Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oké Ibu—Gịnị Bụ Ngwọta Ya?

Oké Ibu—Gịnị Bụ Ngwọta Ya?

Oké Ibu—Gịnị Bụ Ngwọta Ya?

TETA! gbara Diane, bụ́ ọkà n’ihe oriri na-edozi ahụ́, na Ellen, bụ́ nọọsụ e nyere ọzụzụ nke ọma, ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị ghọcharala ọkachamara n’iso ndị buru ibu na ndị buru oké ibu na-arụkọ ọrụ. Ha kweere na ịkwụsị iri nri ndị na-enye carbohydrate ma na-eriwanye nri ndị na-enye protein (anụ), pụrụ ime ka mmadụ felata. Otú ọ dị, ha na-ekwu na, ka oge na-aga, ọ pụrụ inwe mmetụta dị njọ n’ahụ́ onye ahụ. * E mere ka nke a pụta ìhè n’otu chaatị nkà ọgwụ na ahụ́ ike nke a kpọrọ, Ịnọgide Na-enwe Ọ̀tụ̀tụ̀ Ịdị Arọ nke Ga-eme Ka I Nwee Ezi Ahụ́ Ike. Ọ na-ekwu, sị: “Iri nri ndị na-adịchaghị enye carbohydrate mgbe nile pụrụ ịdị ize ndụ, karịsịa ma ọ bụrụ na a na-eri ha n’anataghị ntụzi n’aka dọkịta.” Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “E mere [ha] iji mee ka mmadụ felata ngwa ngwa site n’ime ka ketone (ihe a na-enweta mgbe abụba gbariri n’ahụ́) dị onye ahụ n’ahụ́ mụbaa nke ukwuu n’ụzọ na-adịghị mma.” Ọ bụrụ na ị na-atụle ma ị̀ ga-amalite iriwe nri ndị na-adịchaghị enye carbohydrate, jide n’aka na i bu ụzọ kpọtụrụ dọkịta gị.

Ọ bụrụ na ihe mgbaru ọsọ gị bụ ifelata, obi ekoropụla gị. “Ịchịkwa ibu gị abụghị ihe na-agaghị ekwe omume, ọ dịghịkwa apụta na ị gakwaghị eri nri ma ọ bụkwanụ na ị ga na-eri otu ụdị nri ga-agbụ gị agbụ,” ka Dr. Walter C. Willett na-ekwu. “Site n’ime mgbalị siri ike na ịdị nkọ, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịchịkwa ibu ha ruo ogologo oge site n’ịdị na-eri nri ndị na-atọ ha ụtọ, bụ́kwa ndị kwesịrị ekwesị nakwa site n’ịdị na-emega ahụ́ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị. N’ezie, ogologo ndụ na ahụ́ isi ike ruru mgbalị e meere ha.” *—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.

Ókè Ha Aṅaa Ka Mmega Ahụ́ Dịruru ná Mkpa?

Dr. Willett na-ekwu, sị: “E wezụga eseghị siga, mmega ahụ́ bụ ihe ọzọ kasị mma ị pụrụ ime iji na-enwe ma ọ bụ iji nọgide na-enwe ezi ahụ́ ike ma zere ọrịa ndị na-adịghị ala ala.” Ruo ókè ha aṅaa ka mmadụ kwesịrị ịdị na-emega ahụ́? Olee uru ndị a na-erite ná mmega ahụ́?

Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na imega ahụ́ kwa ụbọchị, ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị ruo minit 30, pụrụ ịba nnọọ uru. Ma a tụrụ aro na ọbụna imega ahụ́ ugboro atọ n’izu pụrụ inyere mmadụ aka izere nsogbu ndị siri ike n’ọdịnihu. Mmega ahụ́ na-agbari calorie, ajụjụ bụ́kwa isi onye na-agbalị ifelata kwesịrị ịjụ bụ, Calorie na-apụ m n’ahụ́ kwa ụbọchị ọ̀ karịrị nke na-abata m n’ahụ́? Ọ bụrụ na nke na-abata gị n’ahụ́ karịrị nke na-apụ gị n’ahụ́, mara na ị ga-eburịrị ibu. Ya mere, jiri ụkwụ na-aga ma ọ bụ na-agba ígwè kama ịdị na-eji ụgbọala. Jiri ụkwụ na-arị steepụ kama ịdị na-eji ígwè mbugo. Na-emega ahụ́! Na-agbari calorie dị gị n’ahụ́!

