Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Pụrụ Ịkasi Ndị Na-eru Újú Obi

Ha Pụrụ Ịkasi Ndị Na-eru Újú Obi

Ha Pụrụ Ịkasi Ndị Na-eru Újú Obi

Otu nwanyị nọ na Jalisco, Mexico, degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico akwụkwọ ozi. Ọ rịọrọ, sị: “Biko ziterenụ m ọnụ ọgụgụ buru ibu nke broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. Abụghị m otu n’ime Ndịàmà Jehova, ma ekweere m ọtụtụ n’ime ihe ndị unu na-ekwu.”

Ọ kọwara ihe mere o ji rịọ arịrịọ ahụ, na-asị: “Achọrọ m broshuọ a n’ihi na echere m na ọ ga-adị mma inye ya ụfọdụ n’ime ndị na-abịa azụrụ okooko osisi n’ụlọ ahịa anyị. Ndị m na-ekwu banyere ha bụ ndị na-abịa azụrụ okooko osisi ndị a na-edebe n’elu ili, mgbe ụfọdụ, ha na-abụ nwunye, ụmụ, ma ọ bụ di nke onye ahụ nwụrụ anwụ. Echere m na broshuọ a pụrụ inyere ha aka nke ukwuu.”

Ikekwe gị onwe gị ma ọ bụ onye ị maara ga-enwetakwa nkasi obi site n’ịgụ broshuọ a dị peeji 32. Ọ zara ajụjụ ndị dị ka: Olee otú m pụrụ isi nagide iru újú m? Olee otú ndị ọzọ pụrụ isi nye aka? È nwere olileanya dịnụ maka ndị nwụrụ anwụ?

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu broshuọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.