Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Kụziiri M Ịhụ Chineke n’Anya Site na Nwata

A Kụziiri M Ịhụ Chineke n’Anya Site na Nwata

A Kụziiri M Ịhụ Chineke n’Anya Site na Nwata

DỊ KA ANATOLY MELNIK SI KỌỌ

Ọtụtụ ndị na-eji obi ụtọ akpọ m Papa Ukwu. Ọ na-emetụ m n’ahụ́ nke ukwuu ma a kpọọ m ya n’ihi na ọ na-echetara m papa ukwu m, bụ́ onye m hụrụ n’anya nke ukwuu nakwa onye m ji nnọọ ụgwọ ekele. Ka m kọọrọ gị banyere ya na otú ya na mama ukwu m si nwee mmetụta dị ukwuu ná ndụ ndị ezinụlọ anyị, nakwa nke ọtụtụ ndị ọzọ.

A MỤRỤ m n’obodo nta bụ́ Hlina, nke dị n’ebe ugwu nke ebe a maara taa dị ka Moldova. * N’afọ ndị 1920, ndị ozi na-ejegharị ejegharị, bụ́ ndị a maara dị ka ndị pilgrim, na-esi Romania abata n’ọmarịcha obodo anyị nke bụ́ ugwu ugwu. Nne na nna mama m egbughị oge n’ịnabata ozi ọma ahụ ha nụrụ e si na Bible kwusaara ha. N’afọ 1927, ha ghọrọ Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Ka ọ na-erule oge Agha Ụwa nke Abụọ malitere n’afọ 1939, e nweelarị ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’obodo nta anyị.

Na 1936, bụ́ afọ a mụrụ m, ndị ikwu m nile bụcha Ndịàmà Jehova, ọ gwụla nanị papa m, bụ́ onye ka na-aga Chọọchị Ọtọdọks. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ọ malitere iche echiche banyere nzube nke ndụ, n’ikpeazụkwa, ọ raara onwe ya nye Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, ma gosipụta nke a site n’ịbụ onye e mere baptizim ime mmiri. Papa ukwu m keere òkè dị ukwuu n’uto ime mmụọ nke ezinụlọ anyị. O nwere ịhụnanya siri ike maka Bible, burukwa ọtụtụ narị amaokwu ndị dị na ya n’isi. Ọ maara otú e si ewebata Bible ná mkparịta ụka ọ bụla.

Mgbe mgbe, ana m anọdụ n’apata ụkwụ papa ukwu m, na-ege ya ntị ka ọ na-akọ akụkọ Bible. Ọ kụnyere ịhụnanya maka Chineke n’obi m. Ana m ekele ya nke ukwuu maka nke ahụ! Mgbe m dị afọ asatọ, mụ na papa ukwu m so gaa ozi ọma mbụ m gara. Site n’iji Bible mee ihe, anyị gosiri ndị obodo anyị onye Jehova bụ na otú e si abịaru ya nso.

Ndị Ọchịchị Kọmunist Emekpọọ Anyị Ọnụ

N’afọ 1947, atụmatụ ndị Ọchịchị Kọmunist na Chọọchị Ọtọdọks mere ka ndị ọchịchị malite ịkpagbu Ndịàmà Jehova nọ na Moldova. Ndị ọrụ nke òtù e mesịrị kpọọ KGB, nakwa ndị uwe ojii obodo, na-abịa n’ụlọ anyị ma na-agwa anyị ka anyị kọọrọ ha ndị na-edu ndú n’ọrụ nkwusa anyị, ebe anyị na-esi enweta akwụkwọ, na ebe anyị na-ezukọ maka ofufe. Ha kwuru na ha gaje ịkwụsị ọrụ Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị ha kwuru na ha “na-egbochi ọganihu nke Ọchịchị Kọmunist ná mba a.”

