Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọnọdụ Ndị Dọkịta n’Ụwa nke Na-agbanwe Agbanwe

Ọnọdụ Ndị Dọkịta n’Ụwa nke Na-agbanwe Agbanwe

Ọnọdụ Ndị Dọkịta n’Ụwa nke Na-agbanwe Agbanwe

N’afọ 1174, a họpụtara Maimonides ịbụ dọkịta ga na-agwọ ndị eze Ijipt. N’obí eze ka ọ na-aka anọ n’ụbọchị. O dere banyere nlọta ọ na-alọta n’ụlọ ya kwa ụbọchị, sị: “Ana m eri obere nri, nke bụ́ nanị nri m na-eri n’ụbọchị. M richaa nri, ana m aga hụ ndị ọrịa bịara ka m gwọọ ha. Ana m edepụtara ha ọgwụ, gwakwa ha otú ha ga-esi ṅụọ ha. Ndị ọrịa na-abịagide ruo abalị, mgbe ụfọdụkwa . . . ike na-agwụ m nke ukwuu nke na ọ na-esiri m ike ikwu okwu.”

KEMGBE ụwa, mmadụ ịbụ dọkịta na-achọ na ọ ga na-achụ onwe ya n’àjà. Ma, ụwa ndị dọkịta nọ arụ ọrụ ha taa na-agbanwe n’ike n’ike. Ọrụ ha ka pụkwara ịbụ nnọọ nke na-agwụ ike otú ahụ nke Maimonides si gwụ ya ike. Ma, à na-akwanyere ha ùgwù otú e sibu akwanyere ndị dọkịta ùgwù? Olee otú ọnọdụ ọhụrụ siworo metụta ndụ ndị dọkịta? Oleekwa otú ihe ndị mere n’oge ndị na-adịbeghị anya siworo gbanwee mmekọrịta dị n’etiti ndị dọkịta na ndị ọrịa?

Mmekọrịta Gbanwere Agbanwe

Ụfọdụ ka na-echeta oge dọkịta pụrụ ibu ọgwụ ya nile n’akpa na-agagharị. E lere ndị dọkịta anya n’ụzọ dịgasị iche n’oge ahụ, dị nnọọ ka a na-eme taa. A sọpụụrụ ihe ka ọtụtụ n’ime ha maka nkà ha, kwanyere ha ùgwù maka ọkwá ha, nwee mmasị n’ebe ha nọ maka ụkpụrụ omume ha. N’otu mgbe ahụ kwa, a pụrụ ịkatọ ha n’ihi ego ha na-ana, ledaa ha anya maka ọrịa ndị ha na-agwọtalighị, kwutọọkwa ha mgbe o yiri ka ha enweghị ọmịiko.

N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị dọkịta nwetara ezigbo afọ ojuju n’ịnọ na-agwọ otu ezinụlọ ruo ọtụtụ ọgbọ. Ha na-aga n’ụlọ ha ọtụtụ ugboro ịgwọ ha. Ọ bụrụ n’ime obodo, mgbe ụfọdụ ha na-anọ rie nri n’ụlọ ndị ha bịara ịgwọ ma ọ bụ ọbụna rahụ arahụ mgbe ha na-aghọ nwa. Ọtụtụ ndị dọkịta ji aka ha mee ọgwụ ndị ha nyere ndị ha na-agwọ. Ndị dọkịta nwere obiọma gwọrọ ndị ọrịa ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’efu, ha gwọkwara ndị mmadụ n’oge ọ bụla n’ụbọchị.

N’ezie, ụfọdụ ndị dọkịta ka ji otú ahụ arụ ọrụ. Ma, n’ọtụtụ ebe, o yiri ka mmekọrịta dị n’etiti ndị dọkịta na ndị ọrịa ọ̀ ka gbanwee n’iri afọ ole na ole gara aga karịa ka o si gbanwee n’ọtụtụ narị afọ gara aga. Olee otú mgbanwe ndị a siworo were ọnọdụ? Ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe banyere ịga n’ụlọ gwọọ mmadụ.

Gịnị Meziri Ndị Dọkịta Ịga n’Ụlọ Gwọọ Mmadụ?

N’oge mbụ, ndị dọkịta na-agakarị n’ụlọ ndị ọrịa agwọ ha, ha ka na-emekwa otú ahụ n’ala ụfọdụ. Ma, nke a jizi nwayọọ nwayọọ na-ala n’ụwa nile. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times of India kwuru, sị: “Ụzọ dị nro ndị dọkịta si emeso onye ọrịa nọ n’ezinụlọ ha na-agwọ ihe, ọmụma ha maara ezinụlọ ndị ahụ nke ọma, na njikere ha dị ịga n’ụlọ ha mgbe ọ bụla a kpọrọ ha, aghọwala ihe na-ala ala n’oge a ọtụtụ ndị dọkịta na-aghọzi nnọọ ndị ọkachamara n’ịgwọ nanị otu ụdị ọrịa.”

