Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịnagide Uche Mkpasasị Nke Mwakpo Ndị Na-eyi Ọha Egwu Kpatara

Ịnagide Uche Mkpasasị Nke Mwakpo Ndị Na-eyi Ọha Egwu Kpatara

Ịnagide Uche Mkpasasị Nke Mwakpo Ndị Na-eyi Ọha Egwu Kpatara

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SPEN

NA March 11, 2004, ụda bọmbụ iri ndị gbawara n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè atọ mere ka obodo Madrid, Spen, mee mkpatụ. Bọmbụ ndị gbawara n’ụgbọ okporo ígwè anọ n’otu oge, gburu ihe dị ka mmadụ 190 ma merụọ mmadụ 1,800 ahụ́.

Ebe bọmbụ ndị ahụ gbawara n’oge ụtụtụ mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-aga mkpa ha, mkpamkpa kpara n’ihi na ndị mmadụ juru n’ụgbọ okporo ígwè ahụ nile. “Ahụrụ m otu nkebi ụgbọ okporo ígwè ka o feliri elu ruo otu mita, nke ahụ gosiri ókè ike bọmbụ ahụ gbawaranụ haruru,” ka Aroa, bụ́ onye ji anya ya hụ ihe merenụ, kwuru. “Mgbe m si n’ụgbọ okporo ígwè m nọ na ya pụta, ebe ahụ nile dị ka ihu agha. Ọ wụrụ m akpata oyi n’ahụ́ iji anya m hụ ozu ndị mmadụ ọnụ ọgụgụ ya haruru otú ahụ.” Ihe a na-awụ akpata oyi n’ahụ́ mere n’ụgbọ okporo ígwè anọ, ebe ndị ha gbawakwara n’ụgbọ okporo ígwè ndị ahụ dị iri. Ndị na-eyi ọha egwu tọgbọrọ akpa ndị ha kwanyejuru bọmbụ na ha n’ime ụgbọ ndị ahụ ma jirizie fon ndị e ji agagharị agagharị mee ka ha gbawaa.

Ọ dabaara nnọọ ụfọdụ ndị njem ahụ na ha enweghị ike icheta ihe ike ahụ ha gabigara. Ma ọtụtụ narị n’ime ha, dị ka Aroa, aghaghị idi ahụ́ ụfụ na obi mmapụ ndị ọ kpataara ha. Aroa kwuru, sị, “Bọmbụ ahụ gbawaranụ mere ka m ghara ịdị na-anụchazi ihe, ma ihe ka enye m nsogbu bụ icheta ihe ndị ahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ́ m hụrụ.

Aroa kwukwara, sị, “Enwere m ekele na, dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, enwetara m nkasi obi dị ukwuu. Ozi m nwetara n’aka ndị si n’ebe dị iche iche n’ụwa na ọkpụkpọ ha na-akpọ m na fon chetaara m na anyị bụ n’ezie òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. Tụkwasị na nke ahụ, Bible na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere oké ihe ọjọọ ndị a ji eme. Akọwaara m ụfọdụ ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na Akwụkwọ Nsọ buru n’amụma na ‘n’ụbọchị ikpeazụ,’ ndị mmadụ ga-abụ ndị na-eme ihe ike ike, na ha agaghịkwa enwe obi mmadụ. A chọpụtakwara m na ozi oge nile m na-eje bụ nnukwu ihe enyemaka n’ibelata ihe mgbu ndị m na-enwe.”—2 Timoti 3:1-3.

Pedro bụ otu n’ime ndị njem merụrụ ahụ́ nke ukwuu. O guzo ihe dị ka mita anọ n’akụkụ ebe bọmbụ nke gbawara n’ụgbọ okporo ígwè nke ọ nọ n’ime ya dị. Ike bọmbụ ahụ ji gbawaa tụdara ya n’ala, nke mekwara ka o merụọ ahụ́ n’isi ma nwee ajọ nsogbu ndị metụtara iku ume. Ka ọ nọsịrị ụbọchị ise ná ngalaba a na-enye nlekọta kpụ ọkụ n’ọnụ n’ụlọ ọgwụ, ọ malitere ịgbake. Ọtụtụ Ndịàmà ibe ya bụ́ ndị bịara leta ya, mere ka obi ruo ya ala, nleta ahụ ha mere tụkwara ndị nọọsụ nọ ebe ahụ n’anya. “Kemgbe afọ iri abụọ na isii, ahụtụbeghị m onye e si otú a bịa leta ma wetara onyinye!” ka otu nọọsụ kwuru. Pedro, n’aka nke ọzọ, kwuru okwu ọma banyere ndị ọrụ nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ. O kwuru, sị, “Ha enweghị atụ. Ha nyere m aka nke ukwuu ịhụ na m gbakere.”

