Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Mma Na-echu Ụra

Ndị Mma Na-echu Ụra

Ndị Mma Na-echu Ụra

MARIA * bụ nwa agbọghọ na-enwe ihe ịga nke ọma, o sikwa n’ezinụlọ hụrụ onwe ha n’anya. N’agbanyeghị nke ahụ, o nweghị obi ụtọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọdịdị ahụ́ ya amasịghị ya. Ọ bụ ezie na ndị ezinụlọ ya na-agbalị ịgba ya ume, ọ na-eche na ya amatụghị mma, nke a na-emekwa ka ọ na-ada mbà n’obi.

José si n’ezinụlọ a na-akwanyere ùgwù, o nwekwara ezigbo ihe mere ọ ga-eji na-enwe obi ụtọ. Ma ọ na-eche na ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ ga-achọta onye ọ ga-alụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ na-eche na ya adịghị mma n’anya, ọbụna na ya jọrọ njọ. O kwenyesiri ike na ọ dịghị ezigbo nwanyị ga-enwe mmasị n’ebe ọ nọ.

Luis, bụ́ onye dị afọ asatọ, na-enwe mmasị ịga akwụkwọ, ya na ndị mmadụ na-adịkwa nnọọ ná mma. Ọ na-atọ ya ụtọ iso ụmụ akwụkwọ ibe ya na-egwuri egwu, ma ọ na-ebekarị ákwá n’ihi na ha na-achị ya ọchị maka ọdịdị ahụ́ ya. Ha na-ekwu na o buru ibu.

Ọnọdụ ndị a abụghị ihe ọhụrụ. Ikwu na nsogbu Maria, José, na Luis nwere bụ nanị na ihere onwe ha na-eme ha pụrụ ịbụ ime ka nsogbu ha yie obere ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị onye ọ na-amasị ka a jụ ya n’ihi ọdịdị ahụ́ ya.

Otú ọ dị, ọtụtụ mmadụ ji ọdịdị ahụ́ kpọrọ ihe gabiga ókè. N’ezie, o yiri ka inwe ihe ịga nke ọma ọ̀ na-adaberekarị n’ọdịdị ahụ́. Dị ka ihe atụ, o yiri ka ọ na-aka adịrị ndị kasị maa mma mfe inweta ọrụ karịa ka o si adịrị ndị na-amaghị mma. Pilar Muriedas, bụ́ otu n’ime ndị isi nke Òtù Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike Ndị Inyom na Latin-America Nakwa na Caribbean, na-ekwu na, n’ebe ndị inyom nọ, “inwe ọdịdị ahụ́ bụ́ ịgba bụ otu n’ime isi ihe a chọrọ iji na-enwe ihe ịga nke ọma.” Dịkwa ka Dr. Laura Martínez si kwuo, o doro ndị inyom anya nke ọma na e meekwa elu mee ala, “ọdịdị ahụ́ dị oké mkpa ma a bịa n’iwe mmadụ n’ọrụ.”

Otú ọ dị, inweta ahụ́ “zuru okè” amalitekwala ichu ọtụtụ ndị ikom ụra. N’eziokwu, ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom na-eme ihe ọ bụla iji maa mma, ọbụna ha na-anọ agụụ ma ọ bụ kwere ka e nye ha ọgwụgwọ na-afụ ụfụ iji maa mma ruo ókè o kwere mee. Inweta ọdịdị ahụ́ bụ́ ịgba ò kwesịrị mgbalị a na-emere ya? È nwere ihe ize ndụ ọ bụla dị na ya?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha ndị ahụ.

[Foto dị na peeji nke 15]

Ọdịdị ahụ́ mmadụ pụrụ ikpebi otú ohere o nwere inweta ihe ga-aharu