Dr. Willett na-akọwa, sị: “Nye ọtụtụ ndị, ịga ije bụ ụzọ magburu onwe ya ha na-ahọrọ isi na-emega ahụ́ n’ihi na a dịghị eji ngwá ọrụ ọ bụla pụrụ iche eme ya, a pụrụ ime ya mgbe ọ bụla nakwa n’ebe ọ bụla, ọ dịghịkwa akpata mmerụ ahụ́.” N’ezie, ụdị ije ọ na-adụ ọdụ ka a na-aga bụ ịgasi ije ike, ọ bụghị ịtụsara nnọọ ahụ́ na-aga. Ọ na-atụ aro iji minit 30 na-emega ahụ́ kwa ụbọchị ma ọ bụrụ na o kwe mee.

Ịwa Ahụ́ Ọ̀ Bụ Ihe Ngwọta Kasị Mma?

Iji felata na iji gbochie ibu oké ibu n’ọdịnihu, ụfọdụ ndị buru ajọ ibu agbasowo ndụmọdụ nke ndị ọkachamara n’ibu oké ibu, bụ́ ndị na-atụ aro ụzọ dịgasị iche iche a pụrụ isi waa mmadụ ahụ́. Olee ndị pụrụ iru eru maka ụdị ịwa ahụ́ a? Ndị dere akwụkwọ bụ́ Mayo Clinic on Healthy Weight na-ekwu ihe na-esonụ, sị: “Dọkịta gị pụrụ ịchọ ịwa gị ahụ́ ma ọ bụrụ na ọ̀tụ̀tụ̀ BMI gị gafere 40, bụ́ ihe na-egosi na i buru ajọ ibu.” (Lee chaatị dị na peeji nke 5.) Akwụkwọ bụ́ Mayo Clinic Health Letter na-ekwu, sị: “N’ozuzu, ndị a na-atụ aro ka a waa ahụ́ n’ihi ibu oké ibu bụ nanị ndị nọ n’agbata afọ 18 na afọ 65, bụ́ ndị ọ̀tụ̀tụ̀ BMI ha gafere 40, ndị oké ibu ha na-akpatakwara ajọ nsogbu ahụ́ ike.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.

Olee ụfọdụ n’ime usoro ịwa ahụ́ ndị a? Ha bụ ahụ́ a na-awa iji gbubilata eriri afọ nke obere na ndị nke a na-awa iji mee ka akpa afọ dịkwuo obere. N’otu n’ime ndị nke a na-awa iji mee ka akpa afọ dịkwuo obere, ihe a na-eme bụ ịdụchi ebe elu nke akpa afọ, hapụ obere oghere nke nri ga-aba na ya ga-abụ nanị ihe dị ka gram 15. A na-egbubiri eriri afọ nke obere ma jikọtazie ya na obere oghere ahụ. N’ụzọ dị otú a, a na-eme ka nri ghara iru n’akụkụ ka ukwuu nke akpa afọ nakwa n’ebe mbido nke eriri afọ nke obere.

Gịnịkwanụ banyere ndị felataworonụ? Ò ruru mgbalị ha meere ya?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Ha na-agụnye mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ iron ịkarị akarị n’ọbara, nsogbu akụrụ, na nsị isi ike ọnyụnyụ.

^ par. 3 Ndị Kraịst raara onwe ha nye bụ́ ndị chọrọ iji ndụ ha mee ihe n’ụzọ a na-anara nke ọma n’ozi dị nsọ nke Chineke, nwere ihe ka ukwuu mere ha ga-eji felata ma nwee ezi ahụ́ ike. Kama ịnwụchu ọnwụ, ha pụrụ n’ụzọ dị otú ahụ, ibikwu ndụ bara uru ruo ọtụtụ afọ n’ozi Chineke.—Ndị Rom 12:1.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ụzọ A Tụrụ Aro Isi Na-eri Nri Iji Nwee Ezi Ahụ́ Ike

Swiiti Ụdị ya dịgasị iche iche

(arala ha mgbe nile; ọ̀tụ̀tụ̀ “calorie” ya

agafela 75 maka otu ụbọchị)

Abụba Mmanụ oliv, akị, mmanụ canola, ube

Bekee (ugboro nri 3-5 kwa ụbọchị, otu ugboro

nri bụ otu ngaji mmanụ ma ọ bụ ngaji akị abụọ)

