Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Mgbe Ọrịa AIDS Ga-akwụsị?

Olee Mgbe Ọrịa AIDS Ga-akwụsị?

Olee Mgbe Ọrịa AIDS Ga-akwụsị?

Site na nwata, ndị ntorobịa na-enweta imirikiti ozi ndị na-akwalite inwe mmekọahụ aghara aghara. Isi n’akwara agbanye ọgwụ ọjọọ n’ahụ́, bụ́ ụzọ ọzọ dị ịrịba ama e si ebute nje HIV, jukwara ebe nile. N’iburu n’uche otú àgwà ọjọọ si jupụta ebe nile taa, ị pụrụ iche ma ọ̀ dị mgbe ọrịa AIDS ga-akwụsị.

N’ỤZỌ dabara adaba, ndị ọkachamara banyere ahụ́ ike na-ekwu na ime mgbanwe n’akparamàgwà bụ ihe dị oké mkpa n’ọgụ a na-alụso ọrịa AIDS. Otu akụkọ Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa bipụtara na-ekwu, sị: “Ọ dị ọgbọ ọ bụla nke ndị na-eto eto mkpa ịnọgide na-enweta ihe ọmụma sara mbara banyere ụzọ ha ga-esi na-elekọta ahụ́ ha bụ́ nke ga-enyere ha aka ịzụlite nkà ndị ga-adịru ogologo ndụ ha nile bụ́ ndị ga-eme ka ha zere akparamàgwà ndị pụrụ ime ka ha bute nje HIV. Ndị nne na nna na ndị nkụzi kwesịrị ikere òkè n’ihe omume dị otú ahụ sara mbara.”

N’ụzọ doro anya, ọ dị ndị nne na nna mkpa ịkụziri ụmụ ha ihe ize ndụ ndị a tupu ndị ọgbọ ha ma ọ bụ ndị ọzọ eduhie ha. Nke a anaghị adị mfe mgbe nile. Ma, ọ pụrụ ichebe ndụ nwa gị. Ime ka ụmụaka mara banyere mmekọahụ na ọgwụ ọjọọ ekwesịghị imebi ha. Ọ pụrụ n’ezie ime ka ha ghara imebi.

Ọzụzụ Ndị Nne na Nna Dị Oké Mkpa

N’etiti ndị Chineke n’oge ochie, a tụrụ anya ka ndị nne na nna kụziere ụmụ ha ihe banyere mmekọahụ na ụzọ ha pụrụ isi chebe ahụ́ ike ha. Ọ dị mma ịmara na iwu ndị Izrel oge ochie gụnyere ụkpụrụ omume ndị doro anya na omume ndị chebere ha pụọ n’ibute ọrịa. (Levitikọs 18:22, 23; 19:29; Deuterọnọmi 23:12, 13) Olee otú a pụrụ isi kụziere ndị mmadụ iwu ndị a? Jehova Chineke gwara ndị Izrel, sị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị.” Ndị nne na nna aghaghị ibu ụzọ ghọta uru ịgbaso iwu ndị a bara na ihe agbasoghị ha pụrụ ịkpatara ha. Mgbe ahụ, a dụrụ ha ọdụ, sị: “Ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”—Deuterọnọmi 6:6, 7.

Okwu Hibru a sụgharịrị ‘izi ihe’ pụtara “ịkụzi ihe na ime ka ihe ruo mmadụ n’obi site n’ikwu ya ma ọ bụ ịgba ya ume, ugboro ugboro.” O doro anya na nke a na-ewe oge. Ndị nne na nna bụ́ ndị na-ewepụta oge iji kụziere ụmụ ha ndị nwoke na ndị nwanyị banyere ihe ize ndụ ndị dị n’iji ọgwụ ọjọọ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, nakwa n’inwe mmekọahụ rụrụ arụ, nọ n’ọnọdụ ka mma n’ezie ịhụ ka ụmụ ha na-ezere àgwà ndị pụrụ ime ka ha bute ọrịa AIDS na ọrịa ndị ọzọ. *

Nkasi Obi Maka Ndị Bu Ọrịa AIDS

Mgbalị ndị a na-eme igbochi ọrịa AIDS nwere ike ọ gaghị abụcha ihe nkasi obi nye ọtụtụ nde mmadụ bu ọrịa a. E wezụga mmetụta ọjọọ ọrịa ahụ na-enwe n’ahụ́ ha, ndị mmadụ na-elekarị ha anya ọjọọ ma na-agbara ha ọsọ n’ihi ọnọdụ ha. Gịnị kpatara ya? Otu ihe na-abụghị eziokwu nke e kweere n’ebe nile bụ na mmadụ pụrụ ibute nje HIV ma o mesa onye bu nje ahụ ahụ́. Ụjọ a na-atụ ibute ọrịa AIDS kwere nghọta, ebe ọ bụ na ọ na-efe efe ma na-egbu mmadụ. Ụfọdụ ekwewo ka ụjọ ha na-atụ ọrịa a mee ka ha tụwa ndị bu ya ụjọ na-enweghị isi. Ajụwo inye ndị bu ya ọgwụ, chụpụ ha na chọọchị, ma wakpo ha n’ike.

