Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Uru Ndị A Na-erite Site n’Ịgụrụ Ụmụaka Ihe

Uru Ndị A Na-erite Site n’Ịgụrụ Ụmụaka Ihe

Uru Ndị A Na-erite Site n’Ịgụrụ Ụmụaka Ihe

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA POLAND

Ndị na-ahazi ihe omume ahụ a na-eme kwa afọ bụ́ “Ndị Poland Nile Na-agụrụ Ụmụaka Ihe” na-ekwu, sị: “Ịgụ ihe dị oké mkpa n’inweta ihe ọmụma na ikike iche echiche. . . . Ọ na-eme ka mmadụ nwee ike iche echiche na inweta ihe ọmụma.” Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, n’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị okenye na ụmụaka ji ewere ịgụ ihe dị ka ihe a na-achọghị bụ́ nke dị oké mkpa?

Ndị malitere ihe omume a na-ekwu, sị: “A ghaghị ime ka ịgụ ihe na inwe mmasị n’akwụkwọ bụrụ ihe maara mmadụ ahụ́ site na nwata.” Ha na-agwa ndị nne na nna, sị: “Ọ bụrụ na unu chọrọ ka ụmụ unu mara ihe ma na-enwe ihe ịga nke ọma n’ụlọ akwụkwọ nakwa ná ndụ, na-agụrụnụ ha ihe n’olu dara ụda ruo minit 20 kwa ụbọchị.”

A gbakwara ndị nne na nna ume ka ha ghara igbu oge n’ịgụrụ ụmụ ha ihe, kama ka ha “na-amalite ngwa ngwa o kwere mee.” Ole mgbe? “Ka anyị na-agụrụ nwa ọhụrụ ihe, na-eku ya n’aka, na-eji ịhụnanya ele ya anya, ma na-eji olu anyị akpali mmasị ya,” ka a gbara ndị nne na nna ume ime. “N’ụzọ dị otú a, anyị na ha ga-enwe mmekọrịta na-adịgide adịgide n’ịgụ ihe, tinyere ahụ́ iru ala, obi ụtọ, na mmekọrịta chiri anya. Tụkwasị na nke a, ọ ga-eme ka nwa ahụ nwee ike iche echiche nke ọma.”

Ndị na-ahazi ihe omume ahụ mesiri ya ike na “ịgụrụ ụmụaka ihe dị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ,” ha kwukwara uru ndị ọzọ a na-erite na ya. Ịgụrụ ụmụaka ihe n’olu dara ụda na-akụziri ha iche echiche, “na-enyere ha aka ịghọta ndị ọzọ, ịghọta ihe ndị gbara ha gburugburu, na ịghọta onwe ha, . . . na-akpali mmasị ha, na-eme ka ha na-echepụta ihe, na-akpali uto mmetụta uche ha, na-eme ka ha zụlite nghọta na mmetụta ọmịiko, na-akụziri ha ụkpụrụ omume ọma, . . . na-eme ka ha nwee ùgwù onwe onye.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ “ihe ngwọta nye ọtụtụ mmetụta ndị na-adịghị mma . . . bụ́ ndị pụrụ ibibi uche na obi ụmụaka,” ka ndị na-ahazi ihe omume a kwubiri.

Ka ịgụ ihe wee bụrụ nke dị nnọọ irè, e kwesịrị iji akwụkwọ ndị na-agba ndị na-eto eto ume ịbịaru Onye Okike ha nke eluigwe nso na-eme ihe. Bible bụ akwụkwọ kasị mma e nwere maka inyere anyị aka ịbịaru Chineke nso. Bible na-ekwu na ọ bụ “malite n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ” ka a kụziiri nwa okorobịa bụ́ Timoti “ihe odide ndị ahụ dị nsọ.” (2 Timoti 3:15) Akwụkwọ ndị dabeere na Bible, ndị dị ka Akwukwọm nke Akukọ Bible na Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, bụ́ ndị e dere karịsịa maka ụmụaka, ndị Ndịàmà Jehova bipụtara, pụrụ iso n’akwụkwọ ndị nne na nna ga na-agụrụ ụmụ ha mgbe nile n’olu dara ụda.