Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ibu Oké Ibu Ọ̀ Bụ Nsogbu n’Ezie?

Ibu Oké Ibu Ọ̀ Bụ Nsogbu n’Ezie?

Ibu Oké Ibu Ọ̀ Bụ Nsogbu n’Ezie?

“Oké ibu ndị nọ n’oge uto na-ebu dị nnọọ ka ọrịa na-efe efe.”—S. K. Wangnoo, bụ́ ọkachamara banyere mmiri ọgwụ ahụ́ n’Ụlọ Ọgwụ Indraprastha Apollo, Delhi, India.

DỊ KA ihe ahụ e kwuru n’elu na-egosi, ọtụtụ ezinụlọ ndị na-abachaghị ọgaranya n’India na-ebizi ụdị ndụ na-eme ka ndị dị afọ iri na ụma na-ebu oké ibu. Nsogbu a aghọwo ihe na-agbasa agbasa n’ọtụtụ mba ka ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ụmụ mmadụ na-adịchaghịzi emega ahụ́ ma bụrụ ndị nri ratụ ratụ ririla ahụ́. Otu ọkachamara n’ịgwọ ndị nọ n’oge uto kwuru, sị: “Ọgbọ ọzọ a ga-enwe [na Britain] ga-abụ . . . ndị ga-akasị ibu n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ Guardian Weekly kọrọ, sị: “Oké ibu bụbu, n’ụzọ bụ́ isi, nsogbu nke ndị okenye. Ugbu a, ndị Britain nwere ndị ntorobịa bụ́ ndị ụzọ ha si eri nri na ọnụnọ ha na-anọkarị otu ebe na-eduba ná nsogbu ndị e bu ụzọ hụ na United States. Ibu oké ibu ruo ogologo oge ga-eme ka ha bụrụ ndị nwere ike ịda ọrịa ndị dị ka ọrịa shuga, ọrịa obi, na ọrịa cancer.”

Ndị dere akwụkwọ bụ́ Food Fight na-ekwu, sị: “Iribiga nri na ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ ókè anọchiela erighị nri ndị na-edozi ahụ́ dị ka nsogbu kasịnụ a na-enwe ná nri n’ụwa.” Don Peck dere na magazin bụ́ The Atlantic Monthly, sị: “Ihe dị ka nde itoolu nke ndị America ‘buru ajọ ibu’ ugbu a, nke pụtara na ha ji ihe dị ka kilogram 45 ma ọ bụ karịa, bufee ibu ókè.” Ọrịa ndị ibu ibu na-akpata na-eme ka ihe dị ka mmadụ 300,000 na-anwụchu ọnwụ kwa afọ ná mba ahụ, ọ “ka ihe ọ bụla ọzọ, ma e wezụga ise siga,” egbu mmadụ. Peck kwubiri, sị: “N’oge na-adịghị anya, oké ibu pụrụ ịka ma agụụ ma ọrịa na-efe efe bụrụ nsogbu ahụ́ ike kasị akpa ọha na eze aka ọjọọ.” N’ihi ya, ọ̀ dị onye ga-achọ ka e leghara egwu oké ibu na-eyi anya? Dr. Walter C. Willett dere n’akwụkwọ bụ́ Eat, Drink, and Be Healthy na “e wezụga ise siga, ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ gị bụ ihe ga-akasị ekpebi ọnọdụ ahụ́ ike gị n’ọdịnihu.” Isi ihe e kwuru ebe a bụ ọnọdụ ahụ́ ike gị n’ọdịnihu.

Olee Otú I Si Akọwa Oké Ibu?

Olee mgbe a na-ewere na mmadụ buru oké ibu, n’abụghị nanị na o buru ibu? Ụlọ Ọgwụ Mayo nke dị na Rochester, Minnesota, U.S.A., na-ekwu, sị: “N’ụzọ bụ́ isi, ibu oké ibu bụ ibubiga ibu ókè n’ihi abụba ịkarị akarị n’ahụ́.” Ma olee otú ị ga-esi ama ma mmadụ o buru ibu? Chaatị ndị na-eji ogo mmadụ atụnyere ịdị arọ ya pụrụ inyere mmadụ aka ịmata ma ọ̀ bụ ibu nkịtị ka o buru ka ibu ya ọ̀ gafeela ókè. (Lee chaatị dị na peeji nke 5.) Otú ọ dị, chaatị ndị a adịghị egosi ọdịiche ndị e nwere n’ihe ndị mejupụtara ahụ́ mmadụ. Ụlọ Ọgwụ Mayo na-ekwu, sị: “Ihe ka egosi ọnọdụ ahụ́ ike mmadụ bụ abụba dị ya n’ahụ́, ọ bụghị ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ ya.” Dị ka ihe atụ, o yiri ka onye na-eme egwuregwu ọ̀ ga-adị arọ karịa onye na-adịghị eme egwuregwu n’ihi otú uru ahụ́ ya haruru ma ọ bụ n’ihi otú ọkpụkpụ ya bururu n’ibu. Olee ihe ndị bụ́ isi na-akpata ibu ibu ma ọ bụ ibu oké ibu? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ahụ.