Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Ọdịda?

Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Ọdịda?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Ọdịda?

“Aka m natara nnọọ rịpọt kaadị m anata ma chọpụta na adaghachila m ihe ọmụmụ anọ ahụ m dara mbụ. Agbalịrị m ike m, ma adakwara m ha ọzọ.”—Lauren, onye dị afọ 15.

“N’ezie, ịnagide ọdịda na-abụ ọgụ na mgba. Ọ dị mfe ịmalite ichewe na olileanya adịghị.”—Jessica, onye dị afọ 19.

ỌDỊDA. Ọ pụrụ ịbụ na ị naghịdị enwe mmasị icheta okwu ahụ echeta. Ma anyị nile na-ada site n’oge ruo n’oge. Ọ sọ ya ya bụrụ ịda n’ule ụlọ akwụkwọ, imechu onwe anyị ihu n’ihu ọha, imechu onye anyị hụrụ n’anya ihu, ma ọ bụ ime omume ọjọọ, ọdịda pụrụ ịbụ ihe na-agbawa obi.

N’ezie, mmadụ nile na-emehie ihe. “Mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke,” ka Bible na-ekwu. (Ndị Rom 3:23) Ma, ọ na-esiri ụfọdụ n’ime anyị ike ibili mgbe anyị dasịrị. Nwa okorobịa aha ya bụ Jason si otú a kwuo ya: “Ọ dịghị onye na-akatọru m otú m si akatọ onwe m. M mehie ihe, ndị mmadụ pụrụ ịchị ọchị—ma ha na-echefukarị banyere ya. Anaghị m echefu ya, ana m anọgidekwa na-eche banyere ihe ahụ m mehiere.”

Ichebara ihe ndị ị dara na ha echiche adịchaghị njọ—karịsịa ma ọ bụrụ na ime otú ahụ na-akpali gị imeziwanye ihe. Otú ọ dị, ịnọgide na-akatọ onwe gị ruo ogologo oge bụ ihe na-emebi ihe ma na-egbochi ọganihu. Ilu 12:25 na-ekwu, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala.”

Tụlee banyere otu nwoke aha ya bụ Epafrọdaịtọs, bụ́ onye e kwuru maka ya na Bible . E zigara ya Rom ka o nyere Pọl onyeozi aka. Otú ọ dị, Epafrọdaịtọs dara ọrịa ma ghara inwe ike ịrụzu ọrụ ahụ. N’ezie, ọ bụzi Pọl bịara lekọtawa ya! Pọl mere ndokwa izilaga Epafrọdaịtọs, na-agwa ndị ọgbakọ ya na nwoke a kwesịrị ntụkwasị obi adawokwa mbà n’obi. Gịnị kpatara ya? “Unu nụrụ na ọ dawo ọrịa,” ka Pọl kọwara. (Ndị Filipaị 2:25, 26) Mgbe Epafrọdaịtọs chọpụtara na ndị ọzọ maara na ahụ́ adịghị ya, na o nweghịkwa ike ịrụzu ọrụ e dunyere ya, ọ pụrụ ịdịwo ya ka ọ dịghịzi uru ọ bara. Ka a sịkwa ihe mere o ji daa mbà n’obi!

Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla a pụrụ isi zere obi mgbawa ọdịda na-akpata?

Mara Ebe Ike Gị Ruru

Otu ụzọ isi belata ohere nke ịda bụ isetịpụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ ndị kwesịrị ekwesị, bụ́kwa ndị ezi uche dị na ha. “N’ebe ndị dị umeala n’obi nọ ka amamihe dị,” ka Bible na-ekwu. (Ilu 11:2; 16:18) Onye dị umeala n’obi na-ama ebe ike ya ruru. N’ezie, ọ na-adị mma mgbe ụfọdụ ịnwale onwe gị iji meziwanye nkà na ikike gị. Ma, na-eji ezi uche eme ihe. E nwere ike ị gaghị abụ ọkà ná mgbakọ na mwepụ ma ọ bụkwanụ dị gara gara ma mara nke a na-akọ n’ime egwuregwu. Nwa okorobịa aha ya bụ Michael na-ekweta, sị: “Amaara m na anaghị m eme nke ọma n’egwuregwu. N’ihi ya, ana m egwu egwuregwu, ma adịghị m ekowe akpa m n’ebe aka m na-agaghị eru.” Ọ na-akọwa, sị: “I kwesịrị isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ị maara na ị ga-eruli.”

Tụlee banyere àgwà Yvonne dị afọ 14, bụ́ onye nwere mkpumkpu azụ ma na-arịa ọrịa ụbụrụ nke na-eme ka ahụ́ ya na-ama jijiji. “Apụghị m ije ije ma ọ bụ ịgba egwú ma ọ bụ ịgba ọsọ dị ka ndị ọzọ,” ka Yvonne na-ekwu. “Ọ na-ewute m nke ukwuu na apụghị m ime ihe ndị ọzọ na-eme. Ọtụtụ ndị adịghị aghọta otú obi na-adị m n’ezie. Ma ana m anagideli ya.” Ndụmọdụ ya abụrụ gịnị? “Akwụsịla. Nọgide nnọọ na-eme mgbalị. Ị daa ma ọ bụ ghara ime nke ọma, adala mbà. Nọgide nnọọ na-eme ike gị.”