Ụfọdụ ndị ekwusiwo ya ike na ọrịa AIDS bụ ntaramahụhụ Chineke na-enye ndị na-emebi iwu. N’eziokwu, ịgbaso ụkpụrụ Bible nyere banyere mmekọahụ, iji ọgwụ eme ihe, na ọbara gaara egbochiworị ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa AIDS ibute ya. (Ọrụ 15:28, 29; 2 Ndị Kọrint 7:1) Otú o sina dị, Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọrịa abụghị ihe àmà na-egosi na Chineke atawala mmadụ ahụhụ maka iwu ọ dara. N’ụzọ megidere nke ahụ, Bible na-ekwu, sị: “A pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13; Jọn 9:1-3) Onye bu nje HIV ma ọ bụ ọrịa AIDS n’ihi agbasoghị ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ, ma bụrụ onye gbanweworo àgwà ya, pụrụ inwe obi ike na Chineke agaghị agbahapụ ya.

Ọmịiko na ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ndị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala nọ pụtara ìhè mgbe Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, bịara n’ụwa. Mgbe Jizọs hụrụ otu onye ekpenta n’oge ọ na-eme njem, o “nwere ọmịiko, o wee matịa aka ya bitụ ya aka.” Jizọs ji ike ọrụ ebube ya mee ihe ma gwọọ onye ekpenta ahụ. (Mak 1:40-42) Jizọs eledaghị ndị na-arịa ọrịa anya. Ịhụnanya o nwere n’ebe ha nọ gosipụtara nnọọ ụdị ịhụnanya Nna ya nke eluigwe nwere.—Luk 10:22.

Ihe Ngwọta Maka Ọrịa AIDS—N’isi Nso!

Ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ mere ihe karịrị imesi anyị obi ike na Chineke hụrụ anyị n’anya. Bible na-agwa anyị na Jizọs Kraịst na-achị achị ugbu a dị ka Eze n’eluigwe. (Mkpughe 11:15) O gosiri, site n’ozi o jere n’elu ụwa, na ya nwere ike ma dị njikere ịgwọ ọrịa ọ bụla na-emekpọ ihe a kpọrọ mmadụ ọnụ. Nke ahụ bụ ihe ọ ga-eme kpọmkwem.

Amụma Bible na-emesi anyị obi ike na n’isi nso “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) N’agbanyeghị na ihe a kpọrọ mmadụ enwebeghị ike ime ka ọrịa AIDS kwụsị ịgbasa ma ọ bụ ịgwọta ndị nile na-arịa ya, obi pụrụ isi anyị ike na ọrịa AIDS ga-ala. “Gọzie Jehova, mkpụrụ obi m,” ka Eze Devid kwuru, “echezọkwala mmeso ọma Ya Ọ na-emeso gị: bụ́ Onye na-agbaghara gị ajọ omume gị nile, Onye na-agwọ ọrịa gị nile.”—Abụ Ọma 103:2, 3.

Olee mgbe a ga-emezu nke a? Olee ihe Chineke na-achọ n’aka ndị na-atụ anya inweta ngọzi ndị dị otú ahụ? Anyị na-agba gị ume ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova iji mụtakwuo banyere nkwa ndị magburu onwe ha dị na Bible.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọtụtụ ndị nne na nna ahụwo akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwuu Ahụ, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara, dị ka ihe enyemaka n’iji nke nta nke nta akụziri ụmụaka banyere mmekọahụ na ụkpụrụ omume ndị bụ́ isi.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 31]

Amụma Bible na-emesi anyị obi ike na n’isi nso “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa”

[Foto dị na peeji nke 30]

Ịkụziri ụmụ gị banyere mmekọahụ na iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi pụrụ ichebe ha

[Foto dị na peeji nke 30]

Ikike Jizọs nwere na njikere ọ dị ịgwọ ndị ọrịa gosiri ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu