Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Kwesịrị Ime Mgbe Ndị Ọzọ Kọsaara M Nsogbu Ha?

Gịnị Ka M Kwesịrị Ime Mgbe Ndị Ọzọ Kọsaara M Nsogbu Ha?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Ka M Kwesịrị Ime Mgbe Ndị Ọzọ Kọsaara M Nsogbu Ha?

“E nwere otu nwa agbọghọ nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị. Ndị mụrụ ya na-achọ ịgba alụkwaghịm, ọ naghịzikwa eme nke ọma n’ule. Ọ na-adị akọrọ m banyere nsogbu dị n’ezinụlọ ha.”—Jan, ọ dị afọ 14. “Otu nwa agbọghọ nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị kọọrọ m na ya na otu nwa okorobịa nwere mmekọahụ. Ya adịrị ime ma sikwopụ ya n’emeghịdị ka ndị mụrụ ya mara banyere ya.”—Mira, ọ dị afọ 15.

GỊ NA enyi gị ma ọ bụ nwa akwụkwọ ibe gị na-akọ akụkọ. Na mberede, ya amalite ịkọrọ gị otu ihe na-enye ya nsogbu n’obi. Ikekwe nsogbu ọ na-enwe bụ nsogbu ndị dị afọ iri na ụma na-enwekarị—uwe, ego, ọdịdị ahụ́, ndị ọgbọ, ịgbata ihe n’ule. N’aka nke ọzọ, ọ pụrụ inwe nsogbu ndị ka sie ike ma taa akpụ.

Ọnọdụ a dị na United States na-egosi nnọọ otú nsogbu ndị na-eto eto na-enwe pụrụ isiru n’ike. Dị ka magazin bụ́ Newsweek si kwuo, “Ụlọ Ọrụ Mba nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike Uche mere atụmatụ na pasent asatọ nke ndị nọ n’oge uto na pasent abụọ nke ụmụaka (ndị ụfọdụ n’ime ha dị nanị afọ anọ) nwere ihe ndị na-egosi na ha dara mbà n’obi.” Ná nnyocha ọzọ e mere, e kwuru, sị: “Ihe dị ka mmadụ iri itoolu na asaa n’ime otu puku ụmụ agbọghọ ọ bụla dị afọ iri na ise ruo iri na itoolu—otu nde ndị America dị afọ iri na ụma—na-atụrụ ime kwa afọ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ agbọghọ ndị a—pasent iri asaa na asatọ—adịghị atụ anya ịtụrụ ime.” E nweziri ọtụtụ nde ụmụaka bụ́ ndị bi n’ezinụlọ na-adịghị n’udo. Ọtụtụ puku n’ime ha bụ ndị a na-emegbu ma ọ bụkwanụ ndị a na-edina. Na United States, ihe karịrị ọkara nke ụmụ akwụkwọ ndị nọ na klas dị elu n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị enwetụla oge ha ṅụbigara mmanya ókè. Imerime ndị na-eto eto nwere nsogbu iri nri.

Ka a sịkwa ihe mere na ọtụtụ ndị ntorobịa na-achọsi ike onye ha ga na-akọsara obi ha! Ọtụtụ mgbe kwa, onye mbụ ha na-akọsara ya bụ onye ọgbọ ha. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọ bụ gị ka a kọsaara ya? Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst, o kwesịghị iju gị anya na ọ bụ gị ka ha bịakwutere. Bible na-enye Ndị Kraịst iwu ka ha bụrụ “ihe nlereanya” n’omume nakwa ka ha nwee ezi uche. (1 Timoti 4:12; Ndị Filipaị 4:5) N’ihi ya, ọtụtụ ndị ọzọ na-eto eto—gụnyere ndị na-abụghị Ndịàmà—ga-achọ nnọọ ịkọrọ gị obi ha. Gịnị ka i kwesịrị ime mgbe ha kọọrọ gị obi ha? Gịnịkwanụ ma ọ́ dị gị ka ihe a kọọrọ gị ọ̀ bụ ihe ị na-agaghị enyeli aka na ya?

Ịbụ Onye Na-aṅa Ntị nke Ọma

Bible na-ekwu na e nwere “mgbe ịgba nkịtị, na mgbe ikwu okwu.” (Eklisiastis 3:7) Mgbe mmadụ nwere nsogbu ma chọọ ịkọrọ gị ya, ọtụtụ mgbe, ihe kasị mma ime bụ nanị ige ya ntị. E kwuwerị, Bible katọrọ mmadụ imechi ntị ya “n’iti mkpu nke onye na-enweghị ike.” (Ilu 21:13) Ọ pụrụ ịbụ na o wetụla enyi gị oge tupu ya akata obi bịa kọọrọ gị nsogbu ahụ. Ige ya ntị pụrụ ime ka ọ dịrị ya mfe ịkọrọ gị ihe ọ chọrọ ịkọrọ gị. “Ihe m na-emekarị bụ inye nnọọ onye ahụ ohere ịkọrọ m ihe ọ chọrọ ịkọrọ m,” ka otu onye ntorobịa bụ́ Onye Kraịst aha ya bụ Hiram na-ekwu. “Ana m enye ya ohere ịkọrọ m ihe na-enye ya nsogbu n’obi, ana m agbalịkwa igosi na ọnọdụ ya wutere m.” Vincent na-ekwu, n’otu aka ahụ, sị: “Mgbe ụfọdụ, ihe ndị mmadụ na-achọ bụ nanị ka ị nụ ihe ha chọrọ ịkọrọ gị.”

