Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwere Isi Mgbaka

Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwere Isi Mgbaka

Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwere Isi Mgbaka

NYE ezinụlọ Okorie, * ụbọchị ahụ malitere nnọọ dị ka ụbọchị ndị ọzọ n’izu. Ezinụlọ ahụ nke mmadụ anọ mejupụtara tetara ma jikere maka ihe omume nke ụbọchị ahụ. Ijeoma chetaara nwa ya nwoke dị afọ 14, bụ́ Chidi, na o meghị ngwa iji soro bọs ụlọ akwụkwọ ha. Ọ dịtụghị onye tụrụ anya ihe mezirinụ. N’ime ọkara awa, Chidi tekasịrị ágbá n’ahụ́ ụlọ nke otu ọnụ ụlọ ihi ụra, nwaa ịgba ebe a na-adọba ụgbọala ọkụ, nwaakwa ịkwụgbu onwe ya n’elu uko.

Ijeoma na di ya, bụ́ Emeka, banyere n’ụgbọala e ji ebu ndị ahụ́ na-adịghị bụ́ nke bu Chidi pụọ, ha nọ nnọọ na-agbalị ịghọta ihe a ga-akpọ ihe a merenụ. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, nke ahụ ka bụ mmalite ya. Ọtụtụ omume mkpaghasị uche ndị ọzọ sochiri, na-eme ka Chidi ghọzie onye isi mgbaka. Nhụjuanya o nwere ruo afọ ise gụnyere ọtụtụ mgbe ọ nwara igbu onwe ya, njide ndị uwe ojii jidere ya ugboro abụọ, mkpọga a kpọgara ya n’ogige asaa a na-agwọ ndị isi mgbaka, na ọtụtụ ugboro ọ gakwuuru ndị ọkachamara n’ọrịa uche. Ndị enyi na ndị ikwu ya, bụ́ ndị ihe a nile gbagwojuru anya, amaghị ihe ha ga-ekwu ma ọ bụ mee.

A na-eme atụmatụ na 1 onye n’ime mmadụ 4 ọ bụla nọ n’ụwa ga-arịa ọrịa uche n’otu oge ná ndụ ha. N’ịtụle ndekọ ọnụ ọgụgụ a na-ebu isi, ọ pụrụ ịbụ na i nwere nne ma ọ bụ nna, nwa, nwanne, ma ọ bụ enyi nke isi na-akpakọghị ọnụ n’ụzọ ụfọdụ. * Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’anya nwere nsogbu dị otú ahụ?

Ghọta Mgbaàmà Ya. E nwere ike a gaghị achọpụta ozugbo na mmadụ nwere isi mgbaka. Ndị enyi na ndị ezinụlọ pụrụ ikwu na ihe kpatara ihe mgbaàmà ndị ahụ bụ mgbanwe ndị e nwere ná mmiri ọgwụ ahụ́, ọrịa, adịghị ike mmadụ nwere n’àgwà ya, ma ọ bụ ọnọdụ ndị tara akpụ. Nne Chidi hụrụ ụfọdụ ihe mgbaàmà ndị na-egosi na Chidi nwere nsogbu, ma nne na nna ya chere na ịda mbà n’obi ya bụ n’ihi na ọ nọ n’oge uto bụ́ nke ọ ga-etofe n’oge na-adịghị anya. Otú ọ dị, mgbanwe ndị pụtara ìhè n’ihi ụra, n’iri nri, ma ọ bụ n’akparamàgwà pụrụ ịbụ ihe na-egosi na mmadụ nwere nsogbu dị njọ karịa mgbanwe ndị ahụ. Ọ bụrụ na onye ọkachamara elee onye ị hụrụ n’anya ahụ́, ọ pụrụ ime ka e nye ya ọgwụgwọ dị irè bụ́ nke ga-eme ka ndụ ya ka mma.

