Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụ̀ Ụwa nke Na-ebelata Ebelata

Akụ̀ Ụwa nke Na-ebelata Ebelata

Akụ̀ Ụwa nke Na-ebelata Ebelata

“Ihe nile e kere eke nwere njikọ, a na-atakwa anyị ụta ugbu a maka iberibe ndị anyị mere n’oge ndị gara aga.”Magazin bụ́ African Wildlife.

DỊ KA Òtù Na-ahụ Maka Anụ Ndị Bi n’Ọhịa Ụwa si kwuo, kemgbe afọ ndị 1980, ọ̀tụ̀tụ̀ ụmụ mmadụ ji jiri akụ̀ ndị dị n’ụwa na-eme ihe karịrị nnọọ ọ̀tụ̀tụ̀ ụwa ji na-emepụtaghachi ha. * Ma nke ahụ bụ nanị otu n’ime ihe ndị na-egosi ọnọdụ ọjọọ a na-etinye ụwa anyị na ya.

Ihe ọzọ na-egosi ya bụ njikọ dị n’etiti ihe ndị dị ndụ nọ n’ụwa na ihe ndị na-adịghị ndụ gbara ha gburugburu. Ọnọdụ njikọ a nọ na ya—nke a na-ahụ site n’ọnụ ọgụgụ anụmanụ ndị bi n’ọhịa nakwa anụ na azụ ndị bi ná mmiri—mejupụtara ihe Òtù Na-ahụ Maka Anụ Ndị Bi n’Ọhịa Ụwa na-akpọ Ihe E Ji Amata Ọnọdụ Ụwa Anyị. N’agbata afọ 1970 na 2000, ihe a e ji amata ọnọdụ ụwa anyị gosiri na ọnụ ọgụgụ nke ihe ndị dị ndụ nọ n’ụwa ji ihe dị ka pasent iri atọ na asaa dalata.

È Nwere Ole Ga-ezuru Mmadụ Nile?

Ọ bụrụ na i bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa bụ́ ebe ngwa ahịa na-eju eju n’ụlọ ahịa, ebe a pụkwara ịzụ ihe ma n’ehihie ma n’abalị, ọ ga-esiri gị ike ichetụ n’echiche na akụ̀ ndị sitere n’okike pụrụ ịdị ụkọ n’oge na-adịghị anya. Otú o sina dị, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole n’ime ndị bi n’ụwa na-ebi ndụ ọgaranya. Ihe ka ọtụtụ aghaghị ịdị na-adọga kwa ụbọchị nanị iji hụ ihe ha riri. Dị ka ihe atụ, e mewo atụmatụ na ego ihe karịrị ijeri mmadụ abụọ ji adị ndụ kwa ụbọchị epeka, nakwa na ijeri mmadụ abụọ enweghị ego ọkụ eletrik.

Ụfọdụ na-ekwu na ihe mere mba ndị ka na-emepe emepe ji daa ogbenye bụ n’ihi otú mba ndị bara ọgaranya si azụ ahịa ha. “N’ọtụtụ ụzọ, ụzọ ụwa si azụ ahịa adịghị adabara ndị ogbenye,” ka akwụkwọ bụ́ Vital Signs 2003 na-ekwu. Ka ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị mmadụ na-azọ ụzọ́ inweta “akụ̀” ụwa, bụ́ ndị na-adịwanye ụkọ na oké ọnụ, ndị ogbenye anaghị azọtali òkè nke ha. Nke a n’onwe ya na-eme ka akụ̀ ụwa a hapụụrụ ndị pụrụ inweta ya—ya bụ, ndị ọgaranya—hikwuo nne.

Oké Ọhịa Ndị Na-apụ n’Anya

E mere atụmatụ na pasent iri asatọ nke ndị bi n’Africa ji nkụ esi nri. Tụkwasị na nke a, “ọnụ ọgụgụ ndị a na-amụ [na] nke ndị na-akwaga n’obodo mepere emepe, kasị hie nne n’Africa,” ka magazin bụ́ Getaway nke a na-ebipụta na South Africa na-ekwu. N’ihi ya, e gbukpọọla osisi ndị dị n’ebe ruru ihe karịrị otu narị kilomita gburugburu ụfọdụ obodo ukwu ndị dị na Sahel, bụ́ ala mmiri na-adịchaghị ezo na ya nke dị n’ebe ndịda Ọzara Sahara. E gbughị osisi ndị ahụ n’ihi ihe ndị na-enweghị isi. ‘Ihe ka nnọọ ọtụtụ n’ụmụ amaala Africa na-ebibi gburugburu ebe obibi ha nanị iji nọgide na-adị ndụ,’ ka Prọfesọ Samuel Nana-Sinkam na-ekwu.