Ọtụtụ n’ime ndị ihe a metụtara bụ ndị si mba ọzọ kwabata Spen na nso nso a. Bọmbụ nke mbụ gbawaranụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị n’Atocha merụrụ Manuel, bụ́ onye Cuba ahụ́, ọ tụbọkwara mgbe nke abụọ gbawara. Ọ kọwara, sị, “Ka ndị mmadụ nọ na-agba ọsọ ndụ ha, ha zọrọ m ụkwụ ka m tọgbọ n’ala n’ihu ebe e si abanye n’ụgbọ. Mgbe m matara onwe m, ọgịrịga m abụọ na otu ụkwụ m gbajiri, otu ntị m kụchikwara kpamkpam.

Manuel kwukwara, sị, “Ndị ọrụ enyemaka—ndị uwe ojii, ndị ambulansị, na ndị na-agbanyụ ọkụ—rutere ebe ahụ n’ime minit ole na ole, ha nyekwaara anyị aka ruo ókè ike kwere ha. Ha maara kpọmkwem ihe ha ga-eme, nkà ha na aka ochie ha bụ n’ọrụ ahụ nyekwara aka mee ka ụjọ ji anyị belata. Ọ bụghị nanị na ha nyere m ọgwụ ndị ahụ́ m chọrọ, ha ji obiọma na ọmịiko mesoo m ihe.”

Uche Mkpasasị Ọ Kpatara

Dị ka ọ kpataara Aroa, ọ kpatakwaara Manuel obi mmapụ. O kwetara, sị, “Ka m bara n’ụgbọ okporo ígwè na nso nso a, ụjọ jidere m. Apụtakwara m ozugbo. Aka m na-enyo onye ọ bụla bu akpa a na-anya n’azụ ma ọ bụ ihe yiri ya bata n’ụgbọ ọha na eze enyo. Ma enwetala m enyemaka dị ukwuu karịa ndị ọzọ, ọ bụ ezie na e nweghị ndị ezinụlọ m bi na Spen. Ọtụtụ narị Ndịàmà kpọrọ m na fon, otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà kpọrọ m ka m bịa nọnyere ha ruo ụbọchị ole na ole n’ụlọ ha ka owu wee ghara ịma m. Nkwado a na-enweghị atụ nke sitere n’aka òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ nyere aka mee ka obi m lọghachi.”

Sergio, bụ́ onye njem na-emerụghị ahụ́, ka na-enwe nsogbu kwa ụbọchị ma o cheta ihe ndị ọ hụrụ gburugburu ya. Otu bọmbụ gbawara n’otu n’ime nkebi ụgbọ ahụ nke nọ ya n’ihu, ọzọ agbawaakwa na nke nọ ya n’azụ. Dị ka Manuel, o nwere ekele maka nkwado ịhụnanya nke ndị ezinụlọ ya na nke Ndịàmà ibe ya nyere ya. O kwuru, sị, “Ọ bụghị nanị na ha mere ka m mara na ha hụrụ m n’anya, kamakwa, ha chetaara m na m so n’òtù ụmụnna dị n’otu nke na-ahụ maka ọdịmma nke onye ọ bụla nọ na ya. E nyere m nkwado a site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, ọtụtụ ndị kpọrọ m na fon mere ka m nwee ike ikwupụta otú o si dịrị m, nke bụ́ ihe na-esikarịrị m ike omume.”

