukwuu nakwa na ha chọrọ ka m bịa soro ha biri. Ọ nọ na-enye m ihe m nọworo na-achọ—ezinụlọ nke na-ahụ n’anya. Ma e nwere otu ihe ha kwuru na m ghaghị ime—m ga-akwụsị iso Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta. Ha nyere m otu izu iji chee ya, ma achọghị m ọbụnadị otu ụbọchị. Azaghachiri m ha ozugbo. Jehova agbahapụtụbeghị m, apụghịkwa m ịgbahapụ ya.

Ozi M Na-ejere Chineke

N’ihi nsogbu m nọ na-enwe n’ụlọ, alakwuuru m nna nkuchi m. Ọ gbara m ume ịnọgide na-amụ ihe, na December 17, 1983 kwa, mgbe m dị afọ 19, e mere m baptizim. Enwere m nnọọ obi ụtọ ịhụ Eddie Besson n’ụbọchị e mere m baptizim. Ugbu a, o nweghịzi obi abụọ ọ bụla na m bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova!

Otú ọ dị, àgwà nna nkuchi m gbanwere mgbe e mesịrị m baptizim. Mgbe ọ bụla ọ hụrụ na m na-ekpe ekpere, ọ na-ekwu okwu n’olu dara ụda, ọbụnakwa na-atụ m ihe! O sikwara ọnwụ na m ga-agụtụkwu akwụkwọ bụ́ nke ga-emetụta ihe mgbaru ọsọ m nke ịghọ onye ọsụ ụzọ, onye na-ezisa ozi ọma oge nile. N’ikpeazụ, ọ gwara m ka m si n’ụlọ ya pụọ. O nyere m akwụkwọ ndọrọ ego iji dọrọ 100 dollar ma gwa m na ọ bụrụ na m adọrọ ego ahụ, ọ ga-edo m anya na Jehova adịghị elekọta m.

Aghọrọ m onye ọsụ ụzọ na September 1, 1986, m ka jikwa akwụkwọ ndọrọ ego ahụ—adọrọbeghị m ya—ruo taa! Mgbe ụfọdụ, ọ na-esi ike ịsụ ụzọ n’ebe na-emepeghị emepe n’ejighị ụgbọala. Ma ndị ọgbakọ m na-akwado ma na-enyere m aka.

Ka oge na-aga, ezutere m otu nwoke nwere obiọma, nke bụ́ Onye Kraịst, nke aha ya bụ Ruben Lenz. Anyị lụrụ n’afọ 1989. Ruben na-eje ozi ugbu a dị ka okenye ọgbakọ na Milton, Ontario, Canada, bụ́ ebe anyị bi kemgbe afọ 2002. Alụmdi na nwunye anyị bụ otu n’ime ngọzi kasịnụ Jehova nyeworo m. Anọgidere m n’ozi oge nile ruo mgbe anyị mụrụ nwa mbụ anyị, bụ́ Erika, n’afọ 1993. N’ihe ji nke nta karịa afọ atọ mgbe e mesịrị, anyị mụrụ nwa nwoke aha ya bụ Mika. Mgbe m nwesịworo owu ọmụma ruo ọtụtụ afọ, Jehova Chineke ji ezinụlọ nke hụrụ ya n’anya dị nnọọ ka m hụrụ ya, gọzie m.

N’agbanyeghị na mụ na ndị Jehova anọghị mgbe ụfọdụ n’oge m nọ na-etolite, ọ dịghị mgbe m kwụsịrị inwe olileanya n’ebe Chineke nọ nakwa maka ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs. (Jọn 3:36) Lee ekele m nwere na Jehova ‘chọtara’ m!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ka m na-agba ịnyịnya onye were m n’ọrụ

[Foto dị na peeji nke 31]

Mụ na di m, bụ́ Ruben, na ụmụ anyị, bụ́ Erika na Mika