Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa Anyị A Na-emebi n’Ụzọ Dị Egwu

Ụwa Anyị A Na-emebi n’Ụzọ Dị Egwu

Ụwa Anyị A Na-emebi n’Ụzọ Dị Egwu

N’AFỌ 1805, ndị nchọpụta a ma ama bụ́ Meriwether Lewis na William Clark rutere n’Osimiri Columbia bụ́ nke dị na Steeti Washington, U.S.A. nke oge a. * Ihe dọọrọ mmasị ha karịa osimiri ahụ n’onwe ya bụ otú azụ salmon si jupụta na ya. “Azụ ndị a hiri nne nke ukwuu nke na ọ dị anyị ka ọ̀ bụ ná nrọ,” ka ha dere n’akwụkwọ njem ụgbọ mmiri ha. “Ọnụ ọgụgụ azụ mmiri ahụ na-ebu agbada na-akarị akarị, ọ na-ebupụtakwa ha n’ikpere mmiri nke na nanị ihe ndị obodo ahụ na-eme bụ ikpokọta ha, gburisie ha, ma chekpọọ ha.” N’ezie, azụ salmon hiri nnọọ nne nke na ndị obodo ahụ na-echekpọ ha ma jiri ha mere nkụ!

Taa, a na-anụzi ihe dị iche. “Ruo ihe karịrị afọ iri, ndị ọkà mmụta sayensị maara na ọnụ ọgụgụ azụ a na-egbu n’oké osimiri karịrị nnọọ ihe azụ na-amụ,” ka otu akụkọ e si na magazin bụ́ Newsweek nweta na-ekwu. Dị ka ihe atụ, e mere atụmatụ na e gbuchapụla pasent iri itoolu nke azụ salmon dị n’Ebe Ugwu nke Oké Osimiri Atlantic.

Ma, ọ bụghị nanị azụ bụ ihe dịzi ụkọ. A na-egwukpọ ihe ndị dị ka mmanụ ala na akụ̀ ndị ọzọ dị n’ime ala, na-egbukpọkwa osisi ndị dị n’oké ọhịa, n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu. Òtù Na-ahụ Maka Anụ Ndị Bi n’Ọhịa Ụwa na-akọ na, n’agbata afọ 1970 na afọ 1995, pasent iri atọ nke akụ̀ ndị sitere n’okike funahụrụ ụmụ mmadụ. Mgbe mgbe, usoro e ji enweta akụ̀ ndị a sitere n’okike na-eyi mma ihu abụọ, ebe ọ bụ na usoro ahụ pụrụ ibibi ihe ndị gbara akụ̀ ndị a gburugburu.

Ụfọdụ na-eche na ebe nsogbu ndị a si ụmụ mmadụ n’aka, na ụmụ mmadụ pụrụ idozi ha. Iji maa atụ, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, mmetọ ikuku belatara n’ọtụtụ obodo mepere emepe. Olileanya dị otú ahụ e nwetụrụ ọ̀ pụtara na ihe a kpọrọ mmadụ achịkwawala ọnọdụ ahụ?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 E zigara Lewis na Clark ka ha gaa nyochaa ma see map nke ógbè ahụ a ka nwetara ọhụrụ bụ́ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Mississippi.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

© Kevin Schafer/CORBIS