Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Ịdị Nwayọọ Ọ̀ Pụtara na Ọ Dịghị Ike?

Mmadụ Ịdị Nwayọọ Ọ̀ Pụtara na Ọ Dịghị Ike?

Echiche nke Bible

Mmadụ Ịdị Nwayọọ Ọ̀ Pụtara na Ọ Dịghị Ike?

“Ọ dịghị mkpa ka ohu nke Onyenwe anyị na-alụ ọgụ, kama ọ dị mkpa ka ọ na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro.”—2 TIMOTI 2:24.

O GOLOGO oge tupu a mụọ anyị, anyị na-ama mgbe ihe metụrụ anyị n’akpụkpọ ahụ́ anyị na-akabeghị aka. Malite n’oge a mụrụ anyị, ọ na-agụ anyị agụụ ka nne anyị na-adịda anyị aka n’ụzọ dị nro. N’oge anyị bụ ụmụaka, mmasị anyị na-enwe n’ịmụmụ ọnụ ọchị, otú anyị si eto n’ụzọ mmetụta uche, na ọbụna ọchịchọ anyị na-enwe ịmụta ụzọ dị mma isi na-enwe nkwurịta okwu, na-adabere n’otú ndị mụrụ anyị gosiruru anyị ịhụnanya.

Otú ọ dị, Bible buru amụma na n’ụbọchị ikpeazụ, ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ.” Àgwà ndị dị nro dị ka obiọma na ọmịiko ga-adị nnọọ ụkọ, ebe ọ bụ na ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ onwe ha n’anya” na “ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe.”—2 Timoti 3:1-3.

Ọtụtụ ndị taa na-eche na ọ dị ha mkpa ịbụ ndị obi ọjọọ na ndị obi kpọrọ nkụ. Ha na-ekwu na mmadụ ịdị nwayọọ pụtara na onye ahụ adịghị ike. Ma ọ̀ bụ eziokwu?

Ndị Dị Nwayọọ Ma Dị Ike

A kọwara Jehova Chineke dị ka “onye agha.” (Ọpụpụ 15:3) Ọ bụ Isi Iyi nke ike nile. (Abụ Ọma 62:11; Ndị Rom 1:20) N’agbanyeghị nke ahụ, ike Jehova egbochighị ya ịbụ onye ‘nwere mmetụta dị nnọọ nro na onye na-eme ebere’ mgbe ọ na-akwụ nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job, ụgwọ ọrụ. (Jems 5:11) N’ụzọ o si mesoo mba Izrel ihe, Jehova kọwara na mmekọrịta ya na ha bụ nke kasị dị nro site n’iji mmetụta o nwere n’ebe ha nọ tụnyere nke nwanyị mụrụ nwa ọhụrụ bụ́ onye na-enwe obi ebere n’ahụ́ “nwa afọ ya.”—Aịsaịa 49:15.

N’otu aka ahụ, Jizọs dị ike ma dị nwayọọ. O ji obi ike katọọ ndị ndú okpukpe iru abụọ nke oge ya. (Matiu 23:1-33) O jikwa ike chụpụ ndị anyaukwu na-agbanwe ego n’ụlọ nsọ. (Matiu 21:12, 13) Ma, asị Jizọs kpọrọ nrụrụ aka na anyaukwu ò mere ka ọ bụrụ onye obi kpọrọ nkụ? Mbanụ! A maara Jizọs dị ka onye na-emeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ dị nro. N’ezie, o jidị onwe ya tụnyere nnekwu ọkụkọ nke ‘na-achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya.’—Luk 13:34.

Ịkpọ Obi Nkụ Ka Ọ̀ Bụ Ịgbasi Ike n’Omume?

