Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 24. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Ọ bụ ezie na Jud bu n’obi idegara ụmụnna ya bụ́ Ndị Kraịst akwụkwọ banyere nzọpụta ha nwekọrọ ọnụ, gịnị ka ọ hụziri mkpa ọ dị ide banyere ya? (Jud 3)

2. Olee obodo nta Kliopas na onye ibe ya na-eje mgbe Jizọs Kraịst nwoghara onwe ya ma sonyere ha? (Luk 24:13-32)

3. Dị ka Bible si kwuo, gịnị ka e ji dee Iwu Iri ahụ n’elu mbadamba nkume abụọ ahụ? (Ọpụpụ 31:18)

4. Olee obodo “ọtụtụ ndị inyom ala ọzọ” Solomọn lụrụ, bụ́ ndị “wezụgara obi ya ka o so chi ọzọ,” si? (1 Ndị Eze 11:1, 4)

5. N’agbanyeghị ọtụtụ ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ, gịnị ka ụmụnne ya na-emeghị banyere ya? (Jọn 7:5)

6. Ọ bụ ezie na ụmụ Eze Devid abụọ, bụ́ Absalọm na Adonaịja, kpara nkata iweghara ọchịchị n’oge abụọ dịgasị iche, olee onye n’ime ha ọ fọrọ nnọọ obere ka o weghara ya? (2 Samuel 16:15-22; 1 Ndị Eze 1:9-11, 38-53)

7. Gịnị bụ ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ nke nkume akụ́ mmiri ígwé ihe atụ ndị ahụ daranụ mgbe mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ọkwá ya nke iwe Chineke? (Mkpughe 16:21)

8. Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ chọrọ ka ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst mee mgbe a chụpụrụ mmadụ n’ọgbakọ? (1 Ndị Kọrint 5:11)

9. Olee chi ụgha ndị inyom Hibru si n’ezi ofufe dapụ nọ na-ebere ákwá bụ́ nke Ezikiel hụrụ n’ọhụụ? (Ezikiel 8:14)

10. Gịnị mere Agua, bụ́ onye dere Ilu isi 30, ji rịọ ka a ghara inye ya “ọnọdụ ogbenye ma ọ bụ akụ̀”? (Ilu 30:8, 9)

11. Olee ihe ịrịba ama e nyere Hezekaịa iji mesie ya obi ike na Jehova ga-agwọ ya ma zọpụta Jeruselem n’aka ndị Asiria? (Aịsaịa 38:5-8)

12. Gịnị ka onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi meere nwoke ahụ e tiri ihe ma hapụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma bụ́ onye ọ hụrụ n’ụzọ gara Jeriko? (Luk 10:34)

13. Olee ụdị ihe ike n’isi e nyere nnukwu ndị nchụàjà Izrel ntụziaka ịdị na-eke? (Ọpụpụ 28:37)

14. Gịnị mere Ebreham ji kwuo ugboro abụọ na Sera bụ nwanne ya nwanyị? (Jenesis 12:19; 20:2)

15. Gịnị bụ aha ugwu ndị ahụ a ga-anọ na ha kwupụta ngọzi maka idebe Iwu Chineke na nkọcha maka imebi ya? (Deuterọnọmi 11:29)

16. Olee obodo eze mbụ nke Izrel, bụ́ Sọl, si na ya? (1 Samuel 10:24-26)

17. Gịnị bụ aha eze ahụ tinyere Daniel n’olulu ọdụm? (Daniel 6:9, 16)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Ịgba ha ume “ịlụsi ọgụ ike maka okwukwe”

2. Emeọs

3. Ọ bụ “mkpịsị aka Chineke”

4. “Moab, Amọn, Edọm, Zaịdọn na Het”

5. Ha ‘egosipụtaghị okwukwe’

6. Absalọm

7. Otu talent (ihe dị ka kilogram 20)

8. Ha ekwesịghị iso onye ahụ na-akpakọ

9. Tamuz

10. Ka onwe ya wee ghara iju ya afọ, ọ jụ Jehova ma ọ bụkwanụ zuo ohi ma mebie aha Chineke

11. Onyinyo anyanwụ dị n’ebe nrịgo Ehaz lara azụ nzọụkwụ ebe nrịgo iri

12. O hichara ma kechie ọnyá ya, kpọga ya n’ụlọ ndị njem ma lekọta ya anya

13. Ákwà nkuku isi

14. N’ihi otú Sera si maa mma, ụjọ tụrụ Ebreham na Fero na Eze Abimelek ga-egbu ya iji lụwa Sera

15. Ugwu Geraizim (ngọzi); Ugwu Ibal (nkọcha)

16. Gibea

17. Daraịọs