Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-emeso Ndị Agadi?

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-emeso Ndị Agadi?

Echiche nke Bible

Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-emeso Ndị Agadi?

N’OGE okpomọkụ nke afọ 2003, ọtụtụ puku mmadụ nwụrụ n’ebe nile na Europe n’ihi otu n’ime oké okpomọkụ kasị njọ e nwetụrụla na Kọntinent ahụ n’ime afọ 60. Ndị okpomọkụ ahụ kasị gbuo bụ ndị agadi. Ụfọdụ n’ime ndị ahụ nwụrụnụ bụ ndị ndị ikwu ha hapụrụ nanị ha n’ụlọ ma gawa ezumike. A kọkwara na ndị ọzọ bụ ndị ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ọrụ na-anyịgbu nakwa ndị ndị na-arụ n’ebe a na-elekọta ndị agadi, leghaara anya. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Le Parisien na-akọ na, na Paris nanị, e nwere ozu mmadụ 450 a hapụrụ n’enweghị ndị bịara buru ha. “Olee ụdị ọnọdụ anyị nọ na ya nke na anyị na-echefu nna anyị, nne anyị, na ndị nne na nna ochie anyị?” ka akwụkwọ akụkọ ahụ jụrụ banyere ọnọdụ nke ndị ahụ a hapụrụ nanị ha, ha ewee nwụọ n’enweghị onye ma ndị ha bụ.

N’ụwa ebe ọnụ ọgụgụ nke ndị gafeworo afọ 65 na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-enwetụbeghị ụdị ya nke bụ́ 795,000 kwa ọnwa, ilekọta ndị agadi aghọwo otu n’ime nchegbu ndị kasị ukwuu e nwere taa. “Ọnụ ọgụgụ nke ndị agadi na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị n’ụwa nile, ọ ga-adịkwa mkpa ka anyị leba anya nke ọma n’otú mba dị iche iche si emeghachi omume banyere ihe ịma aka ndị ime agadi na-akpata nakwa ohere ndị ọ na-eme ka e nwee,” ka Nancy Gordon, bụ́ onye enyemaka nke ọga kpata kpata nke ngalaba na-ahụ maka otú ndị mmadụ si amụba n’Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ọnụ Ọgụgụ Mmadụ na United States, kwuru.

Onye Okike anyị nwekwara mmasị n’ebe ndị agadi nọ. N’eziokwu, Okwu ya, bụ́ Bible, na-enye anyị ntụziaka banyere ụzọ a ga-esi na-emeso ha.

Inwe Nkwanye Ùgwù maka Ndị Agadi

Iwu Chineke, bụ́ nke o nyere Mozis, gbara ume ka a na-akwanyere ndị agadi ùgwù. Iwu ahụ kwuru, sị: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye.” (Levitikọs 19:32) A tụrụ ndị ji nrubeisi na-efe Chineke ofufe anya n’aka ‘ibili ọtọ’ n’ihu onye isi awọ (1) dị ka ihe na-egosi nkwanye ùgwù maka onye meworo agadi nakwa (2) dị ka ihe àmà nke egwu nsọpụrụ ha nwere n’ebe Chineke nọ. Ya mere, ndị agadi ga-abụ ndị a na-akwanyere ùgwù, a ga na-elekwa ha anya dị ka ndị bara uru.—Ilu 16:31; 23:22.

Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst taa anọghị n’okpuru Iwu Mozis, ụkpụrụ ndị dị n’ime ya na-egosi ihe ndị bụ́ echiche Jehova na ihe ndị ọ na-ebute ụzọ, na-eme ka obi abụọ ọ bụla ghara ịdị na ya na ọ na-eji ndị agadi akpọrọ oké ihe. Ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ ghọtara ụkpụrụ ndị a. A kọrọ ihe àmà gosiri na ha ghọtara ya n’akwụkwọ Bible bụ́ Ọrụ Ndị Ozi. Ụfọdụ ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị nọ ná mkpa so ná Ndị Kraịst e nwere na Jeruselem n’oge ahụ. Obi abụọ adịghị ya na ọtụtụ n’ime ha bụ ndị agadi. Ndịozi họpụtara “ndị ikom asaa a gbaara ezi àmà” iji hụ na ndị inyom a nwetara nri a na-ekesa kwa ụbọchị n’ụzọ dị n’usoro, ha lere nlekọta dị otú ahụ anya dị ka ‘ọrụ dị mkpa’ nke dịịrị ọgbakọ.—Ọrụ 6:1-7.