Ka ọ na-erule n’oge a, papa m, bụ́ nwoke gụrụ akwụkwọ nke ọma, abịawokwa hụ eziokwu Bible n’anya nke ukwuu. Ma ya ma papa ukwu m maara otú e si azaghachi ndị na-agba ha ajụjụ ọnụ iji wee ghara ịrara ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst nye. Ha abụọ bụ ndị ikom nwere obi ike na ịhụnanya, bụ́ ndị hụrụ maka ọdịmma nke ndị kwere ekwe ibe ha. Dị ka ha, mama m na-ejide onwe ya aka mgbe nile, obi adịghịkwa amapụ ya.

N’afọ 1948, e jidere papa m ma kpụrụ ya pụọ. Ọ dịghị mgbe a gwara anyị ebubo ndị e boro ya. A mara ya ikpe ịga mkpọrọ afọ asaa n’ụlọ mkpọrọ nwere oké ihe nchebe, maakwa ya ikpe ịga ala ọzọ biri ruo afọ abụọ ọzọ. N’ikpeazụ, e zigara ya n’ógbè Magadan nke dị n’ebe mgbago mgbago nke ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Russia, ihe karịrị nnọọ kilomita 7,000 site n’ụlọ anyị. Anyị na ya ahụghị ruo afọ itoolu. O siiri m ike ịnọ n’enweghị nna, ma papa ukwu m bụụrụ m nnọọ onye enyemaka.

A Chụga Anyị Ala Ọzọ

N’abalị June 6, 1949, ndị soja abụọ na otu onye ọrụ gọọmenti wakporo ebe obibi anyị. Ha kwuru na anyị nwere nanị awa abụọ iji si n’ụlọ anyị pụta ma banye n’ime ụgbọala ha. Ọ dịghị nkọwa ọzọ ha nyere. Nanị ihe ha gwara anyị bụ na a na-akpọga anyị obodo ọzọ nakwa na anyị agaghị alọtakwa ọzọ. N’ihi ya, a kpọgara mụ na mama m, papa ukwu m, mama ukwu m, na ndị kwere ekwe ibe anyị ndị ọzọ, Siberia. Adị m nanị afọ 13. Ka izu ole na ole gasịrị, anyị hụrụ onwe anyị n’ala apịtị ndị dị n’etiti oké ọhịa ndị dịdewere ógbè arctic. Lee ka ebe a si dị iche n’obodo m, bụ́ nke m hụrụ n’anya nke ukwuu! Mgbe ụfọdụ anyị na-ebe ákwá. N’agbanyeghị nke ahụ, obi siri anyị ike na Jehova agaghị ahapụ anyị.

Obere ụlọ iri e ji osisi rụọ mejupụtara obodo nta a kpọgara anyị. A kpọgara Ndịàmà ndị ọzọ n’obodo nta dị iche iche dị n’ala apịtị ahụ. Iji yie ndị obodo ahụ egwu, nakwa iji mee ka ha kpọọ anyị asị, ndị ọchịchị gwara ha na Ndịàmà na-eri anụ mmadụ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ndị obodo ahụ bịara mata na nke a abụghị eziokwu nakwa na ọ dịghị ha mkpa ịtụwa anyị egwu.

N’ọnwa abụọ mbụ anyị rutesịrị, anyị biri n’otu ụlọ mkpuke ochie. Ma ọ dị mkpa na anyị ga-ewu ebe obibi katụ mma tupu oge oké oyi amalite. Papa ukwu m na mama ukwu m nyeere mụ na mama m aka ịrụta otu ụlọ dị nnọọ mfe, nke otu ọkara ya dị n’ime ala, ọkara ya nke ọzọ apụta n’elu. Anyị biri ebe ahụ ihe karịrị afọ atọ. E kweghị ka anyị si n’obodo nta ahụ pụọ n’ebughị ụzọ nata ikike, ọ dịghịkwanụ mgbe e nyere anyị ikike ime otú ahụ.