Ya mere, ọ pụrụ ịbụ na enyi gị ahụ adịghị atụ anya ka i gbooro ya mkpa ya. Nanị ihe dị ya mkpa pụrụ ịbụ inwe onye ga-ege ya ntị nke ọma. N’ihi ya, gee ya ntị! Ekwela ka ihe ndị na-eme gburugburu gị dọpụ uche gị, anapụkwala ya okwu n’ọnụ n’ụzọ na-enweghị isi. Nanị inye ya ohere ma gee ya ntị pụrụ ịbụrụ ya nnukwu ihe enyemaka. Ọ na-egosi na ị na-echebara ya echiche n’ezie.

Nke a ọ̀ pụtara na i kwesịghị ikwu ihe ọ bụla ma ọ kọchaara gị ya? Nke ahụ dabeere nnọọ n’ụdị nsogbu o nwere. Ọtụtụ mgbe, okwu e chere echiche ma jiri obiọma kwuo na-adị mma. (Ilu 25:11) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọdachi dakwasịrị enyi gị, ọ pụrụ ịkasị mma igosi na o wutere gị. (Ndị Rom 12:15) Ilu 12:25 kwuru, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala; ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.” Ikekwe ihe dị ya mkpa bụ agbamume. Gwa ya na i nwere obi ike na ọ ga-emeri ihe ịma aka ahụ nke ọma. Okwu ndị dị ka “Aghọtara m ihe mere obi ji dị gị otú ahụ” ma ọ bụ “O wutere m na ihe dị otú a mere gị” pụrụ ime ka enyi gị mara na i ji obi ọcha gee ya ntị nakwa na ị chọrọ inyere ya aka.

Otú ọ dị, Ilu 12:18 na-adọ aka ná ntị sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.” Ọ dị mkpa izere okwu ndị dị ka “Ihe mere gị adịchaghị njọ,” “Chefuo ya,” ma ọ bụ “Obi ekwesịghị ịdị gị otú ahụ.” Leziekwa anya ka ị ghara ịnwa ime ka nsogbu ahụ yie ihe na-esichaghị ike site n’ikwu ihe na-atọ ọchị. Enyi gị ahụ pụrụ ikwu ozugbo n’obi ya na ị chọghị ịma otú obi dị ya.—Ilu 25:20.

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị maghị nnọọ ihe ị ga-agwa ya? Gwa ya eziokwu. Gwa enyi gị ahụ na ị maghị nnọọ ihe ị ga-ekwu kama na ị ka dị njikere inyere ya aka. Jụọ ya, sị, “Gịnị ka m pụrụ ime iji nyere gị aka?” N’ezie, a pụrụ inwe ihe ndị bara uru i nwere ike ime iji mee ka nsogbu ya belata.—Ndị Galeshia 6:2.

Inye Ndụmọdụ Enyi

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na i chere na ọ dị mkpa inye enyi gị ahụ ndụmọdụ? N’ezie, dị ka onye na-eto eto, i nwechabeghị ahụmahụ ma ọ bụ ezi uche. (Ilu 1:4) N’ihi ya, o nwere ike i gaghị eru eru inye ndụmọdụ banyere nsogbu nile. Ma, Abụ Ọma 19:7 kwuru, sị: “Ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.” Ee, n’agbanyeghị na i ‘nweghị uche,’ ma ọ bụ ahụmahụ, ị pụrụ ịma ụkpụrụ Bible zuru ezu iji nyere enyi gị nọ ná mkpa aka. (Ilu 27:9) Ị pụrụ igosi ya isi ihe ụfọdụ ndị sitere na Bible n’emeghị ka ị̀ na-agwa ya okwuchukwu. Ọ bụrụ na ị maghị kpọmkwem ụkpụrụ Bible ndị metụtara nsogbu ya, mee nnyocha. Kemgbe ọtụtụ afọ, anọwo na-ebipụta ọtụtụ ndụmọdụ ndị dabeere na Bible banyere ajụjụ dịgasị iche iche n’isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . ” bụ́ ndị na-apụta na Teta! Ebe ọzọ ị ga-esi enweta ihe ọmụma bara uru bụ n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. *

Ikekwe, ọ ga-abara ya uru ma ị kọọrọ ya ahụmahụ ndị gị onwe gị nwerela. Ma eleghị anya, ị pụdịrị ịtụrụ ya aro ndị ga-abara ya uru. Ị pụrụ ịkọwara ya ihe ndị nyeere gị aka n’emeghị ka ị na-amanye ya ime ihe i chere. (Ilu 27:17) Otú ọ dị, buru n’obi na ọnọdụ nile abụghị otu. Ihe dabaara gị nwere ike ọ gaghị adabara onye ọzọ.

