Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Intanet—Otú A Pụrụ Isi Zere Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya

Intanet—Otú A Pụrụ Isi Zere Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya

Echiche nke Bible

Intanet—Otú A Pụrụ Isi Zere Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya

N ’OTU obodo nta dịpụrụ adịpụ n’India, otu onye ọrụ ugbo achọpụta ihe a na-ere soybean na Chicago, U.S.A., iji mata mgbe kasị mma ọ ga-ere nke ya. N’otu mgbe ahụ, otu nwanyị laworo ezumike nká amụmụọ ọnụ ọchị ka ọ na-agụ ozi E-mail nwa nwa ya ziteere ya, otu onye njem ahụ otú ihu igwe ga-adị n’ebe ọ na-aga, otu nne achọtakwa ihe ọmụma ga-enyere nwa ya aka ime ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere ya mee n’ụlọ—ha chọtachara ihe a nile n’Intanet. N’ịbụ nke a na-eme atụmatụ na nde mmadụ 600 na-eji eme ihe n’ụwa nile, Intanet agbanwewo ụzọ ụwa si ezirịta ozi ma na-achụ nta ego.

Ọgbọ nke ndị na-eto eto, bụ́ nke a na-akpọ Ọgbọ Kọmputa mgbe ụfọdụ, kasị eji Intanet eme ihe. N’ụzọ na-arịwanye elu, ụmụ akwụkwọ jizi ya edochi anya ọ́bá akwụkwọ dị ka ebe bụ́ isi ha si enweta akụkọ ụwa ma na-eme nnyocha. “N’ikwu ya n’ụzọ dị nkenke, ụmụ akwụkwọ ndị a . . . na-eji ya eme ihe n’ihe ọmụmụ ha nile,” ka Deanna L. Tillisch, bụ́ ọga kpata kpata n’otu ihe ọmụmụ metụtara ụmụ akwụkwọ sekọndrị nọ n’ogo dị elu na United States, na-ekwu. Ee, Intanet bụ ngwá ọrụ bara uru n’ụwa anyị a.

Dị ka ọ na-adịkarị, ka ngwá ọrụ siri ike karị, otú ahụ ka ọ pụrụ ịdị ize ndụ karị. Injin e ji awa osisi pụrụ ịrụpụta ihe buru nnọọ ibu karịa mma ịwa osisi; n’agbanyeghị nke ahụ, a ghaghị ịkpachapụ anya ma e jiri ya na-eme ihe. N’otu aka ahụ, Intanet dị nnọọ ike ma baa uru, ma anyị aghaghị ịkpachapụ anya mgbe anyị ji ya na-eme ihe, ebe ọ bụ na e nwekwara oké ihe ize ndụ ndị dị na ya. Nchegbu a na-enwe banyere ihe ize ndụ ndị a akpaliwo ihe karịrị mba 40 so na Kansụl Europe idepụta iwu ndị ha kwekọrịtara na ha ga-agbaso iji chebe ọha na eze pụọ ná mpụ Intanet.

Gịnị mere e ji na-enwe nchegbu nile a? Olee ụfọdụ ihe ize ndụ ya ndị kasị enye Ndị Kraịst nsogbu? Hà kwesịrị ime ka ị ghara iji Intanet na-eme ihe? Olee nduzi Bible na-enye banyere ya?

Mkpa Ọ Dị Ịkpachara Anya

Ọtụtụ narị afọ gara aga, Bible dọrọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ na-esi n’aka ndị ajọ mmadụ, bụ́ ndị a kọwara dị ka ‘ndị nwe nzube ọjọọ nile’ nakwa ‘ndị na-eche ime ihe ọjọọ.’ (Ilu 24:8) Jeremaịa onye amụma kọwara ha dị ka “ndị na-emebi iwu” bụ́ ndị “ụlọ nile ha jupụtara n’aghụghọ.” Dị ka ndị osi ọnyà, ha “esiwo ọnyà” iji na-anwụde ndị mmadụ na iji “bụrụ ọgaranya.” (Jeremaịa 5:26, 27) Nkà na ụzụ emewo ka e nwee “ndị na-emebi iwu” nke oge a bụ́ ndị na-esi ọnyà ọgbara ọhụrụ iji ghọgbuo ndị mmadụ. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ ha na-echepụta bụ́ ndị pụrụ ịdị oké ize ndụ nye Ndị Kraịst.