Ka oge na-aga, e kwere ka m gawa akwụkwọ. Ebe ọ bụ na nkwenkwe okpukpe m dị iche na nke ndị ọzọ nọ ebe ahụ, ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ ibe m na-ajụkarị m ajụjụ. Papa ukwu m na-enwe obi ụtọ mgbe m lọtara ma kọọrọ ya otú m si nwee ike ịkọwa ihe ndị anyị kweere.

Anyị Enwetụrụ Onwe Anyị

Mgbe onye ọchịchị aka ike ahụ bụ́ Stalin nwụsịrị n’afọ 1953, ndụ anyị bịara katụ mma. E kwere ka anyị na-esi n’obodo nta ahụ na-apụ. Nke a mere ka o kwe anyị omume iso ndị kwere ekwe ibe anyị na-akpakọrịta na ịga nzukọ n’obodo nta ndị a chụgara Ndịàmà ndị ọzọ. Iji zere ime ka ndị mmadụ mara ihe na-aganụ, anyị na-ezukọ n’ìgwè nta dị iche iche. Iji rute ebe ahụ, anyị na-eji ụkwụ gaa ihe ruru kilomita 30, mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ n’okporo ụzọ snow dị na ya na-eru anyị n’ikpere, nke ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi ya bụ minus 40 degree celsius. N’echi ya, anyị na-eji ụkwụ gaa ogologo ụzọ ahụ iji lọghachi n’ebe obibi anyị. Mgbe anyị na-aga n’ụzọ, anyị na-eri kukumba e ji mmanya gbara ụka chekwaa, na-arakwa mkpụrụ shuga ole na ole. N’agbanyeghị ihe ndị a, anyị na-enwe nnọọ ọṅụ dị ukwuu, dị ka Devid oge ochie!—Abụ Ọma 122:1.

N’afọ 1955, e mere m baptizim ná ngosipụta nke nrara m raara onwe m nye Jehova. Oge na-adịghị anya tupu mgbe ahụ, n’otu nzukọ ọgbakọ anyị nwere n’otu obodo nta dịdewere obodo anyị, ezutere m Lidiya, bụ́ nwa agbọghọ dị umeala n’obi nke nwere ntutu ojii. Dịkwa ka anyị, ya na ndị ezinụlọ ya bụ Ndịàmà e si Moldova chụpụ. O nwere ọmarịcha olu abụ, o bukwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ abụ 337 nile dị n’akwụkwọ abụ anyị ji eme ihe n’oge ahụ n’isi. Nke a masịrị m n’ihi na mụ onwe m jikwa abụ anyị kpọrọ oké ihe. N’afọ 1956, anyị kpebiri ịlụ.

Edegaara m papa m akwụkwọ ozi—anyị nụrụ na a kpọgawo ya Magadan—anyị wee yigharịa agbamakwụkwọ anyị ruo mgbe anyị natara ngọzi ya. Oge na-adịghị anya ka e mesịrị, a tọhapụrụ papa m, ọ bịakwara soro anyị biri n’ebe a chụgara anyị. Ọ kọọrọ anyị otú ya na Ndị Kraịst ibe ya, site n’enyemaka Chineke, si lanahụ ọnọdụ ndị dị egwu dị n’ogige ọrụ mmanye ahụ. Akụkọ ndị dị otú ahụ mere ka okwukwe anyị sikwuo ike.

N’oge na-adịghị anya mgbe papa m lọtasịrị, ka mama m nọ na-esi mmanụ anyị ga-eji mere ágbá e ji ete ụlọ na osisi, ihe ọghọm dị egwu mere. A maghị ka nnukwu ite o ji na-esi mmanụ ahụ si wee daa, mmanụ dị na ya wee wụọ ya n’ahụ́. Ọ nwụrụ n’ụlọ ọgwụ. Anyị ruru újú dị ukwuu. Mgbe e mesịrị, papa m kwụsịtụrụ iruru ya újú, ka oge na-agakwa, ọ lụrụ Tatyana, bụ́ Onyeàmà si n’obodo nta dịdebere nke anyị.