N’akwụkwọ ozi ya, Pọl onyeozi ji ụkpụrụ ahụ bụ́ ‘ibili ọtọ n’ihu onye isi awọ’ mee ihe n’ebe ọgbakọ Ndị Kraịst nọ. Ọ gwara Timoti, bụ́ Onye Kraịst bụ́ onye nlekọta nke ọ tọrọ, sị: “Akatọla nwoke meworo okenye n’ụzọ dị njọ. Kama nke ahụ, na-arịọ ya arịrịọ dị ka nna, . . . ụmụ nwanyị meworo okenye dị ka ndị nne.” (1 Timoti 5:1, 2) Ọ bụ ezie na nwa okorobịa bụ́ Timoti nwere ikike ụfọdụ n’ebe Ndị Kraịst meworo agadi nọ, a gwara ya ka ọ ghara ịgwa nwoke meworo okenye okwu mweda n’ala. Kama nke ahụ, ọ ga-eji nkwanye ùgwù na-arịọ ya arịrịọ dị ka nna. Ọ ga-egosikwa nkwanye ùgwù dị otú ahụ n’ebe ndị inyom meworo agadi nọ n’ọgbakọ nọ. N’eziokwu, Pọl onyeozi nọ na-adụ Timoti—nakwa ndị nile nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst—ọdụ ịdị “na-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ.”

Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa inye ndị na-asọpụrụ Chineke iwu tupu ha ejiri nkwanye ùgwù na nsọpụrụ na-emeso ndị meworo agadi. Tụlee ihe atụ Bible banyere Josef, bụ́ onye mefuru nnọọ ihe dị ukwuu iji kpọta nna ya meworo agadi n’Ijipt, si otú ahụ chebe Jekọb dị afọ 130 pụọ n’ụnwụ nri nke zuru ebe nile. Mgbe ọ hụrụ nna ya anya na nke mbụ ya ka ihe karịrị afọ 20 gasịworo, Josef ‘dakwasịrị ya n’olu, kwaa ákwá n’olu ya mgbe dị anya.’ (Jenesis 46:29) Ogologo oge dị anya tupu e nye Izrel iwu isi otú ahụ na-emeso ndị agadi, Josef gosipụtara ihe bụ́ echiche Chineke, bụ́ iji ọmịiko na nkwanye ùgwù miri emi emeso ndị agadi.

N’oge ije ozi ya, Jizọs n’onwe ya gosiri nchegbu o nwere n’ebe ndị agadi nọ. Ọ katọsiri ndị ndú okpukpe ike, bụ́ ndị chere na ha ziri ezi n’ileghara nne na nna ha meworo agadi anya n’ihi omenala okpukpe ha. (Matiu 15:3-9) Jizọs jikwa ịhụnanya lekọta nne ya. Mgbe ọ nọ n’oké ihe mgbu n’elu osisi ịta ahụhụ, o mere ihe iji hụ na Jọn onyeozi, bụ́ onye ọ hụrụ n’anya, ga-elekọta nne ya meworo agadi.—Jọn 19:26, 27.

Chineke Adịghị Agbahapụ Ndị Ya Na-eguzosi Ike n’Ihe

Ọbụ abụ ahụ kpere ekpere, sị: “Atụfula m na mgbe agadi; mgbe ike m gwụsịrị ahapụla m.” (Abụ Ọma 71:9) Chineke adịghị ‘atụfu’ ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi, ọbụna mgbe ha onwe ha pụrụ iche na ha abaghịzi uru ọ bụla. Ọbụ abụ ahụ echeghị na Jehova agbahapụwo ya; kama, ọ ghọtara mkpa ọ dị ya ịdabere n’ebe Onye Okike ya nọ ọbụna karị n’oge ọ na-emewanye agadi. Jehova na-eme ihe banyere iguzosi ike n’ihe dị otú ahụ site n’ịkwado onye ahụ n’oge nile ọ nọ ndụ. (Abụ Ọma 18:25) Enyemaka dị otú ahụ na-abịakarị site n’aka Ndị Kraịst ibe ha.

N’ihi ihe ndị e kwuru n’elu, o doro anya na ndị nile chọrọ ịsọpụrụ Chineke aghaghịkwa ịsọpụrụ ndị agadi. N’ezie, ndị agadi dị nnọọ oké ọnụ ahịa n’anya Onye Okike anyị. Dị ka ndị e kere n’oyiyi ya, ka anyị na-egosipụta mgbe nile na anyị na-ele “isi awọ” anya otú Chineke si ele ya.—Abụ Ọma 71:18.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị Kraịst na-eji nkwanye ùgwù na nsọpụrụ emeso ndị agadi