Ụlọ ọrụ na-emepụta ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet na-akpata nde dollar 2.5 kwa afọ. Ọnụ ọgụgụ ebe ndị a na-edebe ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet arịala nnọọ elu ruo ihe fọrọ nke nta ka o jiri pasent 1,800 karịa otú ọ ha n’afọ ise gara aga. A na-eme atụmatụ na, ka ọ dị ugbu a, ebe ndị a na-edebe ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet dị nde 260, ọnụ ọgụgụ ahụ anọgidewokwa na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị ụdị ya. “Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ejupụtawo n’Intanet nke na o sigburu onwe ya n’ike izere ịhụ ha mgbe ị na-achọghị, nke a na-emekwa ka ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet ghọkwuo ihe nwere ike iri mmadụ ahụ́,” ka Dr. Kimberly S. Young, bụ́ ọga kpata kpata nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Intanet Iri Mmadụ Ahụ́, kwuru.

Bible na-agwa anyị na “a na-anwa onye ọ bụla site n’ọchịchọ nke aka ya ịrapụta ya ma raa ya ụrà.” (Jems 1:14) N’ile onye ọ bụla nwere kọmputa anya dị ka anụ oriri, ndị na-emepụta ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-eji ụzọ aghụghọ dị iche iche eme ihe iji dọrọ ‘ọchịchọ’ onye ọ bụla, ya bụ, “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya.” (1 Jọn 2:16) Nzube ha bụ ‘ịrata’ ndị ji Intanet eme ihe bụ́ ndị na-amaghị ihe na-aganụ.—Ilu 1:10.

Dị ka ndị na-emebi iwu nke oge Bible, ndị na-emepụta ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-ejikarị aghụghọ eme ihe. A na-eme atụmatụ na, ná mgbalị siri ike ha na-eme ịrata ndị ọhụrụ, ha na-ezipụ ihe dị ka ijeri ozi E-mail abụọ kwa ụbọchị. Mgbe mgbe, ozi E-mail ndị ị na-ekwughị ka e zitere gị a na-ezite, na-enwe isiokwu ndị yiri ka ha adịghị ize ndụ. Otú ọ dị, i mepee otu, ị pụrụ ịhụ ọtụtụ foto ndị rụrụ arụ bụ́ ndị ịkwụsị ikiri ha ga-esiri gị ike. Ịrịọ ka ewepụ aha gị ná ndị a na-ezitere ya pụrụ ime ka ha zitewekwuoro gị imirikiti ihe ndị ọzọ na-akpali agụụ mmekọahụ bụ́ ndị ị na-ekwughị ka ha zite.

Osi ọnyà na-eji nlezianya awụsa mkpụrụ ọghịgha n’ụzọ. Nnụnụ na-amaghị ihe na-aganụ ana-atụrụ mkpụrụ ndị ahụ na-atọ ya ụtọ otu otu ruo mgbe ọ ga-anụ kpam! ọnyà ejidela ya. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọchịchọ ịmata ihe na-eduba ụfọdụ ndị n’inyobatụ anya na foto ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Ọ na-adịkwa ndị na-ekiri ihe ndị a ka ọ ghara ịdị onye ga-ahụ ha. N’ịhụ ya dị ka ihe na-adọrọ adọrọ, ụfọdụ na-agaghachi ugboro ugboro ikiri foto ndị a na-akpali akpali ma dị ike. Ihere na obi amamikpe pụrụ ijide ha. Ka oge na-aga, ihe na-awụbu ha akpata oyi n’ahụ́ pụrụ ịdịzi ha ka ọ dịghị ihe ọ bụ. Nye ndị na-enwe ọchịchọ ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, Intanet dị ka fatịlaịza nke na-eme ka ọchịchọ mmadụ too ngwa ngwa ma ghọọ mmehie. (Jems 1:15) N’ikpeazụ, ndị dị otú ahụ pụrụ inwe “‘àgwà nzuzo’ nke ihe bụ́ isi e ji mara ya bụ agụụ mmekọahụ a na-achịkwaghị achịkwa ha ji aka ha emejụ bụ́ nke na-ekwekọghị n’ụkpụrụ omume ọma,” ka Dr Victor Cline, bụ́ ọkà n’akparamàgwà mmadụ nke gwọrọla ọtụtụ narị ndị dabaworo n’ọnyà a, na-akọ.

Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Ebe A Na-akparịta Ụka n’Intanet

Ebe a na-akparịta ụka n’Intanet pụrụ ịbụ ebe na-eri oge mmadụ, a makwa ya ama dị ka ihe na-emebikarị mmekọrịta. N’igosipụta iwe ya n’oge nwunye ya na-etinye n’Intanet, otu nwoke dere, sị: “Mgbe ọ bụla ọ lọtara ọrụ, kọmputa anyị na-amalite ọrụ, ọ pụkwara ịnọgide na ya ruo awa ise ma ọ bụ karịa tupu ya agbanyụọ ya. Alụmdi na nwunye anyị na-achọ itisa n’ihi ya.” Ee, oge i tinyere n’Intanet bụ oge i ji soro ndị na-abụghị ndị ezinụlọ gị nọkọọ.