Ịgbasawanye Ozi Anyị

N’afọ 1958, mụ na Lidiya kwapụrụ na Kizak, bụ́ obodo nta ebe anyị bi, ma kwaga Lebyaie, bụ́ obodo nta ka nnọọ buo ibu nke dị ihe dị ka 100 kilomita site n’ebe anyị bi. Anyị agụtawo n’akwụkwọ na Ndị Kraịst nọ ná mba ndị ọzọ na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ya mere, anyị gbalịrị ime nke a n’ebe ọhụrụ a anyị kwagara. N’ezie, a machibidowo Ụlọ Nche na Teta! iwu, ma anyị na-enweta ndị e si n’ebe ndị ọzọ zobata. Ugbu a, a gwara anyị na anyị ga na-enweta magazin ndị ahụ nanị n’asụsụ Russian. Ruo mgbe ahụ, anyị anatawokwa magazin ndị ahụ n’asụsụ Moldavian. N’ihi ya, anyị mụsiwere asụsụ Russian ike iji mụta ya nke ọma karị. Ọbụna ruo taa, aka m na-echeta, ọ bụghị nanị isiokwu ndị ahụ kamakwa, ụfọdụ n’ime ihe ndị e kwuru na ha.

Iji na-akwado onwe anyị, Lidiya rụrụ ọrụ n’ebe a na-echekwa ihe ọkụkụ, mụ onwe m rụkwara ọrụ ibutu osisi n’ụgbọala. Ọrụ ahụ na-agwụ ike, ego a na-akwụkwa na ya dị nnọọ nta. Ọ bụ ezie na e ji Ndịàmà kpọrọ ihe dị ka ndị na-arụsi ọrụ ike, a dịghị enye anyị ego enyemaka ma ọ bụ ego mmiri oyi. Ndị ọrụ gọọmenti kwuru n’ezoghị ọnụ, sị: “Ndịàmà Jehova enweghị ọnọdụ ná mba ndị Kọmunist na-achị.” N’agbanyeghị nke ahụ, anyị ṅụrịrị ọṅụ na ihe Jizọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya bụ eziokwu n’ọnọdụ anyị: “Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.”—Jọn 17:16.

Ihe Ịma Aka Ndị Ọhụrụ

N’afọ 1959, a mụrụ nwa anyị nwanyị bụ́ Valentina. Oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, mkpagbu ọhụrụ kpụ ọkụ n’ọnụ malitere. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Praịm Minista Nikita Khrushchev malitere otu atụmatụ ọhụrụ megide okpukpe n’afọ 1959-1964.” Ndị ọrụ nchebe nke mba ahụ gwara anyị na ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Soviet setịpụrụ bụ ịhụ na ha kpochapụrụ okpukpe nile, karịsịa Ndịàmà Jehova.

Mgbe ọ fọrọ nke nta ka Valentina gbaa otu afọ, a kpọrọ m ịbanye n’òtù ndị agha. Mgbe m na-agaghị, a mara m ikpe ịga mkpọrọ afọ ise maka ịnọgide na-anọpụ iche. N’otu oge, mgbe Lidiya bịara ileta m, otu onye agha KGB nke nọ n’ọkwá colonel gwara ya, sị: “Anyị enwetawo akwụkwọ n’aka gọọmenti Russia nke na-ekwu na n’ime afọ abụọ, ọ dịghị otu n’ime Ndịàmà Jehova ga-afọdụ na Soviet Union.” Mgbe ahụ, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Ị ghaghị ịgọnahụ okwukwe gị, ma ọ́ bụghị ya, a ga-atụ gị mkpọrọ.” Onye agha ahụ chere na iyi egwu dị otú ahụ ga-eme ka ndị inyom kwụsị ikwupụta okwukwe ha, na-ekwu, sị: “Ha bụ ìgwè na-adịghị ike.”

