Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nairobi—“Ebe E Nwere Mmiri Oyi”

Nairobi—“Ebe E Nwere Mmiri Oyi”

Nairobi—“Ebe E Nwere Mmiri Oyi”

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA KENYA

“Ọ bụ ala apịtị na-adịghị eme nri, nke ikuku na-akpa aka ọjọọ. Ala mmadụ ọ bụla na-ebighị na ya, nke ọtụtụ puku ụmụ anụmanụ dịgasị iche iche ji mere ebe obibi. Nanị ihe gosiri na mmadụ na-abịa ebe ahụ mgbe ụfọdụ bụ ụbá taya ochie nke ụgbọ ịnyịnya ndị si n’ala apịtị ahụ dị larịị gafee.”—MMALITE NKE OBODO KENYA.

O KWU ndị a na-akọwa otú Nairobi dị ihe karịrị otu narị afọ gara aga, bụ́ mgbe ọdụm, enyí ọhịa, agụ owuru, anịgọ, agwọ ọjọọ, na ọtụtụ anụ ọhịa ndị ọzọ ji ya mere ebe obibi. Ndị Masai ụjọ na-anaghị atụ na-achịrị ehi ha ha na-ejighị egwu egwu gaa n’otu iyi dị ebe ahụ nke nwere ezigbo mmiri, bụ́ ebe ndị na-achịgharị ehi na-enwe mmasị ịga. N’ezie, ndị Masai kpọrọ iyi ahụ Uaso Nairobi, nke pụtara “Mmiri Oyi,” ha akpọọkwa ebe mmiri ahụ dị Enkarre Nairobi, nke pụtara “Ebe E Nwere Mmiri Oyi”—si otú ahụ nye ógbè nke ga-agbanwe akụkọ ihe mere eme nke Kenya kpamkpam, aha.

Otu ihe dị mkpa e mere nke so mee ka Nairobi mepee bụ ọrụrụ a rụrụ ụzọ ụgbọ okporo ígwè Kenya, bụ́ nke a mabuuru n’asụsụ Bekee dị ka Lunatic Express. * Ka ọ na-erule n’etiti afọ 1899, e sila n’obodo Mombasa bụ́ nke dị n’ụsọ oké osimiri rụrụ ụzọ ụgbọ okporo ígwè dị kilomita 530 ruo Nairobi. N’oge a, ndị na-arụ ya ka na-ata ahụhụ n’ihi nsogbu ha nwetara n’aka “anụ Tsavo ndị na-eri mmadụ,” bụ́ ọdụm abụọ ndị gburula ọtụtụ n’ime ndị ọrụ ha. Ihe ọzọ chekwara ndị ọrụ a ihu bụ Nnukwu Ndagwurugwu Rift na-eyi egwu. Ebe ọ bụ na ụzọ okporo ígwè ahụ ka ga-abanyekwu n’ime ime mba ahụ, a hụtaghịzi Mombasa, bụ́ ebe bụ́ isi a na-ebusa ngwá ọrụ, dị ka ebe kasị mma maka ibusa ngwá ọrụ. Kama nke ahụ, a hụtaziri Nairobi dị ka ebe kasị mma ndị ọrụ ahụ ga-anọ na-ezuru ike nakwa ebe dị n’ime nke a ga na-ebusa ngwá ọrụ, n’agbanyeghị na o yiri ebe na-adịghị mma ọnụnọ. Nke a nyere aka n’ime ka ọ bụrụ isi obodo Kenya ka e mesịrị.

Ná mmalite narị afọ nke 20, a họọrọ Nairobi ịbụ ebe ọchịchị hiwere isi ná mba ahụ a ka kepụtara ọhụrụ bụ́ East Africa Protectorate, nke bụ́ ihe a na-akpọ Kenya n’oge ahụ. Ihe gaara aka mma ma a sị na a kwadebere akwadebe tupu a rụwa obodo ahụ ka na-emepe emepe. Kama nke ahụ, ihe e mere bụ ịrụkasị mkpọmkpọ ụlọ aghara aghara n’akụkụ ụzọ ụgbọ okporo ígwè ahụ. N’ịbụ ndị e ji osisi, gbamgbam, na ihe ndị ọzọ e nwetara n’ógbè ahụ rụọ, ụlọ ndị ahụ mere ka Nairobi yie ógbè nkịkara ụlọ kama iyi ebe ga-emesị bụrụ ebe ndị si mba dị iche iche ga na-agbakọta. E butụghị n’obi na Nairobi ga-abụ ebe ndị si mba dị iche iche ga na-agbakọta mgbe a na-ewu ụlọ ole na ole ndị e wuru na ya ná mmalite narị afọ nke 20. Ọzọkwa, a ka nọgidere na-atụ egwu anụ ndọgbu ndị na-agagharị na ya.