Angela Sibson, bụ́ ọga kpata kpata nke ụlọ ọrụ na-enye ndụmọdụ banyere alụmdi na nwunye bụ́ ụlọ ọrụ Relate, na-ekwu na Intanet “bụ ọnụ ụzọ e si abanye ná mkpakọrịta ndị ọzọ. Ha pụrụ ịdị nnọọ ike ma na-emebi mmekọrịta nke e nwere enwe.” Ihe malitere dị ka mkparịta ụka enyi na enyi n’Intanet pụrụ ịghọ ihe ọzọ ngwa ngwa. N’ịbụ ndị kpebisiri ike inwe mmekọahụ rụrụ arụ, ndị ‘e cheworo obi ha’ na-eji “ire ụtọ” agwa ndị ha chọrọ inweta ihe ga-adị ha ụtọ ná ntị. (Ilu 6:24; 7:10) Nicola, bụ́ onye dị afọ 26 nke si United Kingdom, bụ́kwa onye mara n’ọnyà ha, na-akọwa, sị: “Ọ dị ka iji ịhụnanya egbu m. Ọ nọgidere na-ekwu na m bụ ugo mma, mụ ekwere.” Dr. Al Cooper, bụ́ editọ nke akwụkwọ bụ́ Sex and the Internet: A Guidebook for Clinicians, na-ekwu na ọ dị anyị mkpa “ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere nsogbu nke na-amalite site n’iji Intanet eme mfegharị ma na-ejedebekarị n’ịgba alụkwaghịm.”

“Ndị ji kọmputa ada iwu mmekọahụ” na-akadị enweta ụmụaka ma na-emerụ ha ahụ́. N’iji “ọnụ na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ” na “egbugbere ọnụ nke na-ekwuhie ekwuhie” eme ihe, ndị na-edina ụmụaka na-elekwasị ụmụaka ndị na-enweghị uche anya. (Ilu 4:24; 7:7) N’ime ihe a maara dị ka nkwadebe, ha na-eji nlebara anya, ịhụnanya, na obiọma egbu nwa ahụ iji mee ka ọ dị ya ka ọ̀ bụ ọpụrụiche. Ọ na-eyi ka hà maara ihe nile nwata nwere mmasị na ha, gụnyere egwú na ihe omume ntụrụndụ ndị kasị amasị ya. Ha na-eme ka obere nsogbu e nwere n’ezinụlọ nwa ahụ yie oké ihe iji mee ka ya na ezinụlọ ya kewaa. Iji mezuo nzube ọjọọ ha, ha pụrụ ọbụna izigara onye ha chọrọ inweta tiketi ọ ga-eji mee njem gaa mba ọzọ. Ihe ndị na-esi na ha pụta na-emenye ụjọ.

Ụkpụrụ Bible Pụrụ Ichebe Gị

Mgbe ụfọdụ ndị tụlesịrị ihe ize ndụ ndị dị na ya, ha ekpebiwo na ọ kaara ha mma izere iji Intanet eme ihe kpamkpam. Otú ọ dị, anyị aghaghị ikweta na ọ bụ nanị ebe ole na ole a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet dị ize ndụ, nakwa na ihe ka ukwuu ná ndị na-eji ya eme ihe enwetabeghị nsogbu ndị dị oké njọ.

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Akwụkwọ Nsọ na-enye anyị nduzi iji ‘chebe’ anyị pụọ n’ihe ize ndụ. A gbara anyị ume inweta ihe ọmụma, amamihe, na izuzu. Àgwà ndị dị otú a ‘ga na-eche anyị nche’ iji ‘napụta anyị n’ụzọ onye ọjọọ.’ (Ilu 2:10-12) “Ma amamihe, olee ebe o si bịa?” ka ohu Chineke nke oge ochie bụ́ Job jụrụ. Azịza ya abụrụ gịnị? “Egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe.”—Job 28:20, 28.

