Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọganihu Ndị E Nwere n’Ọgụ A Na-alụso Ọrịa AIDS

Ọganihu Ndị E Nwere n’Ọgụ A Na-alụso Ọrịa AIDS

Ọganihu Ndị E Nwere n’Ọgụ A Na-alụso Ọrịa AIDS

“Ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ, n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, a mụtarala ihe dị ukwuu n’ime oge dị nnọọ mkpirikpi banyere ọrịa dị mgbagwoju anya otú a,” ka Dr. Gerald J. Stine na-ede n’akwụkwọ ya bụ́ AIDS Update 2003. Ọ na-ekwu na “nchọpụta ndị e meworo banyere nje HIV na ọrịa AIDS bụ otu n’ime ihe ndị dị ịrịba ama ndị ọkà mmụta sayensị rụzuworo.” Olee ihe ndị a rụzuworo?

IHE ọmụma na nkà ndị e nwere n’oge a banyere ọgwụ na ahụ́ ike emewo ka ndị na-eme nnyocha nwee ike imepụta ọgwụ ndị a pụrụ ịṅụkọta ọnụ, bụ́ ndị mere ka ndị bu nje HIV nwekwuo olileanya. Ọzọkwa, ọzụzụ ndị a na-enye banyere ọrịa AIDS arụpụtawo ihe ndị dị mma n’ọtụtụ mba. Ma, ihe ịga nke ọma a na-enwe ná mgbalị ndị ahụ ọ̀ na-egosi na ọrịa a na-egbu egbu, nke zuru ebe nile, abịawala ná njedebe? Mgbalị ndị a na-eme n’oge a n’ihe banyere nkà mmụta sayensị nakwa n’inye ndị mmadụ ọzụzụ hà pụrụ ime ka ọrịa AIDS kwụsị ịgbasa? Tụlee ihe ndị na-esonụ.

Iji Ọgwụ Agwọ Ya

“E Nwetụ Olileanya n’Ọgụ A Na-alụso Ọrịa Aids,” bụ isiokwu gbara n’isi akụkọ nke mbipụta September 29, 1986, nke magazin bụ́ Time. Ihe mere e ji ‘nwetụ olileanya’ a bụ nnwale ndị dọkịta nwalere iji ọgwụ bụ́ azidothymidine eme ihe n’ịlụso nje HIV ọgụ. N’ụzọ dị ịrịba ama, ndị bu nje HIV ṅụrụ ọgwụ a malitere ịdị ogologo ndụ karị. Kemgbe ahụ, ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ agbatịwo ndụ nke ọtụtụ narị puku mmadụ. (Lee igbe bụ́ “Gịnị Bụ Ọgwụ Ndị E Ji Alụso Nje HIV Ọgụ?” na peeji nke 27.) Olee ọganihu e nweworo n’iji ha agwọ onye bu nje HIV?

N’agbanyeghị oké aṅụrị ndị mmadụ nwere mgbe mbụ e mepụtara azidothymidine, magazin bụ́ Time kọrọ na ndị na-eme nnyocha banyere ọrịa AIDS “nwere obi ike na ọgwụ a agaghị agwọchapụ ọrịa AIDS.” Ha kwuru eziokwu. Ahụ́ nke ụfọdụ ndị bu ọrịa a anabataghị ọgwụ azidothymidine, n’ihi ya, a bịara mepụta ọgwụ ndị ọzọ e ji alụso nje HIV ọgụ. Mgbe e mesịrị, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Oriri na Ọgwụ na United States bịara kwadoo ka ndị nje a ji aka ọjọọ na-aṅụkọta ụdị dị iche iche nke ọgwụ ndị e ji alụso nje a ọgụ. Ndị na-elekọta ndị ọrịa AIDS ji nnọọ obi ụtọ nabata usoro ọgwụgwọ a nke ịṅụkọta ọgwụ ọnụ, bụ́ nke bịara gụnye ịṅụkọta ụdị ọgwụ atọ ma ọ bụ karịa e ji alụso nje HIV ọgụ. N’eziokwu, n’otu nnọkọ mba nile e nwere banyere ọrịa AIDS n’afọ 1996, otu dọkịta kwudịrị na ọgwụ ndị ahụ nwere ike ikpochapụ nje HIV n’ahụ́!