N’ime ntakịrị oge, a tụọla ihe ka ọtụtụ ná ndị nwoke bụ́ Ndịàmà mkpọrọ n’ogige ọrụ mmanye. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị inyom Ndị Kraịst nwere obi ike nọgidere na-arụ ọrụ nkwusa ahụ. Ha tinyekwara ndụ ha n’oké ihe ize ndụ iji na-ezobatara ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ na ogige ọrụ mmanye akwụkwọ. Lidiya chekwara ule ndị dị otú ahụ ihu, mgbe mgbe kwa, ụmụ nwoke na-achụ ya iji mete ya enyi n’ihi ọnụnọ m na-anọghị ya. Tụkwasị na nke ahụ, a gwara ya na a gajeghị ịtọhapụ m ma ọlị. Ma a tọhapụrụ m!

Ịtọhapụ M na Ịkwaga Kazakhstan

E weliteghachiri ikpe m n’afọ 1963, e mesịkwara tọhapụ m—mgbe m nọsịrị afọ atọ n’ụlọ mkpọrọ. Ma ọ dịghị ebe anyị nwetaliri akwụkwọ ikike maka ebe obibi, n’ihi ya, enwetalighị m ọrụ. Otu n’ime iwu nke mba ahụ kwuru, sị: “Ma i nwetaghị akwụkwọ ikike ịnọgide na-ebi na mba a, ị gaghị enweta ọrụ.” Anyị rịọsiri Jehova arịrịọ ike n’ekpere maka enyemaka. Mgbe ahụ, anyị kpebiri ịkwaga Petropavl, n’ebe ugwu Kazakhstan. Otú ọ dị, ndị ọchịchị obodo ahụ anụlarị banyere anyị, ha ekweghịkwa ka anyị biri ma ọ bụ rụọ ọrụ n’ebe ahụ. Ihe dị ka Ndịàmà 50 bi n’obodo a nwetara mkpagbu yiri nke ahụ.

Anyị na di na nwunye ọzọ bụ́ Ndịàmà kwagara n’ebe ndịda n’otu obodo nta bụ́ Shchuchinsk. Ọ dịghị Ndịàmà ọzọ bi ebe ahụ, ndị ọchịchị amaghịkwa ihe ọ bụla banyere ọrụ nkwusa anyị. Ruo otu izu, mụ na Ivan—ndị di abụọ ahụ—nọ na-achọ ọrụ, ebe ndị nwunye anyị na-anọ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, bụ́ ebe anyị na-ehi n’abalị. N’ikpeazụ, anyị chọtara ọrụ n’ụlọ ọrụ na-emepụta ugegbe. Anyị nwetara otu ọnụ ụlọ nwere ike ịba ihe ndina abụọ na obere ihe ndị ọzọ maka ndị ezinụlọ anyị, n’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere afọ ojuju.

Mụ na Ivan tinyere onwe anyị n’ọrụ anyị, ndị anyị na-arụrụ ọrụ nwekwara nnọọ obi ụtọ. Ka ọ na-erule oge a kpọrọ m ọzọ ịga agha, manịja ụlọ ọrụ ahụ amatawo na akọ na uche m nke e ji Bible zụọ agaghị ekwe m ịga nara ọzụzụ ije agha. N’ụzọ tụrụ anyị n’anya, ọ gakwuuru onyeisi ndị agha ma gwa ya na mụ na Ivan bụ ndị maara ọrụ nke ọma nakwa na ụlọ ọrụ ahụ ga-ada ma anyị pụọ. N’ihi ya, e kwere ka anyị nọrọ.