Mata Banyere Ya. Ndị nwere isi mgbaka adịkarịghị enwe ike ime nnyocha banyere nsogbu ha. Ya mere, ihe ọmụma ị ga-enweta site n’akwụkwọ ndị ọhụrụ na ndị a pụrụ ịdabere na ha pụrụ inyere gị aka ịghọta ihe onye ị hụrụ n’anya na-agabiga. Ọ pụkwara inyere gị aka isoro ndị ọzọ na-ekwurịta okwu n’ezoghị ọnụ nakwa n’ụzọ amamihe dị na ya. Dị ka ihe atụ, Ijeoma nyere nne na nna ochie Chidi akwụkwọ nta na-ekwu banyere ahụ́ ike bụ́ ndị nyeere ha aka n’ịmatakwu banyere nsogbu ahụ nakwa otú ha ga-esi nye aka.

Chọọ ọgwụgwọ. N’agbanyeghị na ụfọdụ isi mgbaka na-anọte aka, ọ bụrụ na a malite ịgwọ ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọtụtụ ndị nwere nsogbu ahụ pụrụ ibi ndụ dị mma, nke na-arụpụta ihe. N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị na-anọ ruo ọtụtụ afọ n’enwetaghị enyemaka. Dị nnọọ ka ajọ ọrịa obi chọrọ nlebara anya nke ọkachamara n’ihe banyere ọrịa obi, isi mgbaka chọrọ nlebara anya nke ndị maara otú e si agwọ ya. Dị ka ihe atụ, ndị na-agwọ isi mgbaka pụrụ idepụta ọgwụ ndị ọ ga-abụ a nọgide na-aṅụ ha, ha pụrụ inyeaka chịkwaa ọnọdụ uche, belata nchekasị, ma mee ka a na-echezi echiche nke ọma. *

Gbaa onye nwere nsogbu ahụ ume ịchọ enyemaka. Ndị nwere isi mgbaka nwere ike ghara ịma na enyemaka dị ha mkpa. Ị pụrụ ịtụ aro ka onye ahụ nwere nsogbu gaa hụ otu dọkịta kpọmkwem, ka ọ gụọ isiokwu ụfọdụ bara uru, ma ọ bụ ka o soro onye nweworo ihe ịga nke ọma n’ịchịkwa nsogbu yiri nke ahụ kwurịta okwu. Ọ pụrụ ịbụ na onye ị hụrụ n’anya anabataghị ndụmọdụ gị. Ma alala azụ n’ime ihe ma ọ bụrụ na onye ị na-elekọta nọ n’ihe ize ndụ nke imerụ onwe ya ma ọ bụ ndị ọzọ ahụ́.

Zere ịta ụta. Ndị ọkà mmụta sayensị enwebeghị ike ịchọpụta otú mkpụrụ ndụ ihe nketa, gburugburu ebe obibi, na mmekọrịta mmadụ na ibe ya si ejikọ aka akpata nsogbu ụbụrụ. Ọtụtụ ihe pụrụ ijikọ aka kpata isi mgbaka, ha na-agụnye inwe mmerụ ahụ́ n’ụbụrụ, iji ihe na-eri ahụ́ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ihe ndị dị gburugburu mmadụ bụ́ ndị na-akpata nrụgide, adịzighị adịzi nke mmiri ọgwụ ahụ́, na ihe ndị e bu pụta ụwa. Ọ dịghị enye aka ọ bụla ịta ndị mmadụ ụta banyere ihe i chere ha meworo nke so kpata ọrịa ahụ. I kwesịrị itinye ikike gị n’inye nkwado nakwa n’inye agbamume.

Nwee atụmanya ndị ezi uche dị na ha. Ọ bụrụ na ị chọọ ihe dị ukwuu n’aka onye nwere nsogbu ahụ karịa ka ọ pụrụ imeli, ọ pụrụ ịkụda ya mmụọ. N’aka nke ọzọ, ịdị na-ekwutekarị banyere adịghị ike nke onye ọrịa ahụ pụrụ ime ka ọ dị ya ka ọ dịghịzi ihe ọ ga-emeli. Ya mere, mee ka ihe ndị ị na-atụ anya n’aka ya bụrụ ndị ezi uche dị na ha. Otú ọ dị, e kwesịghị ịgbachi nkịtị n’àgwà ndị na-ezighị ezi. Dị nnọọ ka onye ọ bụla ọzọ, ndị nwere isi mgbaka pụrụ ịmụta ihe site n’ihe ndị si n’omume ha pụta. Ime ihe ike pụrụ ime ka a kpụpụ mmadụ n’ụlọikpe ma ọ bụ machibido ya n’ihe ụfọdụ iji chebe onye ahụ ma ọ bụ ndị ọzọ.

