Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oké Ibu—Gịnị Na-akpata Ya?

Oké Ibu—Gịnị Na-akpata Ya?

Oké Ibu—Gịnị Na-akpata Ya?

“Anyị nọ n’etiti nsogbu zuru ebe nile nke pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ike nke ụmụ anyị. Ọ bụrụ na ọha mmadụ emeghị ihe ugbu a iji gbochie ya, mmụba nke oké ibu agaghị akwụsị.”—William J. Klish, bụ́ prọfesọ nke nkà mmụta ọrịa ụmụaka.

ỤFỌDỤ ndị na-enweghị nsogbu ibu na-adịkarị ele ndị buru ibu na ndị bufere ibu ókè anya ọjọọ ma na-ewere ha dị ka ndị umengwụ na ndị na-enwechaghị mkpali ime ihe. Ma nsogbu ahụ ọ̀ dị mfe otú ahụ? Ndị buru oké ibu hà bụ nnọọ ndị umengwụ, ndị na-agbara ụdị mmega ahụ́ ọ bụla ọsọ? Ka ọtụtụ mgbe, è nwere ihe ndị ọzọ na-akpata ya, bụ́ ndị ka sie ike nchịkwa?

Ọ̀ Bụ Ebumpụta Ụwa, Gburugburu Ebe Obibi, Ka Ọ̀ Bụ Ha Abụọ?

Akwụkwọ bụ́ Food Fight na-ekwu, sị: “Ọ dịwo anya a rụwara ụka banyere ihe na-akpata oké ibu, ụfọdụ sị na ọ bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa, ndị ọzọ asị na ọ bụ gburugburu ebe obibi.” Gịnị ka mkpụrụ ndụ ihe nketa e kwuru banyere ya n’ebe a pụtara? Ụfọdụ nwere echiche bụ́ na ahụ́ mmadụ na-eji aka ya echekwa calorie karịrị akarị maka iji ya mee ihe n’ọdịnihu. Otu akwụkwọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ruo ọtụtụ iri afọ, a mụwo banyere otú mkpụrụ ndụ ihe nketa si akpata oké ibu. . . . E mewo nnyocha dị ukwuu ugbu a banyere mkpụrụ ndụ ihe nketa nke mmadụ nakwa banyere oké ibu. A nọwo na-eji ụzọ ndị bụ́ ọkpọka eme ihe iji chọpụta mkpụrụ ndụ ihe nketa ndị pụrụ ime ka mmadụ buo ibu ma bute ọrịa ndị dị ka ọrịa shuga. N’olu ndị ọkà mmụta sayensị, a pụrụ ikwu na ọ bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa na-akpata pasent 25 ruo pasent 40 nke ndịrịta iche a na-enwe n’ịdị arọ nke ndị mmadụ n’ozuzu ha.” Akwụkwọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “N’iburu n’uche na a na-atakarị ndị buru oké ibu ụta na ọ bụ ha ka nsogbu ahụ si n’aka, ọnụ ọgụgụ ndị a na-eme ka òkè mkpụrụ ndụ ihe nketa na-ekere pụta ìhè, n’agbanyeghịkwa nke ahụ, a pụrụ ikwu na ọ bụ gburugburu ebe obibi na-akpata ihe dị ka pasent 60 na ya.” Nke a pụtara na isi ihe na-akpata oké ibu bụ ụdị ndụ mmadụ na-ebi. Calorie na-abata ya n’ahụ́ n’ụbọchị ọ̀ na-akarị nke na-apụ ya n’ahụ́? Ọ̀ na-erichi ụdị nri ọ na-ekwesịghị ịdị na-eri, anya? Ọ̀ na-ewepụta oge kwa ụbọchị iji na-emega ahụ́ ruo ókè kwesịrịnụ?

Ụlọ Ọgwụ Mayo na-akọwa n’ụzọ dị mfe, ihe na-akpata oké ibu, sị: “Mkpụrụ ndụ ihe nketa pụrụ ịkpali ibu ibu ma ọ bụ ibu oké ibu, ma ihe na-emesị kpebie ịdị arọ nke ahụ́ gị bụ ihe ị na-eri na otú i si emega ahụ́. Ka oge na-aga, iribiga nri ndị na-enye calorie ókè, ịnọkarị otu ebe, ma ọ bụ ha abụọ, na-abịa mee ka i buo oké ibu.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Otu ụlọ ọgwụ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụghị iwu na ị ga-eburịrị ibu n’ihi ihe i bu pụta ụwa. . . . Otú ọ sọkwara mkpụrụ ndụ ihe nketa gị ya dịrị, ọ bụ ụdị nri ị na-eri na ihe ndị ị na-eme ga-emesị kpebie otú ị ga-eburu n’ibu.”

