Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ma Ọ Bụrụ na O Kweghị?

Gịnị Ma Ọ Bụrụ na O Kweghị?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Ma Ọ Bụrụ na O Kweghị?

I WEERE ya dị ka enyi. E mesịa, ya adọrọ mmasị gị n’ụzọ ọzọ. Ikekwe, ọ bụ omume ọma ya ma ọ bụ ihu ọchị o ji gwa gị okwu dọtara mmasị gị n’ebe ọ nọ. Ka o sina dị, oge agafeela, o gosighịkwa na ọ hụrụ gị n’anya. N’ihi ya, gị ekpebie ịjụ ya ma ọ̀ ga-achọ ka enyi gị na ya gafee enyi nkịtị. N’ụzọ riri gị ọnụ, ya ejiri obiọma gwa gị hoo haa na ya achọghị. *

Dị ka o kwesịrị ịdị, ihe ahụ o kwuru wutere gị. Ma ya ewutebigala gị ókè; gbalịa ile ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ee, nwa okorobịa ekwuwo na ya enweghị mmasị ka gị na ya banye ná mmekọrịta ịhụnanya. Cheta, ihe o kwuru agbanweghị uru ị bara dị ka mmadụ, nke o ji agbanwe eziokwu ahụ bụ́ na ndị ọzọ ka hụkwara gị n’anya ma na-akwanyere gị ùgwù. N’eziokwu, ihe mere nwa okorobịa ahụ ji kpebie otú ahụ nwere ike ọ bụghị na ọ hụghị gị n’anya kama ọ pụrụ ịbụ n’ihi ihe mgbaru ọsọ ya na ihe ndị ka mkpa ná ndụ ya.

Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst, ị pụkwara icheta na “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.” (Ndị Hibru 6:10) Sonja * si otú a kwuo ya: “Ị ka bara uru. Dị ka onye na-alụbeghị di, ị ka baara Jehova uru.” Ebe ọ bụ na Onye Kasị Ihe Nile Elu ji gị kpọrọ ihe, n’ihi gịnị ka ị ga-eji gharazie iji onwe gị kpọrọ ihe?

Ị ka pụrụ ịdị na-eche na ọ dịghị uru ị bara ma ọ bụ na-atụ ụjọ na ị dịghị mma ọlụlụ. Ma nanị n’ihi na o yiri ka i ‘zighị ezi’ n’anya nwa okorobịa a ugbu a apụtaghị na ọ dịghịzi onye ọzọ i “ziri ezi” n’anya ya. (Ndị Ikpe 14:3) Ya mere, kama iwere ya na ị kụwo afọ n’ala n’ọchịchọ ị na-achọ ezigbo di, ghọta na mgbalị gị arụpụtawo otu ihe dị mma: Ị matawo na nwa okorobịa a abụghị nke gị. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

Nwoke ahụ Ò kwesịịrị Gị?

Bible nyere ndị bụ́ di iwu “ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha.” (Ndị Efesọs 5:28) O nyekwara ndị bụ́ di iwu ‘ikenye ndị nwunye ha nsọpụrụ.’ (1 Pita 3:7) N’ọnọdụ a, ọ pụrụ ịbụ na nwa okorobịa ahụ ji gị kpọrọ ihe dị ka enyi. Ma ebe ọ bụ na o kweghị, o gosiwo na ya adịbeghị njikere ịhụ gị n’anya na inye gị nsọpụrụ dị ka nwunye ya. Ọ bụ ihe ruuru ya ime nhọrọ dị otú ahụ. Sigodị otú a lee ya anya: Ọ bụrụ na obi ya adịghị n’ebe ị nọ, ihe ọ̀ ga-adabara gị na ya n’ezie ma ị lụọ ya? Chegodị ụdị obi ilu ị ga-enwe ma ọ bụrụ na ị lụọ onye na-ahụghị gị n’anya ma jiri gị kpọrọ ihe dị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru!

