Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụlọ Ọrụ nke Na-akpata Ọnwụ

Ụlọ Ọrụ nke Na-akpata Ọnwụ

Ụlọ Ọrụ nke Na-akpata Ọnwụ

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA GERMANY

ỤFỌDỤ na-ekwu na ụlọ ọrụ Mittelwerk bụ nke kasịnụ n’ụwa n’ime ụlọ ọrụ ndị dị n’okpuru ala. N’ịbụ nke dị n’Ugwu Harz nke Germany, ihe dị ka kilomita 260 site n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Berlin, ụlọ ọrụ ahụ bụ nnukwu ọwa dị kilomita 20 bụ́ nke e gwuru n’okpuru ugwu. Site n’afọ 1943 ruo 1945, ọtụtụ puku ndị a kpọchiri n’ogige ịta ahụhụ rụrụ ọrụ dị ka ndị ohu n’ụlọ ọrụ a. A manyere ha ịnọ n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha na-arụpụtara ndị Nazi ngwá agha.

Ihe ndị ọrụ mmanye a rụpụtara abụghị ụdị ngwá agha ọ bụla. Ha rụpụtara bọmbụ ndị a maara dị ka bọmbụ V-1 na V-2 n’ụlọ ọrụ ahụ. A na-esi n’ụlọ ọrụ Mittelwerk ebuga ha n’ebe ndị a na-anọ agbapụ ha, ọ na-abụkarịkwa na France na Netherlands. Ozugbo a gbapụrụ ha, ha na-eche ihu n’ebe a chọrọ ịtụ ha na Belgium, Britain, na France, bụ́ ebe ha na-ada ma gbawaa n’ụzọ dị egwu. Ndị Nazi tụdịrị anya ịrụpụta ụgbọ agha ga-adị ike nke na ọ ga-enwe ike iburu bọmbụ gafee Oké Osimiri Atlantic ma tụọ ya na New York. Ka ọ na-erule oge Agha Ụwa nke Abụọ biri, a tụọla ọtụtụ narị bọmbụ V-1 na V-2 n’obodo ukwu ndị dị na Europe. Otú ọ dị, ndị ahụ a tụrụ bụ nanị ole na ole n’ime bọmbụ ndị Nazi rụpụtara ma na-atụ anya ịtụ ndị iro ha. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime bọmbụ ndị a ruru New York.

Ọdịiche Dị Mwute

Ozugbo agha ahụ biri, ọtụtụ ndị Germany bụ́ ndị ọkà mmụta sayensị na ndị ọrụ nkà na ụzụ bụ́ ndị rụpụtara bọmbụ V-1 na V-2, si Germany kwapụ. Nkà ha nwere n’ịrụpụta bọmbụ sokwa ha, bụ́ nke ha tinyere n’ọrụ ná mba ndị ha kwagara. Otu n’ime ndị ọkà mmụta sayensị dị otú ahụ na-arụpụta ụgbọ agha bụ Wernher von Braun. Ọ kwagara United States, bụ́ ebe o nyere aka rụpụta ụgbọ mbara igwe bụ́ Saturn bụ́ nke bugara mmadụ n’ọnwa.

Taa, kpọmkwem n’akụkụ ebe ahụ ụlọ ọrụ Mittelwerk dịbu, e nwere ihe ncheta e ji echeta mmadụ 60,000 a kpọchiri n’ogige ịta ahụhụ dịbu ebe ahụ. Ọ bụghị nanị na ọtụtụ n’ime ndị a kpọchiri ebe ahụ rụrụ ọrụ n’ọwa ndị ahụ jụrụ oyi ma dị mmiri mmiri, kamakwa ha biri n’ebe ahụ. Ka a sịkwa ihe mere na, dị ka atụmatụ ụfọdụ e mere si dị, ihe ruru mmadụ 20,000 n’ime ndị a kpọchiri na ya nwụrụ. A pụrụ iduru ndị bịara ileta ihe ncheta ahụ gagharịa n’ụlọ ọrụ ahụ. Akụkụ ụfọdụ nke bọmbụ ndị a gbahapụrụ ebe ahụ ihe dị ka afọ 60 gara aga ka jupụtakwara n’ala ụlọ ọrụ ahụ. Magazin bụ́ After the Battle kwuru ihe mere bọmbụ ndị ahụ a rụpụtara na Mittelwerk ji pụọ iche n’ụzọ dị mwute, sị: “Bọmbụ V1 na V2 bụ nanị bọmbụ isi mmadụ ha tara mgbe a na-arụpụta ha arụpụta karịrị ndị ha tara mgbe a tụrụ ha atụ.”

[Foto dị na peeji nke 28]

Foto e sere n’afọ 1945 nke na-egosi bọmbụ V-1 nke dị n’ígwè e ji ebu ihe

[Ebe E Si Nweta Foto]

Quelle: Dokumentationsstelle Mittelbau-Dora

[Foto dị na peeji nke 28]

Ndị mmadụ na-aga eleta ụlọ ọrụ ahụ, bụ́ nke akụkụ ụfọdụ nke bọmbụ ka jupụtara n’ala ya