Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịlụso Oké Ibu Ọgụ—Ò Ruru Mgbalị E Meere Ya?

Ịlụso Oké Ibu Ọgụ—Ò Ruru Mgbalị E Meere Ya?

Ịlụso Oké Ibu Ọgụ—Ò Ruru Mgbalị E Meere Ya?

TETA! gbara ọtụtụ ndị ha na nsogbu oké ibu lụrụla, ajụjụ ọnụ. Mgbalị ha ọ̀ rụpụtara ihe ndị dị mma? Olee aro ha na-atụrụ ndị ọzọ nwere nsogbu a zuru ebe nile?

▪ Ka anyị jụọ Mike, bụ́ onye dị sentimita 183 n’ogo, ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ ya ugbu a abụrụkwa kilogram 130. Mgbe ọ kasị buo ibu, ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ ya bụ kilogram 157.

Mike: “Eburu m ibu ọbụna mgbe m ka na-eto eto. Ọ dị ezinụlọ anyị n’ọbara—nwanne m nwoke na ụmụnne m ndị nwanyị buchara ibu. Ihe e ji mara anyị bụ na nri anaghị afọ n’efere anyị, ọbụna ma a sị na nri e kunyeere anyị karịrị akarị. Ùnu ma ihe mere m ji gbanwee ụzọ m si eri nri? Ọ bụ mgbe dọkịta gwara m na m nọ nnọọ n’ihe ize ndụ nke ibute ọrịa shuga! Echiche nke ịbụ onye a ga na-agbanye insulin n’ahụ́ ná ndụ m nile tụrụ m ụjọ n’ezie. Enwekwara m ajọ nsogbu nke cholesterol ma na-anara ọgwụgwọ.

“Ọrụ m na-arụ n’oge ahụ bụ ọrụ a na-anọ otu ebe arụ, ọ bụ ya ka m ka na-arụkwa. Iji na-emega ahụ́, enwere m usoro ihe omume m na-agbaso mgbe nile, bụ́ nke na-agụnye ịga ije ruo ọkara awa n’elu ígwè nọ otu ebe a na-anọ na ya aga ije, ọ dịkarịa ala, ugboro atọ n’izu. Ihe ọzọ dị mkpa m mere bụ ịdị na-edetu ihe m na-eri kwa ụbọchị edetu. Ịmara na onye ọkà n’ihe oriri na-edozi ahụ́ gaje ịtụle ihe ndị m depụtara kwa izu, nyeere m aka ijide onwe m. Ihe na-abata m n’uche bụ, ‘Ọ bụrụ na i righị ya, ị gaghị ede ya!’

“N’ihi ya, kilogram 28 apụọla m n’ahụ́ n’ime ọnwa 15 gara aga, ọ bụ ezie na ọ ka dị mkpa ka m felatakwuo, ebe m chọrọ ifelata ruo kilogram 102. Iji ruo ihe mgbaru ọsọ a, akwụsịla m iri nri ratụ ratụ na ihe e ghere eghe. Eriwo m akwụkwọ nri n’ọnwa ndị na-adịbeghị anya karịa ka m ritụrụla ná ndụ m nile!

“Ihe ọzọ kpaliri m ime ihe bụ na, dị ka onye na-anya gwongworo, a ghaghị ile m ahụ́ kwa afọ iji mara ma à ga-agbanye m laịsensị ọhụrụ. Anọ m n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye a na-agaghị agbanye laịsensị n’ihi ịbụ onye nwere ike ịrịa ọrịa shuga. Ugbu a, ihe agbanweela. Ọ dịghịzi m mkpa ịṅụ ọgwụ iji na-achịkwa cholesterol dị m n’ahụ́. Ọbara mgbali elu m na-enwe akwụsịwala, adịchaghịkwa m aṅụrụ ya ọgwụ. Enwere m ume ugbu a karị, ọbụna oké azụ mgbu m na-enwe ebelatala. Ọzọkwa, e jiriwo nwayọọ nwayọọ na-agụpụ m n’onye buru oké ibu!”

Teta!: “Onye bụ́ nwunye ọ̀ pụrụ ikere òkè dị mma n’ime ka mmadụ felata?”

Mike: “Mgbe ị na-adọga ka i felata, ọ dị gị mkpa inwe onye kwụ gị n’azụ. Nwunye m na-echebu na ya na-egosi m ịhụnanya site n’inyeju m afọ. Ma ugbu a, ọ na-enyere m aka ịchịkwa ókè ihe m na-eri na-aharu. Agatụghị m akwụsị ime mgbalị iji felata n’ihi na ọ bụrụ na m emee otú ahụ, tupu m mara ihe na-aganụ, ebuwela m ibu ọzọ.”

▪ Tụlee banyere nwoke ọzọ aha ya bụkwa Mike, nke si Kansas, U.S.A. Ọ dị afọ 43 ma dịrị sentimita 173 n’ogo. Anyị jụrụ ya ihe bụ́ ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ ya mgbe ọ kasị buo ibu na ihe ndị kpatara ibu ya.

Mike: “Mgbe m kasị buo ibu, ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ m bụ kilogram 135. N’oge ahụ, ike na-agwụ m mgbe nile, ume anaghịkwa adị m ime ihe ọ bụla. Anaghị m ehili ụra n’ihi nsogbu iku ume. Ya mere, agara m hụ dọkịta, ọ chọpụtakwara na otu n’ime ihe ndị mere m ji ebu ibu bụ na okpo iku ume m na-akpachi n’oge m na-ehi ụra. * Ọ chọpụtakwara na m nwere ọbara mgbali elu.”

Teta!: “Olee otú i si gwọọ nsogbu gị?”

Mike: “Dọkịta kwuru ka a kwụnye m ígwè ọrụ ga-anọgide na-ekunye ikuku n’oghere imi m n’oge m na-ehi ụra. N’ụzọ dị otú a, okpo iku ume m adịghị akpachi, abịakwara m na-eku ume nke ọma. N’ihi ya, abịara m dịkwuo ike ọrụ ma malite ifelata. Amalitekwara m iji ígwè nọ otu ebe a na-anọ na ya aga ije eme ihe ugboro atọ n’izu. Abịara m nwee usoro iri nri, nke pụtara na m ga na-achịkwa ókè ihe m na-eri na-aharu ma zere ịdị na-ekuru nri ugboro abụọ. Ugbu a, kilogram 20 apụọla m n’ahụ́ nanị n’ime ihe karịrị otu afọ, ọ dịkwa m mkpa ka kilogram 20 ọzọ ma ọ bụ karịa pụkwuo m n’ahụ́. Ọ na-ewe oge, ma amaara m na m ga-emeli ya.”

Teta!: “Olee ihe ọzọ kpaliri gị ifelata?”

Mike: “Ọ dịghị enye obi ụtọ ma ị na-anụ ka ndị mmadụ na-ekwu okwu mkparị na okwu ọjọọ banyere ọdịdị ahụ́ gị. Ndị mmadụ na-adịkarị eche na ị bụ nnọọ onye umengwụ. Ha amaghị na a pụrụ inwe ọtụtụ ihe na-akpata oké ibu. Ekweere m na ibu m pụrụ ịbụ ihe e bu pụta ụwa, ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị ezinụlọ anyị nwere nsogbu ibu.

“Otú ọ dị, ana m ekweta na iji felata, aghaghị m ịdị na-emega ahụ́ ma na-achịkwa nnọọ ihe m na-eri.”

Teta! gbakwara Wayne nke si Oregon, bụ́ onye dị afọ 38, ajụjụ ọnụ. Mgbe ọ dị afọ 31, ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ ya bụ kilogram 112.

Wayne: Ana m arụ ọrụ a na-anọ otu ebe arụ ma ghara ịdị na-emega ahụ́. Mgbe m gakwuuru dọkịta m, ọ wụrụ m akpata oyi ịnụ na m nwere ọbara mgbali elu ma nọrọ n’ihe ize ndụ nke inwe nsogbu obi. O zigara m na nke onye ọkà n’ihe oriri na-edozi ahụ́. O mere ka m nwee usoro mmega ahụ́ siri ike na nke ịchịkwa ókè nri m na-eri na-aharu. Amalitere m iji ụkwụ na-aga kilomita 5 n’akwụsịghị akwụsị kwa ụbọchị, ana m etetakwa n’isi ụtụtụ ọ bụla iji megaa ahụ́. Aghaghị m inyeghachi onwe m ọzụzụ banyere ụzọ m si eri nri ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ. Akwụsịrị m iri nri ratụ ratụ ma kwụsịlata ịta bred na ịṅụ mmanya ọtọ bịrịbịrị ma jirizie mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri dochie ha. Ugbu a, ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ m agbadatala ruo kilogram 80!”

Teta!: “Olee uru ndị ị chọpụtara i riteworo?”

Wayne: “Enwere m mmetụta nke ịbụ onye ahụ siri ike karị, ọ dịkwa m ka ọ̀ bụ ugbu a ka m maliteghachiri ndụ n’ezie. Oge mbụ, ọ na-adị m ka à ga-asị na ndụ m anaghị aga aga, na ọ kwụ otu ebe. Uru ọzọ m ritere bụ na akwụsịla m ịṅụ ọgwụ maka ọbara mgbali elu. Anazi m elegideli ndị mmadụ anya n’ihu, na-amara na a gaghị ele m anya ọjọọ n’ihi ibubiga ibu ókè.”

▪ Charles (ọ bụghị ezigbo aha ya) dị sentimita 196 n’ogo. Mgbe ọ kasịkwa buo ibu, ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ ya bụ kilogram 168.

Charles: “Enwere m ajọ nsogbu ahụ́ ike, ọnọdụ m nọkwa na-aka njọ. Apụghị m ịrị steepụ. Enweghị m ume dị m mkpa iji na-arụ ọrụ m. Ana m arụ ọrụ a na-anọ otu ebe arụ, ọrụ m na-agụnyekwa ime nnyocha na ilekọta ọrụ. Ama m na aghaghị m ime ihe banyere ibu m, karịsịa kemgbe m gasịrị hụ dọkịta m. Ọ dọrọ m aka ná ntị na m na-aga inwe ọrịa strok. Ahụla m ihe ọrịa ahụ mere mmadụ. Nke a mere ka m kwenyesie ike na ọ dị m mkpa ime ihe. Dọkịta m mere ka m nwee usoro mmega ahụ́ a ga na-elebara m anya, bụ́ nke m ga-eji ígwè nọ otu ebe a na-anọ na ya aga ije na-eme, e nyekwara m usoro iri nri m na-aghaghị ịgbaso. Ugbu a ihe dị ka otu afọ gaferela, efelatawo m ruo kilogram 136, ma amaara m na aghaghị m ifelatakwu. Uru ndị m riteworo mere ka m kwenyesie ike na o ruru àjà m chụụrụ ya na mgbalị m meere ya. Ugbu a, ana m arịli steepụ, enwewokwa m ume karị.”

▪ Marta, bụ́ onye si El Salvador, nwere oge ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ ya bụ kilogram 83. Nke a mere ka a gụnye ya ná ndị buru oké ibu, ebe ọ bụ na ọ dị sentimita 165 n’ogo.