Ịzụlite Ụmụ na Ijere Ndị Ọzọ Ozi

A mụrụ nwa anyị nwanyị nke abụọ bụ́ Lilya, n’afọ 1966. Otu afọ ka e mesịrị, anyị kwagara Belyye Vody, nke dị n’ebe ndịda Kazakhstan, na nso ókè ya na Uzbekistan, bụ́ ebe e nwere otu obere ìgwè Ndịàmà. N’oge na-adịghị anya, e guzobere ọgbakọ n’ebe ahụ, a họpụtakwara m ịbụ onyeisi oche ndị nlekọta. N’afọ 1969, anyị mụrụ nwa anyị nwoke, bụ́ Oleg, afọ abụọ ka e mesịkwara, anyị amụọ nwa ikpeazụ anyị, bụ́ Natasha. Ọ dịghị mgbe mụ na Lidiya chefuru na ụmụ bụ ihe nketa nke si n’aka Jehova bịa. (Abụ Ọma 127:3) Anyị kwurịtara ihe ndị ọ dị mkpa ka anyị mee iji zụlite ha ịhụ Jehova n’anya.

Ọbụna ruo n’afọ ndị 1970, ihe ka ọtụtụ ná ndị ikom bụ́ Ndịàmà ka nọ n’ogige ọrụ mmanye. Ọtụtụ ọgbakọ nwere mkpa maka nduzi na nlekọta bụ́ ịgba. Ya mere, ka Lidiya na-ekere òkè ka ukwuu n’inye ụmụ anyị ọzụzụ, mgbe ụfọdụ, na-arụ ma ọrụ nne ma ọrụ nna, anọ m na-eje ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Eletara m ọgbakọ ndị dị na Kazakhstan, tinyere mba ndị dịdewere ya bụ́ Tajikistan, Turkmenistan, na Uzbekistan, bụ́ ndị nọcha n’okpuru ọchịchị Soviet. N’otu oge ahụ, anọkwa m na-arụ ọrụ iji na-akpa afọ ezinụlọ m, Lidiya na ụmụ anyị jikwa obi ha kwado m.

Ọ bụ ezie na anaghị m anọ ya ruo ọtụtụ izu, agbalịrị m igosi ụmụ m ịhụnanya dị ka nna, nyekwa aka n’ịzụlite ha n’ụzọ ime mmụọ. Mụ na Lidiya kpekọrọ ekpere ọnụ, rịọsie Jehova ike ka o nyere ụmụ anyị aka, anyị sokwa ha kwurịta otú ha ga-esi merie egwu mmadụ ma soro Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya. E wezụga nkwado achọghị ọdịmma onwe onye nanị nke nwunye m m hụrụ n’anya nyere m, agaraghị m enwe ike ịrụ ọrụ m dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Lidiya na ụmụnna nwanyị ndị ọzọ abụghị “ìgwè na-adịghị ike” dị ka onye agha ahụ kwuru na ha bụ. Ha gbasiri ike—ha bụ ndị dike ime mmụọ n’ezie!—Ndị Filipaị 4:13.

N’afọ 1988, mgbe ụmụaka m nile toliteworo, a họpụtara m dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị oge nile. Sekit m na-eje ozi na-agụnye ihe ka ọtụtụ n’obodo ndị dị n’Ebe Etiti Eshia. Ka iwu kwadosịrị ọrụ nkwusa Ndịàmà Jehova n’ebe bụbu Soviet Union n’afọ 1991, ndị ikom ndị ọzọ tozuru okè malitere ije ozi ná mba Eshia ndị so n’ebe bụbu Soviet Union. Taa, e nwere ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị 14 na-eje ozi ná mba ndị a, bụ́ ebe ihe karịrị mmadụ 50,000 gara ememe Ncheta Ọnwụ Kraịst n’afọ gara aga!

Òkù A Na-atụghị Anya Ya

Ná mmalite afọ 1998, anatara m ozi m na-atụghị anya ya na fon site n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Russia. “Anatoly, gị na Lidiya ùnu echeela echiche banyere ije ozi oge nile?” ka a jụrụ m. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị echetụla banyere ihe ùgwù dị otú ahụ maka ụmụ anyị. N’ezie, nwa anyị nwoke, bụ́ Oleg, anọwo na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Russia ruo ihe dị ka afọ ise.