N’ihi ihe ọmụma dị ukwuu e nwere banyere ịgwọ ọrịa, ọtụtụ ndị dọkịta aghọwo ọkachamara n’ịgwọ ụdị ọrịa ụfọdụ ma na-arụ ọrụ n’ìgwè. Ihe si na ya pụta bụ na onye ọrịa nwere ike ịgakwuru otu dọkịta taa, ọ rịawa ọrịa echi, ya agakwuru dọkịta ọzọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị dọkịta enwekwaghị ike iso ezinụlọ ha na-agwọ na-emekọrịta ihe ruo ogologo oge dị ka ha na-emebu.

Ọ bụ ihe dị ka otu narị afọ gara aga ka ndị dọkịta malitere ịkwụsị ịga n’ụlọ ndị mmadụ agwọ ha. Ihe kpatara ya bụ na ha malitere iji ngwá ndị e ji achọpụta ọrịa eme ihe n’ụzọ ka ukwuu. N’ọtụtụ ebe, ụlọ ọgwụ dị iche iche bịara were ndị dọkịta ịga n’ụlọ ndị mmadụ agwọ ha dị ka igbu oge. Taa, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọrịa na-eji ụkwụ ha agakwuru dọkịta n’ọfịs ya. Ọzọkwa, ndị nọọsụ na ndị na-ahụ maka ọnọdụ mberede na-arụzi ọrụ ndị dọkịta na-arụbu.

Ọnọdụ Gbanwere Agbanwe

N’ụwa taa, ndị dọkịta na-arụrụ onwe ha dịzi ole na ole. Ọtụtụ mgbe, ndị ọrịa na-aga n’ụlọ ọgwụ gọọmenti ma ọ bụ n’ụlọ ọgwụ ndị nkịtị bụ́ ebe e were ndị dọkịta n’ọrụ. Ma, ọ dịghị amasị ọtụtụ ndị dọkịta inwe onye ga na-agwa ha ụdị mmekọrịta ga-adị n’etiti ha na ndị ọrịa. Ụlọ ọgwụ ndị dị otú ahụ na-achọkarị ka ndị dọkịta jiri oge dị nnọọ nta na-ahụ ọtụtụ ndị ọrịa. “Oge mụ na otu onye ọrịa ji anọ na-abụ nanị minit asaa ruo iri,” ka Dr. Sheila Perkins, bụ́ dọkịta nọ na Britain nke na-adịghị agwọ nanị otu ụdị ọrịa, na-ekwu. “Ana m eji ihe ka ukwuu n’oge ahụ edebanye nsogbu ya n’ime kọmputa. Oge na-afọdụrụ m iji soro ya nwee mmekọrịta na-epe nnọọ mpe. Nke a na-abụrụ m nnọọ ihe nkụda mmụọ.”

Mgbanwe a na-enwe n’ụwa nke oge a, bụ́ nke ndị dọkịta nọ na ya arụ ọrụ, emewo ka ndị ọrịa nwekwuo ọnụ okwu. N’oge mbụ, a dịghị agbagha ihe ọ bụla dọkịta kwuru agbagha. Ma n’ọtụtụ mba taa, ọ bụ iwu na dọkịta ga-agwa onye ọrịa banyere ụzọ ndị a pụrụ isi gwọọ ya na ihe ndị pụrụ isi na ha pụta ka onye ọrịa ahụ wee nwee ike ịhọrọ ụzọ a ga-esi gwọọ ya dabere n’ihe ọ maara banyere ụdị ọgwụgwọ ahụ. Mmekọrịta dị n’etiti ndị ọrịa na dọkịta agbanweela. N’anya ụfọdụ ndị, dọkịta abụghịzi o kwuchaa o bie, kama ọ bụ nanị onye na-agwọ ọrịa.

N’ụwa a nke na-agbanwe n’ike n’ike, ihe ka ukwuu ná ndị dọkịta bụ ndị inyom. A ka mara ndị inyom bụ́ dọkịta ama n’ihi na e weere ha dị ka ndị na-aka ege ntị nke ọma. N’ihi ya, ọnụnọ ha nọ n’ọrụ a yiri ka ọ̀ bụ iji mee ka e jirikwuo ọmịiko na-arụ ya.

Ọtụtụ mmadụ na-enwe obi ụtọ ịhụ dọkịta na-aghọta mmetụta na nchegbu ndị ọrịa na-enwe. Ma, ọ dị mma ịjụ, sị, Ndị ọrịa ole na-aghọta mmetụta na nchegbu ndị dọkịta ha na-enwe? Ime otú ahụ pụrụ ime n’ezie ka mmekọrịta dị n’etiti onye ọrịa na dọkịta kawanye mma. Isiokwu na-esonụ pụrụ inye aka.

[Foto dị na peeji nke 13]

Maimonides

[Ebe E Si Nweta Foto]

Brown Brothers

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

N’oge gara aga, ndị dọkịta na-agakarị n’ụlọ ndị ọrịa agwọ ha