Ọ pụkwara ịdị mma ma i lerukwuo nwa okorobịa a anya ugbu a ị na-enweghịzi olileanya na unu ga-abanye ná mmekọrịta ịhụnanya. Mgbe ụfọdụ, ịhụnanya nzuzu na-eme ka mmadụ ghara ịhụ ọrụ onye ọ hụrụ n’anya gbara ma ọ bụ ntụpọ o nwere n’ụzọ ime mmụọ bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ndị ọzọ na-ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ na ọ maghị na mmetụta ịhụnanya ị na-enwe n’ebe ọ nọ na-arị elu, ka ọ̀ kpachaara anya gbachie nkịtị ka mmetụta ahụ ka njọ site n’ịnọgide na-eso gị akpakọrịta? Ọ bụrụ na ọ kpachaara anya gbachie nkịtị, ọ́ dịghị egosi na ọ dịghị njikere ịbụ Onye Kraịst bụ́ di nke nwere mmetụta ọmịiko ma na-echebara ndị ọzọ echiche? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ dị mma na ị chọpụtara nke a, ọ bụ ezie na o nwere ike iwute gị.

Mgbe otu nwa okorobịa malitere inye Marcia ihu n’ụzọ pụrụ iche, Marcia bịara hụ ya n’anya. Mgbe Marcia jụrụ ya ihe bụ́ uche ya, ọ gwara ya na ya enweghị mmasị ịlụ ya. Gịnị nyeere ya aka idi ọnọdụ ahụ? O kwuru, sị, “Iji ụbụrụ m, ọ bụghị obi m, chee echiche enyeworo m aka ịchịkwa mmetụta m.” Icheta ihe ndị Bible chọrọ n’aka ndị bụ́ di nyeere ya aka ịghọta na nwa okorobịa ahụ erughịdị ihe a chọrọ. Nke a nyeere ya aka ịkwụsị inwe obi ilu.

Otu nwa okorobịa mesokwara Andrea ihe n’ụzọ yiri nke ahụ. Andrea mesịrị ghọta na otú nwa okorobịa ahụ si mesoo ya ihe gosiri na o tozughị okè. Ọ bịara chọpụta na ọ dịghị njikere ịlụ nwanyị, o nwekwara ekele na Jehova meghere anya ya ịhụ ihe bụ́ eziokwu. Ọ na-ekwu, sị, “Ekweere m na Jehova pụrụ ichebe gị n’ọnọdụ ndị pụrụ ịgbawa gị obi, ma ị ghaghị ịtụkwasị Ya obi.” N’ezie, n’ọtụtụ ọnọdụ, nwa okorobịa mere otú ahụ nwere ike ịbụ onye na-akpa ezi àgwà, ihe mere o ji sị na ya ekweghị pụkwara ịbụ ihe ezi uche dị na ya. N’ọnọdụ nke ọ bụla, olee otú ị ga-esi nagide mmetụta ndị ị na-enwe n’ihi ihe ọ gwara gị?

Ihe Ị Pụrụ Ime Banyere Mmetụta Gị

Ọ pụrụ iwe oge tupu obi gị anabata eziokwu ahụ bụ́ na o kweghị. Ịhụnanya i nwere n’ebe ọ nọ ji nwayọọ nwayọọ tolite, iwepụ obi gị n’ahụ́ ya ga-ewekwa oge. Mmetụta ịhụnanya adịghị apụ n’obi ngwa ngwa. N’ụbọchị ụfọdụ, mmetụta ahụ pụrụ ịkarị gị akarị n’ahụ́! Nwee ndidi. Mmetụta ndị ahụ ga-akwụsị ka oge na-aga. Ma, ị chọọ ka mmetụta ndị ahụ kwụsị ngwa ngwa, zere ihe ndị na-akpali ha.

