Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ilebara Ụmụaka Anya Otú Ahụ́ Ha Chọrọ

Ilebara Ụmụaka Anya Otú Ahụ́ Ha Chọrọ

Echiche nke Bible

Ilebara Ụmụaka Anya Otú Ahụ́ Ha Chọrọ

ỌKPARA Chineke ò nwere oge iji soro ụmụaka nọkọọ? Ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya echeghị otú ahụ. N’otu oge, ha nwara ịchụpụ ụmụaka ka ha ghara ịbịaru Jizọs nso. Ma, ọ gwara ha, sị: “Kwenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m; unu anwala igbochi ha.” Mgbe ahụ, o ji ịhụnanya nabata ìgwè ụmụaka ahụ ma soro ha kwurịta okwu. (Mak 10:13-16) Jizọs si otú a gosi na ya dị njikere ilebara ụmụaka anya. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya ya taa? Ọ bụ site n’ịzụ ụmụ ha nke ọma ma na-eso ha anọkọ.

N’ezie, ezigbo ndị nne na nna na-agbalịsi ike ilekọta ụmụ ha anya, ma na-ezere imegbu ha. A pụdịrị ikwu na ọ bụ ihe “e bu pụta ụwa” bụ́ ndị nne na nna ịkwanyere ụmụ ha ùgwù na ichebara ha echiche. Otú ọ dị, Bible na-adọ aka ná ntị na ọtụtụ mmadụ n’oge anyị agaghịzi enwe “obi mmadụ.” (2 Timoti 3:1-3) A bịakwa n’ebe ndị nke hụrụ ụmụ ha n’anya nọ, ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe ihe ha ga-amụta ma a bịa n’ihe banyere ịbụ ezigbo nne ma ọ bụ nna. N’ihi ya, ụkpụrụ Bible ndị na-esonụ bụụrụ ndị nne na nna chọrọ ọdịmma ụmụ ha ezigbo ihe ncheta.

Inye Ha Ọzụzụ n’Akpasughị Ha Iwe

Dr. Robert Coles, bụ́ onye nkụzi a ma ama na onye na-ahụ maka ọrịa uche, kwuru n’otu oge, sị: “Ụmụaka na-enwetụ echiche nke ime omume ọma. Ana m eche na ọ bụ ihe si n’aka Chineke, na ụmụaka na-enwe ọchịchọ ịbụ ndị e duziri ime omume ọma.” Ònye ga-emeju ọchịchọ a ha na-enwe maka ịbụ ndị e duziri ime omume ọma?

Ndị Efesọs 6:4, Akwụkwọ Nsọ na-agba ume, sị: “Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” Ị̀ chọpụtara na ọ bụ ndị nna ka Akwụkwọ Nsọ nyere ọrụ nke ime ka ụmụ ha hụ Chineke n’anya ma jiri ụkpụrụ ya kpọrọ ihe? N’amaokwu nke 1 nke Ndị Efesọs isi 6, Pọl onyeozi kpọtụrụ ma nne ma nna aha mgbe ọ gwara ụmụ ka ha ‘na-erubere ndị mụrụ ha isi.’ *

N’ezie, ọ bụrụ na nna anọghị ya, mgbe ahụ nne aghaghị iburu ibu ọrụ a. Ọtụtụ ndị nne na-enweghị di enwewo ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ụmụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova Chineke. Otú ọ dị, ọ bụrụ na nne ahụ alụọ di, di ya bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ibute ụzọ. Onye bụ́ nne kwesịrị iji obi ya nakwere idu ndú di ya n’ịzụlite ụmụ ha nakwa n’ịdọ ha aka ná ntị.

Olee otú ị ga-esi dọọ ụmụ gị aka ná ntị ma ọ bụ nye ha ọzụzụ n’emeghị ha “ihe iwe”? E nweghị ụzọ ọrụ ebube e si eme ya, nke ka nke ebe ọ bụ na ụmụaka nile abụghị otu. Ma ndị nne na nna aghaghị ichebara otú ha si adọ ụmụ ha aka ná ntị echiche nke ọma, na-egosi ha ịhụnanya na nkwanye ùgwù mgbe nile. Ọ dị mma ịmara na Akwụkwọ Nsọ kwughachiri banyere ịkpasu ụmụaka iwe ná Ndị Kọlọsi 3:21. N’ebe ahụ, a dụrụ ndị nna ọdụ ọzọ, sị: “Unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.”