Ụfọdụ ndị njem nọ n’ụgbọ okporo ígwè ndị ahụ nwere nchegbu dịgasị iche iche. Diego gara nọrọ, n’amaghị ama, n’ebe e dobere bọmbụ anọ ndị ọzọ na-ekweghị agbawa. O si n’ụgbọ ahụ gbapụ n’emerụghị ahụ́. O kwuru, sị, “Ugbu a ana m ata onwe m ụta n’ihi na enyereghị m ndị ahụ merụrụ ahụ́ aka. Ụjọ ihe ahụ merenụ mere ka m soro ọtụtụ narị ndị ọzọ chọwagodị ụzọ ọ bụla m ga-esi gbapụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ.”

Bọmbụ nke gbawara n’ụgbọ okporo ígwè Ramón bụ́ nwa okorobịa si Brazil nọ n’ime ya, mere ka ọ nọrọ n’ụjọ nke na o siiri ya ike ịga ije. Otú ọ dị, ụbọchị abụọ ka ọdachi ahụ gasịrị, o kpebiri na ya ga-eje kwusaara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze ahụ. O zutere otu nwoke Portugal nke gwara ya na ya na-achọ ezi okpukpe ahụ. Ramón malitere iduziri nwoke ahụ ọmụmụ Bible, nwoke ahụ malitekwara ịbịa nzukọ Ndị Kraịst ozugbo. “Mgbe i nyeere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ, gị onwe gị na-enwe obi ụtọ,” ka Ramón kwuru.

Obi abụọ adịghị ya na ọ ga-ewe oge tupu ebe ndị mmadụ merụrụ ahụ́ alaa nakwa tupu obi akwụsị ịmapụ ha. Ọ bụ ihe dị mwute na anyị na-ebi n’oge a pụrụ ime ihe ike n’ebe ọ bụla n’echeghị echiche. Ọ bụ ezie na iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe pụrụ inyere ndị ọdachi a metụtara aka ịnagide uche mkpasasị, ọ bụ nanị Alaeze Chineke ga-ewepụ ọdachi ndị a n’ikpeazụ.—Mkpughe 21:3, 4.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 31]

INWETA UME N’ỤZỌ IME MMỤỌ IJI NAGIDE UCHE MKPASASỊ

Manuel Suárez

“Mgbe ahụ obi ka koropụrụ m, ka m ka nọ na-eche ka e buga m ụlọ ọgwụ, anọgidere m na-echeta ihe e dere n’Ilu 18:10: ‘Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọọ n’elu.’ Okwu ndị ahụ nyere m ike.”

Aroa San Juan

“Mgbe i nwere ụdị ahụmahụ a, mgbe ahụ ka ị ga-akasị aghọta na ihe a bụ ụbọchị ikpeazụ nakwa na anyị kwesịrị itinye uche n’ihe ime mmụọ. N’ihi ozi oge nile m na-eje, obi nkoropụ m nwere ji nke nta nke nta na-ebelata.”

Fermín Jesús Mozas

“N’agbanyeghị na m merụrụ ahụ́ n’isi, enyeere m ụfọdụ ndị njem ibe m aka ma gbaa ha ume. Ana m eche na ihe mere ahụ́ ji ruo m ala bụ n’ihi olileanya mbilite n’ọnwụ nke Chineke nyeworo anyị, ọ bụ olileanya na-emesi anyị obi ike n’oge dị otú a.”

Pedro Carrasquilla

“Mgbe m dina ná ngalaba a na-enye nlekọta kpụ ọkụ n’ọnụ n’ihi oké obi mgbu, ihe e kwuru na 1 Timoti 6:19 nọgidere na-abata m n’obi. N’ebe ahụ, a na-agba anyị ume ka anyị tọọ ezi ntọala maka ọdịnihu iji wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie. Amaokwu a chetaara m olileanya Paradaịs anyị nwere, bụ́ nke Chineke kwere ndị hụrụ ya n’anya ná nkwa. Nke ahụ bụ ihe mgbaru ọsọ anyị na-agbalị iru.”

[Foto dị na peeji nke 29]

N’elu: Ebe ndị ọrụ enyemaka na-enyere ndị merụrụ ahụ́ na ndị na-anwụ anwụ aka n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị n’Atocha

[Ebe E Si Nweta Foto]

N’elu: CORDON PRESS

[Foto dị na peeji nke 29]

N’aka nri: Ihe ncheta a na-akwadoghị akwado rụọ