Ụlọ ọrụ ndị na-eme ka ndị mmadụ felata, na-akpata nde kwuru nde dollar ka ndị mmadụ na-agbalịsi nnọọ ike ịchọ ka ọdịdị ahụ́ ha dịghachi otú ọ dịbu. Ma, gịnị ka ndị ọkachamara na-ekwu banyere ya? “Ịgwọ oké ibu bụ ihe sigburu onwe ya n’ike, ihe ka ọtụtụ ná ndị felataranụ na-emesịkwa bughachi ibu,” ka akwụkwọ bụ́ Food Fight na-ekwu. “Atụmatụ olileanya kasị dịrị na ya e mere bụ na ọ bụ pasent 25 [otu ụzọ n’ụzọ anọ] na-efelata ma nọgide otú ahụ, mgbe mgbe, ọ na-achọ ha ime mgbalị ọtụtụ ugboro.”

Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Ibu Oké Ibu

Ibu oké ibu pụrụ ịkpata ajọ nsogbu ahụ́ ike. Dr. Scott Loren-Selco, bụ́ ọkà n’ọrịa akwara ahụ́ n’ụlọ ọgwụ University of Southern California Medical Center, na-adọ aka ná ntị na ọbụna ndị na-eto eto buru oké ibu nọ n’ihe ize ndụ nke ibute Ụdị nke Abụọ nke ọrịa shuga. (Lee Teta! nke May 8, 2003.) Ọ na-ekwu, sị: “Anyị na-ahụzi ya mgbe nile, n’ezie, ọ na-eyi egwu. Ana m agwa [ndị buru oké ibu] na m ga-akpọga ha ná ngalaba a na-agwọ ndị ọrịa shuga ma gosi ha ihe nwere ike ịbụ ọdịnihu ha: ndị ìsì, ndị e gbupụrụ aka ma ọ bụ ụkwụ, imerime ndị na-adịkwaghị ike n’ihi na ha na-arịa Ụdị nke Abụọ [nke ọrịa shuga]—bụ́ ndị buchakwara oké ibu.” Olee otu ihe so akpata ya? “Ha ji ego ịzụta mgbadume na poteto e ghere eghe—n’ihi ya, ha na-azụ ha,” ka Loren-Selco na-ekwu. “Ọ dịghị onye na-agwa ha na ọ dịghị mma—n’ezie ọ bụghị ụlọ ọrụ na-emepụta nri onye ọ dị ngwa, nke o ji abụ ihe ka ọtụtụ ná ndị dọkịta, bụ́ ndị a na-enyebeghị ọzụzụ banyere ihe oriri na-edozi ahụ́.”

Dr. Edward Taub, bụ́ onye a ma ama n’ide banyere ihe oriri na-edozi ahụ́, na-ekwu, sị: “N’oge na-adịbeghị anya, ọ ghọwo ihe a na-anakwere karị, na ọbụna ihe na-adịghị njọ, ikwere na ibu ibu bụ nnọọ ihe dị otú kwesịrịnụ na ihe a nakweere nke ya na ndụ ọgbara ọhụrụ so. Nke a bụ n’ezie ihe ijuanya nke ndị na-emepụta nri ndị na-eme ka mmadụ buo ibu meworo ka ọha na eze kwere, iji na-eme ka ahịa ha na-aga aga.”

Ndị ọkachamara na-ekwu na ndị abụba karịrị akarị n’úkwù ha pụrụ inwe ezi ahụ́ ike karịa ndị abụba karịrị akarị n’afọ ha (karịsịa ma ọ bụrụ na úkwù ha karịrị sentimita 90 ruo sentimita 100). N’ihi gịnị? N’ihi na “abụba dị gị n’afọ na-amụba ohere e nwere na ị ga-enwe ọbara mgbali elu, ọrịa akwara obi na-ekesa ọbara, ọrịa shuga, ọrịa strok na ụdị ụfọdụ nke ọrịa cancer,” ka akwụkwọ bụ́ Mayo Clinic on Healthy Weight na-ekwu. “Ọ bụrụ na abụba karịrị akarị n’úkwù gị, n’apata ụkwụ gị nakwa n’ike gị, ohere i nwere ibute ọrịa agaghị aharu ka nke ahụ.”

Ya mere, gịnị bụ ihe ngwọta e nwere maka ọtụtụ nde ndị okenye na ụmụaka n’ụwa nile bụ́ ndị buru ibu ma nọrọ n’ihe ize ndụ nke inwe ajọ nsogbu ahụ́ ike n’ihi ya? È nwere ihe ngwọta dị irè?

[Igbe/Chaatị dị na peeji 5]

Gịnị Bụ Ọ̀tụ̀tụ̀ BMI? Gịnị Ka Ọ Na-agwa Gị?