Na-enwe nkwurịta okwu. Nkwurịta okwu dị oké mkpa, ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ iyi ka à ghọtahiere ihe i kwuru. A pụghị ịma otú onye nwere isi mgbaka pụrụ isi zaghachi mgbe ụfọdụ, otú o sikwa emeghachi omume nwere ike yie nke na-ekwekọghị n’ọnọdụ e nwere n’oge ahụ. Ka o sina dị, ịdị na-atụchasị ihe onye ọrịa ahụ kwuru adịghị ihe ọzọ ọ ga-eme ma ọ́ bụghị ime ka o nwee obi amamikpe n’elu ịda mbà n’obi ọ dị mbụ nwee. Mgbe ihe i kwuru yiri nke na-enyeghị aka, nọrọ nwayọọ ma gee ntị. Kwuo na ị ghọtara mmetụta na echiche onye ahụ n’akatọghị ya. Gbalịsie ike ịnọ jụụ. Gị na onye ị hụrụ n’anya ga-erite uru ma ị nọgide nnọọ na-egosi na ị na-eche banyere ya. Ọ bụ otú a ka ọ dịịrị n’ebe Chidi nọ. Afọ ole na ole mgbe e mesịrị, o kwupụtara ekele ya maka ndị ọ sịrị nọ “na-enyere m aka mgbe m na-achọghị enyemaka.”

Na-echebara mkpa ndị òtù ezinụlọ ndị ọzọ nwere echiche. Mgbe ezinụlọ na-aghaghị ilekwasị anya n’ebe onye ahụ nwere nsogbu nọ, a pụrụ ileghara ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ anya. Ruo oge ụfọdụ, ọ bịara dị nwanne nwanyị Chidi, bụ́ Ngozi, ka “ọrịa ahụ ọ̀ na-eme ka a na-eleghara ya anya.” O belatara ihe ndị ọ na-arụzu iji ghara ịdọta uche n’ebe ya onwe ya nọ. Ka ọ dịgodị, o yiri ka nne na nna ya hà chọrọ ka ọ na-arụzu ihe ka ukwuu, dị ka à ga-asị na ha chọrọ ka ọ na-arụ nke ya ma na-arụchitere nwanne ya nwoke. Ụmụnne nke onye nwere nsogbu, bụ́ ndị e leghaara anya otú ahụ, na-anwa ime ka e lebara ha anya site n’ịkpata nsogbu. Ezinụlọ ndị ha na nsogbu na-alụ chọrọ enyemaka iji na-elebara onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ anya. Dị ka ihe atụ, mgbe ezinụlọ Okorie tinyere uche ha nile ná nsogbu Chidi, ndị enyi ha nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ha nyeere Ngọzi aka site n’ilebakwuru ya anya.

Kwalite ihe omume ndị ga-eme ka e nwee uche kpakọrọ ọnụ. Atụmatụ ndị sara mbara a na-eme iji mee ka e nwee uche kpakọrọ ọnụ kwesịrị ịgụnye ilebara ihe oriri, mmega ahụ́, ụra, na ntụrụndụ anya. Ihe omume ndị dị mfe e so obere ìgwè ndị enyi eme adịchaghị emenye ụjọ. Ọzọkwa, cheta na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya pụrụ ịkpalikwu ọrịa ahụ ma mee ka ọgwụ a na-aṅụ maka ya ghara ịrụcha ọrụ. Ezinụlọ Okorie na-agbalịzi ịhụ na ha nwere usoro ihe omume nke ga-eme ka uche ha kpakọọ ọnụ, bụ́ nke ga-abara onye ọ bụla uru ma karịsịa nwa ha nwoke.