Okwu Ịdọ Aka ná Ntị

Anọla na-ege ntị ná nsogbu ndị ntorobịa bụ́ ndị na-adịghị asọpụrụ Jehova ma ọ bụ ndị nke na-ejighị ụkpụrụ Ndị Kraịst kpọrọ ihe. Ọtụtụ n’ime nsogbu ndị ha na-enwe pụrụ ịbụ n’ihi ụdị ndụ na-ekwekọghị na Bible ha na-ebi. Ịgbalị inyere ndị na-elelị ndụmọdụ Bible aka pụrụ ịkpasu unu abụọ iwe. (Ilu 9:7) Ọzọkwa, ha pụrụ iji okwu nzuzu ma ọ bụ ọbụna okwu ndị rụrụ arụ na-akọrọ gị nsogbu ha. (Ndị Efesọs 5:3) Ya mere, ọ bụrụ na mkparịta ụka gị na mmadụ na-enwe emee ka ahụ́ ghara iru gị ala, kata obi gwa ya na ị pụghị inyere ya aka ma ọ bụkwanụ na i nweghị mmasị n’ihe ahụ ọ na-akọrọ gị.

Kpachapụ anya ma ọ bụrụ na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị na-adị akọrọ gị ihe ndị dị ya n’obi. Bible na-adọ aka ná ntị na obi dị aghụghọ. (Jeremaịa 17:9) Iso ya na-akpachi anya pụrụ ime ka i nwewa ndọrọ mmekọahụ n’ebe ọ nọ, ọ pụkwara ọbụna iduba gị ná mmekọahụ rụrụ arụ.

Tụkwasị na nke a, ekwela nkwa na ị gaghị akọrọ ya onye ọzọ. Jiri obi umeala ghọta na ụdị enyemaka dị onye ahụ na-akọrọ gị nsogbu ya mkpa pụrụ ịbụ nke ị na-agaghị enyeli.—Ilu 11:2.

Mgbe A Chọrọ Enyemaka nke Ndị Ọzọ

Ọtụtụ mgbe, ihe kasị mma ime bụ gị onwe gị ịchọ enyemaka n’aka onye ọzọ. Mira, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru n’elu kwuru, sị: “Amaghị m nnọọ otú m ga-esi nyere nwa akwụkwọ ibe m ahụ aka. N’ihi ya, akọọrọ m ya otu okenye ọgbakọ anyị, o nyekwara m ndụmọdụ ndị dị mma banyere otú m pụrụ isi nyere ya aka.” N’ezie, n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova, e nwere ndị ikom nwere ahụmahụ bụ́ ndị pụrụ inyere gị aka. (Ndị Efesọs 4:11, 12) Okenye ahụ tụụrụ Mira aro ka ọ gbaa nwa akwụkwọ ibe ya ahụ ume ịkọrọ ya ndị mụrụ ya. Nwa agbọghọ ahụ nabatara ndụmọdụ Mira nyere ya. Mira kwuru, sị: “Ọnọdụ ya akala mma. Ugbu a, ọ chọrọ inwetakwu ihe ọmụma Bible.”

Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na Onye Kraịst ibe gị akọọrọ gị ihe na-enye ya nsogbu n’obi? Dị ka o kwesịrị ịdị, ị ga-achọ ime ihe ọ bụla ezi uche dị na ya ime iji nyere ya aka. (Ndị Galeshia 6:10) Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ọ dịchaghịzi agbaso ụkpụrụ Jehova setịpụrụ banyere omume, ụjọ atụla gị ịgwa ya “eziokwu.” (Ndị Efesọs 4:25) Gwa ya eziokwu ma emela nsọ nsọ. Ịgwa ya eziokwu bụ ihe na-egosi na ị bụ ezigbo enyi ya.—Abụ Ọma 141:5; Ilu 27:6.

N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ dịkwa oké mkpa ka ị gbaa enyi gị ume ka ọ chọọ enyemaka—n’aka ndị mụrụ ya, ndị okenye, ma ọ bụ n’aka Onye Kraịst tozuru okè nke ọ na-akwanyere ùgwù. Ọ bụrụ na oge agafeela ma ọ dịghị onye ọ gwara ya, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i jiri ọnụ gị kọọrọ ya mmadụ. (Jems 5:13-15) Nke a pụrụ ịchọ obi ike n’aka gị, ma ọ na-egosi na ị na-eche banyere enyi gị n’ezie nakwa na ị chọrọ ọdịmma ya.

N’ezie, Jehova adịghị atụ anya na ị ga-edozili nsogbu onye ọ bụla na-enwe. Ma mgbe mmadụ kọsaara gị ihe na-enye ya nsogbu n’obi, echela na ọ dịghị ihe ị pụrụ ime. Tinye ọzụzụ ị natara dị ka Onye Kraịst n’ọrụ, ma gosi na ị bụ ezigbo “enyi.”—Ilu 17:17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 28]

N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mkpa na ị ga-achọ enyemaka onye ọzọ iji nyere enyi gị nọ ná nsogbu aka