“Egwu Jehova,” nke “bụ́ ịkpọ ihe ọjọọ asị,” bụ ihe ndabere maka ịzụlite àgwà ndị na-atọ Chineke ụtọ. (Ilu 1:7; 8:13; 9:10) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na nsọpụrụ anyị na-enye ya, tinyere ùgwù kwesịrị ekwesị anyị na-akwanyere ikike na ịbụisi ya, ga-eme ka anyị kpọọ ihe ọjọọ ọ kpọrọ asị asị, ma zere ha. Ikike nke iche echiche nke ọma, tinyere amamihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke, na-enyere anyị aka ịmata ihe ize ndụ ndị pụrụ imerụ uche, obi, na ọnọdụ ime mmụọ anyị. Anyị na-abịa kpọọ ịchọ ọdịmma onwe nanị na anyaukwu asị, bụ́ ndị pụrụ itisa ezinụlọ anyị ma mebie mmekọrịta anyị na Jehova.

Ya mere, ọ bụrụ na ị na-eji Intanet eme ihe, kpachara anya maka ihe ize ndụ ndị dị na ya. Kpebisie ike idebe iwu Chineke, ma zere iji nsogbu egwuri egwu. (1 Ihe E Mere 28:7) Ọ bụrụzie na ị hụ ihe ize ndụ ndị dị n’Intanet, jiri amamihe gbanahụ ha.—1 Ndị Kọrint 6:18.

[Igbe dị na peeji nke 17]

ZERE IHE NDỊ NA-AKPALI AGỤỤ MMEKỌAHỤ KPAMKPAM!

“Ka a ghara ihotadị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu n’etiti unu, dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ.”—Ndị Efesọs 5:3.

“Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe metụtara ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ na-emerụ ahụ́, na ọchịchọ anyaukwu.”—Ndị Kọlọsi 3:5.

“Nke a bụ uche Chineke, . . . ka onye ọ bụla n’ime unu mara ụzọ isi chịkwaa arịa nke onwe ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ, ọ bụghị n’agụụ mmekọahụ nke ọchịchọ anyaukwu bụkwa ụdị nke mba ndị na-amaghị Chineke nwere.”—1 Ndị Tesalonaịka 4:3-5.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

KPACHARA ANYA BANYERE EBE NDỊ A NA-AKPARỊTA ỤKA N’INTANET!

Otu nwanyị bụ́ onye uwe ojii nke bụ́ ọkachamara n’ịchọpụta mpụ Intanet, kpọrọ onye edemede Teta! ka ọ bịa hụ ihe ize ndụ ndị dị n’ebe ndị a na-akparịta ụka n’Intanet. Nwanyị ahụ banyere n’otu ebe a na-akparịta ụka n’Intanet, mee ka a ga-asị na ọ bụ nwa agbọghọ dị afọ 14. N’ime ihe dị ka sekọnd ole na ole, ọtụtụ ndị kpọtụụrụ ya. Ndị ahụ jụrụ ajụjụ ndị dị ka: “Ebee ka i si?” “Ị̀ bụ nwoke ka ị̀ bụ nwanyị?” “Ànyị pụrụ ịkparịta ụka?” Ọtụtụ n’ime ndị jụrụ ajụjụ a bụ ndị a na-enyo enyo na ha na-emebi mmadụ n’ụzọ mmekọahụ, bụ́kwanụ ndị ndị uwe ojii nọ na-achọ ijide. Nke ahụ na-egosi otú ọ pụrụ isi dịrị onye na-edina ụmụaka mfe iso nwa gị malite mkparịta ụka n’Intanet!

Ụfọdụ ndị nne na nna na-eche na ụmụ ha enweghị nsogbu mgbe ha na-akparịta ụka n’Intanet, ebe ọ bụ na onye ọ bụla nọ na ya na-ahụ ihe ibe ya na-akparịta. Otú ọ dị, ozugbo ị banyere n’ebe a na-akparịta ụka n’Intanet, mmadụ pụrụ ịgwa gị ka nanị gị na ya kparịta ụka. N’izo aka n’omume a, bụ́ nke a na-akpọ ‘ịgba izu’ mgbe ụfọdụ, Ụlọ Ọrụ Na-echebe Ụmụaka Pụọ na Mpụ Intanet na United Kingdom na-adọ aka ná ntị, sị: “Nke a dị ka isi ná nnọkọ ndị mmadụ juru pụọ ma banye n’ọnụ ụlọ dị iche iji soro onye ị na-amaghị kparịta ụka, nanị unu abụọ.”

Ọ dịkwa mkpa ka ndị nne na nna ghọta na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-edina ụmụaka adịghị achọ nanị iso nwatakịrị kparịta ụka. Otu akwụkwọ Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Mpụ Intanet dere, na-akọ, sị: “A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ, dị ka e-mail na fon (e ji agagharị agagharị), mee ka mmekọrịta malitere n’ebe a na-akparịta ụka n’Intanet, gaa n’ihu.” Otu akụkọ e si n’aka Ụlọ Ọrụ Gọọmenti United States nke Na-eme Nchọpụta nweta, na-akọ, sị: “Ọ bụ ezie na ọ na-atọ onye ji kọmputa ada iwu mmekọahụ ụtọ iso nwatakịrị ọ chọrọ inweta kparịta ụka n’Intanet, ọ pụkwara ịbụrụ ya nnọọ ihe isi ike. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-achọ iso ụmụaka kparịta ụka na telifon. Ha na-esikarị na fon akpali ụmụaka inwe agụụ mmekọahụ ma na-achọkarị iyi oge na ebe ha ga-ezute iji nwee mmekọahụ.”

Iji mezuo nke a, ndị ji kọmputa ada iwu mmekọahụ na-enye ụmụaka nọmba fon ha. Ọ bụrụ na nwa gị akpọọ ha, ha ga-ahụ nọmba fon nwa gị n’ebe na-egosi onye kpọrọ fon. Ndị ọzọ na-emebi mmadụ nwere nọmba fon ndị ọ ga-abụ nwa ahụ kpọọ, ọ gaghị akwụ ụgwọ ma ọ bụ ha na-agwa nwa ahụ na ọ bụ ha ga-akwụ ụgwọ fon ma ọ kpọọ ha. Ọbụna ụfọdụ eziteworo nwata fon e ji agagharị agagharị. Ha pụkwara izitere ya akwụkwọ ozi, foto, na onyinye.

Ọ bụghị nanị ụmụaka na-adaba n’ihe ize ndụ ndị dị n’ebe a na-akparịta ụka n’Intanet. N’iji olu ụtọ gwa ụmụ nwanyị ihe dị ha ụtọ ná ntị, otu nwoke nọ na United Kingdom mere ka ụmụ nwanyị isii hụ ya n’anya n’otu mgbe na nso nso a. Otu n’ime ụmụ nwanyị ndị a, bụ́ Cheryl, bụ́ nwa akwụkwọ mara mma nke dị afọ 27, bụ́kwa onye nwetaworo akara ugo mmụta bachelor na Mahadum, kwuru, sị: “Apụghị m nnọọ ịkọwa ya ugbu a. Mmekọrịta mụ na ya bịara sie nnọọ ike nke na ọ bịara na-echu m ụra.”

“Ụmụ nwanyị na-ahụta mkparịta ụka ha na-enwe n’Intanet dị ka ihe nkasi obi n’ihi na onye ha na ha na-akparịta adịghị adabere n’ọdịdị ahụ́ ha wee na-ele ha anya,” ka Jenny Madden, bụ́ onye guzobere òtù bụ́ Ụmụ Nwanyị Ndị Nọ n’Ebe A Na-enwe Mkparịta Ụka n’Intanet, na-ekwu. “Ma ha na-eme ka ịghọgbu ha dị mfe n’ihi na mmadụ na-enwekarị ọchịchọ ịkọ ọtụtụ ihe banyere onwe ya ozugbo, nke ka nke n’ebe a na-akparịta ụka n’Intanet.”

“M gbanyehaala kọmputa m, ana m ahụ ọtụtụ puku ụmụ nwanyị ndị m na-esi n’ime ha ahọrọ onye mụ na ya ga-akparịta ụka,” ka otu nwoke a gbara ajụjụ ọnụ ná nchọpụta Beatriz Avila Mileham meere Mahadum nke Florida, kwuru. Beatriz kwuru, sị: “N’isi nso, Intanet ga-aghọ ụzọ kasịnụ e si egosipụta ekwesịghị ntụkwasị obi, ma ọ bụrụkwa na ọ ghọbeghị.” “Anyị na-anụ ka ndị na-agwọ ọrịa ná mba a na-akọ na agụụ mmekọahụ e si n’Intanet akpali bụ isi ihe na-akpata nsogbu alụmdi na nwunye,” ka Dr. Al Cooper, bụ́ editọ nke akwụkwọ bụ́ Sex and the Internet: A Guidebook for Clinicians, kwuru.

N’iburu eziokwu ndị a na-akpali iche echiche n’uche, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịkpachara nnọọ anya mgbe i ji Intanet na-eme ihe. Gwa ụmụ gị okwu, ma kụziere ha otú ha ga-esi chebe onwe ha pụọ n’ihe ize ndụ. N’ịbụ onye nwetaworo ihe ọmụma kwesịrị ekwesị, ị pụrụ izere ihe ize ndụ ndị dị n’Intanet.—Eklisiastis 7:12.