Dị ka ihe atụ, zere ịta onwe gị ụta site n’ịtụleghachi ihe nile i mere ma kwuo mgbe ị gwara nwa okorobịa ahụ mmetụta ị na-enwe n’ebe ọ nọ. Ọ bụrụ na i zereghị echiche dị otú ahụ, ị pụrụ imesị kwere na ihe ọ zara gị esichaghị ya n’obi ma ọ bụkwanụ na ọ ga-ekweta ma i si ụzọ ọzọ gwa ya. Kweta na ị pụghị ịgbanwe mmetụta ya. O yikarịrị ka otú ọ sọkwara gị si gwa ya ya, azịza ya gaara abụkwa otu ihe ahụ.

Ịmụ anya arọ nrọ bụ ihe ọzọ pụrụ ịbụrụ gị ọnyà. Ị ga-eji anya nke uche gị na-ahụ ebe unu abụọ bi nnọọ n’udo ka unu lụsịrị. Nrọ ahụ pụrụ iyi ihe na-eme ka obi jụrụ gị, ma, ọ bụ nanị nrọ. Ị rọchaa ya, gị amaliteghachikwa inwe mmetụta nke ịbụ onye ihe funahụrụ nakwa obi ilu. Oge ọṅụ a bụ́ nke oge mwute na-esochi ga-adịgide ruo ogologo oge, ọ gwụla ma ị gbalịsiri ike ịkwụsị ya.

Gbalịa ịkwụsị ịmụ anya arọ nrọ. Ọ bụrụ na ị malite ya, bilie gagharịa. Chọọ otu ihe mewe—ihe ga-eme ka echiche gị dịrị n’ihe ọzọ. Tinye uche n’ihe ndị ga-ewuli gị elu, ọ bụghị n’ihe ndị ga-akụda gị mmụọ. (Ndị Filipaị 4:8) Nke a pụrụ isiri gị ike ná mmalite, ma ka oge na-aga, ị ga-emeri n’ọgụ ahụ ma nwee obi iru ala.

Nkwado nke ezi ndị enyi gị pụkwara inyere gị aka. (Ilu 17:17) Otú ọ dị, Sonja na-enye ịdọ aka ná ntị a: “Ọ dịghị mma ma ọ bụrụ na ndị enyi gị nile bụ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ndị ọgbọ gị, na ndị ọ na-agụ agụụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ọ dịkwa mkpa ka i nwee ndị enyi metụrụla okenye, bụ́ ndị pụrụ inyere gị aka ile ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.” Chetakwa, e nwere onye pụrụ inyere gị aka ọbụna karị n’inweta enyemaka iji merie obi mgbawa i na-enwe.

Jehova—Enyi na Onye Nkwado

Mgbe otu nwoke kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie nwere nkụda mmụọ, o kpegaara Jehova ekpere maka enyemaka. Gịnị meziri? O dere, sị: “Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m, nkasi obi Gị nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.” (Abụ Ọma 94:19) Jehova ga-agụgụkwa ma kwadoo gị ma ọ bụrụ na i jiri okwukwe kpegara ya ekpere. Andrea mere otú ahụ. O kwuru, sị, “Ekpere dị nnọọ mkpa iji mee ka i nwee ike ịnagide obi mgbawa ahụ ma dịrịkwa ndụ na-aga.” N’otu aka ahụ, Sonja kwuru banyere ekpere, sị, “Ọ na-enyere mmadụ aka iji onwe ya kpọrọ ihe bụ́ nke na-adabereghị ná ndị ọzọ inwe mmasị n’ebe ọ nọ ma ọ bụ ha ịjụ ya.”

Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịghọtacha mmetụta ị na-enwe, ma Jehova na-aghọtacha ya. O kenyere n’ime ụmụ mmadụ ọchịchọ nke igosirịta ịhụnanya n’alụmdi na nwunye. Ọ maara otú ịhụnanya mmadụ na-enwe n’ebe onye ọ chọrọ ịlụ nọ na-esiru n’ike, ọ makwaara otú e si achịkwa ya. Ọ pụrụ inyere gị aka imeri oké obi mgbawa gị, n’ihi na 1 Jọn 3:20 na-ekwu, sị: “Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe nile.”

