Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Map—Ihe Na-enye Aka N’ọgụgụ Bible

Map—Ihe Na-enye Aka N’ọgụgụ Bible

Map—Ihe Na-enye Aka N’ọgụgụ Bible

Mgbe ị na-agụ na Bible banyere ndị mmadụ na ebe ndị dị iche iche ha gara, ị̀ na-agbalị iji anya nke uche hụ ebe ndị ahụ ha gara na ụzọ ndị ha si gaa? Ugbu a, site n’enyemaka broshuọ e bipụtara ọhụrụ bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ,’ nke nwere map ebe ndị a kpọgasịrị aha na Bible, ị pụrụ ịmatakwu banyere ala ndị a kpọrọ aha na Bible.

Otu nwanyị nke nọ na Ireland bụ́ onye natara broshuọ ahụ bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’ na-akọwa, sị: “Ụtụtụ ọ bụla, ka m na-agụ Bible, broshuọ m na-amalite ọrụ. Lee ọṅụ m na-enwe n’ịchọta ụzọ ndị mmadụ—ndị amụma, ndị eze—si na ha gaa, na-eji anya nke uche m ahụ ihe isi ike ndị ha zutere na njem ha, otú ebe ha gara dịruru n’anya, na ebe ndị ha biri. M na-edetu ihe ụfọdụ n’akụkụ map ndị ahụ ka m gụ na-aga. M ka na-agụ Akwụkwọ Nsọ Hibru, na-atụsikwa nnọọ anya ike mgbe m ga-agụru Akwụkwọ Nsọ Grik.”

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta broshuọ a nwere ihe osise tụrụ àgwà, bụ́ nke dị peeji 36, nke aha ya bụ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ,’ biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Ndagwurugwu mmiri iyi na ihu broshuọ: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est