Ọnọdụ e nwere n’Ebe Ndịda America dịtụ iche. Dị ka ihe atụ, na Brazil, e nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụlọ ọrụ 7,600 e nyere ikike igbu osisi n’oké ọhịa. Ọ bụ ụlọ ọrụ ndị ji ego, ndị sikwa mba dị iche iche jikọrọ aka nwere ọtụtụ n’ime ụlọ ọrụ ndị a na-egbu osisi. Ndị na-egbu osisi na-ere osisi mahogany ihe dị ka dollar 30. Otú ọ dị, mgbe ndị na-egbu osisi, ndị ahịa osisi, na ndị ji ya arụpụta ihe tinyesịrị uru nke ha, ọnụ ego otu osisi ahụ pụrụ iru dollar 130,000 mgbe a ga-ejiwo ya rụọ ihe ndị dị ka oche. Ka a sịkwa ihe mere e ji ewere mahogany dị ka osisi na-amị ego.

E dewo ọtụtụ ihe banyere mbibi a na-ebibi oké ọhịa ndị dị na Brazil. Foto ndị e ji ígwè satellite see na-egosi na e bibiri oké ọhịa dị ihe karịrị square kilomita 20,000 na Brazil kwa afọ, n’agbata afọ 1995 na afọ 2000. “Ọ̀tụ̀tụ̀ a dị egwu e ji bibie ọhịa ndị a pụtara na, n’ime sekọnd asatọ ọ bụla, e bibiri oké ọhịa há ka mbara egwuregwu bọl,” ka magazin bụ́ Veja nke a na-ebipụta na Brazil na-ekwu. Ọ dị mma ịmara na, dị ka a kọrọ, United States nanị tụbatara ihe karịrị pasent iri asaa nke osisi mahogany si Brazil, n’afọ 2000.

A na-anụkwa ụdị akụkọ a ná mba ndị ọzọ. Dị ihe atụ, ọkara nke oké ọhịa ndị dị na Mexico pụrụ n’anya n’ime afọ iri ise gara aga. Ọ̀tụ̀tụ̀ e ji na-egbukpọ oké ọhịa ndị dị na Philippine kadị njọ. Ná mba ahụ, a na-egbukpọ oké ọhịa dị ihe dị ka 100,000 hekta kwa afọ. Laakwa azụ n’afọ 1999, e mere atụmatụ na e jiri aka a, a ga-egbukpọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke oké ọhịa ndị dị ná mba ahụ n’ime afọ iri.

Ọ pụrụ iwe afọ iri isii ruo otu narị afọ tupu osisi siri oké ike, dị ka ụhị́, etoruo otú ọ ga-adị mma ọwụwa, ma ọ na-ewe nanị minit ole na ole iji gbutuo ya. Ò kwesịrị iju anyị anya na oké ọhịa ndị dị n’ụwa na-apụ n’anya?

Ala Ndị Na-ala n’Iyi

Mgbe ala na-enweghịzi osisi na ahịhịa, obere oge, anwụ na-amịkọrọ mmiri dị na ya, ikuku ma ọ bụ mmiri eburukwa ájá ya. Ọ bụ ya na-akpata mbuze.

Mbuze na-emere onwe ya, ọ dịchaghịkwa abụ nsogbu—ọ gwụla ma mmadụ ò mere ka ọ ka njọ site n’imebi ala. Dị ka ihe atụ, magazin bụ́ China Today na-ekwu na oké ifufe ndị na-ebu ájá, tinyere ihe ndị ọzọ dị ka igbukpọ oké ọhịa na anụmanụ ịtachapụ ahịhịa ndị dị n’ala, emewo ka ọzara “na-agbasa ngwa ngwa.” Ajọ ọkọchị e nwere na China n’afọ ndị na-adịbeghị anya emewo ka ikuku ụgụrụ si Siberia na-akpa ebe ọdịda anyanwụ na ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke mba ahụ aka ọjọọ. Ikuku ahụ buuru ọtụtụ nde tripu ájá na-acha odo odo nakwa uzuzu, o buuru ụfọdụ n’ime ha ruo ebe ndị dị nnọọ anya dị ka Korea na Japan. Ihe dị ka pasent iri abụọ na ise nke ala China bụzi ọzara.