N’oge na-adịghị anya, ọrịa kpara mkpamkpa n’ógbè ahụ a ka kwatara na ya ọhụrụ. Ọrịa ndị ahụ tiwapụrụnụ bụ n’ezie ihe ịma aka mbụ ndị ọchịchị ọhụrụ ahụ nwetara. Gịnị ka e mere iji kwụsị ya ngwa ngwa? A gbara ụlọ ndị dị n’ebe ọrịa ahụ metụtara ọkụ iji kwụsị mgbasa ya! N’ime afọ iri ise na-esonụ, Nairobi gaje iji nwayọọ nwayọọ gbanwee ọdịdị ya ahụ na-adịghị mma n’anya ma ghọzie ebe azụmahịa na mmekọrịta mmadụ na ibe ya ga-ehiwe isi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa.

Otú Obodo ahụ Si Mepee

A na-anọ na Nairobi ahụ ọmarịcha ala ndị gbara ya gburugburu n’ihi na ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu ya dị ihe dị ka mita 1,680. N’ụbọchị ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ, ọ na-adị mfe mmadụ ịnọ na ya hụ ugwu abụọ a ma ama n’Africa. N’ebe ugwu, e nwere Ugwu Kenya, bụ́ nke ịdị elu ya bụ mita 5,199, nke bụ́kwa ugwu kasị elu ná mba ahụ na ugwu nke abụọ kasị elu n’Africa. N’ebe ndịda ndịda, n’ókè Kenya na Tanzania, e nwere Ugwu Kilimanjaro, nke ịdị elu ya bụ mita 5,895, ọ bụkwa ugwu kasị elu n’Africa. Ọnụnọ snow na-anọ n’Ugwu Kilimanjaro mgbe nile, bụ́ ugwu dị nso n’akara equator, dọọrọ mmasị ndị Europe na-amụ banyere ọdịdị mbara ala na ndị nke na-eme nchọpụta n’afọ 150 gara aga.

N’ịbụ obodo malitere imepe n’ihe karịrị afọ iri ise gara aga, Nairobi agbanweela nnọọ kpamkpam. A na-ahụ mmepe ọ na-emepe site ná nnukwu ụlọ elu dịgasị iche iche a na-arụ na ya. Taa, ọ na-adị nnọọ ebube ikiri nnukwu ụlọ elu ndị e ji ugegbe na ígwè rụọ bụ́ ndị na-egbukepụ egbukepụ ma anyanwụ na-ada ada na-achakwasị ha. Ọ ga-esiri onye ọbịa bịara n’ógbè azụmahịa bụ́ isi nke Nairobi ike ikweta na ebe ahụ bụbu ebe obibi nke ụmụ anụ ọhịa—ebe dị ize ndụ nye ụmụ mmadụ—otu narị afọ gara aga.

Ka oge na-aga, ihe gbanwere. E si ala Bekee webata fụlawa ndị dị ka bougainvillea na-ama mma n’anya, jacaranda akwụkwọ ya na-adị pokopoko, eucalyptus na-eto ngwa ngwa, na wattle. N’ụzọ dị otú a, e ji nke nta nke nta gbanwee ụzọ ndị ahụ bụbu ụzọ ọhịa uzuzu juru ka ha bụrụzie okporo ụzọ ndị a dụrụ osisi n’ụzọ dị n’usoro n’akụkụ ha abụọ. Osisi ndị a anọgidewokwa na-enye ndị ji ụkwụ aga ndo n’oge ezigbo anwụ na-acha. N’otu ebe a na-azụ osisi na fụlawa na nso etiti obodo ahụ, e nwere ọ dịkarịa ala ụdị osisi na fụlawa 270 dịgasị iche iche na ya. Anyị pụrụ ịghọta ihe mere onye edemede ọzọ ji kwuo na Nairobi “yiri ka ọ̀ dị n’etiti oké ọhịa.” Nnukwu osisi ndị dị na Nairobi enyewo nnọọ aka mee ka ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ ya bụrụ nke na-adị mma n’ahụ́—a na-enwe okpomọkụ n’oge ehihie, oge abalị ana-ajụ oyi.

