Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nleta Anyị Na-agaghị Echefu Echefu Anyị Gara na Ndagwurugwu Ngorongoro

Nleta Anyị Na-agaghị Echefu Echefu Anyị Gara na Ndagwurugwu Ngorongoro

Nleta Anyị Na-agaghị Echefu Echefu Anyị Gara na Ndagwurugwu Ngorongoro

Site n’aka onye edemede Teta! na Tanzania

“A SỊ na ndị mmụọ ozi sere foto n’Ogige Iden, foto ụmụ anụmanụ ha gaara ese agaraghị adịcha iche ná ndị nke mmadụ pụrụ ise na Ndagwurugwu Ngorongoro taa.” Ihe a ka Reinhard Künkel dere n’akwụkwọ ya banyere ebe a na-adọrọ mmasị, bụ́ nke dị na Tanzania. N’ezie, Ndagwurugwu Ngorongoro mara nnọọ mma, ọtụtụ puku ụmụ anụmanụ jukwara na ya. Soro anyị, ka i jiri anya gị hụ!

Ebe Dị Ebube n’Anya

Mgbe anyị jisịrị ụgbọala gaa awa anọ n’okporo ụzọ bụ́ uzuzu uzuzu, anyị mesịrị rute n’elu elu Ndagwurugwu Ngorongoro. Anyị nọ n’ihu họtel anyị kirie ebe a dị ebube n’anya. N’ezie, ebe a enweghị atụ. Ndị ọkà mmụta ihe ndị si n’okike kpọdịrị ya “ihe nke asatọ kasị ịtụnanya n’ụwa,” anyị pụkwara ịhụ ihe kpatara ya.

Ebee ka e si nweta aha ahụ bụ́ Ngorongoro? Ọ dịghị onye maara kpọmkwem ebe ọ bụ. Dị ka Ụlọ Ọrụ Na-echekwa Ihe Ndị E Kere Eke n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa si kwuo, ụfọdụ na-ekwu na Ngorongoro bụ aha onye Masai na-arụpụta mgbịrịgba ehi, bụ́ onye biri na ndagwurugwu ahụ. Ndị ọzọ na-ekwu na aha ahụ si n’aka ìgwè ndị agha Datogo bụ́ ndị ndị Masai meriri mgbe ha na ha lụsịrị agha na ndagwurugwu ahụ afọ 150 gara aga. Ọ bịara yie na mberede ka anyị achọghịzi ịma ebe aha ahụ si mgbe anyị hụrụ ụfọdụ ịnyịnya ọhịa ka ha na-ata nri n’akụkụ ebe a na-adọba ụgbọala. Ka anyị banyere n’ụgbọala anyị, anyị ruru ha nnọọ nso, ma, ọ bịara yie ka à ga-asị na ha ahụghị anyị. Anyị kwọọrọ ụgbọala anyị banye n’ime ndagwurugwu ahụ iji kirie ụmụ anụmanụ ndị ọzọ.

Ndagwurugwu ahụ dị n’ebe ji mita 2,236 karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri, ọ bụkwa ndagwurugwu kasịnụ n’ime ndagwurugwu ugwu mgbawa ndị dị n’ụwa. Ọ dị kilomita 19.2 site n’otu akụkụ ya ruo n’akụkụ ya nke ọzọ, akụkụ ya nile dịkwa square kilomita 304. Anyị ji nwayọọ nwayọọ gbadaa n’ime ndagwurugwu ahụ ịdị omimi ya dị mita 610. Anyị sepụtakwara isi na windo ụgbọala anyị ka anyị wee nwee ike ise ụmụ anụmanụ foto. Mgbe anyị nọ n’ebe mgbago nke ndagwurugwu ahụ, ikuku ụtụtụ jụrụ oyi ma na-enye ume ọhụrụ. Otú ọ dị, mgbe anyị gbadara n’ime ndagwurugwu ahụ, ọ tụrụ anyị n’anya ịhụ na ọ na-ekpo ọkụ.

Ka onye na-anya ụgbọala anyị ji nwayọọ nwayọọ buru anyị na-agagharị n’ime ndagwurugwu ahụ, anyị gafere obere ọdọ mmiri nnu nke ọtụtụ chekeleke na-acha pinki pinki nọ na ya. Mgbe anyị bamikwuru n’ime ya, eluigwe ahụ na-acha anụnụ anụnụ mere ka anyị hụwa elu elu nke ndagwurugwu ahụ nke ọma. Ka anyị na-anụkwa olu ịnyịnya ọhịa na ele nakwa nke anụmanụ ndị ọzọ dị ebe ahụ, a kpaliri nnọọ mmasị anyị. N’ezie, ebe a bụ paradaịs!