Na-elekọta onwe gị anya. Nrụgide nke ya na ilekọta onye nwere isi mgbaka na-agakọ pụrụ imetụta ahụ́ ike nke gị. Ya mere, ọ dị oké mkpa ka ị na-elebara mkpa anụ ahụ́ gị, nke mmetụta uche, na nke ime mmụọ gị anya. Ezinụlọ Okorie bụ Ndịàmà Jehova. Ijeoma na-eche na okwukwe ya nyeere ya aka nke ukwuu ịnagide nsogbu ahụ dapụtara n’ezinụlọ ha. “Nzukọ Ndị Kraịst na-enye aka n’ibelata nchekasị,” ka ọ na-ekwu, “oge iji chefuo nchekasị ndị e nwere ma lekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa na olileanya ahụ bụ́ isi. Ọtụtụ oge, ana m ekpe ekpere maka ahụ́ efe, mgbe mgbe kwa, mgbanwe ụfọdụ na-ewere ọnọdụ, bụ́ nke na-ebelata ihe mgbu ahụ. Site n’enyemaka Jehova Chineke, enwere m obi iru ala, bụ́ nke yiri ihe na-agatụghị ekwe omume n’ọnọdụ anyị.”

Chidi bụzi nwa okorobịa toruworo ogo mmadụ, otú o sikwa ele ndụ anya dịzi iche. “Ana m eche na m bụ mmadụ ka mma ugbu a n’ihi ihe m gabigara,” ka ọ na-ekwu. Nwanne nwanyị Chidi, bụ́ Ngọzi, na-eche na ahụmahụ ahụ bakwaara ya onwe ya uru. “Adịchaghịzi m akatọ ndị ọzọ,” ka ọ na-ekwu. “Ị maghị ihe ndị ha na mmadụ pụrụ ịnọ na-alụ. Nanị Jehova Chineke maara.”

Ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’anya nwere isi mgbaka, na-echeta mgbe nile na ige ya ntị, inyere ya aka, nakwa eburughị ya iwe n’obi pụrụ inyere ya aka ịgbake—nakwa ọbụna inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha ndị ahụ.

^ par. 4 Ụfọdụ ndị na-eji okwu bụ́ “isi akpakọghị ọnụ” eme ihe, ebe ọ bụ na ọ dịchaghị ada njọ njọ ná ntị.

^ par. 7 E kwesịrị ịtụle abamuru ndị ọ ga-eweta nakwa mmetụta ndị na-adịghị mma ọ pụrụ inwe n’ahụ́ mmadụ. Teta! adịghị akwalite otu usoro ọgwụgwọ ọ bụla kpọmkwem. Ndị Kraịst kwesịrị ijide n’aka na ọgwụgwọ ọ bụla ha na-anata emegideghị ụkpụrụ Bible.

[Igbe dị na peeji nke 15]

Ụfọdụ Ihe Mgbaàmà nke Isi Mgbaka

Ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’anya nwere nke ọ bụla n’ihe mgbaàmà ndị na-esonụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka ọ gakwuru ọkachamara n’ihe banyere ahụ́ ike ma ọ bụ ọrịa uche:

• Iwe iwe ma ọ bụ inwe obi mgbarụ ruo ogologo oge

• Ịnọpụrụ onwe ya iche

• Inwebiga obi ụtọ ókè n’oge a na inwe oké ịda mbà n’obi n’oge nke ọzọ

• Oké iwe

• Ime ihe ike ike

• Iji ihe na-eri ahụ́ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi

• Ịtụbiga ụjọ ókè, inwebiga nchegbu ókè, na inwe nchekasị

• Ịtụ oké ụjọ banyere ibu ibu

• Mgbanwe dị ịrịba ama n’ụzọ o si eri ihe ma ọ bụ n’ụzọ o si ehi ụra

• Ịnọgide na-arọ nrọ ọjọọ

• Uche mgbasasị

• Ịnụ na ịhụ ihe ndị na-adịghị adị

• Iche echiche ọnwụ ma ọ bụ echiche igbu onwe onye

• Enweghị ike ịnagide nsogbu na ihe omume ndị dịịrị ụbọchị

• Ekwetaghị na e nwere nsogbu ndị o doro anya na e nwere

• Ọtụtụ ọrịa ndị a na-apụghị ịkọwa ihe kpatara ha

[Foto dị na peeji nke 16]

Mgbe ihe i kwuru yiri nke na-enyeghị aka, nọrọ nwayọọ ma gee onye ahụ nwere nsogbu ntị