Ebe E Nwere Ọdịnala Dịgasị Iche Iche

Dị nnọọ ka magnetọ si adọta ihe, Nairobi adọtawo mmadụ ndị si n’ebe dịgasị iche iche. Ndị bi n’obodo ahụ ugbu a akarịala nde abụọ. Nrụsị a rụsịrị ụzọ ụgbọ okporo ígwè ahụ mere ka ndị mmadụ nwee ezigbo ihe mere ha ga-eji gaa biri n’ógbè ahụ. Ndị India bụ́ ndị nyere aka rụọ ụzọ okporo ígwè ahụ biriziiri ebe ahụ ma mepee ụlọ ọrụ dị iche iche bụ́ ndị bịara too ma gbasaa ná mba ahụ nile. Ndị ọzọ na-achụ nta ego sikwa Australia, Canada, na ọtụtụ mba Africa bịa.

Nairobi bụ ebe e nwere ọdịnala dịgasị iche iche. N’okporo ámá ya, ị pụrụ ịhụ nwanyị India yi uwe ndị obodo ya ka ọ na-aga ahịa, ị pụkwara ịhụ ebe onye Pakistan bụ́ injinia na-agbaga n’ebe ọ na-arụ ọrụ, ebe onye Netherlands na-arụ n’ụgbọelu nke ejiji ya na-egbuke egbuke bịara ka e nye ya ụlọ n’otu họtel, ma ọ bụkwanụ ebe onye ọchụ nta ego si Japan ji ọsọ na-aga nzukọ achụmnta ego dị mkpa, ikekwe n’ụlọ ọrụ na-ahụ maka azụmahịa na Nairobi bụ́ nke na-aga nke ọma. Tụkwasị na nke a, ị pụrụ ịhụ ụmụ amaala obodo ahụ ebe ha na-eche bọs; ebe ha na-ere ihe n’ụlọ ahịa, ebe ha na-ere ihe n’ahịa èzí; ebe ha na-arụ ọrụ n’ọfịs ma ọ bụkwanụ n’ọtụtụ ụlọ ọrụ ndị e nwere na Nairobi.

N’ụzọ na-eju anya, ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime ndị Kenya bi n’obodo ahụ ka a pụrụ ịsị na ha bụ ụmụ afọ “Nairobi.” Ihe ka ọtụtụ n’ime ha si obodo ndị ọzọ dị na Kenya bịa, ka ha na-achọ “ebe osisi na-amị ego.” N’ozuzu, ndị bi na Nairobi nwere omume enyi na afọ ọma. Ikekwe, ọ bụ ụdị omume ile ọbịa a mere obodo a ji bụrụ ebe mba ụwa na òtù dị iche iche na-anọ enwe nzukọ ezumezu. Isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ngalaba Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu dị na Nairobi.

Gịnị Na-adọta Ndị Nleta n’Ebe Ahụ?

Kenya bụ mba e nwere anụ ọhịa ndị dịgasị iche iche. Kwa afọ, ọtụtụ ogige ntụrụndụ na ebe a na-elekọta ụmụ anụmanụ bụ́ ndị e nwere n’obodo ahụ anọgidewo na-eme ka ọtụtụ puku mmadụ na-abịa nleta na ya. Nairobi bụ ebe a na-anọ ahazi ọtụtụ njem nleta. Ma, Nairobi n’onwe ya bụkwa ebe a na-eleta eleta. Ọ bụ nanị obodo ole na ole n’ụwa nwere ụmụ anụmanụ ndị jupụtara n’ime ya otú a. Ogige Nchekwa Anụ Ọhịa nke Nairobi, nke dị ebe na-erughị kilomita iri site n’etiti obodo ahụ, bụ ebe ahụ́ na-eru ndị nleta ala. * N’ebe a, ị ga-eji anya gị hụ anụmanụ ndị ahụ jibu Nairobi mere ebe obibi ha. E ji babụ waya kewapụ ụmụ anụmanụ n’ebe ndị mmadụ bi. N’oge na-adịbeghị anya, bụ́ September 2002, e jidere otu agụ owuru si n’otu oké ọhịa dị nso kpafuo ma banye na palọ mmadụ na Nairobi!

Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie nke Nairobi adịghị anya site n’etiti obodo ahụ. Ọtụtụ narị ndị nleta na-abịa ebe a kwa ụbọchị iji mata banyere ihe ndị na-akpali mmasị mere na Kenya n’oge ochie. E nwere ụdị agwọ dịgasị iche iche n’ogige agwọ nke dị n’ebe ngosi ihe mgbe ochie ahụ. Agụ iyi nọ ebe ahụ achọghịdị ịma ma ndị nleta hà na-ele ya anya. Mbe nke nọ n’akụkụ ebe ahụ, n’agbanyeghị na ọ dịghị agasi ike, adịghị atụ ụjọ ndị bịara ileta ya. N’ezie, anụ ndị ka dịrị ebe ahụ bụ agwọ ndị dị ka ubí, eke, na ajụala. Ebe ọ bụ na anụ ndị dị otú ahụ nọ na ya, hụ na i leziri anya ịgbaso ihe a e dere na saịn bọọdụ: “Lezie Anya Maka Agwọ Ndị Dị Ize Ndụ”!

Mmiri nke Dị Iche

Ọ bụ ezie na mmiri e si nweta aha ahụ bụ Nairobi ka dị, e jiriwo ihe mkpofu ndị si n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe na ndị nke si n’ebe obibi metọọ ya, bụ́ ihe a na-ahụkarị n’ọtụtụ obodo ndị ka na-emepe emepe. Otú ọ dị, kemgbe ọtụtụ afọ, anọwo na-enye ndị bi na Nairobi “mmiri” si n’ebe ka elu. Nke a bụ ozi na-enye ndụ nke si na Bible, bụ́ nke Ndịàmà Jehova, na-ezi.—Jọn 4:14.

N’afọ 1931, ọtụtụ afọ tupu Nairobi abụrụ obodo a ma ama, Gray na Frank Smith, bụ́ ụmụnne abụọ si South Africa, bịara Kenya ikwusa eziokwu Bible. Ha si Mombasa soro ụzọ ụgbọ okporo ígwè ahụ, n’atụghị ụjọ ọtụtụ ihe ize ndụ—mgbe ụfọdụ ọbụna na-arahụ n’ebe dị nso n’ebe anụ ndọgbu nọ. Na Nairobi, ha jisiri ike nyefee akwụkwọ nta 600, tinyere akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Bible. Taa, e nwere ihe dị ka Ndịàmà 5,000 n’ọgbakọ 61 dị na Nairobi. Site ná nzukọ ọgbakọ, mgbakọ sekit na nke distrikti, nakwa mgbakọ mba nile, ndị bi na Nairobi amarawo banyere ọrụ Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ ndị ejiriwo obi ụtọ nabata ozi olileanya ha sitere na Bible.

Ọdịnihu nke Ka Mma

“A na-enwekarị ụkọ ụlọ n’obodo ndị nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ mmepụta ihe . . . Ụlọ ọrụ dị iche iche na-adị emetọ ikuku na mmiri,” ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekwu. Otú ahụ ka ọ dịkwa na Nairobi. Ebe ọ bụkwa na ndị mmadụ na-esi n’ime obodo akwata n’obodo a mepere emepe, nsogbu ndị a pụdịrị ịka njọ. N’ihi nsogbu ndị a a nọgidere na-enwe, ọ pụrụ ịdị mfe imebi mma Nairobi.

Otú ọ dị, ọ bụ ihe obi ụtọ na oge na-abịa n’ime Alaeze Chineke, mgbe mmadụ nile ga-ebi ndụ zuru ezu—ndụ nke ihe ndị na-eme ka ndụ sie ike obibi n’obodo ukwu taa na-agaghị emetụta.—2 Pita 3:13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Iji nweta nkọwa zuru ezu banyere otú e si rụọ ụzọ ụgbọ okporo ígwè ahụ, lee isiokwu bụ́ “‘Ụzọ Ụgbọ Okporo Ígwè A Na-aghọtaghị Isi Ya’ nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa,” na Teta! (Bekee) nke September 22, 1998, peeji nke 21-24.

^ par. 17 Lee Teta! (Bekee) nke June 8, 2003, peeji nke 24-27.

[Map dị na peeji 24]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Nairobi

[Foto dị na peeji nke 26]

Ugwu Kilimanjaro

[Foto dị na peeji nke 26]

Ugwu Kenya

[Ebe E Si Nweta Foto]

Duncan Willetts, Camerapix

[Foto dị na peeji nke 26]

Ahịa èzí

[Foto dị na peeji nke 27]

Frank na Gray Smith n’afọ 1931

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]

© Crispin Hughes/Panos Pictures