N’otu mgbe ahụ, emekpala onwe gị ahụ́ site n’iji ndị ọzọ na-atụnyere onwe gị n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Andrew, bụ́ onye dị afọ 15, na-ekwu, sị, “Ana m agbalị izere iji onye ọzọ atụnyere onwe m n’ihi na ike anyị nile ahaghị.” Okwu Andrew na-akwado okwu Bible a na-ahụ ná Ndị Galeshia 6:4: “Ka onye ọ bụla na-anwapụta ihe ọrụ nke ya bụ, mgbe ahụkwa ọ ga-eme ka o nwee aṅụrị n’ihe banyere nanị onwe ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye nke ọzọ.”

Mgbe Ndị Ọzọ Na-atụ Anya Ihe Dị Ukwuu n’Aka Gị

Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ndị mụrụ gị, ndị nkụzi, na ndị ọzọ na-atụ anya ihe dị ukwuu n’aka gị. Ị pụkwara ịchọpụta na otú ọ sọkwara gị gbalịa, ị pụghị imete ha mma. Nke ka njọ, ha pụrụ iji okwu ndị na-agbakasị gị ahụ́ ma ọ bụ ọbụna ndị na-egbu mmụọ gị ekwupụta ndakpọ olileanya ha. (Job 19:2) Ikekwe, ị na-aghọta na ndị mụrụ gị na ndị ọzọ amaghị ụma na-achọ ịkpasu gị iwe. Dị ka Jessica na-ekwu, “ọtụtụ mgbe, ha adịghịdị aghọta otú ihe ha na-eme si emetụta gị. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ nnọọ nghọtahie.”

N’aka nke ọzọ, ò nwere ike ịbụ na ha na-ahụ ihe ị na-adịghị ahụ? Dị ka ihe atụ, ikekwe ị na-ewere onwe gị dị ka onye na-apụghị imeta ihe ma na-ewetu onwe gị ala. Kama ileghara aro ndị ha na-atụrụ gị anya, ị ga-abụ onye maara ihe ma ị ‘nụrụ ịdọ aka ná ntị.’ (Ilu 8:33) Michael na-akọwa, sị: “Ọ bụ maka ọdịmma gị. Ha chọrọ ka i mee nke ọma karị, ka i meziwanye ihe. Were ya dị ka ihe ịma aka.”

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ọ na-adị gị ka ihe ndị mụrụ gị na ndị ọzọ na-achọ n’aka gị hà bụ nnọọ ndị ezi uche na-adịghị na ha—na ha na-achọ ka i kowe akpa gị n’ebe aka gị na-agaghị eru? Mgbe ahụ, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya iso ha kwurịta ya—n’ụzọ dị ùgwù, n’ezoghị ọnụ—ma mee ka ha mara mmetụta ị na-enwe. Unu pụrụ ịgbakọ aka setịpụ ihe mgbaru ọsọ ụfọdụ ndị ezi uche ka dịrị na ha.

“Ọdịda” ná Ndụ Ime Mmụọ Gị

N’etiti Ndịàmà Jehova, ndị ntorobịa nwere ihe ịma aka nke ịrụ ọrụ ha dị ka ndị ozi Chineke. (2 Timoti 4:5) Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst na-eto eto, ọ pụrụ ịdị gị mgbe ụfọdụ ka i rughị eru. Eleghị anya, ọ na-adị gị ka ị naghị eme nnọọ nke ọma n’ịza ajụjụ ná nzukọ. Ma ọ bụ, ikekwe, ọ na-esiri gị ike ịkọwara ndị ọzọ ozi Bible. Dị ka ihe atụ, Jessica duziiri nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na ụma ọmụmụ Bible. Onye ahụ ọ na-amụrụ Bible bịara nwee nnọọ ọganihu ruo oge ụfọdụ. Otú ọ dị, na mberede, nwa agbọghọ ahụ kpebiri na ya achọghị ijere Chineke ozi. Jessica na-echeta, sị, “Ọ bịara dị m ka ọ dịghịzi uru m bara.”

Olee otú Jessica si nagide mmetụta ndị ahụ? Nke mbụ, ọ ghọtara na ọ bụghị ya ka onye ahụ ọ na-amụrụ ihe jụrụ, kama ọ bụ Chineke. O nwetakwara enyemaka site n’ịtụgharị uche n’ihe atụ ndị dị na Bible banyere Pita, bụ́ nwoke sọpụụrụ Chineke ma nwee ebe ndị ọ na-emezighị emezi. Ọ na-akọwa, sị, “Bible na-egosi na Pita meriri adịghị ike ya, Jehova jikwa ya mee ihe n’ọtụtụ ụzọ iji mee ka ihe ndị metụtara Alaeze ahụ gaa n’ihu.” (Luk 22:31-34, 60-62) N’ezie, ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa imeziwanye nkà gị dị ka onye ozizi, gịnị ma i mekwuo mgbalị n’akụkụ ahụ? (1 Timoti 4:13) Chọọ enyemaka nke ndị tozuru okè n’ọgbakọ bụ́ ndị pụrụ izi gị ihe ma nye gị ọzụzụ.

