Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Enyi Dị Anyị Nile Mkpa

Ndị Enyi Dị Anyị Nile Mkpa

Ndị Enyi Dị Anyị Nile Mkpa

“Enyi gị bụ onye ị pụrụ ịkọrọ ihe ọ bụla n’ezoghị ọnụ, onye ị pụrụ ịkpọ na fon mgbe ọ bụla n’ụbọchị.” —Yaël, France

“Enyi gị na-aghọta mgbe obi na-adịghị gị mma, obi na-adịkwa ya otú ahụ ọ dị gị.” —Gaëlle, France

“ONYE na-ahụ n’anya dị nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.” (Ilu 18:24) Kemgbe e dekọrọ okwu ndị ahụ n’ime Bible n’ihe dị ka afọ 3,000 gara aga, ọdịdị ụmụ mmadụ agbanwebeghị. Ọbụbụenyi ka dị oké mkpa nye mmụọ mmadụ otú nri na mmiri si dị mkpa nye ahụ́ mmadụ. Otú ọ dị, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike igbo mkpa a bụ́ isi nke bụ́ inwe ndị enyi. Owu ọmụma juru ebe nile. “O sighị ike ịmata ụfọdụ n’ime ihe ndị na-akpata ya,” ka Carin Rubenstein na Phillip Shaver na-ekwu n’akwụkwọ ha bụ́ In Search of Intimacy. Ha kwuru na ụfọdụ n’ime ihe ndị na-akpata ya bụ “ndị mmadụ ịgbanwe ebe obibi ha site n’oge ruo n’oge,” ibi ‘n’obodo ndị onye ọ bụla na-agara onwe ya, bụ́kwa ndị mpụ karịrị akarị na ha,’ na “ojiji ndị mmadụ jizi ikiri telivishọn na vidio dochie iso ibe ha akpakọrịta.”

Ndụ a na-ebi n’oge a na-amịkọrọkwa ike na oge anyị. “Onye bi n’obodo ukwu taa na-ezute ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ukwuu n’izu karịa ka onye biiri n’ime obodo na narị afọ nke iri na asaa zutere n’ime otu afọ ma ọ bụ ọbụna ná ndụ ya nile,” ka Letty Pogrebin na-ede n’akwụkwọ ya bụ́ Among Friends. Ebe e nwere ọtụtụ narị ndị anyị na-amata ná ndụ, ọ pụrụ isi ike anyị na otu onye ịkpagide ruo n’ókè nke iso ya malite ma nọgide na-abụ ezigbo enyi.

Ọbụna n’ebe ndị a na-adịchaghị ebi ndụ gbalụ gbalụ n’oge na-adịbeghị anya, mmekọrịta ndị mmadụ na ibe ha na-agbanwezi n’ike n’ike. “N’oge mbụ, anyị na ndị enyi anyị na-akpachi anya,” ka Ulla, bụ́ onye bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, na-ekwu. “Ma ugbu a, ọtụtụ mmadụ na-emikpu onwe ha n’ọrụ ha ma ọ bụ n’ịchụso ihe onwe onye. Onye ọ bụla ji ọrụ n’aka mgbe nile, anyị na-achọpụtakwa na anyị na ndị enyi anyị nwerela enwe na-agbasa.” Ná ndụ gbalụ gbalụ a na-ebi n’oge a, anyị pụrụ iwere ọbụbụenyi dị ka ihe na-adịchaghị mkpa.

Ma mkpa anyị na-enwe maka ndị enyi nọgidere na-esi ike. Ọ kasị njọ n’ebe ndị na-eto eto nọ. Dị ka Yaël, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru n’elu na-akọwa, “mgbe ị dị obere, ọ dị gị mkpa inwe mmetụta nke ịbụ onye a nabatara na onye so biri, nke ịbụ onye ya na mmadụ dị ná mma.” Ọbụbụenyi obi ụtọ, nke nwekwara nzube, dị anyị nile, ma okenye ma nwata, mkpa. N’agbanyeghịkwa ihe ịma aka ndị ọ na-eweta, e nwere ọtụtụ ihe anyị pụrụ ime iji mete ezi ndị enyi ma jidesie ha ike. Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle nke a.