Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nke ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara azịza ha nile na peeji nke 14. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Dị ka Pita si kwuo, n’ihi gịnị ka Chineke ji mee Izrel ime mmụọ ‘agbụrụ ọ họọrọ’? (1 Pita 2:9)

2. Gịnị bụ ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ, oleekwa ebe ọ nọ rụọ ya? (Jọn 2:1-11)

3. Olee ihe Chineke si na ya kee onye inyeaka Adam, bụ́ Iv? (Jenesis 2:22)

4. Olee nwoke a ma ama n’Izrel nke a maara ụmụ ya ndị ikom dị ka “ndị jọgburu onwe ha”? (1 Samuel 2:12)

5. Olee ihe e ji atụ ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ n’oge ochie nke yiri ihe ọ̀tụ̀tụ̀ homer, harakwa ka bath iri? (Luk 16:7)

6. Ọ bụ ezie na ndị Farisii maara otú e si akọwa ọdịdị nke ígwé, gịnị ka Jizọs kwuru na ha apụghị ịkọwa? (Matiu 16:3)

7. N’amụma Izikiel, ònye ga-awakpo ndị Chineke, bụ́ ndị na-ebi ná ntụkwasị obi ma na-enwe ihe ịga nke ọma? (Ezikiel 38:14-16; 39:11)

8. N’ihi gịnị ka Jizọs ji kwuo na ofufe ndị ndú okpukpe ji “egbugbere ọnụ ha” na-efe bụ n’efu? (Mak 7:6, 7)

9. Olee nwa Noa nke mere ihe e ji bụọ nwa nke ya bụ́ Kenean ọnụ? (Jenesis 9:22-25)

10. Olee ebo e ji aha ya mara ebe mgbago mgbago nke Izrel? (Ndị Ikpe 20:1)

11. Gịnị ka Hezekaịa ji tụnyere atụmanya nke ịnwụchu ọnwụ? (Aịsaịa 38:12)

12. Ka Devid nupụsịịrị Chineke isi site n’ịgụ ụmụ Izrel ọnụ, a gwara ya ka ọ họrọ otu n’ime ntaramahụhụ atọ, olee nke o mere ka ọ dakwasị ụmụ Izrel? (2 Samuel 24:12-15)

13. Olee akwụkwọ Bible atọ onye nchụàjà ndị Juu bụ́ Ezra dere?

14. Olee ógbè Gọvanọ Filiks chọpụtara na Pọl si? (Ọrụ 23:34)

15. Ònye bụ onyeisi usuu ndị agha Absalọm mgbe ahụ o nupụrụ isi megide Devid, bụrụkwa onyeisi usuu ndị agha Devid mgbe e gbusịrị Absalọm? (2 Samuel 17:25; 19:13)

16. Ònye ka ọchịagha bụ́ Joab họọrọ ka ọ gaa gwa Eze Devid na Absalọm nwa ya anwụọla? (2 Samuel 18:21, 32)

17. Gịnị mere Jekọb ji kwuo na anụ ọhịa adọgbuwo nwa ya bụ́ Josef? (Jenesis 37:31-33)

18. Gịnị bụ aha mmụọ ozi ahụ gwara Meri na a họrọwo ya ịbụ onye ga-amụ Jizọs? (Luk 1:26-31)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Ka ha wee “kpọsaa n’ebe nile ịdị mma” nke Chineke

2. Ime mmiri ka ọ ghọọ mmanya; na Kena

3. Otu ọgịrịga o wetara n’ahụ́ Adam

4. Ịlaị

5. Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ cor

6. “Ihe ịrịba ama nke oge ndị a”

7. Gọg na “ìgwè” ya

8. Ọ bụ n’ihi na “obi ha dị nnọọ anya n’ebe” Chineke nọ

9. Ham

10. Dan

11. Nkwé ákwà

12. Ajọ ọrịa na-efe efe

13. Ihe E Mere nke Mbụ, Ihe E Mere nke Abụọ, Ezra

14. Silishia

15. Amasa

16. Onye Kush a na-akpọghị aha ya

17. E gosiri ya uwe mwụda Josef nwere akara, bụ́ nke a bịanyere n’ọbara mkpi

18. Gebriel