Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mkpa Ọ Dị Inye Nwa Gị Ọzụzụ

Mkpa Ọ Dị Inye Nwa Gị Ọzụzụ

Mkpa Ọ Dị Inye Nwa Gị Ọzụzụ

IHE mmadụ mụtara ma ọ bụ ghara ịmụta mgbe ọ dị obere pụrụ imetụta ihe ndị ọ ga-emeli n’ọdịnihu. N’ihi ya, gịnị dị ụmụaka mkpa inweta n’aka nne na nna ha iji nwee ike ito ghọọ ndị okenye kwụsiri ike, ndị na-enwekwa ihe ịga nke ọma? Tụlee ihe ụfọdụ ndị kwubiworo dabere ná nnyocha ndị e mere n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya.

Ọrụ Njikọ nke Akwara Ozi Na-arụ

Ọganihu e nwere na nkà na ụzụ nke ise ụbụrụ foto na-emezi ka ndị ọkà mmụta sayensị nwee ike ịchọpụtakwu otú ụbụrụ si eto karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ihe ọmụmụ ndị dị otú ahụ na-egosi na oge mmadụ dị obere bụ oge dị oké mkpa ịzụlite ụbụrụ iji nwee ike iji ihe ọmụma ndị e nwetara mee ihe, igosipụta mmetụta otú kwesịrịnụ, na ịsụ asụsụ nke ọma. “Njikọ nke akwara ozi ndị dị n’ụbụrụ na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu mgbe a dị obere ka njikọ mkpụrụ ndụ ihe nketa na ihe ndị na-eme gburugburu ebe obibi na-enwe mgbe nile na-akpụzi ọdịdị nke ụbụrụ,” ka magazin bụ́ Nation na-ekwu.

Ndị ọkà mmụta sayensị kweere na ihe ka ukwuu ná njikọ ndị a a na-enwe n’akwara ozi na-amalite n’afọ ole na ole mbụ nke ndụ. Nke a bụ oge “ụbụrụ nwata na-atọ ntọala maka ụdị ọgụgụ isi nwa ahụ ga-enwe, otú ọ ga-esi na-ele onwe ya anya, otú ọ ga-esi na-atụkwasị obi n’ihe, na mkpali ọ ga na-enwe banyere ịmụ ihe,” ka Dr. T. Berry Brazelton, bụ́ ọkachamara n’ọzụzụ ụmụaka kwuru.

N’ime afọ ole na ole mbụ ya, ụbụrụ nwata na-eto n’ụzọ dị egwu ma a bịa n’ọdịdị, ibu, nakwa n’ịrụ ọrụ. N’ebe e nwere ọtụtụ ihe na-akpali mmadụ ime ihe nakwa ihe ndị a na-amụ amụ, njikọ nke akwara ozi na-amụbawanye, na-eme ka e nwee ọtụtụ akwara ozi n’ụbụrụ. Akwara ozi ndị a na-eme ka iche echiche, ịmụta ihe, na ịtụgharị uche kwe omume.

Ọ pụrụ ịbụ na ka a na-akpalikwu ụbụrụ nwata ime ihe, otú ahụ ka a na-atụtekwu akwara ozi dị n’ụbụrụ ya, otú ahụkwa ka ha na-enwekwu njikọ. N’ụzọ na-akpali mmasị, mkpali a adịghị abịa nanị site n’inweta ihe ọmụma, n’ịma ọnụ ọgụgụ, ma ọ bụ n’ịmụta asụsụ. Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo na ọ dịkwa mkpa ịkpali mmetụta uche. Nnyocha e mere na-egosi na ụmụaka ndị a na-adịghị eku ma na-emetụ aka, ndị a na-adịghịkwa eso egwuri egwu ma ọ bụ ndị a na-adịghị akpali mmetụta uche ha, agaghị enweru akwara ozi ndị a otú ha gaara enweru ha.

Ọzụzụ na Ihe Nwata Pụrụ Ime

N’ikpeazụ, ka ụmụaka na-etolite, ahụ́ ha na-ewepụsị ihe ụfọdụ. O yiri ka ahụ́ ha ọ̀ na-ewepụsị njikọ akwara ozi ndị ọ pụrụ ịbụ na ha adịghị mkpa. Nke a pụrụ imetụta ihe nwata pụrụ ime n’ụzọ dị ukwuu. “Ọ bụrụ na nwata enwetaghị ụdị ihe mkpali kwesịrị ekwesị n’oge,” ka onye na-enyocha ụbụrụ bụ́ Max Cynader na-ekwu, “mgbe ahụ, akwara ozi ụbụrụ ya agaghị eto otú kwesịrịnụ.” Dị ka Dr. J. Fraser Mustard, si kwuo, ọ pụrụ ime ka nwata nwee ụbụrụ ọkụkọ, ghara inwecha nkà n’ikwu okwu na n’ime mgbakọ na mwepụ, nwee nsogbu ahụ́ ike mgbe o mere okenye, na ọbụna nsogbu n’akparamàgwà.

Ya mere, o yiri ka ahụmahụ mmadụ nwere mgbe ọ dị obere ọ̀ pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’ebe ọ nọ mgbe o mere okenye. Ahụmahụ mmadụ nwere mgbe ọ dị obere pụrụ ikpebi ma ọ̀ ga-agbasi ike ma ọ bụ ghara ịgbasi ike, ma ọ̀ ga-amụta iche echiche nke ọma ma ọ bụ na ọ ga-agaghị amụta, ma ọ̀ ga-abụ onye na-egosi mmetụta ọmịiko ma ọ bụ na ọ gaghị abụ. N’ihi ya, òkè ndị nne na nna na-ekere na nke a dị oké mkpa karịsịa. “Otu n’ime ihe ndị kasị mkpa n’ime ka nwata nweta ahụmahụ a mgbe ọ dị obere,” ka otu ọkà n’ọrịa ụmụaka na-ekwu, “bụ inwe nne ma ọ bụ nna na-aghọta ihe nke ọma.”

Nke ahụ pụrụ ịda nnọọ ka ihe dị mfe. Nye ụmụ gị ọzụzụ ma lekọta ha anya, ha ga-eto nke ọma. N’ụzọ dị mwute, ndị nne na nna maara na ịghọta otú a pụrụ isi lekọta ụmụ anya anaghị adị nnọọ mfe mgbe nile. Ịzụ ụmụaka nke ọma abụchaghị ihe e bu pụta ụwa.

Dị ka otu nnyocha e mere na-egosi, pasent 25 nke ndị nne na nna a gbara ajụjụ ọnụ amaghị na otú ha si lekọta nwa ha pụrụ ime ma ọ bụ ghara ime ka ụbụrụ na-aghọ ya nkọ, ka o nwee obi ike, nakwa ka o nwee mmasị n’ịmụ ihe. Nke a na-akpali ajụjụ bụ́: Olee ụzọ kasị mma ị ga-esi zụlite ikike nwa gị nwere ime ihe ndị ọ pụrụ ime? Oleekwa otú ị pụrụ isi mee ka e nwee ọnọdụ dị mma maka nke ahụ? Ka anyị hụ.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ụmụ ọhụrụ ndị a hapụrụ n’enweghị ihe na-akpali uche ha ime ihe, nwere ike ghara ito nke ọma ka ndị ọzọ