A na-agba ezi Ndị Kraịst ume iṅomi Kraịst site n’iyikwasị “ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị.” (Ndị Efesọs 4:20-24) A gwara anyị ka anyị ‘yipụ ụdị mmadụ ochie ahụ na omume ya,’ dị nnọọ ka nshịkọ si enwo mkpo ya ka o wee nwee ike ito eto. (Ndị Kọlọsi 3:9) Otú ọ dị, n’adịghị ka nshịkọ nke mkpo ya na-emesị sie ike n’oge na-adịghị anya o nwosịrị ya, e nyere anyị iwu ka anyị yikwasị mgbe nile “mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, . . . na ogologo ntachi obi.” (Ndị Kọlọsi 3:12) N’ihi ya, e kwesịrị iji ịdị nwayọọ mara anyị.

Anyị iyikwasị mmetụta ndị dị nro abụghị ihe na-egosi na anyị adịghị ike. N’ụzọ dị iche, ọ chọrọ anyị ịbụ ndị ‘e ji ike sitere ná mmụọ Jehova mee ka anyị dị ike ná mmadụ ahụ nke anyị bụ n’ime.’ (Ndị Efesọs 3:16) Dị ka ihe atụ, otu nwoke aha ya bụ Lee na-ekwu, sị: “Oge na-adịbeghị anya gara aga, abụ m onye obi ọjọọ na ajọ mmadụ. Ọbụna ọdịdị m na-eyi egwu n’ihi na adụnyesịrị m ọla n’ahụ́ m. Ekpebisiri m ike inwe ego, ana m ekwukarịkwa okwu rụrụ arụ ma na-eme ihe ike iji nweta ihe m chọrọ. Enweghị m ọmịiko.” Ka o sina dị, Lee na otu onye ya na ya na-arụkọ ọrụ malitere ịmụ Bible, ọ bịakwara mara Jehova Chineke ma hụ ya n’anya. O yipụla mmadụ ochie ya ma mụtazie inwe njide onwe onye. Ugbu a, ọ na-egosipụta ịhụnanya o nwere n’ebe ndị mmadụ nọ site n’iwepụta oge ya iji nyere ha aka ịmụ Bible.

N’otu oge, Pọl onyeozi n’onwe ya bụ “onye na-akparị mmadụ,” onye na-eme ihe ike iji nweta ihe ọ chọrọ. (1 Timoti 1:13; Ọrụ 9:1, 2) N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe Pọl bịara ghọta ebere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst meere ya na otú ha hụruru ya n’anya, o mere ihe site n’ịgbalịsi ike iṅomi àgwà ha ndị ahụ. (1 Ndị Kọrint 11:1) Ọ bụ ezie na Pọl gbasochiri ụkpụrụ Ndị Kraịst anya, ọ mụtara imeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ dị nro. N’ezie, Pọl alaghị azụ n’igosi ụmụnna ya mmetụta dị nro.—Ọrụ 20:31, 36-38; Faịlimọn 12.

Inweta Ike Iji Na-adị Nwayọọ

Dị ka ahụmahụ Lee na Pọl onyeozi na-egosi, ịmụta imeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ dị nro apụtaghị na mmadụ agaghị agbasi ike n’omume. N’ezie, ọ pụtara na ọ ga-agbasi ike n’omume. Mmadụ aghaghị ịgbasi nnọọ ike tupu ya enwee ike ịgbanwe echiche ya na omume ya na ịlụso ọchịchọ anụ ahụ́ nke ‘iji ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ’ ọgụ.—Ndị Rom 12:2, 17.

Anyị onwe anyị pụrụ ịmụta igosipụta obi ọmịiko site n’ịgụchi Okwu Chineke anya na ịtụgharị uche n’ebere Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, meerela anyị nakwa n’ịhụnanya ha gosirila anyị. Site n’ime nke ahụ, anyị ga-ekwe ka ike nke Okwu Chineke mee ka obi anyị dị nro. (2 Ihe E Mere 34:26, 27; Ndị Hibru 4:12) N’agbanyeghị otú e si zụlite anyị ma ọ bụ otú anyị kpọruru obi nkụ, anyị pụrụ ịmụta ‘imeso mmadụ nile ihe n’ụzọ dị nro.’—2 Timoti 2:24.

[Foto dị na peeji nke 22]

Ezigbo nna na-emeso ụmụ ya ihe n’ụzọ dị nro