Ọ bụ ụdị ihe a mere ájá ndị dị n’Africa ji na-ala n’iyi. “Site n’igbutu osisi ndị dị n’oké ọhịa iji kọọ ihe na ha,” ka akwụkwọ bụ́ Africa Geographic na-ekwu, “ndị ọrụ ugbo egbuola ala n’ụzọ na-agaghịzi ekwe mmekwata.” A na-ekwu na mgbe a sụrụ ọhịa, n’ime afọ atọ, ikike ala ahụ nwere ime nri ga-eji ọkara belata. N’ihi ya, magazin ahụ kwukwara, sị: “E mebielarị ala dị ọtụtụ nde hekta n’ụzọ na-agaghịzi ekwe mmekwata, a na-agakwa imebi ọtụtụ nde hekta ọzọ, ebe ọ bụ na ihe a na-akọta n’ubi n’ebe ụfọdụ na-ebelata site n’afọ ruo n’afọ.”

A na-ekwu na mbuze na-ebupụ ọtụtụ nde tripu ájá na Brazil kwa afọ. Na Mexico, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi na Akụ̀ Ndị Sitere n’Okike na-ekwu na mbuze na-ebibi pasent iri ise na atọ nke ala ndị na-enweghị osisi ukwu, pasent iri ise na itoolu nke oké ọhịa, na pasent iri asaa na abụọ nke ọhịa nkịtị. N’iburu ihe nile n’uche, ka otu akụkọ e nwetara n’aka Ngalaba Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Mmepe na-ekwu, “mbuze na-emetụta, ma eleghị anya, ihe ruru ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ala ndị a na-akọ ugbo n’ụwa. N’ihi ya, ihe a na-akọta n’ugbo na-ebelata nke ukwuu, ebe ọnụ ọgụgụ ndị na-eri ihe ndị a nọgidere na-amụba.”

Mmiri—Ihe E Nyere n’Efu nke Bara Oké Uru

Mmadụ pụrụ ịdị ndụ ruo ihe dị ka otu ọnwa n’erighị nri, ma ọ ga-anwụ n’ime otu izu ma ọ bụrụ na ọ ṅụghị mmiri. N’ihi ya, ndị ọkachamara na-ekwu na ụkọ nke ezigbo mmiri ga-anọgide na-akpata ọgba aghara n’afọ ndị na-abịanụ. Dị ka magazin bụ́ Time kọrọ n’afọ 2002, ihe karịrị otu ijeri mmadụ n’ụwa nile adịghị enweta ezigbo mmiri ọṅụṅụ.

E nwere ihe dịgasị iche iche mere mmiri ji adị ụkọ. Na France, mmetọ a na-emetọ mmiri so akpata ya, ọnọdụ a anọgidewokwa na-enye ndị mmadụ nsogbu n’obi. “E metọọla nnọọ mmiri ndị dị na France,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Le Figaro na-ekwu. Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo na ihe kpatara mmetọ a bụ na mmiri zoo, idei ya na-eburu nnu ndị si na fatịlaịza e ji kọọ ugbo, sọbanye n’iyi. “Mmiri iyi ndị dị na France bubara ọtụtụ nde drọm mmiri nnu n’Oké Osimiri Atlantic n’afọ 1999, nke a fọrọ nke nta ka o jiri okpukpu abụọ karịa nke ha bubara n’afọ 1985,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.

Ọnọdụ ahụ yikwara ihe a na-ahụ na Japan. Iji nọgide na-akọpụta nri ná mba ahụ, “ọ dịghị ihe ọzọ ndị ọrụ ugbo pụrụ ime ma ọ́ bụghị iji fatịlaịza na ọgwụ ụmụ ahụhụ na-akọ ugbo iji nwee ike ịkọpụta ihe ga-ezuru ọha na eze,” ka Yutaka Une, bụ́ onyeisi nke otu òtù ọrụ ebere nke na-ahụ maka ichebe ugbo na-ekwu. Nke a emetọwo mmiri ndị dị n’ime ala—nke akwụkwọ akụkọ bụ́ IHT Asahi Shimbun nke Tokyo kpọrọ “nsogbu bụ́ isi e nwere ebe nile na Japan.”