Marta: “Agakwuuru m dọkịta, ọ gwasikwara m ike ka m malite ifelata. Eweere m ihe o kwuru dị ka ihe dị mkpa n’ihi ọkachamara ọ bụ. O zigara m na nke onye ọkachamara n’ihe banyere nri na-edozi ahụ́ maka inweta ndụmọdụ. Ọkachamara ahụ kọwaara m ihe nile banyere ụzọ m ga-esi efelata. O gosiri m otú m ga-esi wetulata aka n’ihe m na-eri nakwa otú m ga-esi na-achịkwa ya. Na mbụ, ana m aga kwa izu akọrọ ya ka ihe si kwụrụ; ka oge na-aga, m gawazie kwa ọnwa iji kọrọ ya ọganihu m na-enwe. Ma dọkịta ahụ ma ọkachamara ahụ gbara m ume maka ọganihu m na-enwe. N’ikpeazụ, kilogram 12 bịara pụọ m n’ahụ́, adịzi m ihe dị ka kilogram 68, nke bụ́ otú m chọrọ ịha.”

Teta!: “Gịnị banyere mmega ahụ́ na ịnara ọgwụgwọ?”

Marta: “Enweghị m nsogbu cholesterol, ọ dịghịkwa m mkpa ịnara ọgwụgwọ. Amalitere m itinyekwu oge n’ịgasi ije ike kwa ụbọchị.”

Teta!: “Gịnị ka ị na-eme mgbe ị gara na nke ndị enyi gị, ha arụgide gị ka i rie ihe karịrị ókè ị na-eriru?”

Marta: “Ana m agwa ha nnọọ, sị, ‘Otú a ka dọkịta m chọrọ ka m siri na-eri nri maka ahụ́ m,’ ha adịkarịghịkwa arụgide m.”

Ya mere, ọ bụrụ na i buru ibu ma ọ bụ bufee ibu ókè, gịnị ka ị pụrụ ime banyere ya? Ilu ochie ahụ bụ eziokwu, “E nwee ọchịchọ ime ihe, a ga-ahụrịrị ụzọ a ga-esi mee ya.” Ì nwere mkpali na ume ime ihe banyere ya? Dị ka nwata ma ọ bụ okenye nke buru ibu, olee nhọrọ ndị i nwere? Felata ma ọ bụ nwụchuo ọnwụ. Na-ebi ndụ nke ga-eme ka ị na-emega ahụ́, ma nweta afọ ojuju nke na-abịa site n’ịrụzu ihe—ọbụna ihe ndị dị nta, dị ka inwe uwe ndị dị obere karị!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere nsogbu mkpachi okpo iku ume mgbe a na-ehi ụra, lee Teta! nke February 8, 2004, peeji nke 10-12.

[Igbe dị na peeji nke 11]

Ịwa ahụ́ iji mịpụ abụba ọ̀ bụụrụ gị ihe ngwọta ya?

Gịnị bụ ịwa ahụ́ iji mịpụ abụba? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu si otú a kọwaa ya: “Ọ na-abụkarị ịwa ahụ́ maka ịmakwu mma bụ́ nke e ji ewepụ abụba karịrị akarị n’akụkụ ụfọdụ nke ahụ́, dị ka n’apata ụkwụ ma ọ bụ n’afọ, site n’iji ígwè ọrụ ga-amịpụta abụba ndị ahụ mee ihe.” (American Heritage Dictionary) Otú ọ dị, nke ahụ ọ̀ na-apụta na ọ bụ ihe ngwọta nke oké ibu?

Akwụkwọ bụ́ Mayo Clinic on Healthy Weight na-ekwu na ụdị ịwa ahụ́ a bụ ihe a na-eme iji makwuo mma. Ọ bụghị usoro e ji eme ihe iji felata. A na-eji obere tub a dụnyere n’ime ahụ́ mmadụ amịpụ abụba dị ya n’ahụ́. A pụrụ ịmịpụ ọtụtụ kilogram n’otu mgbe. Otú ọ dị, “ụdị ịwa ahụ́ a abụghị ụzọ e si agwọ oké ibu.” Ọ̀ dị nchebe? “Ndị nwere ụfọdụ nsogbu ahụ́ ike ibu na-akpata, gụnyere ọrịa shuga na ọrịa obi, nọ nnọọ n’ihe ize ndụ nke inweta nsogbu ndị ọzọ ma a wasịa ha ụdị ahụ́ a.”