N’ụzọ dị mwute, n’ime otu afọ, ọ bịara doo anya na ọbụna ịgbasochi usoro e kwuru ka e jiri na-aṅụ ọgwụ atọ a anya, apụghị ikpochapụ nje HIV kpamkpam. Ka o sina dị, otu akụkọ e si n’aka òtù UNAIDS nweta na-ekwu na “ịṅụkọta ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ ọnụ emewo ka ndị bu nje a nwee ike ịdịtekwu ndụ aka, inwekwu ahụ́ ike, na ibikwu ndụ bara uru.” Dị ka ihe atụ, iji ọgwụ a eme ihe emewo ka ndị ọrịa AIDS na-egbu na United States nakwa na Europe jiri ihe karịrị pasent 70 belata. Tụkwasị na nke ahụ, ọtụtụ nnyocha ndị e mere egosiwo na ọgwụ ụfọdụ ndị a họrọ ahọ e ji alụso nje HIV ọgụ pụrụ ime ka nwanyị dị ime nke bu ọrịa a ghara ibunye ya nwa ya.

Ma, ọtụtụ nde ndị bu nje HIV anaghị enweta ọgwụ ndị e ji alụso nje a ọgụ. N’ihi gịnị?

“Ọrịa Ndị Ogbenye”

Ebe ndị e ji ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ eme ihe n’ụzọ sara mbara bụ ná mba ndị bara ọgaranya. Otú ọ dị, Òtù Ahụ́ Ike Ụwa (WHO) na-eme atụmatụ na, ná mba ụfọdụ ka na-emepe emepe, ọ bụ nanị pasent 5 n’ime ndị chọrọ ọgwụ a, na-enweta ha. Ọbụna ndị nnọchiteanya nke òtù United Nations akọwawo ahaghị nhata a dị ka “ajọ ikpe na-ezighị ezi” na “arụrụala jọgburu onwe ya a na-arụ n’oge a.”

Ụmụ amaala nke otu mba nwekwara ike ghara ịdị na-enweta ọgwụ ndị a n’ụzọ ha nhata. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Globe and Mail na-akọ na 1 onye n’ime mmadụ 3 ọ bụla ọrịa AIDS na-egbu na Canada aṅụtụbeghị ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ. N’agbanyeghị na a na-enye ọgwụ ndị ahụ n’efu na Canada, e legharawo ìgwè ụfọdụ anya. “Ndị na-adịghị enweta ọgwụgwọ kwesịrị ekwesị,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Globe na-ekwu “bụ ndị ọ kasị jiri n’olu: ndị aborigine, ndị inyom na ndị ogbenye.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian hotara ihe otu nne nọ n’Africa, bụ́ onye bu nje HIV, kwuru, sị: “Ihe a na-agbagwoju m anya. Olee ihe mere ndị ọcha a na-edina ụdị onwe ha ga-eji na-enweta ọgwụgwọ, mụ ana-anwụ?” Azịza nke ajụjụ ya dabeere n’ihe ndị ọ na-efu iji mepụta ọgwụ na iji kesaa ya.