Mgbe m gwara Lidiya banyere òkù ahụ a kpọrọ anyị, ọ jụrụ, sị: “Gịnịkwanụ banyere ụlọ anyị, ubi anyị, na ihe onwunwe anyị?” Mgbe anyị kpesịrị ekpere ma kwurịta ya, anyị kpebiri iwepụta onwe anyị. Ka e mesịrị, a kpọrọ anyị òkù ịbịa jee ozi n’alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị n’Issyk, Kazakhstan, na nso obodo ukwu bụ́ Alma-Ata. N’ebe a, a na-asụgharị akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible gaa n’asụsụ ndị a na-asụ n’ógbè ahụ nile.

Ezinụlọ Anyị Taa

Lee ekele anyị na-enwe n’ebe Chineke nọ maka enyemaka ya n’ịkụziri ụmụ anyị eziokwu Bible! Nwa anyị nwanyị nke kasị okenye bụ́, Valentina, alụwo di, ya na di ya kwagakwara Ingelheim, Germany, n’afọ 1993. Ha nwere ụmụ atọ, ndị bụ́cha Ndịàmà Jehova e mere baptizim.

Lilya, bụ́ nwa anyị nwanyị nke abụọ, nwekwara ezinụlọ nke ya. Ya na di ya, bụ́ okenye n’ọgbakọ Belyye Vody, na-azụ ụmụ ha abụọ ịhụ Chineke n’anya. Oleg lụrụ Natasha, bụ́ nwanna nwanyị bụ́ Onye Kraịst nke si Moscow, ha abụọ na-ejekwa ozi n’alaka ụlọ ọrụ Russia bụ́ nke dị nso na St. Petersburg. N’afọ 1995, nwa anyị nwanyị nke ikpeazụ, bụ́ Natasha, lụrụ di, ya na di ya na-ejekwa ozi n’otu ọgbakọ ji asụsụ Russian amụ ihe na Germany.

Site n’oge ruo n’oge, ezinụlọ anyị nile na-ezukọta maka nnọkọ ezinụlọ. Ụmụ anyị na-akọrọ ụmụ ha otú “Mama” na “Papa” si gee Jehova ntị ma zụlite ụmụ ha ịhụ ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, n’anya na ijere ya ozi. Apụrụ m ịhụ na mkparịta ụka ndị a na-enyere ụmụ ụmụ anyị aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ. Nwa nwa anyị nke ikpeazụ yiri m mgbe m ha ka ya. Mgbe ụfọdụ, ọ na-anọdụ n’apata ụkwụ m ma rịọ m ka m kọọrọ ya akụkọ Bible. Anya mmiri na-eju m anya mgbe m ji obi ụtọ cheta otú m na-esikarị anọdụ n’apata ụkwụ papa ukwu m na otú o si nyere m aka ịhụ Onye Okike Ukwu anyị n’anya na ijere ya ozi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Anyị ga-eji Moldova, bụ́ aha e ji mara obodo a ugbu a mee ihe n’isiokwu a kama iji aha ndị mbụ ya bụ́ Moldavia ma ọ bụ Soviet Republic of Moldavia.

[Foto dị na peeji nke 21]

Ka mụ na nne na nna m nọ n’ihu ụlọ anyị na Moldova, obere oge tupu papa m agawa mkpọrọ

[Foto dị na peeji nke 22]

Mụ na Lidiya n’afọ 1959, mgbe anyị ka nọ n’ebe a chụgara anyị

[Foto dị na peeji nke 23]

Lidiya na nwa anyị nwanyị bụ́ Valentina mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ

[Foto dị na peeji nke 25]

Anyị na ụmụ anyị na ụmụ ụmụ anyị, anyị nile na-ejere Jehova ozi!

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na Lidiya taa