Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ngwọta nke Ọrịa AIDS—A Chọrọ Ya Ngwa Ngwa!

Ihe Ngwọta nke Ọrịa AIDS—A Chọrọ Ya Ngwa Ngwa!

Ihe Ngwọta nke Ọrịa AIDS—A Chọrọ Ya Ngwa Ngwa!

Grace na-ere akpụkpọ ụkwụ ndị dara oké ọnụ n’Ahịa Ezumezu nke Lilongwe, Malawi. O yiri onye obi dị ụtọ nakwa onye ahụ́ siri ike. Otú ọ dị, ihu ọchị ya na-eme ka a ghara ịmata ọnọdụ dị mwute ọ nọ na ya.

N’afọ 1993, Grace na di ya ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe a mụrụ nwa ha nwanyị, bụ́ Tiyajane. Ná mmalite, Tiyajane yiri onye ahụ́ siri ike. Ma, n’oge na-adịghị anya, ọ malitere ịta ahụ́ ma na-arịa ọrịa dịgasị iche iche n’esepụghị aka. Mgbe Tiyajane dị afọ atọ, ọrịa AIDS gburu ya.

Afọ ole na ole mgbe nke a gasịrị, di Grace malitekwara ịrịa ọrịa. Otu ụbọchị, ọ tụbọrọ, e buru ya gaa ụlọ ọgwụ. Ndị dọkịta azọpụtalighị ya. Di Grace, bụ́ onye ya na ya lụworo ruo afọ asatọ, nwụrụ n’ihi ọrịa AIDS.

Grace bi nanị ya ugbu a n’ụlọ nwere nanị otu ọnụ ụlọ, bụ́ nke dị n’ebe dị nso na Lilongwe. Mmadụ pụrụ ịtụwa anya na ebe ọ bụ na Grace dị afọ 30, ọ ga-amalite ndụ ya n’isi. Otú ọ dị, ọ na-akọwa, sị: “Ebukwa m nje HIV, n’ihi ya, agaghị m alụ di ma ọ bụ mụọ ụmụ ọzọ.” *

N’ỤZỌ dị mwute, ahụmahụ dị otú ahụ abụtụghị ihe ọhụrụ na Malawi, bụ́ ebe e mere atụmatụ na ihe dị ka pasent 15 nke ndị bi na ya bu nje HIV. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Globe and Mail na-akọwa na n’otu ụlọ ọgwụ dị n’otu ime obodo, “ndị e nyere àkwà n’ụlọ ọgwụ ahụ ji pasent 50 karịa ókè ha kwesịrị ịharu, ihe karịkwara pasent 50 nke ndị ọrụ ahụ́ ike nke ụlọ ọgwụ a akwụsiwo ọrụ” n’ihi ọrịa AIDS. Ndị bu nje HIV ná mba Africa ndị ọzọ dị na ndịda Sahara dị ukwuu ọbụna karịa. N’afọ 2002, Ụlọ Ọrụ Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka HIV/AIDS (UNAIDS) kọrọ, sị: “Ná nkezi, afọ ndụ mmadụ ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara bụ afọ 47 ugbu a. E wezụga ọrịa AIDS, ọ gaara abụ afọ 62.”

Otú ọ dị, ọrịa AIDS jupụtara ebe nile, na-agbasa ruo n’ebe dịgasị iche iche na-abụghị kọntinent Africa. Òtù UNAIDS na-eme atụmatụ na ihe dị ka nde anọ nke ndị toruworo ogo mmadụ n’India bu nje HIV, ma gaa n’ihu ikwu, sị: “Dabere n’ọnụ ọgụgụ nke ndị bu nje a ugbu a, ọrịa AIDS ga-abụ ihe ga-akasị egbu ndị toruworo ogo mmadụ n’iri afọ nke a.” Ọrịa a na-agbasa n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị ukwuu ná mba ndị so n’Òtù Commonwealth nke Mba Ndị Nweere Onwe Ha, bụ́ òtù nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ihe mejupụtara ya bụ mba ndị dị n’ebe bụbu Soviet Union. Otu akụkọ na-ekwu na, na Uzbekistan, “ọnụ ọgụgụ ndị butere ọrịa AIDS nanị n’afọ 2002 ka hie nne ma e jiri ha tụnyere nke ndị butere ya n’afọ iri bu ụzọ.” Na United States, ọrịa AIDS anọgidewo na-abụ ihe kasị egbu ndị America nọ n’agbata afọ 25 na afọ 44.

Oge mbụ Teta! bipụtara usoro isiokwu kwuru banyere ọrịa AIDS bụ n’afọ 1986. N’afọ ahụ, Dr. H. Mahler, onye bụ́bu onyeisi nke Òtù Ahụ́ Ike Ụwa, dọrọ aka ná ntị na ọ pụrụ ịbụworị na ihe dị ka nde mmadụ iri ebutela ọrịa AIDS. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 20 mgbe nke a gasịrị, ọnụ ọgụgụ ndị bu ọrịa a n’ụwa nile amụbawo ruo ihe dị ka nde mmadụ 42, na-eji ihe karịrị okpukpu iri amụba karịa ọnụ ọgụgụ ndị a na-amụ n’ụwa! Ndị ọkachamara na-ekwu na o yighị ka ọdịnihu ọ̀ ga-aka mma. “Ná mba 45 ndị nje a kasị akpa aka ọjọọ,” ka òtù UNAIDS na-ekwu, “e mere atụmatụ na, n’agbata afọ 2000 na afọ 2020, nde mmadụ 68 ga-anwụchu ọnwụ n’ihi ọrịa AIDS.”

N’ihi ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu ọrịa a si na-agbasa, ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ a chọrọ ihe ngwọta nke ọrịa AIDS ngwa ngwa otú a. N’ihi ya, ndị na-eme nnyocha banyere ahụ́ ike anọgidewo na-agbasi mbọ ike iji lụso nje HIV ọgụ. Olee ọganihu ndị e nweworo n’ọgụ a na-alụso ọrịa a na-egbu ọtụtụ mmadụ? Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụwa anya na ọrịa AIDS ga-akwụsị?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A ma nje HIV, ma ọ bụ nje na-ebelata ikike ahụ́ mmadụ ji alụso ọrịa ọgụ, dị ka nje na-akpata ọrịa AIDS.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]

N’ụwa nile, ihe dị ka nde mmadụ 42 bu ọrịa AIDS; nde mmadụ 2.5 n’ime ha bụ ụmụaka

[Foto dị na peeji nke 24]

INDIA Ebe ndị ọrụ ahụ́ ike, bụ́ ndị na-arụ ọrụ afọ ofufo, na-anara ọzụzụ banyere ọrịa AIDS

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Peter Barker/Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 24]

BRAZIL Ebe otu onye ọrụ ebere na-akasị otu nwanyị na-arịa ọrịa AIDS obi

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Sean Sprague/Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 24]

THAILAND Ebe otu onye ọrụ afọ ofufo na-elekọta otu nwa bu ọrịa AIDS pụta ụwa

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Ian Teh/Panos Pictures