Na United States nakwa na Europe, ego ọ na-efu, ná nkezi, iji zụta ụdị atọ a na-aṅụkọta ọnụ nke ọgwụ ndị ahụ e ji alụso nje HIV ọgụ bụ ihe dị ka dollar 10,000 na dollar 15,000 kwa afọ. Ọ bụ ezie na a na-enwetazi ọgwụ ndị a a na-aṅụkọta ọnụ ná mba ndị ka na-emepe emepe n’ọnụ ego dollar 300 ma ọ bụ ihe na-erughị ya, maka otu afọ, ọnụ ego a ka bụ nnọọ ihe aka ọtụtụ ndị bu nje HIV na-agaghị eru, bụ́kwanụ ndị bi n’ebe a kasị chọọ ọgwụ a. Dr. Stine si otú a chịkọta ọnọdụ a: “Ọrịa AIDS bụ ọrịa ndị ogbenye.”

Ọrụ nke Imepụta Ọgwụ

Ikwe ka ụlọ ọrụ ndị ọzọ na-emepụta ọgwụ e ji mara otu ụlọ ọrụ, ma na-ere ha n’ọnụ ego dị ala adịbeghị mfe. N’ọtụtụ mba, iwu ndị siri ike, bụ́ ndị na-echebe aha e ji mara ọgwụ, na-amachibido ụlọ ọrụ ndị ọzọ imepụtaghachi ọgwụ ndị dị otú a, n’anataghị ikike. “Nke a bụ agha metụtara akụ̀ na ụba,” ka onyeisi nke otu nnukwu ụlọ ọrụ na-emepụta ọgwụ na-ekwu. Ọ na-ekwu na imepụta ọgwụ n’ụdị ọzọ ma na-eresị ha mba ndị ka na-emepe emepe maka uru “bụ imegbu ndị mbụ mepụtara ọgwụ ndị ahụ.” Ụlọ ọrụ ndị mepụtara ọgwụ ndị nwere aha na-arụkwa ụka na uru dị ala pụrụ ime ka e belata ego a na-etinye n’ime nnyocha banyere ọgwụ nakwa n’imepụta ọgwụ ndị ọhụrụ. Nchegbu ndị ọzọ na-enwe bụ na ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ a na-emepụta n’ọnụ ego dị ala maka mba ndị ka na-emepe emepe pụrụ n’ezie ịbụ ndị a ga-erewezi n’ahịa nzuzo ná mba ndị mepere emepe.

Ndị na-akwado ka a na-emepụta ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ n’ọnụ ego dị ala na-ekwu na a pụrụ imepụta ọgwụ ndị ọhụrụ n’ihe dị n’agbata pasent 5 na pasent 10 nke ọnụ ego ụlọ ọrụ na-emepụta ọgwụ kwuru na ọ ga-ewe iji na-emepụta ha. Ha kwukwara na ụlọ ọrụ ndị nkịtị na-emepụta ọgwụ yiri ka hà leghaara ime nnyocha na imepụta ọgwụ ndị ọhụrụ maka iji na-agwọ ọrịa ndị na-akpa mba ndị na-abaghị ọgaranya aka ọjọọ anya. N’ihi ya, Daniel Berman, bụ́ onyeisi nke otu ihe omume bụ́ Inweta Ọgwụ Ndị Dị Mkpa, na-ekwu, sị: “Iji na-emepụta ọgwụ ndị ọhụrụ, ọ dị mkpa ka e nwee iwu nke mba nile ga na-akwadosi ike, bụ́ nke ga-egbutu ọnụ ahịa ha otú aka ndị nọ ná mba ndị ka na-emepe emepe ga-eru.”

Iji gboo mkpa a e nwere n’ụwa nile maka ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ, òtù WHO emewo atụmatụ inye nde mmadụ atọ ọrịa AIDS ji aka ọgwụ ndị a tupu afọ 2005 agwụsịa. “Nke a anwakwala anwa ghọọ atụmatụ ọzọ òtù UN na-emezughị,” ka Nathan Ford nke Médecins Sans Frontières dọrọ aka ná ntị. “Ọnụ ọgụgụ a bụ nanị ọkara nke ndị e mere atụmatụ bu ọrịa AIDS ugbu a, bụ́ ndị chọrọ ọgwụgwọ, ọ pụkwara ịkarị nnọọ otú a [ka ọ na-erule afọ 2005].”