Ụfọdụ ndị nne na nna na-agbọja ma na-eji olu ike agwa ụmụ ha okwu. Obi abụọ adịghị ya na nke a na-akpasu ụmụaka iwe. Ma Bible na-agba ume, sị: “Ka e wepụ obi ilu na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị n’ebe unu nọ.” (Ndị Efesọs 4:31) Bible na-ekwukwa na “ọ dịghị mkpa ka ohu nke Onyenwe anyị na-alụ ọgụ, kama ọ dị mkpa ka ọ na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro.”—2 Timoti 2:24.

Nye Ha Oge Gị

Ilebara ụmụ gị anya otú ahụ́ ha chọrọ pụtakwara na ị ga-adị njikere ịchụ ihe ụtọ na ihe omume ndị na-amasị gị n’àjà maka ọdịmma ha. Bible kwuru, sị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”—Deuterọnọmi 6:6, 7.

Taa, mkpa ego na-eme ka ọtụtụ ndị nne na nna ghara inwe oge, site n’ụtụtụ ruo abalị, nke ha ga-eji soro ụmụ ha na-anọkọ. Ma, Deuterọnọmi kwusiri ya ike na ndị nne na nna ‘ga-ejisi ike’ wepụta oge ha ga-eji soro ụmụ ha na-anọkọ. Ime nke a na-achọ ezi nhazi nakwa ịchụ ihe n’àjà. Ma, nlebara anya dị otú ahụ dị ụmụaka mkpa.

Tụlee ihe a chọpụtara n’otu nnyocha e ji ihe karịrị mmadụ 12,000 dị afọ iri na ụma mee. Ndị nchọpụta ahụ kwubiri, sị: “Onye dị afọ iri na ụma iso nne ya ma ọ bụ nna ya na-akpachi anya bụ ihe ga-akasị eme ka o nwee ezi ahụ́ ike, ọ bụkwa ihe ga-akasị egbochi ya ịkpa àgwà ndị dị ize ndụ.” N’ezie, ụmụaka na-achọ ka ndị mụrụ ha na-elebara ha anya. Otu nne jụrụ ụmụ ya n’otu oge, sị, “Ọ bụrụ na ihe ọ bụla unu chọrọ pụrụ iru unu aka, olee ihe mbụ unu ga-achọ ka o ruo unu aka?” Ha anọ zara, sị, “Ọ bụ ka gị na papa anyị na-ewepụtakwu oge iji na-anọnyere anyị.”

N’ihi ya, ịbụ ezigbo nne ma ọ bụ nna pụtara na ị ga-ahụ na ị na-egbo mkpa ụmụ gị, nke gụnyere mkpa ha nwere maka ọzụzụ ime mmụọ na iso ndị mụrụ ha na-enwe mmekọrịta chiri anya. Ọ pụtara inyere ụmụaka aka ịghọ ndị okenye tozuru etozu bụ́ ndị a ga na-akwanyere ùgwù, ndị ga na-eme ihe n’eziokwu, ndị ga na-eji obiọma na-emeso mmadụ ibe ha ihe ma na-ewetara Onye Okike ha otuto. (1 Samuel 2:26) N’ezie, mgbe ndị nne na nna na-azụlite ma na-adọ ụmụ ha aka ná ntị n’ụzọ nke Chineke, ha na-egosi na ha bụ ezigbo ndị nne na nna.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Okwu Grik Pọl ji mee ihe n’ebe a bụ go·neuʹsin. Ebe e si nweta ya bụ n’okwu bụ́ go·neusʹ, nke pụtara “nne” ma ọ bụ “nna.” Ma n’amaokwu nke 4, okwu Grik o ji mee ihe bụ pa·teʹres, nke pụtara “ndị bụ́ nna.”

[Foto dị na peeji nke 23]

Ịgbọja na iji olu ike agwa nwata okwu pụrụ ime ka obi ghara iru ya ala

[Foto dị na peeji nke 23]

Na-eso ụmụ gị na-anọkọ