Lee Ihe Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

Alụmdi na nwunye pụrụ ịbụ ihe na-eweta obi ụtọ dị ukwuu, ma ọ bụghị nanị ya pụrụ iweta obi ụtọ. Ndị nile na-ejere Jehova ozi na-enwe ọṅụ, ọ bụghị nanị ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye na-enwe ya. N’ụzọ ụfọdụ, ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere uru ụfọdụ karịa ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Ha adịghị enwe “mkpagbu n’anụ ahụ́ ha” bụ́ nke e kwuru banyere ya na 1 Ndị Kọrint 7:28. Mkpagbu a na-ezo aka ná nchegbu na ndọlị nke ndị nile lụrụ di na nwunye na-eche ihu. Ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwekwaara onwe ha karị, ha pụkwara iji ndụ ha jeere Jehova ozi n’enweghị ihe mgbochi. N’ihi ya, Bible na-ekwu, sị: “Onye nyefere ọnọdụ amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ya n’alụmdi na nwunye na-eme nke ọma, ma onye na-enyefeghị ya n’alụmdi na nwunye ga-eme nke ọma karị.” (1 Ndị Kọrint 7:38) Ọ bụrụgodị na ị na-achọsi ike ịlụ di, ịtụgharị uche n’ihe ndị a Bible na-ekwu pụrụ inyere gị aka ile ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma jiri ọnọdụ ị nọ na ya ugbu a mee ihe n’ụzọ ga-akasị abara gị uru.

Ụfọdụ ndị enyi gị bụ́ ndị na-echere gị echiche ọma pụrụ ịgwa gị, sị, “Echegbula onwe gị, otu ụbọchị ị ga-achọta onye dị mma.” Ọ bụkwa eziokwu na otu onye ịjụ gị adịtụghị apụta na ị gakwaghị alụ di. Ka o sina dị, otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst nke aha ya bụ Candace si otú a kwuo ya: “Atụkwasịrị m Jehova obi. Adịchaghị m atụ anya ka o nye m di iji mee ka obi dị m ụtọ. Ma amaara m na ọ ga-enye m ihe m ga-eji mejuo ọchịchọ ahụ.” Iche echiche n’ụzọ dị mma otú a enyeworo ya aka imeri obi mgbawa o nwere mgbe otu nwoke jụrụ ịlụ ya.

N’ụwa a, mgbalị a na-eme ịbanye n’alụmdi na nwunye na-akụkarị afọ n’ala, ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ọtụtụ alụmdi na nwunye. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi ma gbasoo ndụmọdụ ya, ọ pụrụ inyere gị aka ịkwụsị inwe mwute ma malite inwe ọṅụ. Ị pụrụ inwe ụdị ahụmahụ Eze Devid nwere, bụ́ onye dere, sị: “Onyenwe anyị, n’ihu Gị ka ịchọsi ike m nile dị; ize ume m ezonarịghịkwa Gị. N’ihi na Gị, Jehova, ka m cherewooro: Gị onwe gị ga-aza, Onyenwe anyị, Chineke m.”—Abụ Ọma 38:9, 15.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto eto Na-ajụ Sị . . . Olee Otú M Pụrụ Isi Gwa Ya Mmetụta M Na-enwe n’Ebe Ọ Nọ?” (November 8, 2004) kọwara na, n’obodo ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ ihe a na-asọ nsọ bụ́ nwanyị ịgwa nwoke ka ọ lụwa ya. Ọ bụ ezie na Bible akatọghị nwanyị ime otú ahụ, ọ na-agba Ndị Kraịst ume ka ha zere ịbụrụ ndị ọzọ ihe ịsụ ngọngọ. N’ihi ya, ndị chọrọ ngọzi Chineke kwesịrị iburu ndụmọdụ Bible n’uche mgbe ha na-ekpebi ihe ha ga-eme.—Matiu 18:6; Ndị Rom 14:13; 1 Ndị Kọrint 8:13.

^ par. 5 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

Rite uru n’enyemaka Chineke na-enye