Ihe Mgbochi Ndị Ọzọ

Ọ bụrụgodị na e kesaa ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ otú ọ ga-ezuru ndị nọ ná mba ndị ka na-emepe emepe, a ka nwere ihe mgbochi ndị ọzọ a ga-emeri. E nwere ọgwụ ụfọdụ ndị dị mkpa ka e rie nri tupu a ṅụọ ha, ndị dịkwa mkpa ka e jiri mmiri dị ọcha na-aṅụ, ma ọtụtụ narị puku ndị nọ ná mba ụfọdụ bụ nanị otu ugboro ka ha na-erili nri n’ime ụbọchị abụọ. A chọrọ ka a na-aṅụ ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ (nke na-abụkarị mkpụrụ ọgwụ 20 ma ọ bụ karị kwa ụbọchị) n’oge ndị e kwuru ka a ṅụọ ha kwa ụbọchị, ma ọtụtụ ndị bu nje a enweghị klọọkụ. Ọ dị mkpa ịgbanwe ọgwụ ndị a a na-aṅụkọta ọnụ, dabere n’ọnọdụ onye ọrịa nọ na ya. Ma, ndị dọkịta dị ụkọ n’ọtụtụ mba. N’ụzọ doro anya, ikesara mba ndị ka na-emepe emepe ọgwụ ndị a ga-abụ ihe tara nnọọ akpụ.

Ihe ịma aka ndị a na-enwe n’ọgwụ ndị a a na-aṅụkọta ọnụ na-emetụtakwa ọbụna ndị ọrịa nọ ná mba ndị mepere emepe. Nnyocha e mere na-egosi na imerime mmadụ n’ebe nile adịghị aṅụ ọgwụ ndị ahụ otú a sị ha siri na-aṅụ ha nakwa n’oge ndị e kwuru ka ha na-aṅụ ha. Nke a pụrụ ime ka e nwee nje ndị na-eguzogide ọgwụ. A pụrụ ibunye ndị ọzọ nje HIV ndị dị otú ahụ na-eguzogide ọgwụ.

Dr. Stine na-arụtụ aka n’ihe ịma aka ọzọ na-eche ndị bu nje HIV ihu. “Ihe na-eju anya banyere ịgwọ ọrịa AIDS,” ka ọ na-ekwu, “bụ na ọgwụgwọ ya pụrụ inye nsogbu n’ahụ́ karịa ọrịa ahụ n’onwe ya, karịsịa ma ọ bụrụ na a malitere ịgwọ ya mgbe ọ na-apụtabeghị ìhè.” Ọgwụ ndị a na-enwekarị mmetụta ọjọọ n’ahụ́ ndị bu nje HIV, mmetụta ndị gụnyere ọrịa shuga, abụba ịgbasa n’ahụ́ n’ụzọ na-adịghị mma, cholesterol ịkarị akarị n’ahụ́, na ọkpụkpụ ịdị fere fere. Ụfọdụ mmetụta ọjọọ ndị ọ na-enwe na-egbu mmadụ.

Mgbalị Ndị E Mere Igbochi Ya

Olee ihe ịga nke ọma ndị e nweworo ná mgbalị ndị e mere ibelata mgbasa nke ọrịa AIDS nakwa n’igbochi àgwà ndị pụrụ ịkpata ya? Ọzụzụ sara mbara e nyere banyere ọrịa AIDS na Uganda n’afọ ndị 1990 belatara ọnụ ọgụgụ ndị bu nje HIV ná mba ahụ site na pasent 14 e mere atụmatụ ya gaa n’ihe dị ka pasent 8 n’afọ 2000. N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbalị mba Senegal mere n’ime ka ụmụ amaala ya mata banyere ihe ize ndụ ndị dị n’ibute nje HIV enyeworo mba ahụ aka ịnọgide na-enwe ihe na-erughị 1 pasent nke ndị toruworo ogo mmadụ bu nje ahụ. Ihe ndị dị otú a ọ rụpụtara na-agba ume.

