Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Hanbok Ejiji Ndị Korea

Hanbok Ejiji Ndị Korea

Hanbok Ejiji Ndị Korea

Site n’aka onye edemede Teta! na Republic of Korea

NYE ndị Korea, uwe karịrị nanị ihe e ji ekpuchi ọtọ. Otu ihe atụ na-egosi nke a bụ ejiji ndị Korea a na-akpọ hanbok.

Uwe A Na-akwa n’Ụzọ Pụrụ Iche

Ihe mejupụtara ejiji hanbok bụ uwe owoghoro na sket owoghoro nke na-agbadaru n’ala. * N’ụfọdụ n’ime ha, sket ya na-eto ogo okpukpu anọ karịa uwe ya. N’ihi ya, ọbụna nwanyị dị mkpụmkpụ na-adị ka ò toro ogo ma o yiri ya.

A na-asụ sket Hanbok asụ̀. Aka ya na-emepe ka nku nnụnụ, ebe sket ya na-esi n’obi gbasara ruo n’ala. Iji mee ka a hụkwuo ebe obi nke onye yi ya, a na-adụnye ákwà e kere ka taị n’ebe obi ya. Ọ na-afọkwa nke nta ka ọnụ ákwà ahụ e kere ka taị na-akpụ n’ala. Ọtụtụ hanbok nwekwara ọmarịcha ihe osise fụlawa na ihe osise ndị ọzọ e ji chọọ ha mma n’aka na n’olu uwe ha nakwa na sket ha. N’ezie, otú hanbok haruru, ọdịdị ya, na ụcha ya gbakọrọ aka mee ka ọ bụrụ ejiji magburu nnọọ onwe ya.

Uwe A Pụrụ Iyi Mgbe Ọ Bụla

Otú e si akwa hanbok na-eme ka mma ya pụtakwuo. Ebe ọ bụ na a na-esikarị n’ihe ndị sitere n’okike enweta ihe ndị e ji ekwe ákwà hanbok, ọ dị mfe iyi ya mgbe ọ bụla n’afọ. Dị ka ihe atụ, hanbok e si n’ahụ́ osisi dị ka hemp nweta ihe e ji kwee ya, na-eme ka ikuku na-abata n’ahụ́ onye yi ya. Nke a na-emekwa ka ahụ́ jụọ onye ahụ oyi ma o yiri ya n’oge okpomọkụ n’agbanyeghị na ọ ga-ekpuchicha ahụ́ ya. Ihe ndị ọzọ e ji ekwe ya na-eme ka ahụ́ kporo onye yi ya ọkụ, nke a na-eme ka ha kara baa uru n’oge ụgụrụ.

Uwe Hanbok na-ekusa ekusa n’ahụ́. A kwaghị ya otú ahụ iji mee ka ọ bụrụ ejiji na-ewu ewu kama ọ bụ n’ihi ezigbo mkpa e nwere ọtụtụ narị afọ gara aga bụ́ mgbe a na-agbakarị ịnyịnya n’ógbè ahụ. Magazin bụ́ Culture & I kwuru, sị: “E wepụtara uwe a iji na-eche oyi na iji na-achụ nta ma na-achịgharị anụmanụ.” N’ihi ya, ndị Korea na-agba ịnyịnya ekweghị eyi uwe ọ bụla na-ekusaghị ha ekusa n’ahụ́. N’ezie, ndị Korea bụ́ ndị na-eyi hanbok taa ji ndị nna nna ha hà ụgwọ ekele maka otú uwe ahụ si ekusa ekusa n’ahụ́!

Ihe ọzọ na-akpali mmasị banyere hanbok bụ ihe a na-eme kemgbe ụwa nke bụ́ iji ụcha uwe amata onye bụ́ onye. N’oge gara aga, ndị ọchịchị Korea na-eyi uwe tụrụ àgwà, ebe ndị nọ n’ọkwá dị ala na-eyikarị uwe ọcha. Ọzọkwa, a pụrụ ịmata nwanyị na-alụbeghị di site na ya iyi uwe na-achakọta odo odo na ọbara ọbara. Ọ lụọ di, ụcha hanbok ya ga-ekwekọ n’ọkwá di ya nọ na ya. N’ememe agbamakwụkwọ taa, nne nwanyị a na-alụ alụ kwesịrị iyi uwe na-acha pinki pinki, ebe nne nwoke na-alụ nwanyị ahụ na-eyi nke na-acha anụnụ anụnụ. N’ezie, nke a na-eme ka ọ dị mfe ịmata ha.

Hanbok Taa

Mgbe Agha Korea (1950-1953) biri, a malitere ime mkpọsa ka e jiri ihe ọgbara ọhụrụ na-eme ihe. N’ihi ya, ka ọ na-eru n’afọ ndị 1970, a kwụsịrị iyi uwe hanbok, e jikwa ejiji ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa dochie ya. Ihe bụbu uwe a na-eyi kwa ụbọchị si otú a ghọọ uwe na-anọzi n’ala igbe. Nanị mgbe a na-ahụ ya bụ n’oge agbamakwụkwọ, n’oge ememe, na n’oge ndị ọzọ a na-eme ihe omume pụrụ iche.

Otú ọ dị, n’oge na-adịbeghị anya, a maliteghachiwo iyi hanbok. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1996, e mere mgbalị ime ka ejiji ahụ maliteghachi iwu ewu mgbe e wepụtara Saturday mbụ nke ọnwa ọ bụla dị ka “ụbọchị a ga na-eyi hanbok.” Ndị na-emepụta uwe mepụtara hanbok ndị ọhụrụ, bụ́ ndị e mepụtara karịsịa maka ndị ntorobịa. Ihe àmà na-egosi na ndị mmadụ ịlaghachi n’ihe e jibu mara ha na-enye afọ ojuju, n’ihi na ejiji hanbok nke oge a na-ewuzi nnọọ ewu. N’ọgbọ nke ọtụtụ n’ime ejiji ndị e nwere na-egosipụta ọchịchọ anụ ahụ́, hanbok bụ ihe atụ magburu onwe ya nke ejiji mara mma ma kwesị ekwesị.—1 Timoti 2:9.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọ bụ ezie na e nwere hanbok nke ụmụ nwoke na nke ụmụ nwanyị, nke anyị na-atụle n’isiokwu a bụ nke ụmụ nwanyị.