Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ndị Ntorobịa nke A Jara Mma nke Ukwuu

Akwụkwọ Ndị Ntorobịa nke A Jara Mma nke Ukwuu

Akwụkwọ Ndị Ntorobịa nke A Jara Mma nke Ukwuu

NYEISI nke ụlọ akwụkwọ bụ́ Tigoni Academy for Girls, bụ́ nke dị na Limuru, Kenya, degaara alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị ná mba ahụ akwụkwọ, na-arịọ ka e zitere ya akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. O kwuru, sị: “Dị ka unu maara, iso ndị dị afọ iri na ụma emekọ ihe pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Anyị nwere akwụkwọ unu a abụọ, bụ́ nke bawooro ma ndị nkụzi ma ụmụ akwụkwọ uru. O nwere ihe ọmụma zuru ezu, ọ na-egbokwa mkpa nke ndị nkụzi anyị na nke ụmụ akwụkwọ anyị ndị dị afọ iri na ụma.”

Onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ wee kwuzie, sị: “Ọ ga-amasị ndị na-elekọta [ụlọ akwụkwọ a] iji akwụkwọ a bara uru na-akụziri ụmụ akwụkwọ anyị ihe. Akwụkwọ a masịrị ha nke ukwuu. Ndị nne na nna ụmụ akwụkwọ anyị na-anabata mgbalị ọ bụla a na-eme iji nyere ụmụ ha aka. Ka ọ dị ugbu a, ihe anyị chọrọ bụ mkpụrụ iri abụọ na ise.”

Akwụkwọ a bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ nyobara nnọọ anya n’echiche na mmetụta ndị ntorobịa na-enwe. Ọ na-akpali nkwurịta okwu ndị bara uru n’isiokwu ndị dị ka: “Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka Ndị Mụrụ M Nyekwuo M Nnwere Onwe?,” “M̀ Kwesịrị Ịhapụ Ụlọ?,” “Olee Otú M Pụrụ Isi Nweta Ezi Ndị Enyi?,” “Ọrụ Dị Aṅaa Ka M Kwesịrị Ịhọrọ?,” “Olee Banyere Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye?,” na “Olee Otú M Ga-esi Mara Ma Ọ̀ Bụ Ezi Ịhụnanya?”

Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime isiokwu ndị dị n’ime ya. Akwụkwọ ahụ lebakwara anya n’ọtụtụ isiokwu ndị ọzọ n’isiakwụkwọ iri atọ na itoolu o nwere. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.