Ọ̀tụ̀tụ̀ BMI bụ ọ̀tụ̀tụ̀ a na-enweta ma e jiri ogo mmadụ tụnyere ịdị arọ ya, bụ́ nke pụrụ inye aka kọwaa ma ọ̀ bụ nanị ibu nkịtị ka onye ahụ buru ka ò bufeela ibu ókè. Dị ka Ụlọ Ọgwụ Mayo si kwuo, a na-ewere ndị ọ̀tụ̀tụ̀ BMI ha nọ site na 18.5 ruo 24.9 dị ka ndị kasị nwee ezi ahụ́ ike. Ọ bụrụ na ọ̀tụ̀tụ̀ BMI gị nọ n’agbata 25 na 29.9, mara na i buru ibu. A na-ewere onye ọ bụla ọ̀tụ̀tụ̀ BMI ya karịrị 30 dị ka onye buru oké ibu. Olee ebe nke gị nọ ma i were chaatị a tụlee ya? Ọ̀ dị gị mkpa, ma eleghị anya, ịhụ dọkịta gị ka ọ tụọrọ gị aro ihe ị ga-eme ma ọ bụkwanụ gwa gị ebe nke ị kwụ?

Ị chọọ ịmata ọ̀tụ̀tụ̀ BMI gị, jiri ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kilogram chọpụta ịdị arọ gị, were ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị ogo gị bụ́ nke ị ga-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ mita chọpụta, kee ya, i mesịa nke ahụ, werekwa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị ogo gị ahụ i ji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ mita chọpụta kee ihe ọ bụla i nwetara. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ gị bụ kilogram 90, ogo gị abụrụ mita 1.8, ọ̀tụ̀tụ̀ BMI gị bụ 27.7 (90 ÷ 1.8 ÷ 1.8 = 27.7).

[Chaatị]

Ezi ahụ́ ike Ibu Oké ibu

Ọ̀tụ̀tụ̀ BMI 18.5-24.9 25-29.9 30 ma ọ bụ karịa

Ogo Ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ

na kilogram

1.47 m Site 53 gbadaa 54-64 65 ma ọ bụ karịa

1.50 Site 55 gbadaa 56-66 67 ma ọ bụ karịa

1.52 Site 57 gbadaa 58-68 69 ma ọ bụ karịa

1.55 Site 59 gbadaa 60-71 72 ma ọ bụ karịa

1.57 Site 61 gbadaa 62-73 74 ma ọ bụ karịa

1.60 Site 63 gbadaa 64-76 77 ma ọ bụ karịa

1.63 Site 65 gbadaa 66-79 80 ma ọ bụ karịa

1.65 Site 67 gbadaa 68-81 82 ma ọ bụ karịa

1.68 Site 69 gbadaa 70-84 85 ma ọ bụ karịa

1.70 Site 71 gbadaa 72-86 87 ma ọ bụ karịa

1.73 Site 74 gbadaa 75-89 90 ma ọ bụ karịa

1.75 Site 76 gbadaa 77-91 92 ma ọ bụ karịa

1.78 Site 78 gbadaa 79-94 95 ma ọ bụ karịa

1.80 Site 80 gbadaa 81-96 97 ma ọ bụ karịa

1.83 Site 83 gbadaa 84-99 100 ma ọ bụ karịa

1.85 Site 85 gbadaa 86-102 103 ma ọ bụ karịa

1.88 Site 87 gbadaa 88-105 106 ma ọ bụ karịa

1.90 Site 89 gbadaa 90-107 108 ma ọ bụ karịa

[Ebe E Si Nweta Foto]

E si n’akwụkwọ bụ́ Mayo Clinic on Healthy Weight nweta ya

[Igbe dị na peeji nke 5]

Gịnị Bụ “Calorie”?

Olee otú e si akọwa calorie? Ọ bụ ihe a nakweere iji na-amata ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ. N’ihi ya, mgbe ọsụsọ gbara gị, ahụ́ gị na-agbari calorie. Calorie bụ ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ ọ na-ewe iji mee ka otu kilogram mmiri kporo ọkụ ruo kpọmkwem otu degree celsius.” (Balance Your Body, Balance Your Life) Calorie ahụ́ mmadụ na-achọ n’ụbọchị dịgasị iche iche, dabere n’ihe ndị dị ka ogo onye ahụ, ibu ya, afọ ndụ ya, na ókè ọ na-emegaru ahụ́.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Ị na-adọrọ adọrọ ma ọ bụrụ na

▪ Ị na-eji oge ka ukwuu n’ụbọchị anọdụ ala—na-ekiri TV ma ọ bụkwanụ na-anọdụ n’oche ma ọ bụ n’ụgbọala—n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ị dịghị agagharị agagharị

▪ Ị dịkebeghị eji ụkwụ aga ihe karịrị mita 90

▪ Ọrụ ị na-arụ bụ nke ị na-adịghị emega ahụ́ na ya

▪ Ị dịghị eji ihe dị ka minit 20 ruo minit 30 emega ahụ́, ọ dịkarịa ala, otu ugbo n’izu

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ọ dabeere n’akwụkwọ bụ́ Mayo Clinic on Healthy Weight