Otú ọ dị, eleghị anya ọ bụ ozi ụlọ n’ụlọ ka ị chọpụtara na ọ kasị esiri gị ike. Jason na-ekweta, sị, “Mgbe ọ bụla onye nwe ụlọ kwachiri ụzọ ya, ọ na-adị m ka emechaghị m nke ọma.” Olee otú o si anagide ya? “Abịara m cheta na ọ bụghị eziokwu na emeghị m nke ọma.” Ee, o mewo ihe Chineke nyere ya iwu ime—ime nkwusa! Ọ bụkwa ezie na ọ na-esiri mmadụ ike inwe obi ụtọ mgbe a jụrụ ya, ọ bụghị mmadụ nile ga-ajụ ozi Bible. “Mgbe m chọtara onye gere m ntị,” ka Jason na-ekwu, “mgbe ahụ, ana m ama na o ruru mgbalị m mere maka ya.”

Njehie Ndị Dị Oké Njọ

Gịnị ma ọ bụrụ na i jehiere n’ụzọ dị oké njọ—ma ọ bụ ọbụna mee mmehie dị oké njọ? Ana, bụ́ onye dị afọ 19, mere mmehie dị otú ahụ. * Ọ na-ekweta, sị, “Emechuru m ọgbakọ, ezinụlọ m, nakwa karịsịa Jehova Chineke, ihu.” Iji gbakee, ọ dị gị mkpa ichegharị ma chọọ enyemaka nke ndị okenye nọ n’ọgbakọ. (Jems 5:14-16) Ana na-echeta okwu enyemaka otu okenye gwara ya: “O kwuru na n’agbanyeghị ihe ọjọọ nile Eze Devid mere, Jehova ka dị njikere ịgbaghara ya, Devid gbakekwara. Nke ahụ nyeere m aka.” (2 Samuel 12:9, 13; Abụ Ọma 32:5) Ọ dịkwa gị mkpa ime ihe ọ bụla ị pụrụ ime iji wusie onwe gị ike n’ụzọ ime mmụọ. “Ana m agụ akwụkwọ Abụ Ọma ugboro ugboro,” ka Ana na-ekwu, “enwekwara m akwụkwọ m na-edetu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-agba ume.” Ka oge na-aga, mmadụ pụrụ ịgbake ọbụna n’ọdịda dị oké njọ. Ilu 24:16 na-ekwu, sị: “Ugbo asaa ka onye ezi omume na-ada, biliekwa ọzọ.”

Inwe Ọganihu Mgbe Ị Dasịrị

N’ezie, ọbụna ọdịda ndị dị nnọọ nta pụrụ iwute mmadụ. Gịnị pụrụ inyere gị aka inwe ọganihu mgbe ị dasịrị? Nke mbụ, lee ihe ndị i mehiere anya n’ụzọ ezi uche dị na ha. Michael na-atụ aro, sị: “Kama ịnọ nnọọ na-eche na ọ dịghịzi uru ị bara, chọpụta ebe ị na-emeghị nke ọma na ihe kpatara ya. Site n’ime nke a, ị pụrụ ime nke ọma karị n’oge ọzọ.”

Ọzọkwa, zere ibuli onwe gị elu. E nwere “mgbe ịchị ọchị”—nke ahụ pụkwara ịgụnye ịchị onwe gị ọchị! (Eklisiastis 3:4) Ọ bụrụ na ị na-enwe nkụda mmụọ, tinye uche gị n’ihe ndị ị na-emete nke ọma, dị ka ihe ndị i ji atụrụ ndụ ma ọ bụ egwuregwu. ‘Ịba ọgaranya n’ezi ọrụ’—dị ka ịgwa ndị ọzọ ihe ndị i kweere—pụrụ inyere gị aka inwekwu obi ụtọ banyere onwe gị.—1 Timoti 6:18.

N’ikpeazụ, cheta na “Jehova nwere obi ebere, na-emekwa amara . . . Ọ bụghị ruo mgbe nile ka Ọ ga na-ese okwu.” (Abụ Ọma 103:8, 9) Jessica na-ekwu, sị, “Ana m enwe mmetụta na, ka m na-abịarukwu Jehova Chineke nso, ana m enwekwu obi ike na ọ ga-akwado m ma nyere m aka n’ihe ọ bụla m na-agabiga.” Ee, ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na n’agbanyeghị ihe ndị ị dara na ha, Nna gị nke eluigwe ji gị kpọrọ ihe.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 23 A gbanwewo aha ya.

[Foto dị na peeji nke 14]

Ọ bụrụ na ọ na-adị gị ka ihe ndị a na-achọ n’aka gị hà karịrị akarị, chọpụta ụzọ ị ga-esi jiri nkwanye ùgwù kwupụta ya

[Foto dị na peeji nke 15]

Ịdị na-eme ihe ndị ị na-emete nke ọma pụrụ inyere gị aka ime ka mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị uru kwụsị