N’aka nke ọzọ, ọzụzụ ndị a na-enye banyere ọrịa AIDS enwebeghị ihe ịga nke ọma otú ahụ ná mba ndị ọzọ. Ajụjụ ọnụ a gbara mmadụ 11,000 na-eto eto na Canada n’afọ 2002, gosiri na ọkara ụmụ akwụkwọ sekọndrị ndị ka banyere ọhụrụ kweere na a pụrụ ịgwọta ọrịa AIDS agwọta. Dị ka nnyocha e mere na Britain n’otu afọ ahụ gosiri, pasent 42 nke ụmụ nwoke ndị nọ n’agbata afọ 10 na afọ 11 anụtụbeghị ihe ọ bụla banyere nje HIV na ọrịa AIDS. Otú ọ dị, ọbụna ndị ntorobịa ndị maara na e nwere ọrịa AIDS, matakwa na o nweghị ọgwụ, na-akpa àgwà ka ndị na-achọdịghị ịma. Otu dọkịta na-ekwu, sị: “Ọrịa AIDS dị nnọọ ọtụtụ ndị na-eto eto ka otu n’ime ọtụtụ nsogbu ndị ha na-enwe ná ndụ, dị ka ma hà ga-eri ezigbo nri, ndị ha na ha gaje ibi, ma hà ga-aga akwụkwọ.”

Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na òtù WHO na-ekwu na “o yiri ka ilebara ndị na-eto eto anya ọ̀ bụ ụzọ ga-akasị irè isi lụsoo ajọ ọrịa a ọgụ, karịsịa ná mba ndị ọ karịrị akarị.” Olee otú a pụrụ isi nyere ndị ntorobịa aka ịgbaso ịdọ aka ná ntị ndị ha nataworo banyere ọrịa AIDS? Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na a ga-agwọta ọrịa a?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 26]

N’afọ gara aga, ndị chọrọ ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ ma nweta ha n’Africa dị pasent 2 ma e jiri ya tụnyere pasent 84 nke ndị nwetara ha n’America

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 27]

Gịnị Bụ Ọgwụ Ndị E Ji Alụso Nje HIV Ọgụ? *

N’ahụ́ onye ahụ́ dị, mkpụrụ ndụ a na-akpọ helper T na-akpali usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ ịlụso nje ndị batara n’ahụ́ ọgụ. Ọ bụ mkpụrụ ndụ ndị a ka nje HIV kasị awakpo. Ọ na-eji mkpụrụ ndụ emepụtaghachi onwe ya, na-eme ka ike gwụ mkpụrụ ndụ helper T ma na-egbu ha ruo mgbe ike gwụrụ usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ. Ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ na-eme ka nje HIV ghara inwe ike imepụtaghachi onwe ha.

Ka ọ dị ugbu a, e nwere ụzọ ọgwụ anọ bụ́ isi e ji alụso nje HIV ọgụ. Ihe abụọ n’ime ha na-arụ bụ igbochi nje HIV ịbanye na DNA mmadụ. Ihe nke atọ na-eme bụ ime ka otu ụdị mmiri ahụ́ bụ́ protease nke dị ná mkpụrụ ndụ nje ahụ banyeworo, ghara imepụtaghachi nje ahụ na ịmụba ya. Ihe nke anọ na-arụ bụ igbochi nje HIV ịbanye ná mkpụrụ ndụ. Site n’igbochi nje HIV ịmụba, ọgwụ ndị a pụrụ ime ka onye bu ya ghara ịrịa ọrịa AIDS ngwa ngwa, bụ́ ebe ọ ga-abụ o ruo, ị mara na ọ banyela n’ọnọdụ na-enweghịzi mmeta.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 28 Ọ bụghị ndị nile bu nje HIV ka a na-agwa ka ha ṅụwa ọgwụ ndị e ji alụso nje a ọgụ. Ndị bu nje HIV ma ọ bụ ndị na-eche na ha bu ya kwesịrị ịga hụ dọkịta tupu ha amalite usoro ọgwụgwọ ọ bụla. Teta! adịghị akwalite ụdị usoro ọgwụgwọ ọ bụla.

[Foto]

KENYA Ebe dọkịta na-enye onye na-arịa AIDS ntụziaka banyere ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Sven Torfinn/Panos Pictures

[Foto]

KENYA Ebe otu onye na-arịa ọrịa AIDS nọ na-anara ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ n’ụlọ ọgwụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Sven Torfinn/Panos Pictures

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 28]

Ndị Inyom na Ọrịa AIDS

Pasent 50 nke ndị toruworo ogo mmadụ, bụ́ ndị bú ọrịa AIDS ugbu a, bụ ndị inyom

N’afọ 1982, bụ́ mgbe a chọpụtara ọrịa AIDS n’ahụ́ ụfọdụ ndị inyom, e chere na ọ ghaghị ịbụwo na ha butere ya site n’isi n’akwara agbanye ọgwụ ọjọọ n’ahụ́. N’oge na-adịghị anya, a bịara ghọta na ndị inyom pụrụ ibute ọrịa a site n’inwe mmekọahụ nakwa na ha kasị nọrọ n’ihe ize ndụ nke ibute ya. N’ụwa nile, pasent 50 nke ndị toruworo ogo mmadụ, bụ́ ndị bú ọrịa AIDS ugbu a, bụ ndị inyom. “Ndị ọrịa ọjọọ a ka emetụta n’ụzọ dị egwu bụ ndị inyom na ụmụ agbọghọ ụwa na-atụ n’ọnụ n’ihi ịbụ ndị na-emepeghị anya, n’ihi ọdịbendị ha, ihe ndị ha bu pụta ụwa, na ọnọdụ akụ̀ na ụba ha, bụ́kwa ndị na-ebu ibu nke ilekọta ndị ọrịa na ndị nọ n’ọnụ ọnwụ,” ka òtù UNAIDS na-akọ.

N’ihi gịnị ka ndị na-ahụ maka AIDS ji enwe nchegbu pụrụ iche banyere mgbasa ọrịa a na-agbasa n’etiti ndị inyom? A na-agbakarịrị ụmụ nwanyị bu ọrịa AIDS ọsọ karịa otú e si agbara ndị nke nwoke, karịsịa n’ụfọdụ mba ndị ka na-emepe emepe. Ọ bụrụ na nwanyị dị ime, ahụ́ ike nke nwa ya nọ n’ihe ize ndụ; ọ bụrụ na ọ mụtaworị ụmụ, ilekọta ha ga-esiri ya ike, karịsịa ma ọ bụrụ na o nweghị di. Ọzọkwa, ihe ọmụma e nwere banyere otú ndị inyom bu nje HIV si akpa àgwà na otú a pụrụ isi nye ha ọgwụgwọ, dị nnọọ nta.

Ọdịbendị ụfọdụ na-eme ka ndị inyom nọrọ n’ihe ize ndụ karịsịa. N’ọtụtụ mba, a dịghị atụ anya ka ndị inyom na-ekwu banyere ihe ndị metụtara mmekọahụ, ha na-anọkwa n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e dinara n’ike ma ha jụ inwe mmekọahụ. Ndị ikom na-enwekarị ọtụtụ ndị inyom ha na ha na-enwe mmekọahụ, ha na-ebunyekwa ha ọrịa AIDS n’amaghị ama. Ụfọdụ ndị ikom nọ n’Africa na-edina ụmụ agbọghọ ndị ka na-etopụta etopụta iji zere ibute ọrịa a ma ọ bụ n’ihi nkwenkwe ụgha bụ́ na ọrịa AIDS pụrụ ịla ma nwoke bu ya dịnaa nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Ka a sịkwa ihe mere òtù WHO ji kwuo, sị: “A ghaghị ilebara ndị ikom (nakwa ndị inyom) anya ma ọ bụrụ na a ga-echebe ndị inyom.”

[Foto]

PERU Otu nne bu nje HIV na nwa ya nwanyị nke na-ebughị nje HIV

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Annie Bungeroth/Panos Pictures

[Foto]

THAILAND Ebe ụmụ akwụkwọ na-eleta onye na-arịa ọrịa AIDS, dị ka otu akụkụ nke ihe ọmụmụ ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Ian Teh/Panos Pictures

[Foto]

KENYA Ebe e so ndị nọ n’òtù bụ́ Ndị Inyom Ndị Bu Ọrịa AIDS na-enwe nzukọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Sven Torfinn/Panos Pictures

[Igbe/Foto dị na peeji nke 29]

Echiche Ụgha Ndị E Nwere Banyere Ọrịa AIDS

▪ Ndị bu nje HIV na-ata ahụ́ n’anya. “Ná nkezi, ọ na-ewe ihe dị ka afọ 10 ruo afọ 12 tupu onye bu nje HIV arịawa ọrịa AIDS,” ka Dr. Gerald J. Stine na-ekwu. “N’ime oge a, ihe mgbaàmà a ga-ahụ n’ahụ́ onye ahụ bu nje HIV ga-adị ole na ole ma ọ bụrụkwarị na ọ dị nke a ga-ahụ, ma ha nwere ike ibunye ya ndị ọzọ.”

▪ Ọ bụ nanị ndị na-edina ụdị onwe ha na-ebute ọrịa AIDS. Ná mmalite afọ ndị 1980, e weere na ọ bụ nanị ndị na-edina ụdị onwe ha na-ebute ọrịa AIDS. Otú ọ dị, taa, mmekọahụ n’etiti nwoke na nwanyị bụ ụzọ bụ́ isi e si ebufe ọrịa a n’ọtụtụ ebe n’ụwa.

▪ Iji ọnụ amị akụkụ ahụ́ nwoke na nwanyị bụ “mmekọahụ na-adịghị ize ndụ.” Dị ka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa si kwuo, “ọtụtụ nnyocha e mere egosiwo na a pụrụ ibute nje HIV na ọrịa ndị ọzọ a na-ebute site ná mmekọahụ site n’iji ọnụ amị akụkụ ahụ́ nwoke na nwanyị.” Ihe ize ndụ dị n’ibunye mmadụ nje HIV site n’iji ọnụ amị akụkụ ahụ́ nwoke na nwanyị aharughị ka nke dị n’ụdị mmekọahụ ndị ọzọ. Ka o sina dị, ụdị mmekọahụ ahụ aghọwo ihe jupụtara nnọọ ebe nile nke na ụfọdụ ndị dọkịta na-atụ anya na ọ ga-aghọ ụzọ dị ịrịba ama e si ebute nje HIV.

▪ A na-agwọta ọrịa AIDS agwọta. Ọ bụ ezie na ọgwụ ndị e ji alụso nje HIV ọgụ pụrụ ime ka nje HIV ghara ịkpata ọrịa AIDS ngwa ngwa n’ahụ́ ụfọdụ ndị ọrịa, ka ọ dị ugbu a, e nweghị ọgwụ ọ bụla e ji egbochi ma ọ bụ na-agwọ ya.

[Foto]

CZECH REPUBLIC Ebe a na-amịrị ọbara mmadụ iji chọpụta ma ò bu ọrịa AIDS

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Liba Taylor/Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 26]

ZAMBIA Ebe ụmụaka nwanyị abụọ bu nje HIV nọ na-eche ịnara ọgwụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Pep Bonet/Panos Pictures