Na Mexico, ihe kpatara pasent iri atọ na ise nke ọrịa a na-arịa “bụ mmetọ a na-emetọ gburugburu ebe obibi,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Reforma na-ekwu. Ọzọkwa, nnyocha odeakwụkwọ nke ngalaba na-ahụ maka ahụ́ ike mere na-egosi na “otu onye n’ime mmadụ anọ ọ bụla bi na Mexico enweghị ọwa mmiri; ihe karịrị nde mmadụ asatọ na-ekute mmiri ha n’olulu, n’osimiri, n’ọdọ mmiri, ma ọ bụ n’iyi; ebe ihe karịrị otu nde mmadụ na-enweta mmiri ha n’aka ndị tanka mmiri.” Ka a sịkwa ihe mere e ji na-ekwu na ọ bụ mmiri e metọrọ emetọ na-akpata pasent iri itoolu nke ọrịa afọ ọsịsa a na-arịa ná mba ahụ!

“Ọ bụghị nanị okpomọkụ anyanwụ, ájá uzuzu, na mmiri na-acha anụnụ anụnụ ka a na-enweta n’ụsọ oké osimiri ndị dị na Rio,” ka magazin bụ́ Veja nke a na-ebipụta na Brazil na-ekwu. “Nsị na-ejukwa na ha, mmanụ ala kwafuru akwafu na-adịkwa na ha mgbe ụfọdụ.” Ihe mere o ji dị otú ahụ bụ n’ihi na ọkara nke mmiri nsị nke ndị bi na Brazil na-abanye kpọmkwem n’ime iyi, ọdọ mmiri, nakwa n’oké osimiri. Ihe si na ya pụta bụ ajọ ụkọ ezigbo mmiri. Mmiri ndị dị gburugburu São Paulo, bụ́ obodo kasị ukwuu na Brazil, emetọwo nke ukwuu nke na e sizi n’ebe dị ihe dị ka otu narị kilomita ebubatara ha mmiri ọṅụṅụ.

N’akụkụ nke ọzọ nke ụwa, ihe kpatara ụkọ mmiri e nwere n’Australia bụ nnu ijupụta ná mmiri. Ruo ọtụtụ iri afọ, a gbara ndị nwere ala ume ka ha sụchasịa ha iji kọọ ha ihe. Ebe osisi ndị na-amịkọrọ mmiri dị n’ime ala fọziri ole na ole, mmiri ahụ malitere ịgbagote, o bupụtakwara nnu dị ukwuu n’elu ala. “Nnu ejupụtaworị n’ala dị ihe dị ka nde eka 6.2,” ka Òtù Commonwealth Australia nke Na-eme Nnyocha Banyere Sayensị na Nkà Mmepụta Ihe (CSIRO) na-ekwu. “Ihe ka ukwuu n’ala a bụ ebe bụ́ isi ndị Australia na-akọ ugbo.”

Ụfọdụ kweere na a sị na ndị omeiwu Australia butere ọdịmma ndị mmadụ ụzọ kama ibute uru ego ụzọ, a gaara ezereworị nsogbu a. “A gwara gọọmenti kemgbe afọ 1917 na mmiri nnu nwere ike ịkasị metụta ala ndị dị n’Ógbè Ọka Wiit,” ka Hugo Bekle nke Mahadum Edith Cowan dị na Perth, Australia, na-ekwu. “N’afọ ndị 1920, e mere ka ọha na eze mata na igbutusị osisi ga-eme ka nnu banye ná mmiri iyi, n’afọ ndị 1930 kwa, Ngalaba Na-ahụ Maka Ọrụ Ugbo kwetakwara na ọ ga-eme ka mmiri dị n’ime ala gbagote. Òtù CSIRO meere gọọmenti [Australia] nnyocha sara mbara n’afọ 1950, . . . n’agbanyeghị nke ahụ, gọọmenti nọgidere leghara ịdọ aka ná ntị ndị a anya, na-ekwu na ndị ọkà mmụta sayensị amaghị nke a na-akọ.”

A Na-etinye Ụmụ Mmadụ n’Ihe Ize Ndụ

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụmụ mmadụ bu ihe ọma n’uche mee ọtụtụ ihe ha mere. Ma, dị ka ọ na-adịkarị, anyị amaghị gburugburu ebe obibi anyị ruo n’ókè nke ịmata kpọmkwem ihe ihe ndị anyị na-eme ga-apụta. Nke a emebiwo ọtụtụ ihe. “Anyị emebisịwo nnọọ ihe ndị na-akwado ndụ n’ụwa nke na anyị na-etinye ala nke ji anyị ndụ n’ihe ize ndụ, sikwa otú ahụ na-etinye onwe anyị n’ihe ize ndụ,” ka Tim Flannery, bụ́ onyeisi nke Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie nke South Australia na-ekwu.