Anụmanụ Ndị Nọ na Ndagwurugwu Ahụ

Na Ndagwurugwu Ngorongoro, anyị tụrụ anya ịhụ atụ, enyí, ịnyịnya ọhịa, ele, enyí ọhịa, na enwe, anyị hụkwara ha. Anụ ndọgbu ndị dị ka agụ owuru, hyena, nkịta ọhịa, na ọdụm na-agagharịkwa n’ebe ahụ. Enyí mmiri nọ n’ime otu ọdọ mmiri dị ebe ahụ ka ahụ́ wee jụọ ha oyi. Mgbe anyị na-ese ha foto, o yiri ka ha achọghịdị ịma.

Na mberede, onye bu anyị n’ụgbọala kwụsịrị! Ọ tụọrọ anyị aka n’otu enyí ọhịa ojii na-agafe n’ebe dị mita ole na ole n’ihu anyị. Enyí ọhịa ahụ yiri ka ahụ́ ò ruru ya ala na ndagwurugwu ahụ, o sigbukwara onwe ya n’ike ịhụ ya anya n’ebe dị nso otú ahụ n’ọhịa. E gbukpọwala anụmanụ a na-eyi egwu; a na-ekwu na ha erughịzi iri abụọ na ndagwurugwu ahụ. N’ebe a, e jidewo ndị na-achụ ntá n’ụzọ iwu na-akwadoghị ka ha na-egbu enyí ọhịa n’ihi mpi ya, bụ́ nke ha na-eresị ndị na-arụ isi mma nwa ntì na ndị na-eme ọgwụ, n’ahịa iwu. Ndị na-elekọta anụ ọhịa na-agagharị na ndagwurugwu ahụ mgbe nile iji chụọ ha.

Onye ụmụ nnụnụ na-amasị pụrụ ịtụ anya ịhụ ọmarịcha nnụnụ dịgasị iche iche, ndị gụnyere enyí nnụnụ, kori bustard, abà, egret, heron, na imirikiti chekeleke na-acha pinki pinki. Na ndagwurugwu a, e nwere ihe karịrị otu narị ụdị nnụnụ dịgasị iche iche, bụ́ ndị na-adịghị n’Ogige Ụmụ Anụmanụ nke Serengeti, bụ́ nke dị ya nso. E nwere ọtụrụkpọkpọ, apalis nke afọ ya na-acha odo odo, brubrus, na paradise flycatcher. A pụrụ ịhụ nnụnụ longclaw nke afọ ya na-acha ọbara ọbara n’ata ndị dị ebe ahụ, a hụwokwa ọbụna nnụnụ Cape rook a na-adịghị ahụkebe.

Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ anụmanụ ndị a agaghị eme ka ha hụrụ anyị, anyị nọgidere n’ime ụgbọala anyị. Otú ọ dị, ndị Masai, bụ́ ndị bi n’ụlọ ájá ndị e ji ata kụchie elu ha bụ́ ndị dị nso na ndagwurugwu ahụ, na-achịgharị ehi ha na ndagwurugwu ahụ. O yiri ka ha na anụ ndọgbu ndị dị ebe ahụ hà bụzi enyi.

Ịma mma na ịdị jụụ nke Ndagwurugwu Ngorongoro dị ebube n’ezie, ọ tụkwara anyị n’anya nke ukwuu. Anyị agaghị echefu nleta a anyị gara ebe ahụ.

[Foto dị na peeji nke 29]

Enyí ọhịa

[Foto dị na peeji nke 29]

Ebe ndị Masai na-akpa ehi n’ebe elu nke ndagwurugwu ahụ

[Foto dị na peeji nke 29]

Nwanyị Masai

[Foto dị na peeji nke 30]

Agụ owuru

[Foto dị na peeji nke 30]

“Crane” nke nwere àrà

[Foto dị na peeji nke 30]

Chekeleke

[Foto dị na peeji nke 30]

Enyí mmiri

[Foto dị na peeji nke 30, 31]

Ndagwurugwu Ngorongoro

[Foto dị na peeji nke 31]

Ịnyịnya ọhịa

[Foto dị na peeji nke 31]

Atụ

[Foto dị na peeji nke 31]

Enyí

[Foto dị na peeji nke 31]

Enwe