Protein na Mmiri Ara Ehi Àgwà, azụ̀, anụ na-enweghị

abụba, àkwá, mmiri ara ehi na-adịchaghị enye abụba,

cheese (ugboro nri 3-7 kwa ụbọchị; otu ugboro nri bụ

gram 90 nke anụ ma ọ bụ azụ̀ e siri esi)

Carbohydrates Karịsịa mkpụrụ akụ́kụ́, nri ndị dị ka

macaroni, bred, osikapa, ọka (ugboro nri 4-8 kwa ụbọchị;

otu ugboro nri bụ otu ibe bred)

Mkpụrụ Osisi na Akwụkwọ Nri Na-eri ụdị ha dịgasị iche iche (akparala ha ókè; ọ dịkarịa ala ya bụrụ ugboro nri 3 kwa ụbọchị)

Teta! adịghị akwalite ụdị usoro iri nri ọ bụla na nke ịchịkwa ibu. Ihe ọ na-eme bụ nanị ime ka ndị na-agụ ya mara ụfọdụ n’ime nhọrọ ndị e nwere. Mmadụ kwesịrị ịkpọtụrụ dọkịta ya tupu ya amalite ụdị mmega ahụ́ ma ọ bụ usoro iri nri ọ bụla.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ọ dabeere n’aro Ụlọ Ọgwụ Mayo tụrụ

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Iji Felata, Ụfọdụ Anwalewo Aro Ndị A:

1 Mara banyere ókè calorie dị n’ihe ị na-eri nakwa n’ihe ị na-aṅụ haruru. Ihe ịrịba ama: Ihe ọṅụṅụ pụrụ ịbụ isi ihe na-enye calorie, karịsịa ihe ọṅụṅụ ndị dị ụtọ e si ná mkpụrụ osisi nweta. Ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya na-enyekwa calorie nke ukwuu. Kpachakwara anya banyere mmanya ọtọ bịrịbịrị ndị ahụ a na-akpọsakarị ka a zụọ. Lee anya n’akwụkwọ a mapawara n’ahụ́ ha iji chọpụta ókè calorie dị na ha haruru. Ọ pụrụ ịtụ gị n’anya.

2 Zere ọnwụnwa. Ọ bụrụ na i nwere ihe ndị dị ka ji e ghere eghe, swiiti, ma ọ bụ biskiiti n’ụlọ gị, ị gaghị ezeteli iri ha! Jiri ihe ndị na-enwechaghị calorie, dị ka mkpụrụ osisi apụl, karọt, na ụdị biskiiti a na-akpọ cracker, dochie ha.

3 Rie ihe na-ejide ume ma ọ bụ ihe na-akpali agụụ tupu i riwe nri. Ọ ga-eme ka agụụ na-agụ gị belata, ọ pụkwara ime ka ị ghara iriru nri otú ị gaara eriru.

4 Erichala nri nile e buteere gị. Na-ahọ nri ahọ. Erila ihe ị maara na ọ ga-enye gị calorie dị ukwuu.

5 Jiri nwayọọ na-eri nri. Gịnị ka ị na-eriri nri ọkụ ọkụ? Nụ ụtọ nri gị site n’ịchọpụta ihe ị na-eri—ụcha ya, ụtọ ya, ihe ndị mejupụtara ya. Ṅaa ahụ́ gị ntị mgbe ọ na-agwa gị, sị, “Erijuola m. Achọghịzi m iri.”

6 Kwụsị iri nri tupu ya adị gị ka i rijuola.

7 A ma ụlọ nri ndị dị ná mba ụfọdụ ama maka inye mmadụ nri karịrị akarị. Rie nanị ọkara nke nri ha kunyeere gị, ma ọ bụ gị na onye ọzọ rie ya.

8 Ọ dịghị mkpa na ị ga-erirịrị nri nricha ọnụ mgbe i richara nri. Ọ ka mma iji mkpụrụ osisi ma ọ bụ ihe ọzọ na-adịchaghị enye calorie richaa ọnụ.

9 Ụlọ ọrụ ndị na-emepụta nri chọrọ ka ị na-erikwu nri. Ihe bụ́ mkpa ha bụ ego ha ga-enweta. Ha ga-anwa inweta gị n’ebe ị na-adịghị ike. Abụla onye ha ga-eji ọmarịcha foto na mkpọsa ngwá ahịa ha ji akọ eme, nweta. Ị pụrụ ịsị ee e!

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ihe ndepụta a bụ n’akwụkwọ bụ́ Eat, Drink, and Be Healthy, nke Dr. Walter C. Willett dere

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Na-emega ahụ́!