Gịnị bụ ngwọta ya? Ọ̀ dị mgbe ihe a kpọrọ mmadụ ga-amụta otú ha ga-esi na-eji ihe ndị gbara ha gburugburu eme ihe n’emebighị ha emebi? N’ezie, à pụrụ ịzọpụta mbara ala a bụ́ Ụwa?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Dị ka ihe atụ, e mere atụmatụ na, n’afọ 1999, ọ̀tụ̀tụ̀ ụmụ mmadụ ji jiri akụ̀ ndị dị n’ụwa mee ihe ji pasent iri abụọ karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ụwa ji mepụtaghachi ha. Nke a pụtara na o were ihe karịrị ọnwa iri na anọ iji mepụtaghachi akụ̀ ndị sitere n’okike bụ́ ndị ụmụ mmadụ ji mee ihe n’ime ọnwa iri na abụọ ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Ntapụ Mmiri Ọ Bụla Dị Mkpa

A pụrụ ime ihe ole na ole dị mfe iji chekwaa ọtụtụ lita mmiri.

● Rụzie isi pọmpụ ndị na-ehi mmiri.

● Ejila mmiri buru ibu asa ahụ́.

● Emebila mmiri mgbe ị na-akpụ afụ ọnụ ma ọ bụ na-asa ezé.

● Jiri tọwel saa ahụ́ ugboro abụọ ma ọ bụ atọ tupu ị sawa ya mmiri.

● Chere ruo mgbe i nwere ákwà buru ibu ị ga-asa mmiri tupu gị asawa ha.7

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

E Jighị A Kpata A Tụfuo Aba Ọgaranya

● N’agbanyeghị na Australia bụ kọntinent ala ya kasị kpọọ nkụ n’ụwa, otú ha si enweta ihe karịrị pasent iri itoolu nke mmiri na-edere ha ala ubi bụ “site n’isi n’iyi gwuru ala banye n’ubi ha,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Canberra Times na-akọ. Ihe a bụkwa “usoro ndị Ijipt ji mee ihe n’oge ha ka na-ewu pyramid.”

● N’ụwa nile, mmiri otu onye ji eme ihe, ná nkezi, (gụnyere nke e ji rụọ ọrụ ugbo na nke e ji mepụta ihe n’ụlọ ọrụ) bụ ihe dị ka lita 550,000 n’afọ. Otú ọ dị, otu onye n’Ebe Ugwu America na-eji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ lita 1,600,000 eme ihe n’afọ. Otu mba sobu na Soviet Union kasị e ji mmiri eme ihe. Ná nkezi, otu onye na-eji ihe karịrị nde lita 5.3 eme ihe kwa afọ.

● Magazin bụ́ Africa Geographic nyochara otú ala dị mba ọ bụla mkpa iji na-akọpụta ihe ha na-eri, ga-aharu. Dị ka magazin ahụ si kwuo, ná nkezi, a chọrọ ala dị eka iri iji kọpụta ihe otu onye nọ na South Africa ga-eri n’afọ. Otú ọ dị, nanị ala mba ahụ nwere iji na-akọpụta ihe otu onye ga-eri n’afọ bụ eka isii.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ala Sahel nke dị na Burkina Faso bụ́ nke e gbukpọsịrịla osisi ya. Osisi juru ebe a afọ iri na ise gara aga

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Jeremy Hartley/Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 8]

A na-ebibi oké ọhịa ndị dị na Cameroon site n’ịsụ ha ma kpọọ ha ọkụ iji kọọ ihe na ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Fred Hoogervorst/Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 8]

Mmetọ ụgbọala na-emetọ ikuku ka na-akpata nchegbu na United States

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

E bibiri oké ọhịa dị ihe dị ka square kilomita 20,000 na Brazil kwa afọ, n’agbata afọ 1995 na afọ 2000

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Ricardo Funari/SocialPhotos.com

[Foto dị na peeji nke 9]

Ego ihe karịrị ijeri mmadụ abụọ ji adị ndụ kwa ụbọchị epeka

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Giacomo Pirozzi/Panos Pictures

[Foto dị na peeji nke 9]

Azụ̀ oporo a na-azụ̀ n’otu obodo nta dị n’India emetọwo mmiri a si n’ala agbapụta nke ndị obodo ahụ na-ekuru

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Caroline Penn/Panos Pictures